Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w91 11/1 p. 5-7
  • Ụbọchị Ịbọ Ọ́bọ̀ nke Chineke

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ụbọchị Ịbọ Ọ́bọ̀ nke Chineke
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • N’ihi Gịnị Ka E Ji Nwee Ụbọchị Ịbọ Ọ́bọ̀?
  • Gịnị Ka Ụbọchị Ịbọ Ọ́bọ̀ nke Chineke Ga-arụzu?
  • Gịnị Ka Ị Ga-eme?
  • Ịbọ Ọ́bọ̀ Ọ̀ Dị Njọ?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
  • “Nna Unu Na-eme Ebere”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
  • Gịnị Ka I Kwesịrị Ime Mgbe E Mejọrọ Gị?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
w91 11/1 p. 5-7

Ụbọchị Ịbọ Ọ́bọ̀ nke Chineke

DỊ KA anyị hụrụ n’isiokwu bu nke a ụzọ, e nwere ọtụtụ ihe mere o ji dị njọ anyị ịchọ ịbọ ọ́bọ̀. Ọ dị njọ n’ihi na n’ikpeazụ, ọ dịghị edozi nsogbu ọ bụla. Ọ dị njọ n’ihi na ọ na-eme ka ibuiro siwanye ike kama iwulite ihe njikọ nke ọbụbụenyi. Ọ dịkwa njọ n’ihi na ọ bụ ihe na-emerụ ahụ nye onye na-ebu echiche nke ịbọ ọ́bọ̀ n’obi.

Otú ọ dị, ihe kasị mkpa mere ịbọ ọ́bọ̀ ụmụ mmadụ ji dị njọ bụ nke a na-ahụ n’okwu Mosis gwara Israel: “Jehova, bụ́ Chineke gị, bụ Chineke nwere obi ebere.” (Deuterọnọmi 4:31) Ebe Chineke bụ onye nwere obi ebere, anyị kwesịrị inwe obi ebere dị ka ya. Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Nweenụ obi ebere, dị ka Nna unu nwere obi ebere.”—Luk 6:36.

Otú o sina dị, Bible kọwakwara Jehova dị ka “Chineke nke ọ́bọ̀ nile.” (Abụ Ọma 94:1) Aịsaịa onye amụma kwuru okwu banyere “afọ mgbe ihe mmadụ na-atọ Jehova ụtọ,” nakwa “ụbọchị ịbọ ọ́bọ̀ Chineke anyị nwere.” (Aịsaịa 61:2) Olee ụzọ Chineke pụrụ isi bụrụ ma onye nwere obi ebere ma onye na-abọ ọ́bọ̀? Ọ bụrụkwa na anyị ga-eṅomi obi ebere nke Chineke, n’ihi gịnị ka anyị na-apụghị iṅomi ya n’ịbọ ọ́bọ̀?

Iji zaa ajụjụ nke mbụ ahụ, Chineke bụ onye nwere obi ebere n’ihi na ọ hụrụ ihe a kpọrọ mmadụ n’anya, ọ na-agbagharakwa mmehie ruo ókè ọ pụrụ ime, ruokwa ogologo mgbe ọ pụrụ ịnọgide na-eme ya ka o wee nye ụmụ mmadụ ohere idozi ụzọ ha nile. Ọtụtụ ndị, dị ka Pọl onyeozi, ejiriwo obi ebere nke a mee ihe. Ma Chineke bụkwa onye na-abọ ọ́bọ̀—n’echiche nke bụ na ọ na-emezu ikpe ziri ezi—n’ihi na obi ebere ahụ pụrụ ịnọgide nanị ruo ogologo oge a kpaara ókè. Mgbe ụfọdụ ndị gosipụtaworo na ha apụghị ịgbanwe ụzọ ha, Chineke ga-emezu ihe e kpere n’ikpe n’ihe ahụ a kpọrọ ụbọchị ịbọ ọ́bọ̀ ya.

N’azịza nye ajụjụ nke abụọ ahụ, ee e, anyị adịghị eme ihe ziri ezi n’ịbụ ndị na-abọ ọ́bọ̀ n’ihi na Chineke na-abọ ọ́bọ̀. Jehova bụ onye zuru okè n’ikpe ziri ezi. Ụmụ mmadụ abụghị. Chineke na-ahụ akụkụ nile nke okwu, ọ na-emekwa mkpebi ezi omume mgbe nile. A pụghị ịdabere n’ebe anyị nọ ime otu ihe ahụ. Ọ bụ ya mere Pọl ji nye ndụmọdụ, sị: “Ndị m hụrụ n’anya, unu abọlara onwe unu ọ́bọ̀, kama chaaranụ iwe ahụ ụzọ: n’ihi na e dewo ya n’akwụkwọ nsọ, sị, Mụ nwe ọ́bọ̀; mụ onwe m ga-enyeghachi, ka Onyenwe anyị [“Jehova,” NW] kwuru.” (Ndị Rom 12:19) Maka ọdịmma nke onwe anyị, anyị aghaghị ịhapụ ịbọ ọ́bọ̀ n’aka Jehova.

N’ihi Gịnị Ka E Ji Nwee Ụbọchị Ịbọ Ọ́bọ̀?

N’agbanyeghị nke ahụ, n’ọtụtụ ebe dị iche iche, Bible kwetara na ọ dị mkpa iso ndị na-eme ihe ọjọọ n’enweghị nchegharị mee mpịazi. Dị ka ihe atụ, Pọl onyeozi buru amụma na Chineke, site n’aka Jisọs, ga-eweta ‘ịbọ ọ́bọ̀ n’ahụ ndị na-amataghị Chineke, ha na ndị na-aṅaghị ntị ozi ọma nke Onyenwe anyị Jisọs.’ (2 Ndị Tesalọnaịka 1:8) Anyị nwere ezi ihe mere anyị ga-eji jiri okwu ndị ahụ kpọrọ ihe dị mkpa. N’ihi gịnị?

N’otu akụkụ, ọ bụ n’ihi na ihe ka ọtụtụ n’ụmụ mmadụ taa nọgidere na-eleda ọbụbụeze nke Onye Okike ahụ anya, ha na-elefuru iwu ezi omume ya nile anya. Ma hà kwuru na ha kweere na Chineke ma ọ bụ na ha ekwughị otú ahụ, àgwà ha na-egosi n’ụzọ doro anya na ha enweghị echiche nke ịbụ ndị ga-aza ajụjụ n’ihu Chineke. Okwu onye ọbụ abụ ahụ metụtara ndị nile dị otú ahụ: “N’ihi gịnị ka onye na-emebi iwu lelịworo Chineke? Ọ sịwo n’obi ya, Ị gaghị ajụ ajụjụ.” (Abụ Ọma 10:13) O doro anya na Jehova agaghị anọgide ruo mgbe ebighị ebi na-ekwere ka a na-ekwutọ ya n’ụzọ dị otú a. Ọ bụ ezie na ọ bụ Chineke nke ịhụnanya, ọ bụkwa Chineke nke ikpe ziri ezi. Ọ ga-anụrụ ákwá nile nke ndị ahụ ihe banyere ikpe ziri ezi na-emetụ n’obi n’ezie: “Bilie, Jehova; Chineke, welie aka gị elu: echezọla ndị e wedara n’ala.”—Abụ Ọma 10:12.

Ọzọkwa, mmadụ ndị na-emebi iwu na-ebibi elu ala nke anyị bi n’ime ya. Ha na-emetọ ala, ikuku, na mmiri; ha na-eji ikpe na-ezighị ezi na obi ọjọọ mejupụta ụwa. Ha na-akwakọbakwa ngwá agha nke mmiri ọgwụ, nke nuklia, na ụdị ndị ọzọ na-egbu egbu zuru ezu iji yie nlanarị nke ihe a kpọrọ mmadụ egwu. Ọ dị mkpa nke ukwuu ka Chineke tinye aka n’ihe na-eme eme ka e wee jide n’aka na a ga-enwe ọdịnihu nke nọ ná ntụkwasị obi nye ihe a kpọrọ mmadụ na-erube isi. (Mkpughe 11:18) Ọ bụ ntinye aka nke a ka Aịsaịa zoro aka na ya dị ka ụbọchị ịbọ ọ́bọ̀.

Gịnị Ka Ụbọchị Ịbọ Ọ́bọ̀ nke Chineke Ga-arụzu?

Dị ka akwụkwọ bụ Vine’s Expository Dictionary of Old and New Testament Words si kwuo, n’Akwụkwọ Nsọ Grik, mgbe e ji okwu ahụ dịịrị ịbọ ọ́bọ̀ mee ihe n’ihe banyere Chineke, ọ pụtara n’ụzọ nkịtị “‘nke e mere site n’ikpe ziri ezi,’ ọ bụghị, dị ka ọ na-adịkarị n’ịbọ ọ́bọ̀ nke ụmụ mmadụ, site ná mmetụta nke onye e merụrụ ahụ ma ọ bụ site ná mkpasu iwe efu.” Otú a, ịbọ ọ́bọ̀ nke Chineke megide ndị iro ya agajeghị ịbụ oge nke mwụfu ọbara a na-akparaghị ókè, dị ka ọ na-adị ná nserịta okwu mmadụ na ibe ya. “Onyenwe anyị [“Jehova,” NW] matara ịdọpụta ha n’ọnwụnwa, bụ́ ndị na-asọpụrụ Chineke, na idebe ndị ajọ omume n’ahụhụ mmehie ruo ụbọchị ikpe,” ka Bible na-agwa anyị.—2 Pita 2:9.

Ndị ohu Chineke na-elepụ anya gaa n’ụbọchị ịbọ ọ́bọ̀ nke Chineke dị ka oge mgbe a ga-enye omume ziri ezi nkwado, napụtakwa ndị ezi omume site ná mkpagbu nke ndị ajọ omume. Nke a apụtaghị na ha bụ ndị nwere obi ọjọọ ma ọ bụ ndị na-achọ imegwara ihe. “Onye na-aṅụrị ọṅụ banyere nhụjuanya ndị ọzọ, a gaghị agụ ya n’onye na-emeghị ihe ọjọọ,” ka Bible dọrọ aka ná ntị kwuo. (Ilu 17:5) Kama nke ahụ, ha na-azụlite obi ebere na obi ọmịiko, na-ahapụrụ Chineke mkpebi ọ bụla metụtara ịbọ ọ́bọ̀.

N’ezie, ọ bụghị ihe dị mfe ndị iwe ji ime omume n’ụzọ dị otú a. Ma ọ bụ ihe na-ekwe omume, ọtụtụ ndị emewokwa otú ahụ. Dị ka ihe atụ, Pedro enweghị obi ụtọ mgbe ọ bụ nwata, nwanne ya nwoke nke tọrọ ya tikwara ya ihe ọtụtụ mgbe. Ya mere o tolitere bụrụ onye na-eme ihe ike, na-adabakarị ná nsogbu n’aka ndị uwe ojii, na-emeso nwunye ya na ụmụ ya omume obi ọjọọ n’ihi iwe ọ na-eweso nwanne ya nwoke. N’ikpeazụ, o gere ntị n’ihe otu n’ime Ndịàmà Jehova kwuru wee mesịa malite ọmụmụ Bible. “Site n’enyemaka Jehova,” ka ọ kọrọ, “agbanwere m, ugbu a, kama ịdị na-alụso ndị mmadụ ọgụ, ana m enyere ha aka dị ka onye Kraịst bụ okenye.” Site n’enyemaka nke Bible na mmụọ nsọ, ọtụtụ ndị ọzọ a na-apụghị ịgụta ọnụ emewo mgbanwe dị otú ahụ site n’ịbụ ndị bu iwe n’obi ma ọ bụ ndị na-achọ ịbọ ọ́bọ̀ gaa n’igosi ịhụnanya na ndidi n’ebe ndị ọzọ nọ.

Gịnị Ka Ị Ga-eme?

Iburu n’uche ọbịbịa nke ụbọchị ịbọ ọ́bọ̀ Chineke ga-enyere anyị aka iji ohere nke ndidi Jehova nyere anyị mere ezi ihe. Ma ohere ime nke ahụ abụghị ihe a na-akparaghị ókè. N’isi nso, ụbọchị ahụ ga-abịarute. Pita onyeozi gosiri ihe mere na ọ bịabeghị ka ọ dị ugbu a: “Onyenwe anyị [“Jehova,” NW] anọghị ọdụ n’ime nkwa ya, dị ka ụfọdụ na-agụ ya na ọ bụ ịnọ ọdụ; kama ọ na-atachiri unu ogologo ntachi obi, n’ihi na o zubeghị ka ndị ọ bụla laa n’iyi, kama ka mmadụ nile bịaruo nchegharị.”—2 Pita 3:9.

Ya mere, ọ bụ ihe dị ngwa ịkwadebe ugbu a maka ụbọchị ime mpịazi nke Chineke site n’ịmụ Akwụkwọ nsọ na itinye ndụmọdụ ya n’ọrụ. Nke a ga-enyere anyị aka ịgbaso okwu onye ọbụ abụ ahụ, bụ́: “Haa aka iwe iwe, hapụkwa ọnụma: emela ka iwe gị dị ọkụ, ọ na-eduba nanị n’ime ihe ọjọọ. N’ihi na a ga-ebipụ ndị na-eme ihe ọjọọ: ma ndị na-ele anya Jehova, ndị ahụ ga-enweta ala.”—Abụ Ọma 37:8, 9.

[Foto dị na peeji nke 7]

Mgbe ụbọchị ịbọ ọ́bọ̀ Chineke gasịrị, ‘ndị na-ele anya Jehova ga-enweta ala’

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya