Ihe Mere Ha Ji Na-eji Ihe Ochie Ndị Dị Nsọ Eme Ihe n’Ofufe
NAPLES, Itali. Jiri echiche were ya na ị nọ n’ebe ahụ n’afọ ndị mbụ nke narị afọ nke 18 nke Oge Anyị. N’ime ụlọ katidral ya, ọkà ihe ọmụma onye Ireland bụ George Berkeley na-eguzo n’ihu otu ihe ochie dị nsọ nke okpukpe a ma ama. O ji obi abụọ na-ekiri ihe ahụ yiri ka ọ bụ ime ka ọbara nke “San Gennaro” dịrị mmiri mmiri, “senti” ndị Katọlik bụ́ Januarius.
Naples enwewo nanị mgbanwe dị nta n’ihe banyere nke a. Dị ka ihe atụ, n’agbanyeghị ọnọdụ ihu eluigwe dị njọ n’otu oge n’afọ ndị na-adịbeghị anya gara aga, chọọchị ahụ jupụtakwara ná ndị mmadụ ọzọ, ihe yiri ọrụ ebube ewerewokwa ọnọdụ. E ji oké ịkụ aka nabata ihe ochie ahụ dị nsọ na ịkwụ n’ahịrị nke onye nọ n’isi ya bụ onye kadịnal bụ bishọp ukwu. Ee, nke a bụ ọzọ n’ime ọtụtụ oge mgbe o yiri ka ọbara nke “San Gennaro” dịghachiri mmiri mmiri. A kọwawo na ọrụ ebube ndị metụtara ihe ochie dị nsọ nke a nke okpukpe anọwo na-ewere ọnọdụ kemgbe narị afọ nke 14.
Dị ka omenala ndị Katọlik si dị, ihe ochie dị nsọ (Bekee: relic) (nke e nwetara site n’okwu Latin bụ relinquere, nke pụtara “ịhapụ n’azụ”) bụ ihe onye e lere anya na ọ bụ onye senti hapụrụ. Dị ka akwụkwọ Dizionario Ecclesiastico mere ka ọ pụta ìhè, ihe ochie dị iche iche dị nsọ “bụ nke nkọwa kasị doo anya o nwere bụ ahụ ma ọ bụ akụkụ ahụ na ntụ nke onye Senti ahụ, n’ụzọ sara mbara karị, ihe ọ bụla nke metụrụ ahụ onye senti ahụ nke e kwesịkwara inye ofufe n’ihi nke ahụ.”
Nkwado Ndị Popu
Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ọtụtụ ndị na-eji oké nsọpụrụ emeso ihe ochie okpukpe dị iche iche dị nsọ n’ihi ihe ndị ahụ yiri ọrụ ebube e jikọtara n’ebe ha nọ. Ihe àmà gosiri na nkwado ndị popu bụ isi ihe ọzọ mere e ji nwee mmasị n’ebe ha dị.
Ya dịkarịa ala, ndị popu anọ n’ime 70 afọ gara aga elebarawo ihe ochie dị nsọ anya n’ụzọ pụrụ iche. Otu akwụkwọ ndị Katọlik na-ebipụta site n’oge ruo n’oge na-ekpughe na dị ka onye bu ya ụzọ, bụ́ Pius nke Iri na Otu, Pope Pius nke Iri na Abụọ “na-ebugharị n’ahụ nke onwe ya ihe ochie dị nsọ nke senti nke Lisieux.” Paul nke Isii “debere mkpịsị aka nke [Thomas] onyeozi n’elu table dị n’ọfis ya,” John Paul nke Abụọ “na-edebekwa, n’ime ebe obibi ya, iberibe ihe nke . . . akụkụ na-anwụ anwụ nke “Senti Benedict” na “Senti Andrew.”—30 giorni, March 1990, peji 50.
N’iburu nkwado ndị popu dị otú a n’uche, ọ bụghị ihe ijuanya na ọchịchọ a na-achọ ihe nsọ ochie dị iche iche maka ịdị na-enye ha ofufe nke onwe onye na nke ihu ọha na-amụbawanye. Ma inye ihe nsọ ochie nke okpukpe ofufe ọ̀ na-amasị Chineke?
[Foto dị na peeji nke 3]
Mkpọ̀ relinquary bụ́ ihe a na-eji etinye, na-echebekwa ihe nsọ ochie nke okpukpe
[Ebe e si Nweta Foto]
A natara ikike isepụta ya n’aka The British Museum