Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w91 9/15 p. 4-6
  • Ekpere Òle Ndị Ka A Na-aza?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ekpere Òle Ndị Ka A Na-aza?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Àmà Na-egosi na Chineke Na-aza Ekpere
  • Ihe Mere na A Dịghị Aza Ekpere Ụfọdụ
  • ‘A Nụrụ Olu’ Jisọs
  • Ụzọ Jehova Na-esi Aza Ekpere Taa
  • A Na-aza Ekpere Ha
  • Bịaruo Chineke Nso n’Ekpere
    Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?
  • Otú Jehova Si Aza Ekpere Anyị
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2023
  • Okwu mmalite
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2021
  • Ekpere Òle Ndị Ka A Na-aza?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
w91 9/15 p. 4-6

Ekpere Òle Ndị Ka A Na-aza?

JEHOVA bụ Chineke onye na-aza ekpere. N’eziokwu, Okwu ya, bụ́ Bible, kpọrọ ya “Onye na-anụ ekpere.” (Abụ Ọma 65:2) Ọ dị njikere ịza ekpere. Ma ọ̀ bụ ekpere òle ndị ka ọ na-aza n’ezie?

Chineke na-aza ekpere nke mmadụ ndị na-eme ihe na-atọ ya ụtọ. Ha nwere àgwà nsọpụrụ ahụ dị omimi nke onye ọbụ abụ ahụ, bụ́ onye kwuru, sị: “Dị ka agụụ iyi mmiri si agụ nne ele, otú a ka agụụ gị na-agụ mkpụrụ obi m, Chineke. Akpịrị Chineke, bụ́ Chineke dị ndụ, akpọwo mkpụrụ obi m nkụ.” (Abụ Ọma 42:1, 2) Ma, ihe àmà dị aṅaa ka e nwere iji gosi na Jehova na-aza ekpere nke ndị na-efe ya ezi ofufe?

Ihe Àmà Na-egosi na Chineke Na-aza Ekpere

E nwere n’ime Bible, ihe ndekọ dị ukwuu nke na-anwapụta na Jehova na-aza ekpere nke ndị ohu ya kwesịrị ntụkwasị obi. Dị ka ihe atụ, mgbe Eze Jehoshafat nke Juda kpere ekpere maka nnapụta, Chineke zara ekpere ya wee mee ka o nwee mmeri site n’ime ka ndị iro ya gburịta ibe ha. (2 Ihe Emere 20:1-26) Mgbe Eze Hezekaịa chekwara usuu ndị agha dị oké ike ihu n’otu aka ahụ, o ji ịdị umeala n’obi kpekuo Chineke ekpere maka enyemaka. Hezekaịa hụrụ nnapụta nke Jehova mgbe otu mmụọ ozi tigburu 185,000 ndị Asịria n’otu anyasị.—Aịsaịa 37:14-20, 36-38.

N’ihi gịnị ka Chineke ji zaa ekpere ndị ahụ? N’ọnọdụ abụọ ndị ahụ, eze ndị ahụ rịọrọ arịrịọ na ịbụ ndị e meriri n’agha ahụ ga-enwe mmetụta dị njọ n’aha Jehova. (2 Ihe Emere 20:6-9; Aịsaịa 37:17-20) Ha nwere nchegbu banyere aha ọma ya. “Nzube kasị elu nke ekpere,” ka akwụkwọ bụ The International Standard Bible Encyclopedia kwuru, “abụghị nanị maka ọdịmma nke onye ahụ na-arịọ arịrịọ, kama ọ bụ nsọpụrụ nke aha Chineke.” N’ihi ya, ndị ohu Jehova kwesịrị ntụkwasị obi pụrụ ijide n’aka na ọ ga-enyere ha aka “n’ihi aha ya.” Ihe ndekọ ndị na-egosi na a zawo ekpere ndị dị otú ahụ na-enye ndị Chineke obi ike nke bụ na ọ na-anụ ekpere ha.—Abụ Ọma 91:14, 15; 106:8; Ilu 18:10.

Otú ọ dị, ọbụna ma a sị na ọnọdụ emetụta aha Jehova, Chineke na-ekpebi ma ọ̀ ga-aza ekpere ụfọdụ ma ọ bụ na ọ gaghị aza. Ọ pụrụ inwe ihe ndị ziri ezi mere na ọ gaghị aza ekpere ụfọdụ. Ọ bụrụ na anyị na-eche na a dịghị aza ekpere anyị, ọ dị mma ịtụle ihe pụrụ ịkpatawo nke a.

Ihe Mere na A Dịghị Aza Ekpere Ụfọdụ

N’otu mgbe gara aga, Jehova gwara ụmụ Israel, sị, “Ọbụna mgbe unu na-ekpe ọtụtụ ekpere, m gaghị adị na-anụ.” N’izo aka n’ihe kpatara nke a, ọ gara n’ihu ikwu, sị: “Aka unu jupụtara n’ọbara.” (Aịsaịa 1:15) Olee otú mmadụ pụrụ isi na-elefuru iwu Jehova anya ma nweekwa ohere nke ịbụ onye ọ nụrụ olu ya? Otu ilu dị na Bible na-enye azịza doro anya, na-asị: “Onye na-ewezụga ntị ya n’ịnụ iwu, ọbụna ekpere ya bụ ihe arụ.”—Ilu 28:9.

Bible na-enye ihe ọzọ mere na a dịghị anụ ekpere ụfọdụ mgbe ọ na-asị: “Unu na-arịọ arịrịọ, ma unu adịghị anata ihe, n’ihi na unu na-arịọ n’obi ọjọọ, ka unu wee mefuo ya n’ihe ụtọ nile unu.” (Jemes 4:3) Ee e, Jehova agaghị aza ekpere iji mejuo agụụ ihe ọjọọ. Anyị aghaghịkwa icheta na Chineke adịghị eme ihe ụmụ mmadụ nyere ya iwu ka o mee, dị ka a pụrụ ikwu ya. Ọ bụ ya bụ Onye na-ekpebi ụzọ ọ ga-esi zaa ekpere anyị.

Ndị e ji n’aka na a ga-aza ha bụ ekpere ndị a na-ekpeku Chineke site n’obi dị ọcha, site ná nzube kwesịrị ekwesị, sitekwa n’ụzọ ọ họpụtaworo—site na Jisọs Kraịst. (Jọn 14:6, 14) Ma, ọbụna ndị ekpere ha ruworo ihe ọ̀tụ̀tụ̀ ndị ahụ enwewo mmetụta mgbe ụfọdụ nke ịbụ ndị a na-anụghị ekpere ha. N’ihi gịnị ka Chineke na-agaghị aza ekpere ụfọdụ nke ndị ohu ya ozugbo ahụ?

Jehova maara oge kasị kwesị ekwesị iji zaa ekpere. Ọ bụ ezie na nwatakịrị pụrụ ịrịọ ka a zụtara ya ịnyịnya ígwè, ọ pụrụ ịbụ na nna ya agaghị azụtara ya ịnyịnya ígwè ahụ ruokwa mgbe o toruru ogo ịgba ya n’enweghị mmerụahụ. Ọ pụkwara ịdị otú ahụ n’ihe banyere ekpere nke ndị hụrụ Chineke n’anya. N’ịmara ihe kasị mma nye ha, ọ na-enye ha ihe dị ha mkpa n’oge kasị kwesị ekwesị maka ya.

Ma, ndị ohu Jehova adịghị enwetacha ihe nile ha kpere ekpere maka ha. N’ịbụ ndị na-ezughị okè, ha pụrụ inwe ọchịchọ maka ihe ụfọdụ ndị na-agaghị adịrị ha mma. Nna ha nke eluigwe onye na-ahụ n’anya agaghị enye ha ihe ọ bụla na-emerụ ahụ, n’ihi na ọ bụ Onye na-enye “ezi onyinye ọ bụla na ihe ọ bụla zuru okè nke e nyere enye.” (Jemes 1:17) N’otu aka ahụ, ọ pụrụ ịbụ na Chineke agaghị enye mmadụ ihe na-adịghị mkpa site n’ụzọ ya onwe ya si ele ihe anya. (Tụlee 2 Ndị Kọrint 12:7-10.) Ọ na-aza ekpere n’ụzọ kwekọrọ n’ọchịchọ na nzube ya maka ndị ya.—1 Jọn 5:14, 15.

‘A Nụrụ Olu’ Jisọs

Jisọs bụ onye na-ekpe ekpere mgbe nile. (Matiu 6:9-13; Jọn 17:1-26) O nwere obi ike zuru ezu na Nna ya nke eluigwe ga-anụ, zaakwa ekpere ya nile. N’otu mgbe Jisọs kwuru, sị: “Nna, . . . mụ onwe m matara na ị na-anụ olu m mgbe nile.” (Jọn 11:41, 42) Ma, ọ̀ bụ na a jụghị inye Jisọs ihe ọ chọrọ ná ngwụsị ngwụsị nke ije ozi elu ala ya? Ọ̀ bụ na o tiwapụghị mkpu n’oge ahụ, sị: “Chineke m, Chineke m, ọ̀ bụ n’ihi gịnị ka ị hapụrụ nanị m?”—Matiu 27:46.

Mgbe Jisọs kwuru okwu ndị ahụ, ihe àmà gosiri na ọ na-emezu otu amụma banyere ọnwụ ya. (Abụ Ọma 22:1) N’ụzọ a kpaara ókè, ihe Jisọs kwuru pụrụ ịpụta na Jehova ewepụwo nchebe ya ma kwere ka Ọkpara ya nwụọ ọnwụ ihe mgbu nakwa nke ihere ka o wee tinye nguzosi ike n’ezi ihe ya n’ule ruo ọ̀tụ̀tụ̀ kasị elu. Nnyocha nke ihe ndị mere n’ụbọchị ikpeazụ ahụ nke ndụ elu ala Jisọs na-egosi na Chineke nụrụ ekpere ya.

N’anyasị ahụ e jidere ya, Jisọs kpere ekpere n’ogige Getsemane. Ugbo atọ ọ rịọrọ arịrịọ, sị: “Nna m, ọ bụrụ na ọ ga-ekwe mee, ka iko a gabiga m.” (Matiu 26:39, 42, 44) Ọ bụghị na Jisọs na-ala azụ n’inye ndụ ya dị ka ihe mgbapụta maka ihe a kpọrọ mmadụ ndị kwere ekwe. Ee e, kama ihe àmà gosiri na o nwere nchegbu dị omimi banyere nkọcha a pụrụ iwetara Nna ya ọ hụrụ n’anya nke ukwuu site n’ịnwụ n’elu osisi ịta ahụhụ dị ka onye nkwutọ a bụworo ọnụ. Jehova ọ̀ nụrụ ekpere Jisọs?

Mgbe ọtụtụ afọ gasịrị, Pọl onyeozi dere, sị: “N’ụbọchị nke anụ ahụ ya, mgbe o weresịrị ịkwa ákwá siri ike na anya mmiri chee ekpere na arịrịọ n’ihu onye ahụ pụrụ ịzọpụta ya n’ọnwụ, mgbe a nụsịkwara olu ya n’ihi na ọ tụrụ egwu Chineke.” (Ndị Hibru 5:7; Luk 22:42, 44) Ee, n’anyasị ihe mgbu ahụ bu ọnwụ ya ụzọ, ‘a nụrụ olu’ Jisọs. Ma ọ̀ bụ n’ụzọ dị aṅaa?

Jehova zipụrụ otu mmụọ ozi nke ‘bịakwutere Jisọs, na-enye ya ike.’ (Luk 22:43) N’ịbụ onye e si otú a nye ike, Jisọs nwere ike iche ọnwụ ihu n’elu osisi ịta ahụhụ. Ọ ghaghị ịbụworị na n’oge ahụ Jehova mesiri ya obi ike na ọnwụ ya n’elu osisi ahụ agaghị ewetara aha Chineke nkọcha, kama na ọ ga-emesị bụrụ kpọmkwem ihe e ji doo ya nsọ. N’eziokwu, ọnwụ Jisọs n’elu osisi ịta ahụhụ meghere ụzọ nye ndị Juu, bụ́ ndị ga-abụworị ndị a bụrụ ọnụ n’okpuru Iwu ahụ ma e wezụga nke ahụ, ịbụ ndị a zọpụtara n’amamikpe ọnwụ.—Ndị Galetia 3:11-13.

Mgbe ụbọchị atọ gasịrị, Jehova kpọlitere Jisọs n’ọnwụ wee wepụchasịa ebubo nkwutọ ọ bụla a pụrụ ibowo ya rịị site n’ibuli ya gaa n’ọnọdụ ka elu n’eluigwe. (Ndị Filipaị 2:7-11) Lee nnọọ ụzọ dị ebube nke a bụ isi zaa ekpere Jisọs banyere “iko a”! A zara ekpere ahụ n’ụzọ nke Jehova. Jisọs nwetakwara ngọzi ndị dị ebube n’ihi na ọ gwaworị Nna ya nke eluigwe sị: “Ka e mee ihe gị onwe gị na-achọ, ọ bụghị ihe mụ onwe m na-achọ.”—Luk 22:42.

Ụzọ Jehova Na-esi Aza Ekpere Taa

Dị ka Jisọs, ndị ahụ na-achọ ime ihe na-atọ Jehova ụtọ taa kwesịrị ịdị na-arịọ ka e mee uche Chineke mgbe nile. Ọ dị ha mkpa inwe okwukwe na Jehova ga-aza ekpere ha n’ụzọ nke ga-abara ha uru karịsịa. N’eziokwu, ọ ‘ga-emebiga ihe ókè nke ukwuu hie nne karị ihe nile ha na-arịọ ma ọ bụ nke ha na-atụgharị n’uche.’—Ndị Efesọs 3:20.

