Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w91 11/15 p. 27-28
  • Ọchịagha Ndị Rom ahụ Nwere Obi Ọma

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ọchịagha Ndị Rom ahụ Nwere Obi Ọma
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Nwee Obi Ike, Jehova Bụ Onye Na-enyere Gị Aka
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2020
  • Kpọsaa Alaeze Jehova N’atụghị Egwu!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • “O Nweghị Onye Ọ Bụla n’Ime Unu Ga-ala n’Iyi”
    ‘Ịgba Àmà nke Ọma Banyere Alaeze Chineke’
  • Obiọma Bụ Àgwà A Na-egosi Ma n’Okwu Ma n’Omume
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2018
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
w91 11/15 p. 27-28

Ọchịagha Ndị Rom ahụ Nwere Obi Ọma

NDỊ ọchịagha ndị Rom abụghị ndị e ji inwe obi ọma mara. N’ịbụ ndị e kenyere ọrụ iduzi ìgwè otu narị ndị agha ndị ibu agha meworo ka obi taa ha mmiri, onye ọchịagha aghaghị ịbụ onye nduzi nke na-achị ọchịchị aka ike, onye maara otú e si enye ọzụzụ na ahụhụ, nakwa mgbe ụfọdụ, ọbụna onye ògbú. Ma n’agbanyeghị nke ahụ, Bible na-agwa anyị banyere otu onye ọchịagha Rom nke na-eduzi otu ìgwè ndị agha nke Ọgustọs, onye gosiri ezi mmesapụ aka na ọmịiko n’ebe Pọl onyeozi nọ. Gịnị bụ aha ya? Juliọs.

Bible na-eme ka anyị mata nwoke nke a n’Ọrụ Ndị Ozi isi 27. Pọl onyeozi arịọwo ka Siza nụrụ ikpe ya na Rom. Otú a, e nyefere Pọl na ọtụtụ ndị mkpọrọ ndị ọzọ n’aka “ọchịagha . . . aha ya bụ Julịọs, nke òtù ndị agha Ọgustọs.” Ha si Sizaria kwọpụ ụgbọ, bụ́ obodo ọdụ ụgbọ mmiri dị n’ebe ugwu ọdịda anyanwụ nke Jerusalem, nke nọ dị ka ebe e nwere isi ụlọ ọrụ nke usuu ndị agha Rom. Onye ọkọ akụkọ ihe mere eme ahụ bụ Luk kwuru, sị: “Ụbọchị sonị ànyị wee ruo ala na Saịdọn: Juliọs wee were obi ọma mezie Pọl, kwere ka o jekwuru ndị enyi ya ka e wee lee ya anya nke ọma.”—Ọrụ 27:1-3.

E kwughị ihe kpaliri Juliọs igosi obi ọma dị otú ahụ n’ime Bible. Ọ pụrụ ịbụ na Onye Ọchịchị bụ Festọs nyere ya iwu ka o mesoo Pọl n’ụzọ pụrụ iche. Ma ọ bụ eleghị anya, ebe ọ mawooro ihe banyere ọnọdụ e ji n’ihi ya jide Pọl, ọ pụrụ ịbụ na Juliọs nwere mmasị banyere obi ike na nguzosi ike n’ezi ihe nke Pọl. Otú o sina dị, o yiri ka Juliọs ọ̀ matara na Pọl abụghị onye mkpọrọ efu.

N’agbanyeghị nke ahụ, Juliọs họọrọ ịjụ ige ntị n’ịdọ aka ná ntị Pọl megide ịkwọpụ ụgbọ site n’Ọnụ Mmiri Ọma. N’oge na-adịghị anya, ụgbọ mmiri ahụ dabara n’oké ifufe nke yiri egwu ịgbakpu ya n’ájá mmiri nke dị ná mpụga ọnụ ọnụ oké osimiri nke ebe ugwu Africa. (Ọrụ 27:8-17) N’etiti oké ifufe nke a, Pọl guzoro ọtọ wee mesie ndị nọ n’ụgbọ ahụ egwu na-atụ obi ike na “ọ dịghị ntụfu ndụ ga-adị n’etiti [ha], kama ọ bụ ntụfu nke ụgbọ.” Ma n’agbanyeghị nke ahụ, ụfọdụ n’ime ndị na-arụ ọrụ n’ụgbọ ahụ nwara ịgbapụ. Mgbe ahụ, Pọl gwara Juliọs, sị: “Ọ bụrụ na ndị a anọgideghị n’ụgbọ, a pụghị ịzọpụta unu onwe unu.”—Ọrụ 27:21, 22, 30, 31.

N’oge nke a, Juliọs họọrọ ige Pọl ntị, e wee mebie mgbalị ndị ahụ na-arụ ọrụ n’ụgbọ na-eme iji gbapụ. Kpọmkwem dị ka Pọl buru n’amụma, ụgbọ ahụ kpụrụ n’ala n’ebe ahụ mmiri na-adịchaghị omimi, o wee tikasịa. N’ịtụ egwu na ndị mkpọrọ ahụ ga-agbafusị, ndị agha nọ n’ụgbọ ahụ kpebiri igbuchapụ ha nile. Ma Juliọs tinyekwara ọnụ n’okwu ahụ ọzọ wee gbochie ndị agha ya ime nke ahụ, wee si otú a zọpụta ndụ Pọl.—Ọrụ 27:32, 41-44.

Bible agwaghị anyị ihe mesịrị mee onye ọchịagha nke a nwere obi ọma ma ọ bụ ma ò mesịrị nabata okwukwe ndị Kraịst. Obi ọma ọ bụla nke o gosiri bụ ngosipụta nke ụzọ akọ na uche Chineke nyere mmadụ na-esi arụ ọrụ. (Ndị Rom 2:14, 15) Otú ọ dị, ndị Kraịst na-eme ihe karịrị obi ọma nkịtị nke mmadụ, wee na-egosipụta obi ọma nke Chineke nke na-apụta site n’inwe mmụọ nke Chineke. (Ndị Galetia 5:22) N’eziokwu, ọ bụrụ na onye agha nke na-ekpere arụsị, onye na-amaghị Chineke pụrụ igosi obi ọma, lee ka o si dị mkpa na e kwesịrị ịkpali ndị Chineke ime otú ahụ!

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya