Iju Mmiri Ahụ A Na-adịghị Echezọ Echezọ
IHE dị ka 4,300 afọ gara aga, oké iju mmiri na-eweta mbibi kpuchiri elu ala. N’otu nzachapụ dị ukwuu, o kpochapụrụ ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ihe nile dị ndụ. Ọ bụ ihe dị ukwuu otú a nke na ọ hapụrụ mmetụta a na-apụghị ihichapụ ehichapụ n’ebe ihe a kpọrọ mmadụ nọ, ọgbọ nke ọ bụla nyefekwara akụkọ ahụ n’aka nke na-esotenụ.
N’ihe dị ka 850 afọ mgbe Iju Mmiri ahụ gasịrị, onye Hibru na-ede ihe bụ Mosis dekọrọ akụkọ nke Oké Iju Mmiri ahụ zuru ụwa nile ọnụ. E chebewo ya n’akwụkwọ Bible nke Jenesis, bụ́ ebe anyị pụrụ ịgụta otú ihe nile si mee n’ụzọ na-edo anya n’isi nke 6 ruo 8.
Ihe Ndekọ Bible nke Iju Mmiri Ahụ
Jenesis na-akọ otú ihe ndị a nile si mee, nke doro anya na ọ bụ nke onye ji anya ya hụ kọrọ: “N’afọ nke [narị isii] nke ndụ Noa, n’ọnwa nke abụọ, n’ụbọchị nke iri na asaa nke ọnwa, n’ụbọchị ahụ ka a gbawara isi iyi nile nke oké ogbu mmiri, e meghekwara window nile nke eluigwe. Iju mmiri ahụ wee dị n’elu ụwa [ụbọchị iri anọ]; mmiri ahụ wee baa ụba, bulie ụgbọ ahụ, e wee si n’elu ụwa bulie ya elu. Mmiri ahụ dị ike nke ukwuu nke ukwuu n’elu ụwa; e wee kpuchie ugwu nile dị elu nke dị n’okpuru eluigwe nile.”—Jenesis 7:11, 17, 19.
Banyere mmetụta Iju Mmiri ahụ n’ahụ ihe nile dị ndụ, Bible na-ekwu, sị: “Anụ ahụ nile nke na-akpụ akpụ n’elu ụwa wee kubie ume, n’ime anụ ufe, na n’ime anụ ụlọ, na n’ime anụ ọhịa, na n’ime ihe nile ọ bụla na-enupụta enupụta nke na-enupụta n’elu ụwa, na mmadụ nile ọ bụla.” Otú ọ dị, Noa na mmadụ asaa ndị ọzọ lanarịrị, tinyere nhọpụta nke ụdị anụ ọhịa nile, anụ ufe, na ihe na-akpụ akpụ n’ala. (Jenesis 7:21, 23) E chebewo ha nile n’ụgbọ dị ukwuu na-ese n’elu nke dị ihe dị ka 133 mita n’ogologo, 22 mita n’obosara, na 13 mita n’ịdị elu. Ebe nanị ọrụ ụgbọ ahụ na-arụ bụ ka mmiri ghara ịba n’ime ya nakwa ka o see n’elu, o nweghị okpuru dị gburugburu, ebe ihu pịrị ọnụ, ihe ga-enuga ya ihu ma ọ bụ azụ, ma ọ bụ ígwè e ji anyagharị ya. Ụgbọ Noa bụ nnọọ ihe yiri igbe.
Ọnwa ise mgbe Oké Iju Mmiri ahụ malitere, ụgbọ ahụ tọgbọọrọ n’elu ugwu Ararat, bụ́ nke dị n’ebe ọwụwa anyanwụ Turkey nke taa. Noa na ezinụlọ ya pụrụ n’ime ụgbọ ahụ gaa n’ala akọrọ n’otu afọ site na mgbe Iju Mmiri ahụ malitere ma maliteghachi usoro e ji ebi ndụ. (Jenesis 8:14-19) Mgbe oge na-aga, ihe a kpọrọ mmadụ abawo ụba n’ụzọ zuru ezu iji malite iwu obodo ukwu bụ Bebel na ụlọ ukwu ya a ma ama na nso nso Osimiri Yufretis. Site n’ebe ahụ ndị mmadụ nke nta nke nta gbasara gaa n’akụkụ nile nke elu ala mgbe Chineke ghagburu asụsụ nke ihe a kpọrọ mmadụ. (Jenesis 11:1-9) Ma gịnị mere ụgbọ ahụ?
Ịchọ Ụgbọ Ahụ
Kemgbe narị afọ nke 19, e nwewo ọtụtụ mgbalị e mere iji chọta ụgbọ ahụ n’ugwu nile nke Ararat. Ugwu ndị a nwere nsọtụ abụọ a ma ama, otu dị 5,165 mita n’ịdị elu, nke ọzọ dịkwa 3,914 mita. Nke kasị elu na ha abụọ bụ nke snow na-ekpuchi mgbe nile. N’ihi mgbanwe nke ihu eluigwe nke sochiri Iju Mmiri ahụ, ụgbọ ahụ n’oge na-adịghị anya ga-abụworị nke snow rikpuru. Ụfọdụ ndị na-eme nchọpụta kwenyesiri ike na ụgbọ ahụ ka dị ebe ahụ, bụrụ nke e liri n’ime nnukwu ice. Ha kwuru na e nwewo oge mgbe ice ndị ahụ gbazesịrị n’ụzọ zuru ezu iji mee ka akụkụ nke ụgbọ ahụ bụrụ nke e kpughere ruo nwa oge nta.
Akwụkwọ bụ In Search of Noah’s Ark hotara George Hagopian, onye Armenia, onye kwuru na ya rịgooro Ugwu Ararat ma hụ ụgbọ ahụ n’afọ 1902, ọzọkwa n’afọ 1904. Ọ sịrị na ná njem nleta nke mbụ, ọ rịgooro n’ezie n’elu ụgbọ ahụ. “Eguzo m nnọọ kpọmkwem ma lee akụkụ ụgbọ ahụ nile anya. Ọ dị ogologo. Ịdị elu ya dị ihe dị ka mita iri na abụọ.” N’ihe banyere nchọpụta ya ná njem nleta ya nke abụọ, o kwuru, sị: “Ahụghị m ebe ọ bụla a gbagọrọ ya agbagọ. Ọ dịghị nnọọ ka ụgbọ ndị ọzọ m hụworo. O yiri ụgbọ ike ya dị larịị.”
Site 1952 ruo 1969, Fernand Navarra mere mgbalị anọ iji chọpụta ihe na-egosi ịdị adị nke ụgbọ ahụ. Ná njem nke atọ o mere gaa n’Ugwu Ararat, o jeruru n’ala nke mgbawa ghere oghe dị omimi n’ime ice, bụ́ ebe ọ hụrụ mkpirisi osisi dị ojii e liri n’ime ice ahụ. “Ọ ghaghị ịbụworị ihe dị nnọọ ogologo,” ka o kwuru, “ma eleghị anya bụrụkwa ihe a nyakọtara n’akụkụ ndị ọzọ nke ihe e ji wuo ụgbọ ahụ. M pụrụ nanị ịdị na-egbukapụ akụkụ osisi ahụ ruo mgbe m gbujipụrụ otu mkpirisi dị ihe dị ka otu mita na ọkara n’ogologo.”
Professor Richard Bliss, otu n’ime ndị ọkachamara nyochara osisi ahụ, kwuru, sị: “Osisi ahụ Navarra wetara bụ ógwè osisi e ji arụ ihe na nke a nyazuru bitumen. O nwere ebe ndị e gbupụrụ egbupụ na ebe ndị a pụrụ isi jikọọ ya na osisi ndị ọzọ. Ọ bụkwa nke o doro anya na e ji aka kwaa ụdịdị ya, meekwa ka o nwee akụkụ anọ hà nhata.” Ihe a gbakọrọ dị ka afọ ole nke osisi ahụ nọworo ka e debere n’ihe dị ka puku afọ anọ ma ọ bụ ise.
Ọ bụ ezie na e mewo mgbalị ịchọpụta ụgbọ ahụ n’Ugwu Ararat, e nwere ihe àmà doro anya na e ji ya mee ihe iji lanarị oké iju mmiri wetara mbibi dị n’ihe ndekọ e dere ede nke ihe omume ahụ n’akwụkwọ Bible bụ Jenesis. A pụrụ ịhụta ihe na-egosi na ihe ndekọ ahụ bụ eziokwu n’ime ọnụ ọgụgụ dị ukwuu nke akụkọ ifo iju mmiri n’etiti ndị oge ochie n’elu ụwa nile. Tụlee nkwupụta ha n’isiokwu ndị na-esonụ.
[Foto dị na peeji nke 4, 5]
Ụgbọ ahụ nwere ikike ibu ihe hà ka nke ụgbọ okporo ígwè 10 na-ebu ngwá ahịa nke na-adọkpụ ihe dị ka 25 ụgbọ ibu America n’otu n’otu pụrụ ibu