‘Ịdị Ndụ Na-eburu n’Uche Ịdị Nso nke Ụbọchị Jehova’
DỊ KA LYLE REUSCH SI KỌỌ
LAA azụ ruo ogologo oge m pụrụ icheta, ndụ ezinụlọ anyị gbanyere mkpọrọgwụ n’ikwere n’ụwa ọhụrụ nke ezi omume nke na-abịanụ. Nne m na nna m na-agụrụ anyị bụ ụmụntakịrị ihe sitere na Bible banyere ‘eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ ahụ’ nakwa banyere ‘nne ehi na anụ ọhịa bear ịtakọ nri, ọdụm ịta ahịhịa dị ka oké ehi, nakwa nwata ịbụ onye na-edu ha nile.’ Ha mere ka ọ bụrụ ihe dị adị n’ezie, ana m eji anya nke uche na-ahụ onwe m dị ka nwata ahụ.—2 Pita 3:11-13; Aịsaịa 11:6-9.
N’afọ ndị 1890, nna nna m, bụ́ August Reusch, mụtara eziokwu Bible ndị bụ isi site ná nderịta akwụkwọ nke ya na Charles T. Russell. O kwusara ozi ọma nke ukwuu n’ime na gburugburu obodo ya nke dị n’Ókèala Ebe Ugwu Ọdịda Anyanwụ nke Canada, nke bụ Yorkton, Saskatchewan, ugbu a. Ọtụtụ ugbo ọ na-enye ụmụ ya ndụmọdụ, sị: “Ụmụ m, lepụnụ anya maka 1914!” N’ikweresi ike na ụbọchị nke Jehova dị ezi nso tinyere n’ime nna m echiche nke ịdị ngwa, bụ́ nke dịgidere n’oge ndụ ya nile, nke ahụ abụrụwokwa ụzọ nke ndụ nye m.
Mama na Papa bụ ndị na-ele ndị ọbịa anya nke ọma nke ukwuu. Òtù ọmụmụ Bible nke Ọgbakọ Saskatoon, Saskatchewan, nke Ndị Mmụta Bible na-ezukọta mgbe nile n’ụlọ anyị. Ndị ozi na-ejegharị ejegharị, (ndị a na-akpọ ndị pilgrim) na-anọ n’ụlọ anyị ọtụtụ mgbe. Mụ na nwanne m nwoke, bụ́ Verne, na nwanne m nwanyị, bụ́ Vera, ritere uru n’ụzọ ime mmụọ. Mgbe nile, a na-enwe echiche nke bụ na ozi Alaeze ahụ bụ ihe dị adị n’ezie, na e nwekwara mkpa dị ngwa ịgwa ndị ọzọ banyere ya. (Matiu 24:14) Amataghị m n’oge ahụ na n’afọ ndị na-abịa n’ihu, m ga-etinye akụkụ ka ukwuu nke ndụ m n’iburu ọrụ nke ndị pilgrim ndị a gaa n’ihu site n’ije ozi dị ka onye nlekọta na-ejegharị ejegharị nke Ndịàmà Jehova.
Na 1927, Papa m kpọọrọ ezinụlọ anyị kwafee Berkeley, California. Mgbe ahụ, n’oge oké ndakpọ akụ na ụba ahụ e nwere na 1933, agụsịrị m akwụkwọ na kọleji. Mụ na nwanne m nwoke, bụ́ Verne lere onwe anyị anya dị ka ndị nwere ihe ndabara ọma inweta ọrụ n’ụlọ ọrụ Ford Motor Company nke dị na Richmond, California. Otú ọ dị, n’otu ụbọchị n’oge opupu ihe ubi nke 1935, atụgharịrị m uche, sị: ‘Ọ bụrụ na m ghaghị ịrụsi ọrụ ike, ọ ga-aka nnọọ mma ka m rụsie ọrụ ike maka ihe bara uru.’ N’ụbọchị ahụ, etinyere m akwụkwọ ịgba arụkwaghịm, n’echi ya, edekwara m akwụkwọ iji nata akwụkwọ m ga-eji rịọ ka e were m maka ije ozi Betel, bụ́ isi ụlọ ọrụ ụwa dum nke Ndịàmà Jehova, dị na Brooklyn, New York. Mgbe m jesịrị mgbakọ ahụ na-akpali akpali e nwere na Washington, D.C., na June 1935, a nabatara m maka ije ozi Betel.
Ije Ozi Betel
Nathan Knorr, bụ́ onye na-elekọta ebe obibi akwụkwọ, dunyere m ịrụ ọrụ idozi ụlọ ndị e wuworo ewu. Ọ bụ nanị m na-arụ ọrụ nke a. Dị ka nwa okoro dị 20 afọ, enwere m mmetụta nke onye dị mkpa nke ukwuu. Enwere m ike ijegharị ebe masịrị m n’ime ebe obibi akwụkwọ ahụ, ọ dịghịkwa onye na-ajụ m ajụjụ ihe m na-eme. Nwanna Knorr nwere mmasị n’otú m si arụ ọrụ m, ma ọ chọpụtara na e nwere nsogbu banyere àgwà m. Ọ nọgidere na-agbalị inwe mmetụta dị mma n’ahụ m ka m wee nwee ike ịzụlite inwe obi umeala.
Otú ọ dị, o were ogologo oge ụfọdụ tupu m ghọta na Nwanna Knorr na-agbalị inyere m aka n’ezie. Ya mere arịọrọ m ya mgbaghara maka àgwà m wee kwupụta mkpebi siri ike m nwere imeziwanye ihe. Nke ahụ bụ mmalite nke ogologo mkpakọrịta na-enye obi ụtọ nke mụ na Nwanna Knorr, onye mesịrị ghọọ onye isi oche nke atọ nke Watch Tower Society na January 1942.
E wezụga ịrụ ọrụ ndozi ụlọ ahụ, amụrụ m otú e si eji ihe ka ọtụtụ n’ígwè ọrụ ndị dị n’ebe a na-ekwe azụ akwụkwọ arụ ọrụ ma ọ bụ inye aka na ha. Mgbe oge ụfọdụ gasịrị, arụrụ m ọrụ n’ọfịs, idepụta na izipụ akwụkwọ ndị na-enye ike ka a rụọ ọrụ dị iche iche n’ebe obibi akwụkwọ ahụ. Oge opupu ihe ubi na oge okpomọkụ nke 1943 bụ oge ịrụsi ọrụ ike na oge na-akpali akpali n’ụzọ pụrụ iche. Ụwa nọ n’etiti Agha Ụwa nke Abụọ, Ndịàmà Jehova anagidewokwa nsogbu a na-enye ha, njide, na ịtụ mkpọrọ n’ihi ụdị ebubo ụgha dị iche iche. Na 1940, Ụlọ Ikpe Ukwu nke mba U.S. ekpebiwo na ụlọ akwụkwọ dị iche iche nwere ike ikwu ka ụmụ akwụkwọ ha kelee ọkọlọtọ. Nke a kpaliri oké ntiwapụ nke ime ihe ike na 44 n’ime 48 steti e nwere n’oge ahụ. A chụpụrụ ụmụntakịrị Ndịàmà n’ụlọ akwụkwọ, e jidere ndị mụrụ ụmụ, ìgwè ndị na-eme ihe ike chụpụrụ Ndịàmà n’obodo dị iche iche. A gbara ndị mmadụ ụfọdụ égbè, wụọ ndị ọzọ ágbá coal tar ma wụkwasị ha abụba ọkụkọ.
Ka Ndịàmà Jehova na-eguzogide mmeso ọjọọ ndị a nile n’ụlọ ikpe dị iche iche, e nwere ọtụtụ akwụkwọ ndị dị n’ụdị ọkpụkpọ òkù ụlọ ikpe, ndepụta ihe ndị ọkà iwu, akwụkwọ dị iche iche ndị na-arụ ọrụ ná ngalaba Society nke na-ahụ maka okwu ikpe depụtara, ndị e wetaara m maka obibi. Anyị nile rụrụ ọrụ ọtụtụ hour karịa otú anyị kwesịrị iji rụpụta ihe ndị a mgbe a chọrọ ha. Mkpebi ikpe Ụlọ Ikpe Ukwu ndị si na nke a pụta na May na June nke 1943—mgbe e kpelaara Ndịàmà Jehova 12 n’ime 13 okwu ikpe dị iche iche—aghọwo akụkụ nke ihe ndekọ akụkọ ihe mere eme nke okwu ikpe. Enwere m obi ekele iji anya m hụrụ otú Jehova siri meghee ụzọ n’iguzobe ozi ọma ahụ na iji iwu kwadoo ya.—Ndị Filipaị 1:7.
Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
N’ụzọ ụfọḍụ, anyị enweghị ngwá ọrụ kwesịrị ekwesị n’oge ahụ maka ịrụzu oké ọrụ ahụ e buru amụma ya na Matiu 24:14, nke bụ, ‘ikwusa ozi ọma nke a nke Alaeze n’elu ụwa dum tupu ọgwụgwụ ihe nile eruo.’ Nwanna Knorr, dị ka onye isi oche Society, hụrụ mkpa e nwere maka usoro ihe omume nke inye ọzụzụ. Mụ na ndị nwoke ndị ọzọ nọ n’ezinụlọ Betel natara ọkpụkpọ òkù idenye aha anyị maka “Ọzụzụ Dị Elu n’Ije Ozi Ọchịchị Chineke.” Nke a mesịrị ghọọ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke, bụ́ nke nọworo na-arụ ọrụ n’ọgbakọ dị iche iche nke Ndịàmà Jehova kemgbe 1943.
Anyị zukọtara n’ụlọ nzukọ ezinụlọ Betel n’uhuruchi Monday, February 16, 1942, Nwanna Knorr kwukwara okwu izi ihe nke mbụ. Isiokwu ya bụ “Ihe Odide Ochie Dị Iche Iche nke Bible.” Nwanna T. J. Sullivan bụ onye nlekọta ụlọ akwụkwọ ahụ, nyekwa anyị ndụmọdụ iji nyere anyị aka imeziwanye ihe. Mgbe oge na-aga, e nyere m ọrụ nke a nke ịbụ onye nlekọta ụlọ akwụkwọ Betel, bụ́ nke m lere anya dị ka oké ihe ùgwù. Ma ọ bụkwa oge ọzọ maka ịnara ọzụzụ.
Akatọrọ m otu nwanna meworo okenye karị nke ukwuu nakwa n’ụzọ na-egosighị nkwanye ùgwù, ya mere Nwanna Knorr gwara m hoo haa, sị: “Ọ dịghị onye ọ na-amasị mgbe ị na-egosigharị onye ọ bụla ike i nwere.” Mgbe ihe ọ kọwara doworo m anya, mgbe ahụ dajulatachara m, anya buru ibu na-acha nchara nchara nke Nwanna Knorr dajụlatara. N’olu dị nwayọọ, ọ gụrụ Abụ Ọma 141:5, sị: “Ka onye ezi omume tie m ihe; ọ ga-abụ obi ebere: ka ọ baakwara m mba; ọ ga-abụ mmanụ dị oké mma, nke na-agaghị etiwa m isi.” (King James Version) Ejiwo m akụkụ ihe odide ahụ mee ihe ọtụtụ mgbe mgbe ọ bụworo ọrụ dịịrị m inye ndị ọzọ ndụmọdụ iji gbazie ha.
Tupu mmalite nke Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke, ọ bụ nanị ole na ole n’ime anyị nwere ohere ikwu okwu ihu ọha hie nne. Mgbe Nwanna Rutherford nwụrụ, Nwanna Knorr rụsiri ọrụ ike imeziwanye ikike ikwu okwu ya. Ụlọ ebe m bi na Betel dị kpọmkwem n’okpuru ebe obibi ya, ana m anụkwa ka ọ na-amụghachi okwu ihu ọha ya. N’ezie, ọtụtụ ugbo, ọ gụpụtara n’olu dara ụda okwu ihu ọha ahụ isiokwu ya bụ “Udo—Ọ̀ Pụrụ Ịdịgide?” tupu o kwuo ya ná mgbakọ ahụ e mere na Cleveland na 1942.
N’Okporo Ụzọ
Mgbe m jesịworo ozi ruo afọ 13 na Betel, Nwanna Knorr nyere m ọrụ ije ozi n’ubi dị ka onye nlekọta distrikt. Mgbe ọ na-akọrọ m banyere ọrụ ọhụrụ ahụ e kenyere m, ọ sịrị: “Lyle, ugbu a, ị ga-enwe ohere iji anya gị hụ ụzọ Jehova na-esi emeso ndị ya ihe.” N’iburu nke a n’uche, burukwa igbe abụọ n’aka, amalitere m ọrụ m dị ka onye nlekọta na-ejegharị ejegharị na May 15, 1948. Tupu m malite ọrụ distrikt ahụ, ejere m ozi dị ka onye nlekọta sekit ruo ọnwa ole na ole.
Òtù, ma ọ bụ ọgbakọ mbụ m letara bụ otu nke nta dị n’ime obodo Waseca, Minnesota. Ebuwo m ụzọ degara Dick Cain akwụkwọ, onye bụ onye ohu òtù ahụ (dị ka a na-akpọ onye isi oche ndị nlekọta n’oge ahụ) ka o zute m n’ebe ụgbọ okporo ígwè na-akwụsị. Ọ bụ onye ọsụ ụzọ pụrụ iche, ijikwa belata mmefu ego ya, o siwo n’otu ọnụ ụlọ ahụ ọ natara ná ngo, bụ́ ebe ọ na-anọ n’oge oyi, kwafee n’ebe ọ na-ebi n’oge okpomọkụ, bụ́ n’ụlọ ntu. Otu ọ dị, Minnesota n’ọnwa May abụchaghị nnọọ oge okpomọkụ! N’abalị ahụ, ebe ahụ na-ama m jijiji n’ime ụlọ ntụ ahụ, atụgharịrị m uche ma ụzọ ndụ nke a ò kwesịkwaara m. Oké àzụ̀zụ̀ jidere m, bụ́ nke nọruru ọtụtụ izu, ma alanarịrị m ya.
N’afọ ndị mbụ ndị ahụ, mgbe m na-eleta ọgbakọ na sekit dị iche iche, ana m ebi n’ụlọ ụmụnna dị iche iche, ihe nile m ji biri na-adịkwa n’ime igbe. Enwetara m ụdị ebe obibi dị iche iche, gụnyere ihi ụra n’ala kichin, n’oche kushọn ogologo ndị dị na palọ, n’uko ụlọ ndị na-ekpo ọkụ, ndị na-enweghị ebe ikuku si abata ha. Mgbe ụfọdụ ana m ebi n’ụlọ ebe otu n’ime ndị ezinụlọ ahụ na-emegide ihe ndị anyị kweere na ha. Na Wisconsin, otu onye bụ di nke na-ekweghị ekwe legidere m anya ọjọọ n’ogologo izu ahụ dum mgbe m nọ na-abata, na-apụkwa. Mgbe ọ lọtara n’otu anyasị mgbe mmanya na-egbu ya, mgbe m nụpetakwara ka ọ na-eyi egwu “ịgbagbu onye ahụ,” ekwubiri m na oge eruwo ka m laa. Ma ahụhụ ndị na-adịghị enye obi obi ụtọ dị ole na ole ma e jiri ha tụnyere ndị ọzọ, ha tinyekwukwara ihe ụtọ n’ọrụ m. Ha na-abụ ihe na-atọ ọchị mgbe oge gasịrị.
Achọta M Onye Inyeaka
Ana m echeta ya nke ọma. N’otu mgbakọ sekit e mere na Tiffin, Ohio, ezutere m otu ọmarịcha nwa agbọghọ anya ya na-acha nchara nchara, bụ́ Leona Ehrman, onye si Fort Wayne, Indiana. A zụlitekwara ya n’okwukwe ndị Kraịst, ọ bụwokwa onye ọsụ ụzọ kwesịrị ntụkwasị obi ruo ọtụtụ afọ. Ịnọ na njem mgbe nile enyeghị ohere maka ime mkpakọrịta nke mbedo, ma anyị nọgidere na-ederịta akwụkwọ ozi. Mgbe ahụ, na 1952, ajụrụ m, sị, “Ọ̀ ga-amasị gị?” Ọ sịkwara, “Ee, ọ ga-amasị m!” anyị wee mee otú ahụ. Anyị lụrụ di na nwunye. Ọtụtụ mgbe, a jụwo anyị ihe mere na anyị ebighị n’otu ebe wee nwee ụlọ na ezinụlọ, ma anyị na-asị na anyị nwere ezinụlọ—ụmụnna nwoke, ụmụnna nwanyị, ndị nna, na ndị nne, n’ihe dị ka 44 steti dị iche iche ebe anyị jeworo ozi.—Mak 10:29, 30.
Ụfọdụ ndị ajụwo, sị, ‘Ọ́ dịtụbeghị mgbe ike gwụrụ gị, o wee dị gị ka gị kwụsị?’ Ee, karịa otu ugbo. Ma n’etiti anyị abụọ, mgbe ike gwụrụ otu onye, onye nke ọzọ na-akwalite ya. N’otu mgbe, ọbụna na edegaara m nwanne m nwoke, bụ́ Verne, akwụkwọ, na-ajụ ya ma ọ̀ ga-ekwe omume iso ya na-arụ ọrụ n’ọrụ ya nke ite ụlọ ágbá. Ọ zaghachiri na ya enwewo olileanya maka nke ahụ ọtụtụ mgbe n’ihi na anyị nwere nnọọ mmekọrịta chiri anya mgbe anyị na-etolite etolite. Otú ọ dị, o nyere m ndụmọdụ ka m tụlee mkpebi m nke ọma. Mgbe ahụ echetara m okwu ahụ Nwanna Knorr na-ekwughachikarị gwa ndị nọ n’ezinụlọ Betel: “Ọ naghị ewe oké mgbalị ịhapụ ọrụ gị; ọ na-achọ obi ike na iguzosi ike n’ezi ihe iji nọgide n’ọrụ e kenyere gị.” Nke ahụ ka bụ ndụmọdụ dị mma.
Ọ dịghị onye nlekọta na-ejegharị ejegharị nke pụrụ ịrapagidesi ike n’ọrụ e kenyere ya ruo ogologo oge ma ọ bụrụ na o nweghị nwunye nke na-eguzosi ike n’ihe, na-akwadokwa ya; dị ka Leona bụwooro m. Ezi ọdịdị mmadụ ya nke na-ahụ n’anya, nakwa àgwà ya nke inwe ihu ọchị n’ọgbakọ ndị anyị jeworo na ha emewo ka ọtụtụ puku mmadụ hụ ya n’anya. Ike anaghị agwụ m mgbe ọ bụla ịgwa ya otú m si hụ ya n’anya nke ukwuu. Eji m n’aka na nke ahụ na-enyere ya aka ịrapagidesikwa ike n’ọrụ ahụ.
Ihe Àmà nye Ngọzi Jehova
Ọrụ bụ isi nke onye nlekọta distrikt na-emetụta mgbakọ sekit, ebe ọ na-eje ozi kwa izu dị ka onye isi oche, onye na-ekwu okwu ihu ọha, na onye nlekọta ụlọ akwụkwọ. Ngọzi Jehova ná ndokwa nke a pụtara ìhè n’eziokwu ahụ nke bụ na n’ime ọtụtụ narị mgbakọ sekit ndị m lekọtaworo, ọ dịbeghị nke ọ bụla a hapụrụ inwe. Ọ bụ ezie na ihe ụfọdụ agbalịwo ịkwụsị ụfọdụ n’ime ha, ma ọ dịbeghị nke ọ bụla a kagburu.
Na Wooster, Ohio, n’oge opupu ihe ubi nke 1950, mgbe m kpọrọ abụ mmechi maka nnọkọ oge anyasị nke Saturday, ìgwè ndị na-eme ihe ike nke ihe karịrị otu puku ndị na-emegide emegide zukọtara n’èzí nke ụlọ nzukọ anyị nọ na-eme mgbakọ ahụ. Ìgwè ndị ahụ na-eme ihe ike bu ọtụtụ igbe àkwá rere ere ha ga-atụ anyị mgbe anyị na-apụta. Ya mere, anyị tụlere ọnọdụ ahụ wee mee ka usoro ihe omume ahụ nọgide na-aga n’ihu, na-eji abụ, ahụmahụ, na okwu Bible ndị e chepụtara ozugbo ahụ. Ndịàmà ahụ dị 800 nọgidere jụụ, nweekwa ndidi.
N’elekere 2:00 nke isi ụtụtụ, ọnọdụ ihu eluigwe jụrụ oyi nke ukwuu. Dị ka à ga-asị na ọ bụ ịkwadebe maka ịpụta, ndị atendantị wepụtara paịpụ mmiri e ji agbanyụ ọkụ wee malite ịsachapụsị àkwá ndị dara n’akụkụ okporo ụzọ ahụ nke dị n’ihu ụlọ. Ìgwè ndị ahụ na-eme ihe ike zukọtakwara ọzọ, na-ahapụ okpomọkụ nke ebe nkwụsị bọọsụ dị nso. Ma ihe ahụ ndị atendantị na-eme bụ iji megharịa ha anya. Anyị gbasakwara, wee mee ka ìgwè mmadụ ahụ jiri nwayọọ si n’ụzọ nke dị n’azụ ụlọ wee pụọ. Mmadụ nile jeruru n’ebe ha dọbara ụgbọ ala ha n’enweghị mmerụ ahụ ọ bụla. Ìgwè ndị na-eme ihe ike nwakwara igbochi mgbakọ ndị ọzọ e mere n’Ohio, na Canton, Defiance, na Chillicothe. Ma ime ihe ike nke ìgwè mmadụ na-ebelata, ka mkpebi dị iche iche nke Ụlọ Ikpe Ukwu mba U.S. na-ekpelara anyị malitere inwe mmetụta n’ahụ ndị ahụ na-emebi iwu.
Mgbe oge na-aga, nsogbu ahụ ike mere ka ọ dị mkpa ime mgbanwe. Ya mere n’etiti afọ ndị 1970, Society ji obi ọma kenye m ọrụ dị ka onye nlekọta sekit n’ebe ndịda California ebe ọgbakọ dị iche iche dịrịtara ibe ha nso, ebe a pụkwara inweta nlekọta ahụ ike ngwa ngwa. Ebe ọrụ onye nlekọta distrikt metụtara ịga njem nke ukwuu karị, nakwa ilekọta ọtụtụ sekit, ọrụ onye nlekọta sekit metụtara ịhazi mgbakọ sekit na ikenye na ịmụgharị ihe omume dị iche iche. Tinyere nke a, ọ dịkwa mkpa ịhazi, lekọtakwa Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọsụ Ụzọ. Ya mere, ọrụ ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị ma ọ̀ bụ nke distrikt ma ọ̀ bụ sekit, bụ ụzọ ndụ ọrụ oge nile nke na-enyeghachi ụgwọ ọrụ.
Anyị Ka Nọ Na-ele Anya Ụbọchị Jehova
Site na mgbe kasị dịrị anya m pụrụ icheta n’ihe karịrị 70 afọ gara aga, anọgidewo m na-enwe mmetụta nke ịdị ngwa. Mgbe nile, Amagedọn anọgidewo na-abụ, n’echiche m, ihe ga-abịa nwanne echi. (Mkpughe 16:14, 16) Dị ka nna m mere, dịkwa ka nna ya mere tupu ya onwe ya, ebiwo m ndụ m dị ka onye onyeozi ahụ gbara ume, “na-ele anya ọbịbịa [“ọnụnọ,” NW] nke ụbọchị ahụ nke Chineke [“Jehova,” NW].” Anọgidewo m na-ele ụwa ọhụrụ ahụ e kwere ná nkwa anya dị ka ‘ihe dị adị n’ezie, ọ bụ ezie na a hụghị ya anya.’—2 Pita 3:11, 12; Ndị Hibru 11:1.
N’oge na-adịghị anya, a gaje imezu olileanya nke a a kụnyeworo n’ime m eri mgbe m bụ nwata. “Nne ehi na anụ ọhịa bear ga-atakọkwa nri,” “ọdụm ga-atakwa okporo ọka dị ka ehi,” “nwatakịrị ga na-edukwa ha.” (Aịsaịa 11:6-9) E mere ka nkwa ndị ahụ na-enye obi ụtọ bụrụ ihe e ji n’aka site n’ihe Jisọs gwara Jọn ná Mkpughe 21:5, sị: “Onye ahụ nke na-anọkwasị n’ocheeze ahụ wee sị, Lee, ana m eme ihe nile ka ha dị ọhụrụ. O wee sị, Dee akwụkwọ: n’ihi na okwu ndị a kwesịrị ntụkwasị obi, bụrụkwa eziokwu.”