Otu nwa agbọghọ onye Kraịst onye ya na ndị mụrụ ya, bụ́ ndị na-ekweghị ekwe bi, matara ịbụ eziokwu nke akụkụ akwụkwọ nsọ ahụ. N’otu akwụkwọ ozi sitere n’aka Watch Tower Society, a gwara ya ka o jiri ekpere tụlee ma ọ̀ ga-ekwe ya omume ịnara ọrụ pụrụ iche dị ka onye ozi ala ọzọ. Ọ bụ ezie na ọchịchọ obi ya bụ ịnọrọ n’ụlọ iji nyere ndị mụrụ ya aka ịghọ ndị Kraịst, ọ rịọrọ Chineke n’ekpere, sị: “Gịnị bụ uche gị? Ọ̀ bụ ka m nara ọkpụkpọ òkù nke a n’agbanyeghị mmegide nke ndị mụrụ m, ka ọ̀ bụ ka m nyere ndị mụrụ m aka site n’ịnọgide na-ebinyere ha?” Mgbe ọ bụla o kpere ekpere, akọ na uche ya na-agwa ya ka ọ nara ọkpụkpọ òkù ahụ. O kpebiri na nke a bụ azịza sitere n’aka Jehova.

Chineke wusiri nwanyị a ike ịnọgide ná mkpebi ya. Mgbe a gwara ya ka ọ kwafee n’Agwaetiti Awaji, Japan, ọ nwụrụ ndị mụrụ ya ibubo n’ahụ, ha wee mesiwanye mmegide ha ike. Otú ọ dị, ebe ha na-enweghị ike ime ka ọ gbanwee uche ya, nne ya kpebiri ịmụ Bible nanị ka ọ wee hụ ihe mere nwa ya nwanyị ji mee ụdị mkpebi ahụ. Mgbe ọnwa atọ gasịrị, ndị mụrụ ya bịara ileta ya. Mgbe ha hụrụ ụzọ Ndịàmà Jehova ndị ọzọ si na-elekọta ya, o metụrụ nna ya n’obi nke ukwuu o wee kwaa ákwá mgbe nanị ya nọ. N’oge na-adịghị anya, ọ malitekwara ịmụ Bible. Mgbe oge ụfoḍụ gasịrị, nne na nna nke nwa agbọghọ ahụ mere baptism wee malite ijere Jehova ozi n’ikwesị ntụkwasị obi. Ọ̀ bụ na Jehova Chineke agọzighị nwanyị onye Kraịst nke a n’ụzọ bara ụba hie nne?

A Na-aza Ekpere Ha

Ì chetara okwu nke nwanyị ahụ e hotara ná mmalite nke isiokwu bu nke a ụzọ? Ọ dịbeghị mgbe o nwere mmetụta nke ịbụ onye a zara ekpere ya. Ma, o mechara chọpụta na Chineke nọ na-aza ekpere ya. Nwanyị ahụ anọwo na-eme ihe ndekọ nke isi ihe ndị dị n’ekpere ya. Otu ụbọchị, o leghachiri anya n’akwụkwọ ndekọ ya wee chọpụta na Jehova anụwo ihe ka ọtụtụ n’ekpere ya, ọbụna ndị nke ya onwe ya chefuworo! O si otú a mara na Chineke na-elekọta ya, na-azakwa ekpere ya n’ụzọ dị nro nke baara ya uru karịsịa.

Ọ bụrụ na ị na-eche na a dịghị aza ekpere gị, jụọ onwe gị, sị: ‘M̀ nwere mmekọrịta onwe onye n’etiti mụ na Jehova, bụ́ “Onye na-anụ ekpere”? Ọ bụrụ na enweghị m, m̀ na-eme mgbalị iji mụta ihe banyere ya wee ghọọ otu n’ime ndị ohu ya raara onwe ha nye ya?’ Ọ na-aza ekpere nke ndị ahụ hụrụ ya n’anya, ndị na-emekwa uche ya. Ha ‘na-anọgide n’ikpe ekpere,’ a na-azakwa ekpere ha, dị ka a zara nke Jisọs. (Ndị Rom 12:12) Ya mere, ‘wụsịa obi gị dị ka mmiri’ nye Jehova, meekwa uche ya. (Abụ Ọma 62:8) Mgbe ahụ, a ga-anụ ekpere gị.

Taa, ọtụtụ nde mmadụ na-ekpe ekpere maka otu ihe pụrụ iche. Ee, a na-anụkwa ekpere ha. Ka anyị lee ihe mere anyị pụrụ iji jide n’aka na a gaje ịza ekpere ndị dị otú ahụ.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya