Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w91 12/1 p. 2-5
  • Okpukpe Ọ̀ Dị Mkpa n’Ezie?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Okpukpe Ọ̀ Dị Mkpa n’Ezie?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ntolite nke Ụkpụrụ Ịgbakụta Okpukpe Azụ
  • Ndaghachi Azụ nke Ụkpụrụ Ịgbakụta Okpukpe Azụ
  • Ịmaliteghachi Inwe Mmasị n’Okpukpe
  • Okpukpe Ọ Bụla Ọ̀ Dị Nnọọ Mma?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Okpukpe È Nwere Uru Ọ Na-aba?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
  • Inwere Onwe Onye Pụọ n’Okpukpe Ụgha
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Ikpe Okpukpe Dị Ọcha Maka Nlanarị
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
w91 12/1 p. 2-5

Okpukpe Ọ̀ Dị Mkpa n’Ezie?

OKPUKPE ọ̀ dị mkpa nye gị? Ma eleghị anya, ị̀ nọ n’otu òtù okpukpe ma ọ bụ chọọchị? Ya bụrụ otú ahụ, ọ dị ọtụtụ ihe gị na ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’ụmụ mmadụ ndị biri laa azụ na 1884 nwekọrọ, bụ́ afọ mgbe onye Germany bụ ọkà ihe ọmụma, bụ́ Karl Marx, dere, sị: “Okpukpe . . . bụ ọgwụ mmegharị anya a na-enye ụmụ mmadụ.” N’oge ndị ahụ, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ mmadụ nile na-eje chọọchị, okpukpe nwekwara mmetụta siri ike n’akụkụ nile nke òtù ụmụ mmadụ. Taa, nke ahụ agbanwewo n’ụzọ dị ukwuu, okpukpe na-enwekwa mmetụta dị nta ma ọ bụrụ na ọ dị nke o nwere enwe ná ndụ nke ọtụtụ narị nde ụmụ mmadụ. Ọ bụrụ na ị na-eje chọọchị, ma eleghị anya ọnụ ọgụgụ ndị na-eme otú ahụ n’ógbè unu ebughị ibu.

Gịnị kpatara mgbanwe ahụ? Otu ihe bụ na Karl Marx wulitere nkà ihe ọmụma nke megidere okpukpe nke nwere mmetụta dị ukwuu n’ahụ ụmụ mmadụ. Ihe àmà gosiri na Marx lere okpukpe anya dị ka ihe mgbochi dịịrị ọganihu ụmụ mmadụ. O kwuru na ụzọ kasị mma a pụrụ isi gboo mkpa ihe a kpọrọ mmadụ bụ ịhụ ihe onwunwe n’anya, bụ́ nkà ihe ọmụma nke na-enyeghị ohere ọ bụla maka Chineke ma ọ bụ okpukpe ọdịnala. Nke a dujere ya n’ikwu, sị: “Ihe mbụ dị mkpa maka obi ụtọ ụmụ mmadụ bụ ikpochapụ okpukpe.”

Onye Germany ahụ na-akwado usoro ọchịchị socialist, bụ́ Friedrich Engels na onye Russia bụ onye ndú ndị Kọmunist, bụ́ Vladimir Lenin mere ka nkà ihe ọmụma nke Marx banyere ịhụ ihe onwunwe n’anya gakwuo n’ihu. E mesịrị mara ya dị ka ozizi Marx na Lenin. Ruokwa mgbe na-adịbeghị anya gara aga, ihe karịrị otu ụzọ n’ụzọ atọ nke ihe a kpọrọ mmadụ bi n’okpuru ọchịchị dị iche iche ndị na-agbaso ruo n’ókè ụfọdụ nkà ihe ọmụma nke a nke na-ekwenyeghị na Chineke. Ọtụtụ ndị ikom na ndị inyom ka na-agbasokwa ya.

Ntolite nke Ụkpụrụ Ịgbakụta Okpukpe Azụ

Ma ọ bụghị nanị mgbasa nke nkà ihe ọmụma ndị Kọmunist mere ka ojiji okpukpe ji ihe a kpọrọ mmadụ aka daa mbà. Ọganihu ndị e nwere na nkà ihe ọmụma sayensị kerekwara òkè. Dị ka ihe atụ, mgbasa ozizi evolushọn gbasazuru ebe nile dujere ọtụtụ ndị n’ịmalite ịrụ ụka banyere ịdị adị nke Onye Okike. E nwekwara ihe ndị ọzọ.

Akwụkwọ Encyclopædia Britannica hotara “nchọpụta nke nkọwa nkà mmụta sayensị maka ihe omume ndị e cheburu na ọ bụ ike ndị karịrị mmadụ kpatara ha” na “mwepụ nke mmetụta okpukpe a haziri ahazi na-enwe n’ihe omume ndị dị ka nkà mmụta ọgwụ na ahụ ike, mmụta akwụkwọ, na ime nkà.” Ihe omume ndị yiri ndị a edujewo ná ntolite nke ụkpụrụ ịgbakụta okpukpe azụ. Gịnị bụ ụkpụrụ ịgbakụta okpukpe azụ? A kọwara ya dị ka “echiche banyere ndụ . . . nke dabeere ná nghọta nke bụ na e kwesịrị ilefuru okpukpe na echiche okpuke dum anya, ma ọ bụ lezie anya gụpụ ha ná ntụle ndị a na-eme.” Ụkpụrụ ịgbakụta okpukpe azụ nwere mmetụta dị ukwuu n’ala ndị Kọmunist na nke na-abụghị nke ndị Kọmunist.

Ma ụkpụrụ ịgbakụta okpukpe azụ na ozizi Marx na Lenin abụghị nanị ha kpatara ịda mbà nke mmetụta okpukpe na-enwe. Chọọchị nile nke Krisendọm aghaghị iketa òkè n’ụta ahụ. N’ihi gịnị? N’ihi na ruo ọtụtụ narị afọ ha ejiwo ike ha na-eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi. Ha akụziwokwa ozizi ndị dabeere n’omenala ndị akwụkwọ nsọ na-akwadoghị na nkà ihe ọmụma mmadụ kama ịbụ ndị dabeere na Bible. N’ihi ya, ọtụtụ ndị n’etiti ìgwè atụrụ ha abụwo ndị dara mbà nke ukwuu n’ime mmụọ nke na ha apụghị iguzogide mwakwasị nke ụkpụrụ ịgbakụta okpukpe azụ.

Ọzọkwa, chọọchị dị iche iche n’onwe ha, n’ụzọ ka ukwuu, mesịrị nakwere ụkpụrụ ịgbakụta okpukpe azụ. N’ime narị afọ nke 19, ndị ọkà mmụta okpukpe nọ na Krisendọm wulitere otu ụdị nke ime oké nkatọ nke bibiri echiche ọtụtụ ndị nwere banyere ịbụ eziokwu nke Bible dị ka Okwu Chineke nke sitere n’ike mmụọ ya. Chọọchị dị iche iche, gụnyere Chọọchị Roman Katọlik, nakweere ozizi evolushọn. Ee, ha ka na-ekwu na ha kwenyere n’okike. Ma ha nabatara echiche ahụ nke bụ na ọ pụrụ ịbụ na anụ ahụ mmadụ si n’ihe ọzọ pụta, ebe Chineke kere nanị mkpụrụ obi. N’ime afọ ndị 1960, okpukpe Protestant wulitere nkà mmụta okpukpe nke kpọsara “ọnwụ nke Chineke.” Ọtụtụ ndị ndú okpukpe Protestant gbachiri nkịtị ka ụzọ ndụ nke ịhụ ihe onwunwe n’anya nọgide. Ha nakweere inwe mmekọahụ tupu a lụọ di ma ọ bụ nwunye na ọbụna idina ụdị onwe. Ụfọdụ ndị ọkà mmụta okpukpe Katọlik wulitere nkà mmụta okpukpe nke ntọhapụ, na-agwakọta okpukpe Katọlik na ozizi mgbanwe ọchịchị nke Marx.

Ndaghachi Azụ nke Ụkpụrụ Ịgbakụta Okpukpe Azụ

Otù a, ụkpụrụ ịgbakụta okpukpe azụ malitere inwe mmetụta ka ike, karịsịa n’ime afọ ndị 1960, ruokwa ihe dị ka etiti afọ ndị 1970. Mgbe ahụ, ihe gbanwekwara ọzọ. O yiri ka okpukpe ọ̀ lọghachitere ma, ọ bụ ezie na n’ụzọ ka ukwuu, ọ bụghị chọọchị ndị ahụ bụ isi. Gburugburu ụwa dum, e nwere ntiwapụ nke ọtụtụ òtù okpukpe ndị ọhụrụ n’ime akụkụ ikpeazụ nke afọ ndị 1970 na afọ ndị 1980.

N’ihi gịnị ka okpukpe ji biliteghachi? Onye France bụ ọkà mmụta ihe banyere mmekọrịta ọha mmadụ bụ Gilles Kepel kwuru na “ndị nkịtị gụrụ akwụkwọ . . . nọgidere na-ekwu na ịgbaso omenala ụwa enwebeghị ebe o dujere ha, nakwa site n’ikwu na ha enwerewo onwe ha pụọ n’aka Chineke, ụmụ mmadụ na-aghọta mkpụrụ ha kụrụ n’ihi mpako na nganga ha, bụ́ nnupụisi, ịgba alụkwaghịm, ọrịa AIDS, iji ọgwụ ọjọọ eme ihe, [na] ogbugbu onwe onye.”

Ndaghachi azụ nke ụkpụrụ ịgbakụta okpukpe azụ agasiwo ike karị kemgbe ihe na-eme n’oge na-adịbeghị anya, bụ́ nke yiri ndakpọ nke ozizi Marx na Lenin. Nye ọtụtụ ndị, nkà ihe ọmụma nke a nke na-ekwenyeghị na Chineke aghọwo okpukpe n’ezie. Ya mere, cheedị echiche banyere mgbagwoju anya nke ndị ahụ tụkwasịrị ya obi! Otu ozi akwụkwọ akụkọ Washington Post natara site na Moscow hotara okwu otu onye bụbu onye isi nke ụlọ akwụkwọ Communist Party Higher School kwuru, onye sịrị: “Mba na-adị ndụ ọ bụghị nanị n’ọnọdụ akụ na ụba na ụlọ ọrụ ya dị iche iche, kamakwa n’akụkọ mgbe ochie banyere ya na banyere ndị guzobere ya. Ọ bụ ihe na-awụ ibubo n’ahụ òtù ụmụ mmadụ ọ bụla ịchọpụta na akụkọ mgbe ochie ndị kasị ukwuu o nwere adabereghị n’eziokwu, kama na ha dabeere ná mgbasa akụkọ efu na nchepụta echiche na-enweghị isi. Ma nke ahụ bụ ihe anyị na-ahụ ugbu a n’ihe banyere Lenin na mgbanwe ọchịchị ahụ.”

N’ikwu okwu banyere ma akụkụ ụwa ndị na-agbaso ụkpụrụ ọchịchị ndị Kọmunist ma ndị na-agbaso ụkpụrụ ọchịchị ndị aka ji akụ, onye France ahụ bụ ọkà mmụta ihe banyere mmekọrịta ọha mmadụ na onye ọkà ihe ọmụma, bụ́ Edgar Morin nakweere, sị: “Anyị ahụwo, ọ bụghị nanị ndakpọ nke ọdịnihu ahụ mara mma nke e chere ndị nkịtị n’ihu, kama anyị ahụwokwa ndakpọ nke ọganihu ahụ na-abịara òtù ndị nkịtị n’enweghị onye mere ihe ọ bụla iji weta ya, bụ́ ebe a tụrụ anya na nkà mmụta sayensị, usoro ichezi echiche, na ọchịchị onye kwuo uche ya gaara na-agara onwe ha n’ihu. . . . O nweghị ọganihu ọ bụla e ji n’aka ugbu a. Ọdịnihu nke anyị tụburu anya ya adakpọwo.” Otú ahụ ka ọ dị, bụ́ mmetụta ịtọgbọrọ n’efu nke ọtụtụ ndị tinyere okwukwe ha ná mgbalị ụmụ mmadụ na-eme iguzobe ụwa ka mma n’adabereghị na Chineke.

Ịmaliteghachi Inwe Mmasị n’Okpukpe

Mmetụta nkụda aka nke a zuru ụwa ọnụ na-eme ka ọtụtụ ndị nwere obi eziokwu mata mkpa nke inwe akụkụ ime mmụọ ná ndụ ha. Ha na-ahụ mkpa nke okpukpe dị. Ma ha adịghị enweta afọ ojuju site na chọọchị ndị bụ isi, ụfọdụ ndị nwekwara ihe ịrụ ụka banyere okpukpe ndị ọhụrụ ahụ—gụnyere òtù ọgwụgwọ ọrịa dị iche iche, òtù ụka mmụọ nsọ dị iche iche, òtù dị iche iche nke ihe ọmụma dị omimi, na ọbụna òtù dị iche iche nke ndị na-efe Setan. Ịnụbigara okpukpe ọkụ n’obi ókè na-ebilitekwa. Ya mere, ee, okpukpe na-alọghachite n’ụzọ ụfọdụ. Ma nlọghachite dị otú ahụ a na-alọghachite n’ebe okpukpe dị ọ̀ bụ ihe ọma nye ihe a kpọrọ mmadụ? N’ezie, ọ̀ dị okpukpe ọ bụla nke na-egbo mkpa ime mmụọ nke ihe a kpọrọ mmadụ n’ezie?

[Foto dị na peeji nke 3]

“Okpukpe bụ nkasi obi nke onye a na-emegbu emegbu, mmetụta echiche nke ụwa obi tara mmiri, mkpụrụ obi nke ọnọdụ na-enweghị mkpụrụ obi. Ọ bụ ọgwụ mmegharị anya a na-enye ụmụ mmadụ”

[Ebe e si Nweta Foto]

Foto: New York Times, Berlin—33225115

[Foto dị na peeji nke 4]

Vladimir Lenin (elu) na Karl Marx hụrụ okpukpe dị ka ihe na-egbochi ọganihu mmadụ

[Ebe e si Nweta Foto]

Musée d’Histoire Contemperaine—BDIC (Universitiés de Paris)

[Foto dị na peeji nke 5]

Echiche dị n’ozizi Marx na Lenin etinyewo olileanya dị elu n’obi ọtụtụ nde mmadụ

[Ebe e si Nweta Foto]

Musée d’Histoire Contemperaine—BDIC (Universitiés de Paris)

[Ebe e si Nweta Foto dị na peeji nke 2]

Fọto dị n’ihu akwụkwọ: Garo Nalbandian

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya