Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w91 12/1 p. 24-27
  • Ịrapagidesi Ike ná Nzukọ Chineke

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ịrapagidesi Ike ná Nzukọ Chineke
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Oge Ule
  • Ịhazigharị Ihe Iji Rụọ Ọrụ Ọsụ Ụzọ
  • Ịrụ Ọrụ Ọsụ Ụzọ n’Ebe Ndịda
  • Ije Ozi Betel
  • Ịgbanwe Ọrụ
  • Ndụ Jupụtara n’Ezi Ihe n’Ozi Jehova
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
  • “Anyị Emewo Ihe Anyị Ji Ụgwọ Ime”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Jehova Gọziri Mkpebi M Mere nke Ukwuu
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2018
  • Onye Jehova Ziri Ihe Site na Nwata
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
w91 12/1 p. 24-27

Ịrapagidesi Ike ná Nzukọ Chineke

DỊ KA ROY A. RYAN SI KỌỌ

Sandhill, Missouri, bụ nnọọ aha kwesịịrị ebe ahụ, ebe ọ bụ na e nwechaghị ọdịiche dị n’etiti ya na mkpumkpu ájá uzuzu buru ibu nke dị n’akụkụ ime obodo ebe e nwere ọtụtụ ugwu nta. Obodo nta nke a nke dị n’agbata ụzọ abụọ dị kilomita ise n’ebe ọdịda anyanwụ nke obodo Rutledge, o nwekwara nanị ụlọ asatọ ma ọ bụ itoolu, otu chọọchị Methodist, na otu ụlọ ọrụ onye na-akpụ ụzụ. Ọ bụ n’ebe ahụ ka a mụrụ m n’October 25, 1900.

NNA M bụ onye na-akpụ ụzụ n’obodo ahụ. Ọ bụ ezie na ndị mụrụ m adịghị ejechi chọọchị anya, Nne m malitere iduje m ụlọ akwụkwọ Sunday school nke dị na Chọọchị Methodist ahụ. Aha ahụ bụ Methodist amasịghị m, ebe m na-eche na e kwesịrị ịkpọ mmadụ onye Kraịst; ma n’agbanyeghị nke ahụ, ewulitere m akpịrị ịkpọ nkụ maka eziokwu nke Bible na mmasị n’ịdị ndụ ebighị ebi.

Mgbe m dị afọ 16, ejere m wee malite ọrụ n’ụlọ ọrụ ụgbọ okporo ígwè dị na Santa Fe. Otu n’ime Ndị Mmụta Bible nke Mba Nile (dị ka a na-akpọ Ndịàmà Jehova n’oge ahụ) onye aha ya bụ Jim bịara ịrụ ọrụ n’òtù ndị ọrụ ụgbọ okporo ígwè nke anyị, mụ na ya rụkọkwara ọrụ ọtụtụ mgbe. Jim kwuru okwu, egekwara m ntị ihe ọ na-ekwu banyere Bible. Ọ tọrọ m ụtọ ná ntị, m wee rịọ ma ọ̀ pụrụ ịgbazinye m otu n’ime akwụkwọ ya.

Jim gbazinyere m mpịakọta nke mbụ nke usoro akwụkwọ Studies in the Scriptures, nke C. T. Russell onye so n’òtù Ndị Mmụta Bible nke Mba Nile bipụtara. Mgbe m weghachiri ya, agwara m ya ka o wetara m mpịakọta ndị ọzọ. Nwa mgbe nta mgbe nke ahụ gasịrị, Jim hapụrụ ụlọ ọrụ ụgbọ okporo ígwè ahụ, mgbe ọzọ m hụkwara ya, ọ nọ n’okporo ụzọ dị na Rutledge, na-edetu aha ndị chọrọ ka e wetara ha akwụkwọ ahụ e sere ihe osise, bụ́ Scenario of the Photo-Drama of Creation. Mgbe e mesịrị, ọ kpọrọ m òkù ịbịa nzukọ ìgwè ahụ na-enwe n’ụlọ ya. N’ụbọchị Sunday ọ bụla, ejiri m ụkwụ gaa kilomita ise ahụ ọ na-ewe iji ruo Rutledge maka nzukọ ahụ.

Mgbe e wepụtara magazin Golden Age (nke a na-akpọ Teta! ugbu a) na 1919, achọrọ m ịmalite ije ozi ubi. Mụ na otu Onye Mmụta Bible ọhụrụ ọzọ kpebisiri ike ikesa magazin ọhụrụ nke a site n’ụlọ ruo n’ụlọ. O metụrụ anyị ihere ije n’ụlọ ndị mmadụ n’obodo nke aka anyị, ya mere, anyị banyere n’ụgbọ okporo ígwè wee jee n’otu obodo dị nso. Mgbe anyị rutere ebe ahụ n’ụtụtụ, anyị chere ihu n’akụkụ dị iche iche, na-akụkwa aka n’ọnụ ụzọ ndị mmadụ ruo ehihie, ọ bụ ezie na e nyeghị anyị ọzụzụ ọ bụla n’ọrụ nke a. Anatara m aha mmadụ abụọ chọrọ ka a na-ezitere ha ụtụ magazin, otu n’ime ha bụ otu nwoke mụ na ya na-arụkọ ọrụ n’ụlọ ọrụ ụgbọ okporo ígwè ahụ.

N’October 10, 1920, e mere m baptism n’otu ọdọ mmiri nta dị nso Rutledge. Ndị mụrụ m megidere nsonye m na-esonyere Ndị Mmụta Bible nke Mba Nile ahụ. Nke a bụ n’ihi mmegide ahụ ndị ndú okpukpe kpaliri, bụ́ nke Ndị Mmụta Bible ahụ nwetara n’afọ ndị ahụ a na-alụ agha bụ 1914 ruo 1918. Otú ọ dị, mgbe e mesịrị, nna m malitere ịbịa ụfọdụ n’ime nzukọ Ndị Mmụta Bible ahụ na-enwe, ọ gụkwara magazin The Golden Age ahụ. Tupu ọ nwụọ, nne m malitere inwe mmasị karị ná nghọta anyị nke eziokwu Bible. Ma ọ dịghị onye ọ bụla n’ezinụlọ m nke mere ka eziokwu a bụrụ nke aka ya.

Oge Ule

N’oge ndị mbụ ahụ, e nwere nanị mmadụ atọ e wezụga mụ onwe m, ndị na-abịazu nzukọ ọmụmụ Bible nile a na-enwe na Rutledge. Mmadụ atọ ndị a mesịrị hapụ nzukọ a. Otu n’ime ha bụ ezi onye ọkà okwu, onye na-ekwu okwu ihu ọha ndị dabeere na Bible n’ógbè ahụ. Otú ọ dị, ọ malitere inwe mpako n’ihi ikike ndị o nwere, wee chee na ọ bụ iweda ùgwù ya ala ikere òkè n’ọrụ nkwusa site n’ụlọ ruo n’ụlọ dị ka ndị Kraịst oge gboo mere.—Ọrụ 5:42; 20:20.

Mgbe mmadụ atọ ndị a kwụsịrị iso Ndị Mmụta Bible nke Mba Nile na-akpakọrịta, echetara m inwe mmetụta yiri nke Pita onyeozi n’oge Jisọs gwara ìgwè mmadụ ahụ okwu banyere ‘iri anụ ahụ Jisọs na ịṅụ ọbara ya.’ N’ịbụ ndị ozizi ya mere ka ha sụọ ngọngọ, ọtụtụ ndị hapụrụ ya n’oge ahụ. Mgbe nke ahụ mere, Jisọs jụrụ ndị ozi ahụ, sị: “Unu onwe unu [ùnu] na-achọkwa ịla?” Pita zaghachiri, sị: “Onyenwe anyị, Ònye ka anyị ga-ejekwuru? I nwere okwu nke ndụ ebighị ebi.”—Jọn 6:67, 68.

