Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w91 9/15 p. 9-14
  • Nwee Okwukwe nke Dabeere n’Eziokwu

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Nwee Okwukwe nke Dabeere n’Eziokwu
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Gịnị Bụ Okwukwe?
  • Ọ Dabeere n’Eziokwu Ndị Bụ Isi
  • Mkpụrụ nke Mmụọ Nsọ
  • Imezu Okwukwe
  • N’ihi Gịnị Ka Anyị Ga-eji Tụlee Okwukwe Anyị?
  • Nwee Okwukwe ná Nkwa Ndị Jehova Kwere
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2016
  • Okwukwe Na-eme Ka Anyị Nwee Obi Ike
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2019
  • Ì Nwere Okwukwe N’ezie N’ozi Ọma Ahụ?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
  • ‘Nyere M Aka n’Ebe Ọ Dị M Mkpa Inwekwu Okwukwe!’
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
w91 9/15 p. 9-14

Nwee Okwukwe nke Dabeere n’Eziokwu

“A sị na okwukwe adịghị ọ bụ ihe a na-apụghị ime, bụ́ ime ihe ga-atọ Chineke ezi ụtọ: n’ihi na onye na-abịakwute Chineke aghaghị ikwe na ọ dị, na ọ na-egosikwa onwe ya onye na-enyeghachị ndị na-achọ ya ụgwọ ọrụ.”—NDI HIBRU 11:6.

1, 2. Olee ụzọ e si tinye okwukwe Adam n’ule, gịnịkwa si na ya pụta?

OKWUKWE chọrọ ihe karịrị ikwere na Chineke dị adị. Mmadụ mbụ ahụ, bụ́ Adam enweghị ihe ịrụ ụka ọ bụla banyere ịdị adị nke Jehova Chineke. Chineke agwawo Adam okwu, ma eleghị anya site n’Ọkpara ya, bụ́ Okwu ahụ. (Jọn 1:1-3; Ndị Kọlọsi 1:15-17) Ma n’agbanyeghị nke ahụ, Adam tụfuru olileanya nke inwe ndụ ebighị ebi n’ihi na o rubereghị Jehova isi, nweekwa okwukwe n’ebe ọ nọ.

2 O yiri ka è tinyere obi ụtọ Adam gaje inwe n’ọdịnihu n’ihe ize ndụ mgbe nwunye ya, bụ́ Iv, nupụụrụ Jehova isi. Ee, nanị icheta n’echiche na nwanyị ahụ ga-efunarị ya tinyere okwukwe nke nwoke mbụ ahụ n’ule! Chineke ọ̀ pụrụ idozi nsogbu ahụ n’ụzọ nke ga-eme ka Adam nọgidekwa na-enwe obi ụtọ na ihe ịga nke ọma? Site n’isonyere Iv n’ime mmehie, Adam gosiri na ya echeghị otú ahụ. Ọ gbalịrị idozi nsogbu ahụ n’ụzọ nke ya, kama ịchọsi nduzi Chineke ike. N’egosighị okwukwe n’ebe Jehova nọ, Adam wetaara onwe ya na ụmụ ya nile ọnwụ.—Ndị Rom 5:12.

Gịnị Bụ Okwukwe?

3. Olee ụzọ nkọwa Bible nyere okwukwe si dị iche na nke otu akwụkwọ ọkọwa okwu nyere?

3 Otu akwụkwọ ọkọwa okwu kọwara okwukwe dị ka “ikweresi ike n’ihe nke a na-enweghị ihe nnwapụta maka ya.” Otú ọ dị, n’abụghị nke kwadoro echiche ahụ ma ọlị, Bible na-emesi okwu ike banyere kpọmkwem ihe megidere nke ahụ. Okwukwe dabeere n’ihe ndị dị adị, n’ihe ndị mere eme n’ezie, n’ihe bụ eziokwu. Akwụkwọ nsọ na-asị: “Okwukwe bụ ndabere nke ihe a na-ele anya, bụrụkwa nnwapụta nke ihe a na-ahụghị anya.” (Ndị Hibru 11:1) Mmadụ nke nwere okwukwe nwere ihe ndị mere ọ ga-eji were ihe nile Chineke kwere ná nkwa dị ka ihe ndị mezuworonụ. Ihe àmà e nwere banyere ihe ndị a na-ahụghị anya na-esi ike nke ukwuu nke na e kwuru na okwukwe na ihe àmà dị otú ahụ hà nhata.

4. Olee ụzọ otu akwụkwọ nlereanya si kwadoo nkọwa ahụ Bible nyere okwukwe?

4 Ná nsụgharị New World Translation, mgbe ụfọdụ a na-asụgharị ụdị ahụ nke na-egosi ihe kpatara ihe omume nke ngwaa Hibru bụ ʼa·manʹ dị ka “igosipụta okwukwe.” Dị ka akwụkwọ Theological Wordbook of the Old Testament si kwuo, “ihe bụ isi n’ihe mkpọrọgwụ okwu ahụ pụtara bụ echiche nke ijide ihe n’aka . . . n’igosi ọdịiche dị n’etiti ya na echiche ọgbara ọhụrụ banyere okwukwe dị ka ihe pụrụ ime eme, ihe e nwere olileanya na ọ ga-abụ eziokwu, ma bụrụ nke a na-ejighị n’aka.” Otu akwụkwọ ahụ kwukwara, sị: “Okwu ahụ e si na nke yiri ya wepụta, bụ́ ʼāmēn nke pụtara ‘n’ezie,’ bụ nke e bufere bata n’ime Agba Ọhụrụ n’okwu ahụ bụ amēn nke bụ okwu asụsụ Bekee [ahụ] bụ ‘amen.’ Jisọs jiri okwu ahụ mee ihe ọtụtụ ugbo (Mat. 5:18, 26, na ebe ndị ọzọ) iji mesie ike otú o si bụrụ na ihe a na-ekwu okwu ya bụ ihe e ji n’aka.” Okwu ahụ a sụgharịrị ịbụ “okwukwe” n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst pụtakwara ikweresi ike n’ihe, n’ịdabere n’ihe dị adị n’ezie ma ọ bụ n’eziokwu.

5. Olee ụzọ e si jiri okwu Grik ahụ a sụgharịrị ịbụ “ndabere nke ihe a na-ele anya” ná Ndị Hibru 11:1 eme ihe n’akwụkwọ ndị metụtara azụmahịa n’oge ochie, gịnị bụkwa ịdị mkpa nke a nye ndị Kraịst?

5 Okwu Grik (hy·poʹsta·sis) nke a sụgharịrị ịbụ “ndabere nke ihe a na-ele anya” ná Ndị Hibru 11:1 bụ nke a na-ejikarị eme ihe n’ihe odide oge ochie ndị e dere n’akwụkwọ papyrus banyere azụmahịa iji kọwaa echiche nke ihe na-eme ka e jide n’aka na a gaje inweta ihe n’ọdịnihu. Ndị ọkà mmụta bụ Moulton na Milligan tụrụ aro nsụgharị bụ: “Okwukwe bụ akwụkwọ na-enye ikike maka ihe ndị a na-atụ anya ha.” (Vocabulary of the Greek Testament) N’ezie, ọ bụrụ na mmadụ ji akwụkwọ na-enye ikike maka otu ibé ala, ọ pụrụ inwe “ndabere nke ihe a na-ele anya” na otu ụbọchị, olileanya ya inweta ala ahụ ga-abụ nke e mezuru.

6. Gịnị bụ ọdịmkpa nke okwu Grik ahụ a sụgharịrị ịbụ “nnwapụta” ná Ndị Hibru 11:1?

6 Ná Ndị Hibru 11:1, okwu Hibru ahụ a sụgharịrị ịbụ “nnwapụta” (eʹleg·khos) na-enye echiche nke igosi ihe àmà iji nwapụta ihe, karịsịa ihe dị iche n’ihe yiri ka ọ̀ bụ otú ihe dị. Ihe àmà doro anya ma ọ bụ ihe àmà nke gbara ọkpụrụkpụ na-eme ka ihe na-apụtabughị ìhè doo anya, wee si otú ahụ na-emegide ihe yiri nanị otú ihe dị. Ya mere, ma n’Akwụkwọ nsọ Hibru ma na nke Grik, okwukwe abụghị ma ọlị “ikweresi ike n’ihe nke a na-enweghị ihe nnwapụta maka ya.” Kama nke ahụ, okwukwe dabeere n’eziokwu.

Ọ Dabeere n’Eziokwu Ndị Bụ Isi

7. Olee ụzọ Pọl na Devid si kọwaa ndị ahụ na-agọpụ ịdị adị nke Chineke?

7 Pọl onyeozi kwupụtara otu eziokwu bụ isi mgbe o dere na “ihe [Onye Okike ahụ] anya na-ahụghị site n’okike ụwa ka a na-ahụ nke ọma, ebe a na-aghọta ha site n’ihe nile e kere eke, bụ́ ike ebighị ebi ya na ụdị Chineke ya; ka [ndị na-emegide eziokwu ahụ] ghara inwe ngọpụ.” (Ndị Rom 1:20) Ee, “eluigwe na-akọ nsọpụrụ Chineke,” ‘ụwa jupụtakwara n’ihe o mepụtara.’ (Abụ Ọma 19:1; 104:24) Ma, gịnịkwanụ ma ọ bụrụ na mmadụ adịghị njikere ịtụle ihe àmà e nwere? Onye ọbụ abụ bụ Devid kwuru, sị: “Onye ajọ omume, n’ihi mpako ya [“n’ịbụ onye na-ebuli onwe ya elu,” The New English Bible], adịghị eme nnyocha ọ bụla; echiche ya nile bụ: ‘Ọ dịghị Chineke dịnụ.’” (Abụ Ọma 10:4, NW; 14:1) N’otu akụkụ, okwukwe dabeere n’eziokwu ahụ bụ isi nke bụ na Chineke dị adị.

8. Ihe imesi obi ike na nghọta dị aṅaa ka ndị ahụ na-egosipụta okwukwe pụrụ inwe?

8 Ọ bụghị nanị na Chineke dị ndụ; ọ bụkwa onye e kwesịrị ịtụkwasị obi, anyị pụkwara ịdabere ná nkwa ya nile. O kwuwo, sị: “N’ezie dị ka m cheworo, otú a ka ọ ga-adị; na dị ka m zubeworo, nke ahụ ga-eguzosi ike.” (Aịsaịa 14:24; 46:9, 10) Okwu ndị a abụghị okwu efu na-enweghị isi. E nwere ihe àmà pụtara ìhè na ọtụtụ narị amụma ndị e dekọrọ n’Okwu Chineke emezuwo. Site n’inwe nghọta nke a, ndị ahụ na-egosipụta okwukwe nwekwara ike ịghọta mmezu na-aga n’ihu nke ọtụtụ amụma Bible ndị ọzọ. (Ndị Efesọs 1:18) Dị ka ihe atụ, ha na-ahụ mmezu nke “ihe ịrịba ama” ahụ nke ọnụnọ Jisọs, nke gụnyere nkwusa na-aga n’ihu ọsọ ọsọ nke Alaeze ahụ e guzobeworo, tinyekwara mgbasa ahụ e buru amụma ya nke ezi ofufe. (Matiu 24:3-14; Aịsaịa 2:2-4; 60:8, 22) Ha maara na n’oge na-adịghị anya, mba nile ga-eti mkpu ahụ bụ “Udo na ntụkwasị obi” na n’oge na-adịghịkwa anya mgbe nke ahụ gasịrị, Chineke ‘ga-emebi ndị ahụ na-emebi ụwa.’ (1 Ndị Tesalọnaịka 5:3; Mkpughe 11:18) Lee nnọọ ngọzi ọ bụ inwe okwukwe nke dabeere n’eziokwu ndị e buru n’amụma!

Mkpụrụ nke Mmụọ Nsọ

9. Ihe njikọ dị aṅaa dị n’etiti okwukwe na mmụọ nsọ?

9 Eziokwu nke okwukwe dabeere na ya bụ nke a na-achọta n’ime Bible, ọ bụkwa mkpụrụ nke mmụọ nsọ Chineke. (2 Samuel 23:2; Zekaraịa 7:12; Mak 12:36) Ya mere, n’ụzọ ezi uche dị na ya, okwukwe apụghị ịdị ma ọ bụrụ na mmụọ nsọ ahụ adịghị arụ ọrụ. Ọ bụ ya mere Pọl ji nwee ike ide, sị: “Mkpụrụ nke mmụọ nsọ [gụnyere] . . . ikwesị ntụkwasị obi [“okwukwe,” NW].” (Ndị Galetia 5:22) Ma ọtụtụ ndị na-ajụ eziokwu nke Chineke, jiri ọchịchọ anụ ahụ na echiche ndị na-emejọ mmụọ Chineke na-emerụ ndụ ha. Otú a, “ọ bụghị mmadụ nile nwere okwukwe,” n’ihi na ha enweghị ihe ndabere ọ bụla a ga-azụlite ya n’elu ya.—2 Ndị Tesalọnaịka 3:2; Ndị Galetia 5:16-21; Ndị Efesọs 4:30.

10. Olee ụzọ ndị ohu Jehova oge ochie ụfọdụ si gosi na ha nwere okwukwe?

10 Otú ọ dị, n’etiti ụmụ Adam, ụfọdụ ndị enwewo okwukwe. Ndị Hibru isi 11 hotara Ebel, Inọk, Noa, Abraham, Sera, Aịsak, Jekọb, Josef, Mosis, Rehab, Gideọn, Berak, Samson, Jefta, Devid, na Samuel, tinyere ọtụtụ ndị ohu Jehova a na-akpọtụghị aha, ndị “a gbaara ha àmà site n’okwukwe ha.” Rịba ama ihe e mere “site n’okwukwe.” Ọ bụ okwukwe ka Ebel ji “chee àjà n’ihu Chineke,” ka Noa jikwa “dozie ụgbọ.” Okwukwe ka Abraham ji “ṅaa ntị ịpụ jee ebe nke ọ gaje ịnara ka ọ bụrụ ihe nketa.” Ọ bụkwa okwukwe ka Mosis ji “hapụ Ijipt.”—Ndị Hibru 11:4, 7, 8, 27, 29, 39.

11. Gịnị ka Ọrụ Ndị Ozi 5:32 na-egosi n’ihe banyere ndị na-erubere Chineke isi?

11 O doro anya na ndị ohu Jehova nile ahụ mere ihe karịrị nanị ikwere na Chineke dị adị. N’igosipụta okwukwe, ha tụkwasịrị ya obi dị ka Onye “na-enyeghachi ndị na-achọ ya ụgwọ ọrụ.” (Ndị Hibru 11:6) Ha mere ihe mmụọ Chineke duziri ha ime, na-eme ihe kwekọrọ n’ezi ihe ọmụma nke eziokwu e nwere n’oge ahụ, ọ bụ ezie na ọ bụ nke a kpaara ókè. Lee ka nke a si dị iche n’ebe Adam nọ! O meghị ihe n’okwukwe nke dabeere n’eziokwu ma ọ bụ n’ụzọ kwekọrọ ná nduzi nke mmụọ nsọ. Ndị Chineke na-enye mmụọ ya bụ nanị ndị ahụ na-erubere ya isi.—Ọrụ 5:32.

12. (a) Na gịnị ka Ebel nwere okwukwe, oleekwa ụzọ o si gosi nke a? (b) N’agbanyeghị okwukwe ha, gịnị ka ndịàmà Jehova biri tupu Kraịst na-enwetaghị?

12 N’adịghị ka nna ya bụ Adam, Ebel onye na-asọpụrụ Chineke nwere okwukwe. Ma eleghị anya site n’ọnụ ndị mụrụ ya, ọ matara banyere amụma mbụ ahụ e buru, bụ: “Iro ka m [Jehova Chineke] ga-etinyekwa n’etiti gị na nwanyị ahụ, na n’etiti mkpụrụ gị na mkpụrụ ya: mkpụrụ ahụ ga-echipịa gị n’isi, gị onwe gị ga-echipịakwa ya n’ikiri ụkwụ.” (Jenesis 3:15) Chineke si otú a kwe nkwa ibibi mmebi iwu ma weghachi ezi omume. Ebel amataghị ụzọ a gaje isi mezuo nkwa nke a. Ma okwukwe o nwere na Chineke bụ Onye Na-enyeghachi ndị na-achọsi Ya ike ụgwọ ọrụ siri ike ruo n’ókè nke ịkpali ya iche àjà n’ihu ya. Ma eleghị anya o chebaworo amụma ahụ echiche nke ukwuu wee kwere na ịwụpụ ọbara ga-adị mkpa iji mezuo nkwa ahụ na iji bulie ihe a kpọrọ mmadụ elu gaa n’izu okè. N’ihi nke a, àjà anụmanụ Ebel chụrụ kwesịrị ekwesị. Otú ọ dị, n’agbanyeghị okwukwe ha, Ebel na ndịàmà Jehova ndị ọzọ ndị dịrị ndụ tupu Kraịst “anataghị [“mmezu,” NW] nkwa ahụ.”—Ndị Hibru 11:39.

Imezu Okwukwe

13. (a) Gịnị ka Abraham na Devid mụtara banyere mmezu nke nkwa ahụ? (b) N’ihi gịnị ka a pụrụ iji kwuo na “eziokwu sitere n’aka Jisọs Kraịst bịa”?

13 Site n’oge ruo n’oge n’ime ọtụtụ narị afọ ndị gafeworonụ, Chineke kpughekwuru eziokwu ndị ọzọ banyere ụzọ a gaje isi mezuo nkwa ahụ metụtara ‘mkpụrụ nke nwanyị ahụ.’ A gwara Abraham, sị: “Ná mkpụrụ gị ka mba nile nke ụwa ga-agọzi onwe ha.” (Jenesis 22:18) Mgbe e mesịrị, a gwara Eze Devid na Mkpụrụ ahụ e kwere ná nkwa ga-esite n’usoro ndị eze ya pụta. N’afọ 29 O.A., Mkpụrụ ahụ pụtara dị ka Jisọs Kraịst. (Abụ Ọma 89:3, 4; Matiu 1:1; 3:16, 17) N’ụzọ na-eyighị Adam onye na-enweghị okwukwe, “Adam ikpeazụ” ahụ, bụ́ Jisọs Kraịst, bụ ezi ihe nlereanya n’igosipụta okwukwe. (1 Ndị Kọrint 15:45) O biri ndụ nke iji nrara onwe onye jeere Jehova ozi, mezuokwa ọtụtụ amụma ndị ahụ e buru banyere Mesaịa. Jisọs si otú a mee ka eziokwu ahụ banyere Mkpụrụ ahụ e kwere ná nkwa pụtakwuo ìhè, meekwa ka ihe ndị ahụ e sere onyinyo ha n’Iwu Mosis bụrụ ihe dị adị n’ezie. (Ndị Kọlọsi 2:16, 17) N’ihi ya, a pụrụ ikwu na “eziokwu sitere n’aka Jisọs Kraịst bịa.”—Jọn 1:17.

14. Olee ụzọ Pọl si gosi ndị Galetia ahụ na okwukwe enwetawo akụkụ ndị ọhụrụ?

14 Ugbu a, mgbe eziokwu ahụ bịaworo site na Jisọs Kraịst, e nwere ntọala sawanyere mbara ebe a ga-ewukwasị okwukwe ná “nkwa ahụ.” E mewo ka okwukwe siwanye ike, ka o nwee akụkụ ndị ọhụrụ, dị ka a pụrụ ikwu ya. N’ihe banyere nke a, Pọl gwara ndị Kraịst e tere mmanụ ibe ya, sị: “Ihe e deworo n’Akwụkwọ nsọ mechibidoro ihe nile n’okpuru mmehie, ka e wee were nkwa ahụ nke sitere n’okwukwe e kwere na Jisọs Kraịst nye ndị kwere ekwe. Ma mgbe okwukwe akabịaghị, a na-eche anyị nche n’okpuru Iwu, ebe a na-emechibido anyị ruo okwukwe ahụ nke a gaje ikpughe. Ya mere Iwu ahụ aghọwo onye ozizi anyị ikuru anyị bịakwute Kraịst, ka e wee site n’okwukwe gụọ anyị ná ndị ezi omume. Ma ebe okwukwe ahụ bịaworo, anyị anọghị ọzọ n’okpuru onye ozizi. N’ihi na unu nile bụ ụmụ Chineke, site n’okwukwe, n’ime Kraịst Jisọs.”—Ndị Galetia 3:22-26.

15. Ọ̀ bụ nanị n’ụzọ dị aṅaa ka a pụrụ isi mee ka okwukwe zuo okè?

15 Ụmụ Israel enwewo okwukwe ná mmeso Chineke mesoro ha site n’ọgbụgba ndụ Iwu ahụ. Ma ugbu a, ọ dị mkpa ka e nyere okwukwe ahụ aka. N’ụzọ dị aṅaa? Site n’igosi okwukwe na Jisọs ahụ e jiworo mmụọ nsọ tee mmanụ, onye a haziworo Iwu ahụ iduru ha jekwuru ya. Ọ bụ nanị n’ụzọ dị otú ahụ ka a pụrụ ime ka okwukwe e nwere tupu Kraịst zuo okè. Lee ka o si dị oké mkpa nye ndị Kraịst oge mbụ ahụ ‘ilegide Jisọs anya, bụ́ Onye Isi na Onye Mmezu nke okwukwe ha’! (Ndị Hibru 12:2) N’eziokwu, ọ dị mkpa ka ndị Kraịst nile mee otú ahụ.

16. N’ụzọ dị aṅaa ka mmụọ nsọ si bịa n’ụzọ siwanyere ike, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị?

16 N’ihi ihe ọmụma ahụ bawanyeworo ụba nke eziokwu Chineke na okwukwe e meworo ka o zuo okè nke siworo na ya pụta, mmụọ nsọ ọ̀ gajekwa ịbịa n’ụzọ siwanyere ike? Ee. Na Pentikọst 33 O.A., a wụpụrụ mmụọ Chineke, bụ́ ihe inyeaka ahụ nke Jisọs kwuworo okwu ya, n’isi ndị na-eso ụzọ ya. (Jọn 14:26; Ọrụ 2:1-4) Mgbe ahụ, mmụọ nsọ malitere ịrụ ọrụ n’ahụ ha n’ụzọ dị nnọọ ọhụrụ dị ka ụmụnna Kraịst ndị e teworo mmanụ. E wusiwanyere okwukwe ha ike, bụ́ mkpụrụ nke mmụọ nsọ. Nke a kwadebere ha maka nnukwu ọrụ ime ndị na-eso ụzọ ahụ nke chere ha n’ihu.—Matiu 28:19, 20.

17. (a) Olee ụzọ eziokwu siworo bịa, oleekwa ụzọ e siworo mee ka okwukwe zuo okè kemgbe 1914? (b) Ihe àmà dị aṅaa ka anyị nwere iji gosi na mmụọ nsọ nọ n’ọrụ kemgbe 1919?

17 Okwukwe bịarutere mgbe Jisọs wepụtara onwe ya dị ka Onye A Họpụtaworo Ịbụ Eze n’ihe karịrị 1,900 afọ gara aga. Ma ugbu a mgbe ọ nọworo na-achị achị dị ka Eze n’eluigwe, ihe ndabere anyị maka okwukwe—eziokwu ahụ nke e kpugheworo—amụbawo nke ukwuu, wee si otú a na-eme ka okwukwe anyị zuo okè. N’ụzọ dịkwa otú ahụ, ịrụ ọrụ nke mmụọ nsọ ahụ abụrụwo nke e mesiwanyere ike. E nwere ihe àmà pụtara ìhè banyere nke a na 1919, mgbe mmụọ nsọ wusighachiri ndị ohu Chineke raara onwe ha nye ya ike site n’ọnọdụ nke fọrọ nke nta ka ọ bụrụ nke arụkwaghị ọrụ. (Ezikiel 37:1-14; Mkpughe 11:7-12) Mgbe ahụ, a tọrọ ntọala maka paradaịs ime mmụọ, bụ́ nke pụtawanyeworo ìhè, dịwanyekwa ebube n’afọ ọ bụla n’ime ọtụtụ iri afọ ndị sochiworonụ. À pụrụ inwe ihe àmà ọzọ ka ukwuu nke mmụọ nsọ Chineke nọ n’ọrụ?

N’ihi Gịnị Ka Anyị Ga-eji Tụlee Okwukwe Anyị?

18. Olee ụzọ ndị nledo ahụ bụ ndị Israel si dịrịta iche n’ibe ha n’ihe banyere okwukwe?

18 Nwa mgbe nta mgbe a tọpụsịrị ụmụ Israel site n’ịbụ ohu n’Ijipt, e dupụrụ ndị ikom 12 ije ledoo otú ala Kenean ahụ dị. Otú ọ dị, mmadụ iri n’ime ha enweghị okwukwe, na-arụ ụka ikike Jehova nwere imezu nkwa ya inye Israel ala ahụ. Ọ bụ ihe ha hụrụ anya kpaliri ha, ihe nke anụ ahụ. N’ime mmadụ 12 ahụ, nanị Joshua na Keleb gosiri na ha na-eje ije n’okwukwe, ọ bụghị site n’ihe a hụrụ anya. (Tụlee 2 Ndị Kọrint 5:7.) N’ihi igosi okwukwe, ọ bụ nanị ha n’ime ndị ikom ahụ dịrị ndụ ịbanye n’ime Ala Nkwa ahụ.—Ọnụ Ọgụgụ 13:1-33; 14:35-38.

19. Olee ụzọ o si bụrụ na ntọala nke a ga-ewukwasị okwukwe na ya guzosiri ike ugbu a karịa ka ọ dịtụworo mgbe ọ bụla na mbụ, ma n’agbanyeghị nke ahụ, gịnị ka anyị kwesịrị ime?

19 Taa, anyị na-eguzo n’ọnụ ọnụ ụwa ọhụrụ ezi omume nke Chineke. Ka anyị wee banye na ya, okwukwe dị oké mkpa. Ọ bụ ihe obi ụtọ ịhụ na ọ dịbeghị mgbe ọ bụla ọzọ ntọala nke eziokwu ahụ ebe a ga-ewukwasị okwukwe ahụ guzosiworo ike karịa ka ọ dị ugbu a. Anyị nwere Okwu Chineke zuru ezu, ihe nlereanya nke Jisọs Kraịst na ndị na-eso ụzọ ya e tere mmanụ, nkwado nke ọtụtụ nde ụmụnna nwoke na nwanyị ime mmụọ, na nkwado nke mmụọ nsọ Chineke n’ọ̀tụ̀tụ̀ a na-enwetụbeghị ya na mbụ. Ma n’agbanyeghị nke ahụ, anyị ga-eme nke ọma ịtụle okwukwe anyị, meekwa ihe iji wusiwanye ya ike mgbe anyị ka nwere ike ime otú ahụ.

20. Ajụjụ dịgasị aṅaa ka anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị?

20 Ị pụrụ ikwu, sị, ‘Oo, ekwenyere m na nke a bụ eziokwu.’ Ma ruo ókè ha aṅaa ka okwukwe gị siri ike? Jụọ onwe gị, sị: ‘Alaeze eluigwe Jehova ọ̀ bụ ihe dị adị n’ezie nye m dị ka ọchịchị ụmụ mmadụ dị? M̀ na-anakwere, na-akwadokwa n’ụzọ zuru ezu, nzụkọ Jehova a na-ahụ anya na Òtù Na-achị Isi ya? Site n’anya nke okwukwe, m̀ pụrụ ịhụ na a nọ ugbu a na-eduzi mba nile gaa n’ọnọdụ ikpeazụ ahụ maka Amagedọn? Okwukwe m ọ̀ dị n’ọnọdụ dị mma iji ya tụnyere nke “oké ìgwè ndịàmà” ahụ e hotara ná Ndị Hibru isi 11?—Ndị Hibru 12:1; Mkpughe 16:14-16.

21. Olee ụzọ okwukwe na-esi akpali ndị ahụ nwere ya, oleekwa ụzọ a na-esi agọzi ha? (Weta okwu site n’ihe ndị dị n’igbe nke dị na peji 13.)

21 A na-akpali ndị nwere okwukwe nke dabeere n’eziokwu ime ihe. Dị ka àjà ahụ a na-anara nke ọma Ebel chụrụ, àjà otuto ha na-achụ bụ ndị na-atọ Chineke ụtọ. (Ndị Hibru 13:15, 16) Dị ka Noa, bụ́ onye na-ekwusa ezi omume nke rubeere Chineke isi, ha na-agbaso ụzọ ezi omume dị ka ndị nkwusa Alaeze. (Ndị Hibru 11:7; 2 Pita 2:5) Dị ka Abraham, ndị ahụ nwere okwukwe nke dabeere n’eziokwu na-erubere Jehova isi n’agbanyeghị ihe isi ike nakwa ọbụna n’okpuru ọnọdụ ndị kasị na-eweta ọnwụnwa. Dị ka ndị ohu Jehova kwesịrị ntụkwasị obi n’oge ochie, ndị ahụ nwere okwukwe taa na-enweta ngọzi n’ụba, bụrụkwa ndị Nna ha na-ahụ n’anya nke eluigwe na-elekọta.—Matiu 6:25-34; 1 Timoti 6:6-10.

22. Olee ụzọ a pụrụ isi wusiwanye okwukwe ike?

22 Ọ bụrụ na ị bụ ohu Jehova ma na-ahụ na ọ dị ụzọ okwukwe gị si bụrụ nke na-esichaghị ike, gịnị ka ị pụrụ ime? Wusie okwukwe gị ike site n’ịmụsi Okwu Chineke ike na ikwe ka ọnụ gị na-agbọpụta mmiri nke eziokwu nke jupụtara n’obi gị. (Ilu 18:4) Ọ bụrụ na a naghị emesi okwukwe gị ike mgbe mgbe, ọ pụrụ ịda mbà, kwụsị ịrụ ọrụ, ọbụna nwụọ anwụ. (1 Timoti 1:19; Jemes 2:20, 26) Kpebisie ike na nke a agaghị eme okwukwe gị. Rịọ Jehova maka enyemaka, na-ekpe ekpere, sị: ‘Nyere m aka ebe ọ dị m mkpa inwekwu okwukwe!’—Mak 9:24.

Gịnị Bụ Azịza Gị?

◻ Gịnị bụ okwukwe?

◻ N’ihi gịnị ka a na-apụghị inwe okwukwe ma ọ bụrụ na eziokwu na mmụọ nsọ adịghị?

◻ N’ụzọ dị aṅaa ka Jisọs Kraịst si ghọọ Onye Mmezu nke okwukwe anyị?

◻ N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji tụlee otú okwukwe anyị siruru n’ike?

Igbe dị na peeji nke 13]

NDỊ NWERE OKWUKWE...

◻Na-ekwu okwu banyere Jehova. —2 Ndị Kọrint 4:13.

◻Na-arụ ọrụ ndị yiri nke Jisọs. —Jọn 14:12.

◻Bụ isi iyi nke agbamume nye ndị ọzọ.—Ndị Rom 1:8, 11, 12.

◻Na-emeri ụwa.—1 Jọn 5:5.

◻Enweghị ihe ọ bụla mere ha ga-eji tụọ egwu.—Aịsaịa 28:16.

◻Ruru eru ịnata ndụ ebighị ebi. —Jọn 3:16.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya