Ihe Atụ—Isi Ihe E Ji Erute n’Obi
DEVID anọwo na-agba ọsọ ndụ. Onye iro ya bụ Sọl, bụ́ eze Israel e tere mmanụ. Otú ọ dị, Sọl bụ nwoke nke jupụtara n’ikpọasị maka Devid, ekworo na-eripịakwa ya. N’ọchịchọ obi ọjọọ ya, eze ahụ akpọrọwo ihe dị ka 3,000 ndị agha bịa ugbu a. N’ịbụ ndị a karịrị n’ọnụ ọgụgụ nke ukwuu, Devid na ndị ikom ya ezomiwo n’ime ọ́gbà nkume dị n’ọzara ahụ.
Ka Devid na ndị ikom ya na-anọkọ n’ime ọchịchịrị ahụ, otu ihe dị ịtụnanya mere. Onye eze bụ Sọl batara kpọmkwem n’ime ọ́gbà nkume nke a maka ịga mposi. Devid jiri nwayọọ were ihe agha ya bịaruo onye iro ya nke a na-adịghị ihe ọ pụrụ ime ugbu a nso. Ma n’ịbụrụ ndị ikom Devid ihe ijuanya, o gbughị eze ahụ. Ihe o mere bụ nanị ịchabiri ọnụ ọnụ uwe mwụda Sọl. N’inwe mwute ọbụna maka ihe nke a o mere, Devid sịrị: “Ya bụrụ m ihe arụ site na Jehova; m gaghị eme onyenwe m, bụ́ onye Jehova e tere mmanụ, ihe a ma ọlị, bụ́ isetị aka m megide ya, n’ihi na onye Jehova e tere mmanụ ka ọ bụ.”—1 Samuel 24:1-6.
Ihe ndekọ nke a dị na Bible na-enye ihe mmụta dị omimi banyere inwe nsọpụrụ banyere ike ịchịisi Chineke nyeworo. Ọ na-emetụkwa n’obi, ma eleghị anya n’ụzọ dị irè karịa okwu ndụmọdụ e kwuru kpọmkwem. Otú ahụ ka ọ dị, bụ́ ike nke ihe ndekọ ndị dị n’ime Okwu Chineke maka iji nye anyị ntụziaka.—Ndị Rom 15:4.
N’ụzọ kwekọrọ na nke ahụ, Ndịàmà Jehova na-agbalị ime ihe karịrị ikwu ihe ndị bụ eziokwu mgbe ha na-ekwusa ozi ọma ahụ, na-eduzi ọmụmụ Bible ebe obibi, na-ekwu okwu ndị dabeere n’Akwụkwọ nsọ, ma ọ bụ na-agba àmà mberede. Ha na-agbalị iru n’obi ndị mmadụ site n’ịkọ ahụmahụ na iji ihe atụ dị iche iche eme ihe. Akwụkwọ ha bụ Akwukwọ-nduzi Ulo-akwukwọ Ije-ozi Ọchichi-Chineke na-akọwa, sị: “Ihe atụ na-akpasu mmasị, na-ekwusikwa echiche ndị dị mkpa ike. Ha na-akpali usoro iche echiche nke mmadụ, na-emekwa ka ọ dị mfe karị ịghọta echiche ọhụrụ dị iche iche. Ihe atụ nile a họpụtara nke ọma na-ekekọta mmasị uche n’ahụ mmetụta nke mkpali obi. . . . N’oge ụfọdụ, a pụrụ iji ihe atụ wezụga obi ọjọọ ma ọ bụ obi mmegide.”a—Peji 172.
N’akwụkwọ ya bụ Essentials of Public Speaking, Warren DuBois kwuru, sị: “Ọ bụrụ na onye na-ede ihe ma ọ bụ onye ọkà okwu akọwapụta echiche ya site n’ihe omume na okwu ndị mmadụ na-eji eme ihe, isiokwu kasị bụrụ ihe na-adịghị akpali mmasị na-aghọ ihe na-akpali akpali, dịkwa ụtọ.” Otú a, itinye mkpali na ịdị ụtọ n’ozi nke dịwororịị mbụ bụrụ ihe na-akpali akpali, na-enyekwa ndụ, bụ ihe e ji n’aka na ọ ga-enyere ndị Kraịst na-eje ozi aka irute n’obi ndị mmadụ.
Ihe Atụ Ndị Na-ezi Ihe
Ụdị ihe atụ dị aṅaa na-akasị enwe ihe ịga nke ọma? Ọ na-abụkarị nke dabeere n’ihe ga-adịrị ụmụ mmadụ mfe ịghọta. Jisọs Kraịst setịpụrụ ezi ihe nlereanya n’ihe banyere nke a. N’Ozizi Elu Ugwu ya, Jisọs kwuru banyere ihe nkịtị ndị dị ka nnú, oriọna, na nnụnụ. (Matiu 5:1–7:29) Dị ka ihe atụ, onye ọ bụla maara banyere oriọna ndị e ji mmanụ olive na-amụ, ndị a na-edebekwa mgbe ụfọdụ n’elu ihe ndọba oriọna. N’ihi ya, ndị na-eso ụzọ Jisọs aghaghị ịghọtaworị na ha kwesịrị ịbụ ndị na-enye ìhè ime mmụọ mgbe ọ gwara ha, sị: “Ha adịghị amụnye oriọna, dọba ya n’okpuru mgbé, kama n’elu ihe ịdọba oriọna; ọ na-enwukwara mmadụ nile nọ n’ụlọ ahụ. Otú a meenụ ka ìhè unu na-enwu n’ihu mmadụ, ka ha wee hụ ọrụ ọma nile unu, wee too Nna unu nke bi n’eluigwe.” (Matiu 5:15, 16) Ihe atụ ndị na-adịghị mgbagwoju anya, ndị kwekọkwara n’isi ihe a na-ekwu ga-enyere ndị ozi bụ ndị Kraịst aka ime ka echiche na ozizi Bible dị iche iche doo anya.
Ma eleghị anya ihe atụ ndị kasị ike Jisọs jiri mee ihe lekwasịrị anya n’ụmụ mmadụ. Tụlee ndị ahụ e dekọrọ na Luk isi 15 na 16. Ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii akatọwo Jisọs n’ihi ịnabata ndị mmehie na ndị ọna ụtụ. Ná nzaghachi, ọ kọrọ akụkọ ndị na-akpali akpali banyere ụmụ mmadụ. O kwuru banyere otu onye na-azụ atụrụ, onye chọtara atụrụ ya furu efu, otu nwanyị nke chọtara otu mkpụrụ ego furu efu, nwa mmefu onye lọghachiri n’ụlọ, na otu onye na-achị ezinụlọ nke na-adịghị eme ezi omume.
Ihe atụ ndị metụtara ihe ndị na-eme eme n’ezie, na akụkọ ndị mere eme n’ezie pụrụ ịbụ ihe ndị bara uru nke ukwuu nye onye na-eje ozi bụ onye Kraịst. Dị ka ihe atụ, lee ụzọ Alexander H. Macmillan, onye mere njegharị dị ukwuu dị ka onye ọkà okwu ihu ọha ruo 60 afọ, si kọwaa eziokwu Bible banyere ndị nwụrụ anwụ. Nwa mgbe nta tupu ọnwụ nke nna ya, bụ́ onye kweere na mkpụrụ obi adịghị anwụ anwụ ma ọlị, Macmillan sooro ya nwee mkparịta ụka nke a:
“Nna m jụrụ m ajụjụ ahụ kapịrị ọnụ, bụ: ‘Nwa m, owu ọ̀ ga-ama m n’ime ili mgbe m nọ na-echere ka alaeze ahụ malite ọrụ ya nke iji izu okè mejupụta elu ala?’
“Nke ahụ bụ ajụjụ nwa okorobịa na-apụghị ịza ngwa ngwa n’ụzọ ga-eju onye meworo agadi afọ, bụ́ onye na-adịbeghị mgbe ọ bụla o chere echiche banyere nke ahụ.
“Ná nzaghachi, ajụrụ m ya, sị: ‘Papa, ị̀ rahụrụ ụra nke ọma n’anyasị gara aga?’
“Ọ zara, sị, ‘Ee, nwa m, arahụrụ m nnọọ nke ọma mgbe onye dọkịta nyesịrị m mkpụrụ ọgwụ ụra ụfọdụ.’
“‘Owu ọ̀ na-ama gị mgbe ị na-arahụ ụra?’
“‘Ee e, owu amaghị m. Ọ ga-amasị m ma a sị na m na-ehi ụra mgbe nile, n’ihi na mgbe ahụ adịghị m enwe ihe mgbu ọ bụla.’”
Mgbe ahụ, A. H. Macmillan gụụrụ nna ya Job 14:13-15 na 3:17-19 wee kwuo, sị: “Ị̀ hụla, Papa, ndị nwụrụ anwụ nọ n’ụra ọnwụ, ha amaghịkwa ihe ọ bụla mgbe ha nọ n’ọnọdụ ahụ, ya mere olee otú owu pụrụ isi na-ama ha?”
Lee nnọọ ozizi ihe dị irè nke ahụ bụ! Ọ bụrụ na ị bụ otu n’ime Ndịàmà Jehova, gị onwe gị pụkwara iji akụkụ akwụkwọ nsọ na ihe atụ dị iche iche mee ihe iji ruo n’uche na n’obi ndị mmadụ.
Ịchọta Ihe Atụ Ndị A Ga-eji Mee Ihe
Ma olee ebe ị pụrụ ịchọta ihe atụ ndị dị irè ma ọ bụ akụkọ ihe ndị mere eme n’ezie? Ị pụrụ inweta ọtụtụ n’ime ha site ná nchịkọta akụ nke ahụmahụ ndị i nwere n’onwe gị. Dị ka ihe atụ, ọ̀ dị gị mkpa igosipụta ngọzi ndị a na-enweta site n’inwe okwukwe, ike nke ekpere, ma ọ bụ ọṅụ a na-enweta site n’ije ozi ahụ? Ọ bụrụ na ị bụ onye Kraịst raaraworo onwe ya nye, ọ ghaghị ịbụ na ị pụrụ ịkọ ihe dị iche iche ndị mere ná ndụ nke onwe gị. Ị pụrụ ịnụ ezi ahụmahụ dị iche iche ná nzukọ ọgbakọ ma ọ bụ mgbe gị na ndị Kraịst ibe gị na-ekwurịta okwu. Ma ọ bụ, ị pụrụ ịgụta ahụmahụ na-agba ume n’ime akwụkwọ Yearbook of Jehovah’s Witnesses. N’eziokwu, akwụkwọ Watch Tower Publications Index na-eduje n’ahụmahụ ndị e bipụtaworo ebipụta, bụ́ ndị sitere n’akụkụ ụwa dum.
Olee ụzọ ị pụrụ isi kọọ ahụmahụ n’ụzọ dị irè? Otu ihe bụ na ịkpali ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ nke olileanya na-enyere gị aka ijigide ntụkwasị uche nke ndị na-ege gị ntị. Ị pụrụ ịmalite ịkọ otu ahụmahụ site n’ikwu, sị: “Otu onye ọsụ ụzọ mụtara n’onwe ya ụzọ Jehova na-esi agọzi ndị na-atụkwasị ya obi.” Ozugbo ahụ, ndị na-ege gị ntị ga-amalite iche echiche ihe bụ ngọzi ndị onye nkwusa Alaeze oge nile ahụ nwetara. Gbaa mbọ hụ na ị kọọrọ ha.
Gbalịa ịkọ ahụmahụ n’okwu nke aka gị. Kọọ ụmụ irighiri ihe nile dị n’akụkọ ahụ, n’ihi na nke a na-eme ka akụkọ ahụ nwekwuo mmetụta. Site n’ịkọwapụta ọnọdụ ndị dị na ya nke ọma, ọ pụrụ ịdịrị gị mfe karị ịkpali ndị na-ege gị ntị. Ma, jide n’aka na ị bamighị n’ịkọ ogologo akụkọ nke ukwuu nke na ha agaghị aghọta ihe mere i ji na-akọ ahụmahụ ahụ. Ọzọkwa, zere ikwu gabiga otú ihe mere n’ezie, n’ihi na ọ bụ ezie na nke a pụrụ ime ka akụkọ tọwanye ụtọ, ma ọ pụrụ ime ka ị bụrụ onye a na-agaghị eji n’aka ma ihe o kwuru ọ̀ bụkwa eziokwu. N’ihi otu ihe ahụ, zere ịkọ akụkọ sitere n’ọnụ fere n’ọnụ ma ọ bụ ịkọ ahụmahụ ndị ị na-apụghị ịnwapụta ịbụ eziokwu ha.
Ịkọwapụta Bible nke Ọma
A na-achọta ahụmahụ ndị kasị na-enye ọzụzụ n’ime Bible n’onwe ya. Dị ka ihe atụ, ka a sị nnọọ na ị chọrọ igosi onye mmụta Bible ma ọ bụ onye na-ege gị ntị na ụmụntakịrị pụrụ iwere ọnọdụ ha n’akụkụ nke Jehova Chineke. Ị pụrụ ikpebi iji ihe ndekọ banyere nwa agbọghọ nta ahụ a na-akpọtụghị aha ya, onye gwara nwunye Neaman okwu banyere onye amụma Jehova bụ Elaịsha. Nke mbụ, gụọ ihe ndekọ ahụ dị ná 2 Ndị Eze 5:1-5. Mgbe ahụ, ị pụrụ ịjụ, sị: “Olee otú i chere na o siruru n’ike ka nwa agbọghọ nke a jigide iguzosi ike n’ezi ihe nye Chineke n’ala nke ofufe ụgha? Ọ̀ bụ na ọ bụghị obi ike ka o ji kwuo okwu n’ụzọ mere ka e kwere ihe o kwuru banyere Jehova na onye amụma ya?”
Ibu ụzọ mee nnyocha pụrụrịị inyeworo gị aka ịkọwapụta ihe ndekọ ahụ nke ọma. Ị pụrụ ịchọtaworị ihe ọmụma na-enye aka n’okpuru isiokwu ndị dị ka NAAMAN, SYRIA, na ELISHA n’ime akwụkwọ Watch Tower Publications Index. Ihe ntụaka ndị dị ná nsụgharị New World Translation of the Holy Scriptures pụrụ iduruworị gị site n’ihe ndekọ ahụ dị ná 2 Ndị Eze gaa n’Abụ Ọma 148:12, 13, ebe anyị na-agụ, sị: “Ma ụmụ okorobịa ma ụmụ agbọghọ; ndị agadi, ha na ụmụntakịrị: ka ha too aha Jehova; n’ihi na e mewo ka aha ya dị elu, nanị ya: ebube ya dị n’elu ụwa na eluigwe.” Lee nnọọ ihe agbamume nke a bụ nye ndị na-eto eto iji nkwuwa okwu na-ekwu okwu Chineke!—Ọrụ 4:29-31.
Ọ bụrụ na ị bụ onye na-eje ozi bụ onye Kraịst, ‘lezie ozizi gị anya mgbe nile’ n’ihe banyere nke a. (1 Timoti 4:16) Ọ bụghị nanị ikwupụta ihe bụ eziokwu—mee ihe atụ iji kọwaa ya. Mee ka ihe ndekọ Bible dị iche iche pụta ìhè, nweekwa isi ihe dị na ha. Jiri ahụmahụ na ihe atụ ndị kwesịrị ekwesị mee ihe. Ndị a bụ ụzọ isi rute n’obi ndị mmadụ.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.
[Foto dị na peeji nke 29]
Dị ka Jisọs, ndị Kraịst na-eje ozi n’oge a pụrụ iji ihe atụ ndị pụtara ìhè zie ozi ha, rutekwa n’obi ndị mmadụ