Ịzụlite Mkpụrụ nke Njide Onwe Onye
“Mkpụrụ nke mmụọ nsọ bụ ịhụnanya, ọṅụ, udo, ogologo ntachi obi, obi ọma, ịdị mma, ikwesị ntụkwasị obi [“okwukwe,” NW], ịdị nwayọọ, imeru ihe n’ókè [“ijide onwe onye,” NW]: ọ dịghị iwu na-emegide ihe nile dị otú a.” —NDỊ GALETIA 5:22, 23.
1. Òle ndị nyeworo anyị ihe nlereanya kachasị mma nke njide onwe onye, dị ka a hụrụ ya n’akụkụ akwụkwọ nsọ dịgasị aṅaa?
JEHOVA CHINEKE na Jisọs Kraịst enyewo anyị ihe nlereanya kachasị mma nke njide onwe onye. Eri mgbe nnupụisi mmadụ n’ogige Iden, Jehova anọwo na-egosipụta àgwà nke a. (Tụlee Aịsaịa 42:14.) Ugbo itoolu n’Akwụkwọ Nsọ Hibru, anyị na-agụ na ọ bụ “onye na-adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ.” (Ọpụpụ 34:6) Nke ahụ chọrọ njide onwe onye. O dokwara anya na Ọkpara Chineke gosipụtara njide onwe onye dị ukwuu, n’ihi na “mgbe a na-ekwutọ ya, ọ dịghị ekwutọghachi ọzọ.” (1 Pita 2:23) Ma Jisọs pụrụ ịrịọworị Nna ya nke eluigwe maka nkwado nke ‘ihe karịrị legiọn iri na abụọ n’ime ndị mmụọ ozi.’—Matiu 26:53.
2. Ezi ihe nlereanya Akwụkwọ nsọ dịgasị aṅaa ka anyị nwere banyere ụmụ mmadụ na-ezughị okè igosipụta njide onwe onye?
2 Anyị nwekwara ezi ihe nlereanya Akwụkwọ nsọ nke ụmụ mmadụ na-ezughị okè ndị gosipụtara njide onwe onye. Dị ka ihe atụ, e gosipụtara àgwà nke a n’oge otu ihe kwesịrị ịrịba ama mere ná ndụ Josef, bụ́ nwa nke nna ochie ahụ bụ Jekọb. Lee nnọọ njide onwe onye Josef gosipụtara mgbe nwunye Pọtifa nwara ịrafu ya! (Jenesis 39:7-9) E nwekwara ihe nlereanya nke ụmụ okoro ndị Hibru anọ ahụ, ndị gosipụtara njide onwe onye site n’ịjụ iri nri ụtọ nke eze Babilọn n’ihi mgbochi ndị Iwu Mosis tinyere.—Daniel 1:8-17.
3. Òle ndị ka a maara banyere àgwà ọma ha, dị ka a na-ahụta site n’àmà dị aṅaa a gbaara ha?
3 Maka ihe nlereanya ndị nke oge a nke njide onwe onye, anyị pụrụ izo aka n’ebe Ndịàmà Jehova nọ n’ozuzu ha. O kwesịrị ekwesị, bụ́ ịja mma ahụ akwụkwọ New Catholic Encyclopedia nyere ha—na ha bụ “otu n’ime òtù ndị kasị nwee àgwà ọma n’ụwa dum.” Otu onye na-ezi ihe n’otu mahadum dị na Philippines kwuru na “Ndịàmà ahụ na-etinyesi nnọọ ike ihe ha mụtara n’Akwụkwọ nsọ n’ọrụ.” N’ihe banyere mgbakọ Ndịàmà ahụ nwere na Warsaw na 1989, otu onye ntá akụkọ bụ onye Poland dere, sị: “55,000 mmadụ eseghị ọbụna otu mkpụrụ sịga ruo ụbọchị atọ! . . . Ngosipụta nke àgwà ọma karịrị ike mmadụ mere ka m nwee mmetụta nke mmasị na oké egwu n’ebe ha nọ.”
Ịtụ Egwu Chineke na Ịkpọ Ihe Ọjọọ Asị
4. Gịnị bụ otu n’ime ihe enyemaka ndị kasị ukwuu n’igosipụta njide onwe onye?
4 Otu n’ime ihe enyemaka ndị kasị ukwuu n’ịzụlite njide onwe onye bụ ịtụ egwu Chineke, bụ́ ịtụ egwu n’ụzọ dị mma maka imejọ Nna anyị nke eluigwe, onye na-ahụ n’anya. A pụrụ ịhụta otú o kwesịrị ịdịru anyị ná mkpa, bụ́ iji nsọpụrụ na-atụ egwu Chineke site n’eziokwu ahụ nke bụ na Akwụkwọ nsọ hotara ya ọtụtụ ugbo. Mgbe Abraham na-akwado iji nwa ya bụ Aịsak chụọ àjà, Chineke sịrị: “Esetịla aka gị tụkwasị n’ahụ nwa okoro ahụ, e mekwala ya ihe ọ bụla: n’ihi na ugbu a ka m maara na onye na-atụ egwu Chineke ka ị bụ, n’ihi na i gbochighị nwa gị nwoke, nke i nwere nanị ya, iwere ya nye m.” (Jenesis 22:12) Ihe ịrụ ụka adịghị ya na e nwere oké mkpali nke mmetụta n’oge ahụ, ya mere, ọ ghaghị iweworịị njide onwe onye dị ukwuu n’akụkụ Abraham ịgbaso ihe Chineke nyere n’iwu ruo n’ọ̀tụ̀tụ̀ nke iweli mma ya elu iji gbuo nwa ya bụ Aịsak ọ hụrụ n’anya. Ee, egwu nke Chineke ga-enyere anyị aka igosipụta njide onwe onye.
5. Ọrụ dị aṅaa ka ịkpọ ihe ọjọọ asị na-arụ n’anyị igosipụta njide onwe onye?
5 Otu ihe e jikọrọ ya na ịtụ egwu Jehova n’ụzọ chiri anya bụ ịkpọ ihe ọjọọ asị. Anyị na-agụ n’Ilu 8:13, sị: “Egwu Jehova bụ ịkpọ ihe ọjọọ asị.” N’ịga n’ihu, ịkpọ ihe ọjọọ asị na-enyekwara anyị aka igosipụta njide onwe onye. Ugboro ugboro, Akwụkwọ nsọ na-agwa anyị ka anyị kpọọ ihe ọjọọ asị—ee, kpọọ ya asị nke ukwuu. (Abụ Ọma 97:10; Emọs 5:14, 15; Ndị Rom 12:9) Ọtụtụ mgbe, ihe dị njọ na-abụ ihe ụtọ, ihe na-adọrọ mmasị, ihe na-adọrọ adọrọ nke na anyị aghaghị ịkpọ ya asị iji wusie onwe anyị ike megide ya. Ọkpụkpọ asị nile a kpọrọ ihe ọjọọ n’ụzọ dị otú ahụ na-enwe mmetụta nke iwusi mkpebi anyị ike igosipụta njide onwe onye, wee si otú a na-eje ozi dị ka ihe nchebe nye anyị.
Njide Onwe Onye, Ụzọ nke Amamihe
6. N’ihi gịnị ka o ji bụrụ ụzọ amamihe ibelata mkpali ọchịchọ onwe anyị site n’igosipụta njide onwe onye?
6 Otu oké ihe ọzọ na-enyere anyị aka n’igosipụta njide onwe onye bụ ịghọta amamihe dị n’igosipụta àgwà nke a. Jehova na-agwa anyị ka anyị gosipụta njide onwe onye maka abamuru nke onwe anyị. (Tụlee Aịsaịa 48:17, 18.) Okwu ya nwere ndụmọdụ dị ukwuu nke na-egosi otú o si bụrụ ihe amamihe anyị ibelata mkpali ọchịchọ ọdịmma nanị onwe anyị site n’igosipụta njide onwe onye. Anyị apụghị nnọọ ịgbanarị iwu Chineke ndị na-adịghị agbanwe agbanwe. Okwu ya na-agwa anyị, sị: “Mkpụrụ ọ bụla mmadụ na-agha, nke ahụ ka ọ ga-ewetakwa n’ubi. N’ihi na onye na-agha mkpụrụ nye anụ ahụ onwe ya ga-esite n’anụ ahụ ahụ weta mbibi dị ka ihe ubi; ma onye na-agha mkpụrụ nye mmụọ nsọ ga-esite ná mmụọ nsọ weta ndụ ebighị ebi dị ka ihe ubi.” (Ndị Galetia 6:7, 8) Otu ihe nlereanya pụtara ìhè bụ nke iri ihe na ịṅụ ihe ọṅụṅụ. Ọtụtụ ajọ ihe na-abịa n’ihi na ụmụ mmadụ ribigara ihe ókè ma ọ bụ ṅụbiga ihe ọṅụṅụ ókè. Ịdara ọchịchọ nile nke onwe onye dị otú ahụ n’ala na-anapụ mmadụ ùgwù onwe onye. Karịa nke ahụ, mmadụ apụghị ịdara ọchịchọ onwe onye n’ala n’emebighị mmekọrịta ya na ndị ọzọ. Nke kasị njọ, enweghị njide onwe onye na-emebi mmekọrịta anyị na Nna anyị nke eluigwe.
7. Gịnị bụ otu isiokwu pụtara ìhè nke akwụkwọ Ilu, dị ka e gosiri site n’ihe odide Bible dịgasị aṅaa?
7 N’ihi ya, anyị aghaghị ịnọgide na-agwa onwe anyị na ịchọ ọdịmma onwe onye nanị na-emebiri onye na-eme ya ihe. Otu isiokwu pụtara ìhè nke akwụkwọ Ilu, nke na-emesi ike mkpa ọ dị inye onwe onye ọzụzụ, bụ na ịchọ ọdịmma onwe onye adịghị arụpụta ezi ihe, na e nwekwara amamihe n’igosipụta njide onwe onye. (Ilu 14:29; 16:32) Ka a rịbakwa ya ama na ọzụzụ onwe onye gụnyere ihe karịrị nanị izere ihe dị njọ. Ọzụzụ onwe onye, ma ọ bụ njide onwe onye, dịkwa mkpa iji mee ezi ihe, bụ́ nke pụrụ ịbụ ihe siri ike n’ihi na nke a na-emegide ọchịchọ anyị nile nke ime mmehie.
8. Ahụmahụ dị aṅaa na-egosi amamihe dị n’igosipụta njide onwe onye?
8 Okwu banyere ihe otu n’ime Ndịàmà Jehova nke guzo n’ahịrị n’otu ụlọ akụ mere mgbe otu nwoke nuru ya aka na-eme ihe atụ na amamihe dị n’igosipụta njide onwe onye. Ọ bụ ezie na nke a adịchaghị Onyeàmà ahụ mma n’obi, o gosipụtara njide onwe onye. N’otu ụbọchị ahụ kpọmkwem, ọ gaje ijekwuru otu onye injinia ka ọ bịanye aka n’akwụkwọ maka atụmatụ iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ònyekwa ka onye injinia ahụ bụ? Ee, ọ bụ kpọmkwem nwoke ahụ nke nuru ya aka n’ụlọ akụ! Ọ bụghị nanị na onye injinia ahụ mesoro ya omume dị ka onye bụ enyi, kama ọ nara Onyeàmà ahụ ego dị ala karịa otu ụzọ n’ụzọ iri nke ihe ọ na-ana ndị ọzọ. Lee ka Onyeàmà ahụ si nwee obi ụtọ na ya gosipụtara njide onwe onye ná mmalite ụbọchị ahụ, n’ekweghị ka a kpasuo ya iwe!
9. Gịnị bụ ụzọ amamihe dị na ya ịgbaso mgbe anyị zutere mmeghachi omume nke mkparị n’ije ozi anyị?
9 Ọtụtụ mgbe, mgbe anyị na-aga site n’ụlọ ruo n’ụlọ ikwusa ozi ọma nke Alaeze Chineke ma ọ bụ na-eguzo n’akụkụ okporo ụzọ na-agbalị ịdọrọ mmasị ndị na-agafe agafe bịa n’ozi anyị, anyị na-ezute okwu mkparị. Gịnị bụ ụzọ amamihe dị na ya ịgbaso? E kwuru okwu nke a amamihe dị na ya n’Ilu 15:1: “Ọzịza okwu dị nro na-eme ka ọnụma laghachi azụ.” N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, ọ dị anyị mkpa igosipụta njide onwe onye. Ọ bụghịkwa nanị na Ndịàmà Jehova ahụwo nke a dị ka ihe bụ eziokwu, kama ndị ọzọ emewokwa otú ahụ. Ndị ọkà mmụta ọgwụ na ahụ ike na-ahụwanye abamuru ọgwụgwọ ọrịa dị ná njide onwe onye.
Ịhụnanya nke Na-adịghị Achọ Ọdịmma Onwe Onye Na-enye Aka
10, 11. N’ihi gịnị ka ịhụnanya ji bụrụ ezi ihe enyemaka n’igosipụta njide onwe onye?
10 Nkọwa Pọl nyere ịhụnanya ná 1 Ndị Kọrint 13:4-8 na-egosi na ike ya pụrụ inyere anyị aka igosipụta njide onwe onye. “Ịhụnanya nwere ogologo ntachi obi.” Inwe ogologo ntachi obi chọrọ njide onwe onye. “Ịhụnanya adịghị ekwo ekworo; ịhụnanya adịghị anya isi, ọ dịghị afụli onwe ya elu.” Àgwà nke ịhụnanya na-enyere anyị aka ịchịkwa echiche na mmetụta anyị nile, ibelata ọchịchọ ọ bụla nke ikwo ekworo, ịnya isi, ma ọ bụ ịfụli onwe anyị elu. Ịhụnanya na-akpali anyị ime kpọmkwem ihe megidere nke ahụ, na-eme ka anyị bụrụ ndị wedatara onwe ha ala, ndị dị umeala n’obi, dị ka Jisọs bụ.—Matiu 11:28-30.
11 Pọl gara n’ihu ikwu na ịhụnanya ‘adịghị eme ihe na-adịghị mma n’anya.’ Ọ chọkwara njide onwe onye iji mee omume n’ụzọ dị mma n’anya n’oge nile. Àgwà nke ịhụnanya na-echebe anyị pụọ n’igosi anyaukwu, site n’ịnọ mgbe nile ‘na-achọ ọdịmma nke onwe anyị.’ Ịhụnanya ‘adịghị ewe oké iwe.’ Lee ka ọ na-esi adị mfe ịbụ onye a kpasuru iwe n’ihi ihe ndị ọzọ kwuru ma ọ bụ ihe ha mere! Ma ịhụnanya ga-enyere anyị aka igosipụta njide onwe onye, gharakwa ikwu ma ọ bụ ime ihe ndị anyị ga-emesịa kwaa ụta maka ha. Ịhụnanya ‘adịghị agụ ihe ọjọọ e mere ya.’ Ọdịdị mmadụ na-achọkarị ibu mmejọ n’obi ma ọ bụ ibu iwe n’obi. Ma ịhụnanya ga-enyere anyị aka iwepụchasị echiche nile dị otú ahụ site n’uche anyị. Ịhụnanya ‘adịghị aṅụrị ọṅụ n’ime ajọ omume.’ Ọ chọrọ njide onwe onye iji ghara inweta ọṅụ n’ihe na-ezighị ezi, dị ka ihe odide ma ọ bụ ihe osise banyere mmekọahụ ma ọ bụ ihe nkiri TV ndị na-emerụ emerụ. Ịhụnanya ‘na-anagidekwa ihe nile, na-enwekwa ntachi obi n’ihe nile.’ Ọ chọrọ njide onwe onye iji nagide ihe dị iche iche, iji nwee ntachi obi n’ihe ndị na-etinye mmadụ n’ule ma ọ bụ n’ihe ndị bụ ibu arọ, gharakwa ikwe ka ha kụda anyị aka, kpalie anyị imegwara ihe n’otu ụzọ ahụ, ma ọ bụ kpalie anyị ịkwụsị ijere Jehova ozi.
12. Gịnị bụ otu ụzọ anyị na-esi egosipụta ekele anyị maka ihe nile Jehova Chineke na Jisọs Kraịst mewooro anyị?
12 Ọ bụrụ na anyị hụrụ Nna anyị nke eluigwe n’anya n’ezie, nweekwa ekele maka àgwà ya nile ndị dị ebube na ihe nile o mewooro anyị, anyị ga-achọ ime ihe na-atọ ya ụtọ site n’igosipụta njide onwe onye n’oge nile. Ọzọkwa, ọ bụrụ na anyị hụrụ Onyenwe anyị na Nna Anyị Ukwu, bụ́ Jisọs Kraịst, n’anya n’ezie, nweekwa ekele maka ihe nile o mewooro anyị, anyị ga-ege ntị n’iwu ahụ o nyere ‘iburu osisi ịta ahụhụ anyị ma nọgide na-eso ya mgbe nile.’ (Mak 8:34) O doro anya na nke ahụ chọrọ ka anyị gosipụta njide onwe onye. Ịhụnanya maka ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwanyị bụ ndị Kraịst ga-egbochikwa anyị imerụ ha ahụ site n’ịgbaso ụzọ ọchịchọ ọdịmma onwe onye.
Okwukwe na Ịdị Umeala n’Obi dị ka Ihe Ndị Na-enye Aka
13. N’ihi gịnị ka okwukwe pụrụ iji nyere anyị aka n’igosipụta njide onwe onye?
13 Ihe enyemaka ọzọ dị ukwuu n’igosipụta njide onwe onye bụ okwukwe n’ebe Chineke nọ na n’ebe nkwa ya nile dị. Okwukwe ga-enyere anyị aka ịtụkwasị Jehova obi, cherekwa oge ya a kara aka iji dozie ihe nile. Pọl onyeozi mere ka otu isi ihe ahụ pụta ìhè mgbe o kwuru ná Ndị Rom 12:19, sị: “Ndị m hụrụ n’anya, unu abọlara onwe unu ọ́bọ̀, . . . n’ihi na e dewo ya n’akwụkwọ nsọ, sị, Mụ nwe ọ́bọ̀; mụ onwe m ga-enyeghachi, ka Onyenwe anyị [“Jehova,” NW] kwuru.” N’ihe banyere nke a, ịdị umeala n’obi pụkwara inyere anyị aka. Ọ bụrụ na anyị bụ ndị dị umeala n’obi, anyị agaghị adị ngwa n’ịbụ ndị a kpasuru iwe n’ihi mmejọ ndị anyị chere na e mejọrọ anyị ma ọ bụ ndị e mejọrọ anyị n’ezie. Anyị agaghị adị ngwa n’ikpebi ime ihe n’onwe anyị, dị ka a pụrụ ikwu ya, kama anyị ga-egosipụta njide onwe onye, dịkwa njikere ichere Jehova.—Tụlee Abụ Ọma 37:1, 8.
14. Ahụmahụ dị aṅaa na-egosi na ọbụna ndị ahụ na-enweghị ya ma ọlị pụrụ ịzụlite njide onwe onye?
14 E mere ka eziokwu ahụ bụ na anyị pụrụ ịmụta igosipụta njide onwe onye pụta ìhè nke ọma n’otu ahụmahụ metụtara otu nwoke nke na-ewe iwe ọkụ. Ee, ọ na-ewe oké iwe nke na mgbe a kpọrọ ndị uwe ojii n’ihi ọgba aghara ya na nna ya na-akpata, ọ kụdara ndị uwe ojii atọ tupu ndị ọzọ enwee ike ijitu ya n’ala! Otú ọ dị, mgbe oge na-aga, o zutere Ndịàmà Jehova, wee mụta otú e si egosipụta njide onwe onye, bụ́ otu n’ime mkpụrụ nke mmụọ Chineke. (Ndị Galetia 5:22, 23) Taa, mgbe 30 afọ gasịworo, nwoke a ka na-ejere Jehova ozi n’ikwesị ntụkwasị obi.
Njide Onwe Onye n’Ime Ezinụlọ
15, 16. (a) Gịnị ga-enyere onye bụ di aka igosipụta njide onwe onye? (b) Njide onwe onye dị mkpa karịsịa n’ọnọdụ dị aṅaa, dị ka a pụrụ ịhụ site n’ahụmahụ dị aṅaa? (ch) N’ihi gịnị ka o ji dị onye bụ nwunye mkpa igosipụta njide onwe onye?
15 O doro anya na njide onwe onye dị mkpa n’ime ezinụlọ. Ka onye bụ di wee hụ nwunye ya n’anya dị ka ọ hụrụ onwe ya chọrọ ka o nwee ike nchịkwa dị ukwuu n’ebe echiche, okwu, na ihe omume ya nile dị. (Ndị Efesọs 5:28, 29) Ee, ọ chọrọ njide onwe onye ka ndị bụ di gbasoo okwu Pita onyeozi nke dị na 1 Pita 3:7: “Ndị bụ di, otú ahụ, soonụ nwunye unu bikọọ n’ụzọ ihe ọmụma.” Karịsịa, mgbe onye bụ nwunye bụ onye na-ekweghị ekwe, ọ dị onye bụ di nke kwere ekwe mkpa igosipụta njide onwe onye.
16 Iji mee ihe atụ: E nwere otu okenye ọgbakọ onye nwere nwunye nke bụ onye na-ekweghị ekwe nke na-ewe iwe ọkụ. Ma n’agbanyeghị nke ahụ, o gosipụtara njide onwe onye, nke a bakwaara ya uru nke ukwuu nke na onye dọkịta na-elekọta ya gwara ya, sị: “John, otú e si kee gị, ị ghaghị ịbụ onye nwere nnọọ ndidi, ma ọ bụghịkwanụ otú ahụ, ọ̀ bụrụ na okpukpe gị siri ike nke ukwuu.” Okpukpe anyị siri ike n’ezie, n’ihi na “Chineke enyeghị anyị mmụọ nke ụjọ; kama ọ bụ nke ike na ịhụnanya na ime ka uche zuo okè,” na-eme ka anyị nwee ike igosipụta njide onwe onye. (2 Timoti 1:7) Ọzọkwa, ọ na-ewe njide onwe onye n’akụkụ nke onye bụ nwunye ido onwe ya n’okpuru, karịsịa mgbe di ya na-abụghị onye kwere ekwe.—1 Pita 3:1-4.
17. N’ihi gịnị ka njide onwe onye ji dị mkpa ná mmekọrịta nke ndị mụrụ ụmụ na ụmụ ha?
17 Ọ dịkwa mkpa anyị inwe njide onwe onye ná mmekọrịta nke ndị mụrụ ụmụ na ụmụ ha. Iji nwee ụmụntakịrị ndị na-ejide onwe ha, ndị mụrụ ụmụ n’onwe ha aghaghị ibu ụzọ setịpụ ezi ihe nlereanya. Mgbe ọ dịkwara mkpa inye ụmụntakịrị ọzụzụ ma ọ bụ ahụhụ n’otu ụzọ ma ọ bụ n’ụzọ ọzọ, e kwesịrị ime nke a n’ịdị nwayọọ na n’ịhụnanya, bụ́ nke na-ewe ezi njide onwe onye. (Ndị Efesọs 6:4; Ndị Kọlọsi 3:21) Ọzọkwa, ka ụmụntakịrị wee gosipụta na ha hụrụ ndị mụrụ ha n’anya n’ezie chọrọ nrubeisi, o dokwara anya na nrubeisi chọrọ njide onwe onye.—Ndị Efesọs 6:1-3; tụlee 1 Jọn 5:3.
Iji Enyemaka nke Chineke Na-enye Na-eme Ihe
18-20. Ndokwa ime mmụọ atọ dị aṅaa ka anyị na-aghaghị iji mee ihe ka anyị wee zụlite àgwà ndị ga-enyere anyị aka igosipụta njide onwe onye?
18 Iji tolite n’ịtụ egwu Chineke, n’ịhụnanya nke na-adịghị achọ ọdịmma onwe onye, n’okwukwe, n’ịkpọ ihe ọjọọ asị, na ná njide onwe onye, ọ dị anyị mkpa iji enyemaka nile Jehova Chineke nyeworo mee ihe nke ọma. Ka anyị tụlee ndokwa ime mmụọ atọ ndị pụrụ inyere anyị aka igosipụta njide onwe onye. Nke mbụ, e nwere ihe ùgwù ahụ dị oké ọnụ ahịa nke ikpe ekpere. Ọ dịghị mgbe ọ bụla anyị ga-achọ ịbụ ndị ji ọrụ n’aka nke ukwuu nke na anyị enweghị ohere ikpe ekpere. Ee, anyị kwesịrị inwe ọchịchọ ‘ịdị na-ekpe ekpere n’esepụghị aka,’ ‘ịnọgidesi ike n’ikpe ekpere.’ (1 Ndị Tesalọnaịka 5:17; Ndị Rom 12:12) Ka anyị mee ka ịzụlite njide onwe onye bụrụ ihe anyị na-etinye n’ekpere. Ma mgbe anyị na-egosipụtachaghị njide onwe onye n’ụzọ kwesịrị ekwesị, ka anyị jiri obi nke nọ ná mwute rịọ Nna anyị nke eluigwe maka mgbaghara.
19 Akụkụ nke abụọ e si enweta enyemaka n’igosipụta njide onwe onye bụ inweta enyemaka ahụ nke na-abịa site n’ịzụ onwe anyị n’Okwu Chineke na n’akwụkwọ e ji amụ ihe bụ ndị na-enyere anyị aka ịghọta na itinye ihe dị n’Akwụkwọ nsọ n’ọrụ. Ọ dị nnọọ mfe ilefuru akụkụ nke a nke ije ozi anyị dị nsọ anya! Anyị aghaghị igosipụta njide onwe onye, nọgidekwa na-agwa onwe anyị na e nweghị ihe ọgụgụ dị mkpa karịa Bible na ndị ahụ “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche” bipụtara, n’ihi ya, anyị aghaghịkwa idebe ha n’ọkwá mbụ. (Matiu 24:45-47) E kwuwo n’ụzọ ziri ezi na o kweghị omume imezu ihe nile ná ndụ a na-adị kwa ụbọchị, ma anyị aghaghị ịhọrọ ihe anyị ga-eji oge anyị mee. Ànyị bụ ndị ikom na ndị inyom mmụọ nsọ na-achị n’ezie? Ọ bụrụ na anyị maara mkpa ime mmụọ anyị, anyị ga-egosipụta njide onwe onye nke dị mkpa iji gbanyụọ TV ma kwadebe maka nzukọ anyị ma ọ bụ gụọ Ụlọ Nche nke ọ pụrụ ịbụ na anyị ka natara ọhụrụ.
20 Nke atọ, e nwere okwu banyere ijezu nzukọ ọgbakọ anyị nile na nzukọ na mgbakọ ndị buru ibu karị. Nzukọ ndị ahụ nile hà bụ ihe anyị na-aghaghị ije? Ànyị na-abịa, na-adị njikere ikere òkè, meekwa otú ahụ ruo ókè anyị nwere ohere? Ruo n’ókè anyị na-ejezu nzukọ anyị nile, ọ bụ n’ókè ahụ ka a ga-ewusi mkpebi anyị ike igosipụta njide onwe onye n’okpuru ọnọdụ nile.
21. Gịnị bụ ụfọdụ n’ime nkwụghachi ụgwọ ndị anyị pụrụ inweta n’ihi ịzụlite mkpụrụ nke mmụọ ahụ bụ́ njide onwe onye?
21 Nkwụghachi ụgwọ dịgasị aṅaa ka anyị pụrụ ịtụ anya ya site n’ịgbalịsi ike igosipụta njide onwe onye n’oge nile? Otu ihe bụ na ọ dịghị mgbe ọ bụla anyị ga-enweta mkpụrụ dị ilu nke ịchọ ọdịmma onwe onye. Anyị ga-enwe ùgwù onwe onye na akọ na uche dị ọcha. Anyị ga-azọpụta onwe anyị site n’ọtụtụ nsogbu, nọgidekwa n’ụzọ ahụ nke na-eduje ná ndụ. Ọzọkwa, anyị ga-enwe ike ime ihe kachasị mma anyị pụrụ imere ndị ọzọ. Karịsịa ihe nile, anyị ga na-agbaso ihe ahụ e dere n’Ilu 27:11: “Mara ihe, nwa m, wee mee ka obi m ṅụrịa, ka m wee zaghachi onye na-ata m ụta okwu.” Nke ahụ bụkwa nkwụghachi ụgwọ kasị ukwuu anyị pụrụ inweta—ihe ùgwù nke ime ka obi nke Nna anyị nke eluigwe, onye na-ahụ n’anya, bụ́ Jehova, ṅụrịa!
Ị̀ Na-echeta?
◻ Olee ụzọ ịtụ egwu Chineke si enyere anyị aka igosipụta njide onwe onye?
◻ N’ihi gịnị ka ịhụnanya na-eji enyere anyị aka igosipụta njide onwe onye?
◻ Olee ụzọ njide onwe onye na-esi enye aka ná mmekọrịta dị n’ezinụlọ?
◻ Ndokwa dịgasị aṅaa ka anyị na-aghaghị iji mee ihe nke ọma ma ọ bụrụ na anyị ga-azụlite njide onwe onye?
[Foto dị na peeji nke 15]
Josef gosipụtara njide onwe onye mgbe a nwara ya
[Foto dị na peeji nke 17]
Inye ụmụntakịrị ọzụzụ ma ọ bụ ahụhụ n’ịdị nwayọọ na n’ịhụnanya chọrọ ezi njide onwe onye