Ọ bụ ezie na Pita aghọtachaghị ihe okwu Jisọs pụtara, bụ́ ‘iri anụ ahụ Jisọs na ịṅụ ọbara ya,’ ọ matara na Jisọs nwere okwu nke ndụ. Ọ bụ ụdị mmetụta ahụ ka m nwere banyere nzukọ a. Eziokwu ahụ dị na ya ọbụna ma a sị na adịghị m aghọtacha mgbe nile ihe nile m na-agụta n’akwụkwọ dị iche iche. N’agbanyeghị nke ahụ, mgbe ọ bụla e kwuru ihe m na-aghọtaghị, ọ dịghị mgbe m na-arụ ụka megide ya. Mgbe e mesịrị, a na-eme ka okwu ahụ doo anya, ma ọ bụ mgbe ụfọdụ a na-agbanwe echiche ndị e nwere. Ana m enwe obi ụtọ mgbe nile na ejiwo m ndidi chere ka nkọwa ahụ bịa.—Ilu 4:18.

Ịhazigharị Ihe Iji Rụọ Ọrụ Ọsụ Ụzọ

Na July 1924, ejere m mgbakọ mba nile e nwere na Columbus, Ohio. Magazin The Golden Age kọwara ya dị ka “mgbakọ kasị ukwuu nke Ndị Mmụta Bible nweworo n’ọgbọ nile.” N’ebe ahụ, a nabatara nkwupụta okwu ahụ na-akpali akpali, bụ́ “Indictment” (Nkwupụta Ikpe Ọmụma). Ihe ọmụma a natara na mmụọ e gosipụtara ná mgbakọ ahụ gbara m ume ịghọ onye na-eje ozi oge nile, ma ọ bụ onye ọsụ ụzọ.

Mgbe m si mgbakọ ahụ lọghachi, ahapụrụ m ọrụ m n’ụlọ ọrụ ụgbọ okporo ígwè ahụ, mụ na otu Onye Mmụta Bible ọzọ malitekwara ijekọ ozi dị ka ndị ọsụ ụzọ. Otú ọ dị, mgbe ihe dị ka otu afọ gasịrị, ọnọdụ ahụ ike ndị mụrụ m dịwanyere njọ ruo n’ókè nke na ha chọrọ enyemaka m. Akwụsịrị m ọrụ ọsụ ụzọ wee nweta ọrụ n’ụlọ ọrụ ndị na-eli paịpụ mmiri n’ala, ma ebe ọ bụ na ndị na-arụ ọrụ n’ebe ahụ adịghị enwe mmetụta dị mma n’ahụ m, ahapụrụ m ọrụ ahụ wee banye n’ọrụ nke ịkpa aṅụ ma na-ere mmanụ aṅụ ya.

Ka ọ na-eru oge mgbụsị akwụkwọ osisi nke 1933, ma nne m ma nna m anwụworị, na-ahapụ m n’enweghị ibu ọrụ ọ bụla. Ya mere, n’oge opupu ihe ubi nke 1934, enyefere m onye ọzọ ọrụ ilekọta aṅụ ahụ, wuo otu ụlọ nta ụgbọ ala na-adọkpụgharị nke m ga-ebi n’ime ya, wee maliteghachi ije ozi oge nile dị ka onye ọsụ ụzọ. Na mbụ, mụ na otu Onyeàmà meworo okenye rụrụ ọrụ n’ógbè Quincy, Illinois. Emesịrị m jeghachi Missouri, bụ́ ebe m sonyeere otu ìgwè ndị ọsụ ụzọ.

Na 1935, e nwere oké ụkọ mmiri ozuzo n’Etiti Ebe Ọdịda Anyanwụ America, ebe ọ bụkwa na anyị na-arụ ọrụ n’ógbè nanị ihe ha na-arụ bụ ọrụ ubi, ihe siiri anyị ike. Ọ dịghị onye nwere ego, ya mere, ndị nwere obi ekele na-enyekarị anyị ihe oriri ma ọ bụ ihe ndị ọzọ mgbe anyị nyere ha akwụkwọ.

Ịrụ Ọrụ Ọsụ Ụzọ n’Ebe Ndịda

N’oge oyi nke afọ ahụ, anyị kwagara n’ebe ndịda, n’Arkansas, iji gbanarị oyi ọtụtụ dị n’ebe ahụ. O kwere anyị omume ikesa akwụkwọ dị ukwuu n’ógbè ahụ, natakwa ihe oriri dị ukwuu ndị a gbara n’iko. Ọtụtụ mgbe, anyị na-anara ihe ndị ọzọ ndị anyị pụrụ ire iji nweta ego, gụnyere ihe ochie ndị e ji aluminium mee, ígwè brass ma ọ bụ copper ochie, radiator na batrị moto ochie. Nke a nyere anyị ego anyị ga-eji gbanye mmanụ ụgbọ ala n’ụgbọ ala Model A Ford m, bụ́ nke anyị ji na-eje ozi.

Anyị jere ozi n’ógbè Newton, Searcy, na Carroll, ndị dị n’ógbè ahụ ọtụtụ oké ugwu dị na ya, nke Ozark Plateau. Ahụmahụ ndị anyị nwere mgbe anyị na-ekwusa ozi ọma n’etiti ndị bi n’ebe ugwu nke Arkansas ga-ejupụta akwụkwọ ma e dee ha ede. Ebe ọ bụ na ụzọ ndị e nwere n’oge ahụ dị ochie ma ọ bụkwanụ ghara ịdị adị, anyị ji ụkwụ gaa ije n’akụkụ dị ukwuu nke ọrụ anyị. Ụfọdụ ndị ọsụ ụzọ so n’ìgwè anyị ahụ ji ịnyịnya mee ihe ijekwuru ndị bi n’akụkụ ndị ka elu nke oké ugwu ndị ahụ.

N’otu mgbe, anyị nụrụ banyere otu nwoke nwere mmasị aha ya bụ Sam, onye anyị mesịrị hụ na o bi n’elu elu otu ugwu. Ọ nabatara anyị nke ọma, nweekwa obi ụtọ ime ka anyị nọrọ n’ụlọ ya ruo echi. Ọ bụ ezie na nwunye Sam enweghị mmasị n’ozi anyị, nwa ya nwoke dị afọ 16, bụ́ Rex, nwere mmasị. Mgbe anyị hapụrụ ya, Sam gwara anyị ka anyị bịaghachikwa ọzọ. Ya mere mgbe izu abụọ gasịrị, anyị na ha nọkọkwara ọzọ.

Mgbe anyị na-ahapụ nke ugbo abụọ ahụ, ọ bụ nwunye Sam kpọrọ anyị òkù ka anyị bịakwa ọzọ. O kwuru na anyị nwere mmetụta dị mma n’ahụ Rex. “Ọ bụ ajọ nwa, ọ na-ekwukwa okwu rere ure,” ka ọ kọwara, “echeghịkwa m na o kwuwo okwu rere ure dị ka ọ na-ekwubu kemgbe unu bịasịrị ebe a.” Mgbe ọtụtụ afọ gasịrị, ezutere m Rex ọzọ mgbe ọ bịara ụlọ akwụkwọ ndị ozi ala ọzọ nke Gilead na South Lansing, New York. Ahụmahụ ndị yiri nke a ewetaworo m oké afọ ojuju n’ime ọtụtụ afọ ndị gafeworonụ.

Ije Ozi Betel

Mgbe m tinyere akwụkwọ maka ịbụ onye ọsụ ụzọ, etinyekwara m akwụkwọ maka ije ozi n’isi ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị na New York, bụ́ nke a na-akpọ Betel. N’oge opupu ihe ubi nke 1935, a gwara m na a nakwerewo akwụkwọ ahụ m tinyere, na m ga-abịakwa n’ụlọ ọrụ Kingdom Farm nke Watchtower Society, nke dị na South Lansing, New York, ịmalite ije ozi Betel m. Ozugbo ahụ, emere m ndokwa ka otu Onyeàmà ibe m weghara ụlọ ahụ ugbọ ala na-adọkpụgharị nke m nọ na ya na-arụ ọru ọsụ ụzọ.

Akwọọrọ m ụgbọ ala Model A Ford m jee New York, ihe dịkwa ka mgbe o jiri ọkara gafee elekere iri n’ụtụtụ nke May 3, 1935, erutere m ebe ahụ. N’ihe dị ka elekere mbụ nke ehihie ahụ, e nyere m ọrụ nke ịwa nkụ. N’echi ya, a gwara m ka m jee n’ụlọ ebe a na-edebe ehi maka inye aka n’ịpịpụta mmiri ara ehi. Arụrụ m ọrụ n’ebe ahụ a na-emepụta mmiri ara ehi ruo ọtụtụ afọ, mgbe ụfọdụ na-apịpụta mmiri ara ehi n’ụtụtụ na n’uhuruchi ma soro ìgwè ndị na-arụ ọrụ n’ubi na n’ebe a kụrụ ihe ọkụkụ na-arụ ọrụ n’oge ehihie. Ana m elekọtakwa aṅụ, na-ewetakwa mmanụ aṅụ ezinụlọ Betel ji eme ihe. Na 1953, e wefere m ná ngalaba na-emepụta cheese.

Otu n’ime ndị nwere mmetụta dị ukwuu ná ndụ m n’ihi ezi ihe nlereanya ya nke inwe obi umeala, iguzosi ike n’ihe, na nrubeisi nye Jehova bụ Walter John “Pappy” Thorn. Ọ bụ otu n’ime 21 Ndị Mmụta Bible a họpụtara na 1894 ịbụ ndị pilgrim mbụ—ndị ikom ndị rụrụ ọrụ yiri nke ndị nlekọta sekit na-arụ taa—ndị na-eleta ọgbakọ dị iche iche ịgba ha ume. Mgbe ọtụtụ afọ nke ọrụ njegharị ahụ gasịrị, Nwanna Thorn bịara na Kingdom Farm wee rụọ ọrụ n’ụlọ ebe a na-elekọta ọkụkọ. Ọtụtụ ugbo, a nụrụ m ka ọ na-ekwu, sị: “Mgbe ọ bụla m malitere ichebiga echiche ókè banyere onwe m, ana m akpọrọ onwe m gaa n’otu akụkụ, dị ka a pụrụ ikwu ya, wee sị: ‘Leenụ gị, nwa ahụhụ nta. Gịnị ka i nwere ị ga-eji na-anya isi?’”

Otu nwoke ọzọ nke dị umeala n’obi nke ghọọrọ m ezi ihe nlereanya bụ John Booth, onye so n’Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova ugbu a. E hotawo okwu ya ọtụtụ ugbo n’afọ ndị gara aga dị ka onye na-asị: “Ọ bụghị ebe ị nọ na-eje ozi, kama ọ bụ onye ị na-ejere ozi bụ ihe dị mkpa n’ezie.” Nke a bụ okwu dị mfe, ma lee nnọọ ka o si bụrụ eziokwu! Ijere Jehova ozi bụ ihe ùgwù kachasị ihe ùgwù nile!

Otu n’ime isi ihe ndị dị n’ije ozi Betel m bụ mmeghe e meghere ụlọ akwụkwọ ndị ozi ala ọzọ nke Gilead na Kingdom Farm na 1943. Iso ndị ọsụ ụzọ si akụkụ ụwa dum na-akpakọrịta bụ n’ezie ihe na-akpali akpali. N’oge ndị ahụ, a na-enwe ihe dị ka otu narị ụmụ akwụkwọ na klasị nke ọ bụla, ya mere n’ọnwa isii ọ bụla, otu narị ndị ọhụrụ na-abịa na Kingdom Farm. Ọtụtụ puku mmadụ na-abịa ememe ngụsị akwụkwọ ndị a na-enwe n’ebe ọmụmụ akwụkwọ nke a nke dị n’ime ime obodo ebe a na-akọ ugbo n’ebe ugwu nke steti New York.

Ịgbanwe Ọrụ

Mgbe e bufere ụlọ akwụkwọ Gilead na Brooklyn wee ree ụlọ nke bụ isi e ji mere ebe obibi na ụlọ klasị na South Lansing, e bufere ụlọ ọrụ mmepụta mmiri ara ehi ahụ na Watchtower Farms nke dị na Wallkill, New York. Ya mere, n’oge mgbụsị akwụkwọ osisi nke 1969, a gwara m ka m gafee n’ugbo ahụ nke dị na Wallkill wee nọgide na-emepụta cheese ruo 1983. Mgbe ahụ a gbanweere m ọrụ, m wee malite ịrụ ọrụ n’idozi mbara ala.

N’otu mgbe a na-agba m ajụjụ ọnụ n’oge gara aga, a jụrụ m ihe m chere banyere ịgbanwere m ọrụ mgbe m nọsịworo 30 afọ n’imepụta cheese. “O nyeghị m nsogbu,” ka m kwuru n’eziokwu, “n’ihi na ọ dịghị mgbe o masịrị m ime cheese.” Isi ihe dị na ya bụ na anyị pụrụ inwe obi ụtọ n’ijere Jehova ozi n’ọrụ ọ bụla e kenyere anyị ma ọ bụrụ na anyị enwee echiche ziri ezi, jirikwa obi dị umeala doo onwe anyị n’okpuru nduzi ọchịchị Chineke. Ya mere, n’agbanyeghị na enweghị m mmasị n’ezie n’ime cheese, enwetara m ọṅụ site n’ọrụ ahụ e kenyere m n’ihi na ọ nyeere ezinụlọ Betel aka. Ọ bụrụ na anyị ejeere Chineke ukwu anyị bụ Jehova ozi n’ikwesị ntụkwasị obi, n’emeghịkwa mkpesa, anyị pụrụ inwe obi ụtọ n’agbanyeghị ihe ọrụ anyị bụ.

N’afọ ndị a ike maliteworo ịgwụsị m, echeghị m na ọ dị ihe ọ bụla ka mma m pụrụ ime karịa ije ozi na Betel. A na-elekọta m nke ọma, enwewokwa m ike ịnọgide na-arụzu ọrụ m ọ bụ ezie na agbawo m 90 afọ. Ruo ọtụtụ afọ ugbu a, enwewo m ihe ùgwù nke ikere òkè m n’ịnọ n’isi oche n’usoro ihe omume nnọkọ ofufe nke ụtụtụ nke ezinụlọ Betel na-eme na Watchtower Farms ebe a. Ruo ókè m nwere ohere ya, ana m agba ndị bịara Betel ọhụrụ ume ịnara ihe ùgwù ije ozi nile e nyere ha, ka ha mụtakwa inwe afọ ojuju na obi ụtọ na ha.

N’ime afọ ndị gaworo aga, enwewo m ike ije mba ọzọ dị iche iche ọtụtụ ugbo—India, Nepal, Ime Ime Ọwụwa Anyanwụ Ụwa, na Europe. Ndụmọdụ na-esonụ pụrụ ịbụ ihe bara uru nye ndị nọ n’ọgbakọ ha dị iche iche nke ndị Jehova gburugburu ụwa: Nwee obi ụtọ, nweekwa afọ ojuju n’ọnọdụ ndị ị nọ na ya ugbu a, nweekwa ọganihu ime mmụọ n’ala ebe a kụnyere gị.

Ahọrọwo m ịnọ n’alụghị nwunye, ebe o meworo ka m nwee ike ịnọgide n’enweghị ihe ndọpụ uche n’ozi m na-ejere Chineke. Dị ka ụgwọ ọrụ maka ikwesị ntụkwasị obi, Chineke ukwu anyị enyewo m olileanya nke ndụ ebighị ebi. Nye ọtụtụ ndị, nke ahụ ga-apụta ndụ na-adịghị agwụ agwụ n’ime ebe obibi bụ paradaịs n’elu ala ebe a. Ndị ọzọ n’ime anyị na-elepụ anya maka ịdị ndụ ebighị ebi n’eluigwe, na-elekọta ọrụ ọ bụla e nyere anyị.

Ụfọdụ ndị ga-eche na 90 afọ m dịworo abụwo ndụ ogologo nke jupụtara n’ezi ihe. Ndụ m abụwo nke jupụtara n’ezi ihe, ma ọ dịghị ogologo ruo ókè zuru ezu. Site n’ịnọ nzukọ Chineke na okwu ya nile nke eziokwu nso, anyị pụrụ ịgbatịpụ ndụ anyị ruo mgbe ebighị ebi.a

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a N’oge Roy Ryan na-eme ihe ndekọ nke ahụmahụ ndụ ya, ọnọdụ ahụ ike ya jọwanyere njọ na mberede. O jezuru ozi elu ala ya na July 5, 1991, n’oge na-adịghị anya mgbe o keresịrị òkè ya dị ka onye isi oche nnọkọ ofufe ụtụtụ na Watchtower Farms.

[Foto dị na peeji nke 26]

Nwanna Ryan n’oge ọ ka bụ okorobịa n’akụkụ ụgbọ ala Model T Ford

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya