Gịnị Bụ Isi Ihe Dị n’Ezi Iso Ụzọ Kraịst?
TAA, ọtụtụ ndị karị na-ekwu na ha nọ n’Iso Ụzọ Kraịst karịa òtù okpukpe ọ bụla ọzọ n’ụwa. Ma nkwenkwe ndị a kpọrọ onwe ha ndị Kraịst na-emegiderịta ibe ha, ha enweghị ịdị n’otu ọ bụla, mgbe ụfọdụ kwa ha na-egbu ọbụna ibe ha. O doro anya na ọtụtụ abụghị ezi ndị Kraịst. Jisọs kwuru na n’ụbọchị anyị, ọtụtụ ndị ga-agwa ya, sị, “Onyenwe anyị, Onyenwe anyị,” n’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, ha ga na-asị na ha bụ ndị Kraịst ma ọ ga-agwa ha, sị: “Ọ dịghị mgbe ọ bụla m maara unu: si n’ebe m nọ pụọ, unu ndị na-arụ ọrụ na-emebi iwu.” (Matiu 7:21, 23) N’ezie, ọ dịghị onye n’ime anyị ga-achọ ịnọ n’etiti ndị a! Ya mere, olee otú anyị pụrụ isi mata ma ànyị bụ ezi ndị Kraịst?
Ihe bụ eziokwu bụ na ọtụtụ ihe dị mkpa iji bụrụ ezi onye Kraịst. Ezi onye Kraịst aghaghị inwe okwukwe siri ike n’ihi na “ma a sị na okwukwe adịghị ọ bụ ihe a na-apụghị ime, bụ́ ime ihe ga-atọ Chineke ezi ụtọ.” (Ndị Hibru 11:6) Ọrụ ndị ziri ezi aghaghị isonyere okwukwe ahụ siri ike. Jemes onye na-eso ụzọ dọrọ aka ná ntị na “okwukwe bụ ihe nwụrụ anwụ ma ọrụ adịghị ya.” (Jemes 2:26) Karịakwa nke ahụ, onye Kraịst aghaghị ịnakwere ịbụ isi nke “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche.” (Matiu 24:45-47) Ma isi ihe dị n’ezi Iso Ụzọ Kraịst bụ ihe dị iche site n’ihe ndị a.
Gịnị bụ isi ihe ahụ? Pọl onyeozi kọwara n’akwụkwọ ozi mbụ o degaara ndị Kọrint, sị: “A sị na eji m asụsụ dị iche iche nke mmadụ na nke ndị mmụọ ozi na-ekwu okwu, ma enweghị m ịhụnanya, aghọwo m ọla na-ara ara, ma ọ bụ ájá ọla na-ada ụda. A sịkwa na enwere m onyinye ibu amụma, matakwa ihe omimi nile na ihe ọmụma nile; a sịkwa na enwere m okwukwe nile, nke mere m ga-enwe ike ibubiga ugwu, ma enweghị m ịhụnanya, abụghị m ihe ọ bụla. A sịkwa na eweere m ihe nile m nwere zụọ ndị ogbenye, a sịkwa na araara m ahụ m nye ka e wee ree m ọkụ, ma enweghị m ịhụnanya, ọ baghịrị m uru ọ bụla.”—1 Ndị Kọrint 13:1-3.
Ya mere ịhụnanya bụ isi ihe dị n’ezi Iso Ụzọ Kraịst. Okwukwe, ọrụ, na mkpakọrịta ziri ezi bụ ihe ndị dị mkpa, ndị a na-apụghị ịtụfu atụfu. Ma e nweghị ịhụnanya, a dịghị ahụta uru ha. N’ihi gịnị ka o ji dị otú ahụ?
N’ụzọ bụ isi, n’ihi ụdị Chineke anyị na-efe. Jọn onyeozi kọwara Jehova, bụ́ Chineke nke ezi Iso Ụzọ Kraịst, n’okwu ndị a: “Chineke bụ ịhụnanya.” (1 Jọn 4:8) Jehova Chineke nwere ọtụtụ àgwà ndị ọzọ, dị ka ike, ikpe ziri ezi, na amamihe, ma ebe ọ bụ n’ụzọ bụ isi Chineke nke ịhụnanya, ụdị dị aṅaa ka ọ ga-achọ ka ndị na-efe ya ofufe bụrụ? N’ezie, ọ bụ ndị na-eṅomi ya ma na-azụlite ịhụnanya.—Matiu 5:44, 45; 22:37-39.
Ebumnobi Ziri Ezi
Ee, ịhụnanya na-akpali ndị Kraịst ịdị ka Chineke ha na-efe. Ọ pụtara na ebumnobi ha yiri ebumnobi ndị nke Chineke. Olee ebumnobi kasị ndị ọzọ nile elu nke kwaliri Jehova Chineke izite Jisọs n’elu ụwa ka o nye anyị ohere nke inweta ndụ ebighị ebi? Ịhụnanya. “Chineke hụrụ ụwa n’anya otú a, na o nyere ọbụna Ọkpara ọ mụrụ nanị ya, ka onye ọ bụla nke kwere na ya wee ghara ịla n’iyi, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.” (Jọn 3:16) Ya mere, gịnị kwesịrị ịbụ ebumnobi anyị n’ime uche Chineke? Ọzọkwa, ọ bụ ịhụnanya. “Nke a bụ ịhụnanya Chineke, ka anyị debe ihe nile o nyere n’iwu.”—1 Jọn 5:3.
Ọ̀ pụrụ ikwe mee ijere Chineke ozi site n’ebumnobi na-ezighị ezi? Ee. Pọl hotara ụfọdụ ndị n’oge ya bụ́ ndị na-eje ozi site n’ekworo na ịma aka. (Ndị Filipaị 1:15-17) Nke ahụ pụrụ ime anyị. Ụwa nke a jupụtara n’ịma aka, mmụọ ahụ pụkwara imetụta anyị. Anyị pụrụ inwe mpako site n’iche na anyị bụ ndị ọkà okwu ka mma ma ọ bụ na anyị nwere ike itinye ọtụtụ akwụkwọ karịa ndị ọzọ. Anyị pụrụ iji ihe ùgwù ije ozi ndị anyị nwere tụnyere nke onye ọzọ nwere wee malite inwe echiche nke onye dị mkpa n’anya onwe ya—ma ọ bụ nwee ekworo. Onye okenye pụrụ ikworo ọnọdụ ịbụ isi ya ekworo, ọbụna ruo n’ókè nke igbochi onye bụ nwata karịa ya nke nwere ikike ka ọ ghara inwewanye ọganihu. Ọchịchọ uru onwe onye pụrụ ịkpali anyị ime ka anyị na ndị Kraịst bara ọgaranya karị bụrụ ndị enyi mgbe anyị na-eleghara ndị dara ogbenye karị anya.
Ihe ndị a pụrụ ime n’ihi na anyị ezughị okè. Otú ọ dị, ọ bụrụ na—dị ka Jehova—anyị emee ịhụnanya ihe bụ isi na-akpali anyị, anyị ga-alụso ọchịchọ ndị dị otú ahụ ọgụ. Ọchịchọ onwe onye nanị, mmasị nke inye onwe anyị otuto ma ọ bụ nganga pụrụ ihichapụ ịhụnanya, anyị ewee ghara ‘inweta uru ọ bụla.’—Ilu 11:2; 1 Ndị Kọrint 13:3.
Ịhụnanya n’Ụwa nke Ịchọ Ọdịmma Onwe Onye Nanị
Jisọs sịrị na ndị na-eso ụzọ ya “esiteghị n’ụwa.” (Jọn 17:14) Olee otú anyị pụrụ isi zere ịbụ ndị ike ndọrọ nke ụwa anyị bi n’ime ya rikpuru? Ịhụnanya ga-enye aka. Dị ka ihe atụ, taa ụmụ mmadụ bụ ndị “na-ahụ ihe ụtọ n’anya kama ịhụ Chineke n’anya.” (2 Timoti 3:4) Jọn dọrọ anyị aka ná ntị ka anyị ghara ịdị otú ahụ. Ọ sịrị: “Unu ahụla ụwa, ma ọ bụ ihe nke dị n’ụwa, n’anya. Ọ bụrụ na onye ọ bụla ahụ ụwa n’anya, ịhụnanya nke Nna anyị adịghị n’ime ya. N’ihi na ihe nile nke dị n’ụwa, bụ́ agụụ ihe ọjọọ nke anụ ahụ, na agụụ ihe ọjọọ nke anya, na oké okwu nke ibi obi, esiteghị na Nna anyị, kama o sitere n’ụwa.”—1 Jọn 2:15, 16.
Ma, ọ dịghị mfe ịgbakụta “agụụ ihe ọjọọ nke anụ ahụ” na “agụụ ihe ọjọọ nke anya” azụ. A hụrụ ihe ndị a nnọọ n’anya n’ihi na ha na-adọrọ mmasị anụ ahụ anyị. Karịsịa, e nwere ọtụtụ ihe ụtọ dị iche iche taa karịa ka e nwere n’ụbọchị Jọn, ya mere ọ bụrụ na agụụ ihe ọjọọ nke anya bụ nsogbu n’oge ahụ, ọ ka njọ ugbu a karị.
Ọ dị mma ịmara na ọtụtụ n’ime ihe ụtọ ọgbara ọhụrụ nke ụwa na-enye adịghị njọ n’onwe ha. Ọ dịghị ihe dị njọ n’inwe ụlọ buru ibu, ụgbọ ala mara mma, telivishọn, ma ọ bụ ngwá egwu stereo. Ime njem ogologo nke dị ụtọ iji nwee ezumike na-akpali akpali adịghịkwa emebi iwu Bible. Mgbe ahụ, gịnị bụ isi ihe dị n’ịdọ aka ná ntị Jọn? Otu ihe bụ na ọ bụrụ na ihe ndị dị otú ahụ adị anyị mkpa karịa, ha na-azụlite n’ime anyị mmụọ nke ịchọ ọdịmma onwe onye nanị, ịhụ ihe onwunwe n’anya, na mpako. Mgbalị nke inwetakwa ego iji nweta ha pụrụ igbochi anyị n’ozi anyị na-ejere Jehova. Ọbụna ịnụ ụtọ ihe ndị dị otú ahụ na-ewe oge, ọ bụkwa ezie na ọ̀tụ̀tụ̀ ezi uche dị na ya nke ntụrụ ndụ pụrụ inye ume ọhụrụ, oge anyị nwere ehighị nne n’ihi ọrụ dịịrị anyị ịmụ Bible, iso ndị Kraịst ibe ya zukọọ maka ofufe, na ikwusa ozi ọma nke Alaeze.—Abụ Ọma 1:1-3; Matiu 24:14; 28:19, 20; Ndị Hibru 10:24, 25.
N’ọgbọ nke a nke ịchụso ihe onwunwe, ọ na-ewe mkpebi siri ike iji ‘debe Alaeze Chineke n’ọnọdụ mbụ’ ma guzogide ‘iji ụwa eme ihe n’ụzọ zuru ezu.’ (Matiu 6:33; 1 Ndị Kọrint 7:31) Okwukwe siri ike ga-enye aka. Ma karịsịa, ezi ịhụnanya maka Jehova na maka ndị agbata obi anyị ga-enye anyị ume iji guzogide ihe ndọrọ dị iche iche ndị, ọ bụ ezie na ha adịghị njọ n’onwe ha, ma ha pụrụ igbochi anyị ‘ijezu ozi anyị nke ọma.’ (2 Timoti 4:5) Ma e nweghị ịhụnanya dị otú ahụ ọ pụrụ ịdị mfe ozi anyị ịdalata ala ghọọ nanị ihe iji mezuo iwu.
Ịhụnanya n’Ime Ọgbakọ
Jisọs kọwapụtara mkpa nke ịhụnanya mgbe ọ sịrị: “Mmadụ nile ga-eji nke a mara na unu bụ ndị na-eso ụzọ m, ọ bụrụ na unu enwerịta ịhụnanya n’ebe ibe unu nọ.” (Jọn 13:35) N’ihi gịnị ka ndị okenye ga-eji tinye oge dị ukwuu n’ịzụ ndị Kraịst ibe ha dị ka atụrụ ma na-enyekwara ha aka ma ọ bụrụ na ha ahụghị ha n’anya? N’ihi gịnị ka ọgbakọ ga-eji na-anagide adịghị ike nke ibe ha—gụnyere ndị okenye—ma ọ bụrụ na ọ bụghị n’ihi ịhụnanya? Ịhụnanya na-akpali ndị Kraịst inyerịtara ibe ha aka n’ụzọ a na-ahụ anya mgbe ha nụrụ na ndị ọzọ nọ ná mkpa. (Ọrụ 2:44, 45) N’oge mkpagbu, ndị Kraịst na-echebe ibe ha ọbụna na-anwụ maka ibe ha. N’ihi gịnị? N’ihi ịhụnanya.—Jọn 15:13.
Mgbe ụfọdụ ihe ngosipụta ndị kasị ukwuu nke ịhụnanya na-abịa n’ụzọ ndị dị nta. Onye Kraịst ọzọ pụrụ ịgakwuru otu onye okenye, bụ́ onye nwewororị nrụgide site n’oké ọrụ dịkwasịrị ya n’ubu, wee weliteghachikwa mkpesa nke yiri nnọọ ihe na-adịghị mkpa nye onye okenye ahụ. Onye okenye ahụ ò kwesịrị iwe iwe? Kama ikwere ka nke a bụrụ ihe ga-akpata nkewa, ọ na-eji ndidi na obi ọma mesoo nwanna ya. Ha na-atụlekọ okwu ahụ, ọ na-emekwa ka ọbụbụenyi ha siwanye ike. (Matiu 5:23, 24; 18:15-17) Kama onye nke ọ bụla ịdị na-esi ọnwụ maka ihe ndị ruuru ya, mmadụ nile kwesịrị ịgbalị ịzụlite mmesapụ aka nke Jisọs gbara ume ya, dị njikere ịgbaghara ụmụnna ha ‘ugbo iri asaa na asaa.’ (Matiu 18:21, 22) Otú a, ndị Kraịst na-agbalịsi ike iyikwasị onwe ha ịhụnanya, “nke bụ ihe nkekọ nke izu okè.”—Ndị Kọlọsi 3:14.
Ime Ka Ịhụnanya Anyị Hụrụ Ibe Anyị Siwanye Ike
Ee, ịhụnanya bụ ebumnobi ziri ezi maka ijere Jehova ozi. Ịhụnanya ga-enye anyị ume iji nọpụ iche n’ụwa, ịhụnanya ga-emekwa ka ọgbakọ ahụ nọgide na-abụ nke ndị Kraịst n’ezie. N’ewepụghị ihe n’ịrụzu ọrụ, ọ ga-enyere ndị nọ n’isi aka ka ha ghara iburu nrụzu nke ọrụ ha n’uche ruo n’ókè nke ha ichezọ obi ọma na ịdị nro n’imeso ndị ọzọ ihe. Ịhụnanya na-enyere anyị nile aka ‘ikwenyere ndị na-edu ndú, na-edokwa onwe anyị n’okpuru ha.’—Ndị Hibru 13:17.
Pita onyeozi gbara anyị ume ka anyị nwee ‘ịhụnanya dị ike’ maka ibe anyị n’ihi na “ịhụnanya na-ekpuchi ọtụtụ mmehie.” (1 Pita 4:8) Olee otú anyị pụrụ isi mee nke a? E kere mmadụ n’oyiyi Chineke, ya mere o nwekwara ikike ebumpụta ụwa maka inwe ịhụnanya. Ma ụdị ịhụnanya anyị na-ekwu ebe a chọrọ ihe ọzọ. N’ezie, ọ bụ mkpụrụ bụ isi nke mmụọ Chineke. (Ndị Galetia 5:22) N’ihi ya, iji zụlite ịhụnanya, anyị aghaghị ikpughepụ onwe anyị nye mmụọ Chineke. N’ụzọ dị aṅaa? Site n’ịmụ Bible, bụ́ nke mmụọ Jehova nyere ikike ya. (2 Timoti 3:16) Site n’ikpe ekpere maka mmụọ Jehova iji wulite ịhụnanya anyị maka Jehova na ụmụnna anyị. Nakwa site n’isonyere ọgbakọ ndị Kraịst, ebe mmụọ ahụ na-erugharị n’enweghị ihe mgbochi ọ bụla.
Ọ dịkwa anyị mkpa inyocha onwe anyị iji chọpụta ihe omume ma ọ bụ echiche ọ bụla nke enweghị ịhụnanya. Cheta na ịhụnanya bụ àgwà nke dị n’obi, ‘obi dịkwa aghụghọ karịa ihe nile, ihe na-adịghị ngwọta ka ọ bụkwa.’ (Jeremaịa 17:9) N’agbanyeghị enyemaka nile Jehova na-enye, mgbe ụfọdụ anyị ga-eme ihe n’ụzọ enweghị ịhụnanya. Anyị pụrụ ịgwa onye Kraịst ibe anyị okwu n’ụzọ dị ike nke na-adịghị mkpa, ma ọ bụ anyị pụrụ ịgbarụ ihu ma wee iwe n’ihi ihe e kwuru. N’ihi ya, ọ dị mma ka anyị na-eburu ekpere Devid n’uche, nke bụ: “Gwupụta ala obi m, Chineke, wee mara obi m: na-anwa m, wee mara iche uche m nile: hụkwa ma ọ̀ dị ụzọ ọ bụla na-eweta ihe mgbu dị n’ime m, durukwa m n’ụzọ ebighị ebi.”—Abụ Ọma 139:23, 24.
Dị ka Bible na-ekwu, “ịhụnanya adịghị ada mgbe ọ bụla.” (1 Ndị Kọrint 13:8) Ọ bụrụ na anyị na-ahụ ibe anyị n’anya, ọ dịghị mgbe anyị na-agaghị eru eru n’oge ule. Ịhụnanya nke dị n’etiti ndị Chineke na-etinye ihe nke ukwuu na paradaịs ime mmụọ nke e nwere taa. Nanị ndị hụrụ ibe ha n’anya n’ụzọ dị ike site n’obi ga-enwe obi ụtọ n’ibi ndụ n’ụwa ọhụrụ. N’ihi ya, ṅomie Jehova n’igosipụta ịhụnanya dị otú ahụ, sikwa otú ahụ gbaa ihe nkekọ ahụ nke ịdị n’otu ume. Zụlite ịhụnanya, nweekwa isi ihe dị n’ezi Iso Ụzọ Kraịst.