Nwee Mmụọ nke Iji Onwe Onye Achụ Àjà!
ROLFa bụ onye e were n’ọrụ nke e ji eme ọnụ. Mgbe o kpebiri inweta ọrụ nwa oge ka o wee nwee ike ịmụbawanye òkè ọ na-ekere n’ozi ndị Kraịst, onye were ya n’ọrụ kwenyere ozugbo. Ya mere, ruo ọtụtụ afọ Rolf nwere ike ije ozi ọsụ ụzọ. Otú ọ dị, otu ụbọchị ọnọdụ ọrụ ahụ gbanwere. Rolf egosiwo onwe ya ịbụ onye maara ọrụ ya nke ukwuu nke na e nyere ya ọkwa nke onye nlekọta azụmahịa ụlọ ọrụ ahụ. Ọrụ ahụ nwere ụgwọ ọnwa na-adọrọ adọrọ na ezi olileanya maka ọganihu n’ọdịnihu. Otú ọ dị, ọrụ nwa oge agaghịkwa ekwe omume.
Rolf nwere nwunye na ụmụ abụọ ọ na-akwado, ego ọzọ ahụ ọ ga-enwetakwu gaara abawo uru. Ka o sina dị, ọ jụrụ onyinye ahụ ma tinye akwụkwọ maka ọrụ ọzọ, nke ga-enye ya ohere ilekọta ibu ọrụ ime mmụọ na ibu ọrụ ego ndị dịịrị ya. Onye were Rolf n’ọrụ nwere ijuanya ná mkpebi nke a. N’ihi ịmata na ọbụna onyinye ụgwọ ọnwa ka elu abaghị uru, onye nlekọta ọrụ ya kwubiri, sị: “Ahụwo m na apụghị m ịgbanwe ihe ikpebiri n’obi gị.”
Ee, Rolf nwere mkpebi siri ike. Ma o nwekwara àgwà ọzọ—mmụọ nke iji onwe onye achụ àjà. Mmụọ dị otú ahụ dị ụkọ n’ụwa nke a nke imeju mkpa onwe onye. Ma ọ pụrụ iduba n’ụzọ ndụ nke bara uru ma na-enye afọ ojuju. Gịnị bụ mmụọ nke iji onwe onye achụ àjà? Gịnị ka ọ gụnyere? Gịnịkwa ka anyị na-aghaghị ime iji nọgide na-enwe ya?
Ọ Bụ Ihe Bible Chọrọ
Ịchụ àjà pụtara ịhapụ ma ọ bụ ịgbahapụ ihe bara uru. Ịchụ àjà abụwo otu akụkụ nke ofufe dị ọcha eri mgbe onyeàmà mbụ kwesịrị ntụkwasị obi bụ́ Ebel, wetara “ụfọdụ n’ime ụmụ e buru ụzọ mụọ nke ìgwè ewu na atụrụ” n’àjà nye Chineke. (Jenesis 4:4) Ndị ikom nwere okwukwe, dị ka Noa na Jekọb, gbasokwara ụzọ ahụ. (Jenesis 8:20; 31:54) Àjà ụmụ anụmanụ bụkwa otu ihe dị mkpa n’Iwu Mosis. (Levitikọs 1:2-4) Otú ọ dị, n’okpuru Iwu ahụ, a gbara ndị na-efe ofufe ume ka ha nye ihe ha kasị mma. E nyeghị ha ohere inye anụ ọ bụla nwere nkwarụ dị ka àjà. (Levitikọs 22:19, 20; Deuterọnọmi 15:21) Mgbe ndị Israel si n’ezi ofufe dapụ mebiri Iwu nke a, Chineke dọrọ ha aka ná ntị, na-asị: “Mgbe unu na-eweta nso nke gwọrọ ngwụrọ [iji chụọ àjà, unu na-asị], Ihe ọjọọ adịghị ya! Biko, weta ya nso onye na-achị ala gị; ihe gị [ọ] ga-atọ ya ụtọ? Ma ọ bụ ọ̀ ga-ahụ gị ihu ọma? . . . M̀ ga-anara nke a nke ọma n’aka unu?”—Malakaị 1:8, 13.
E bufere ụkpụrụ nke ịchụ àjà n’ofufe ndị Kraịst. Otú ọ dị, ebe ọ bụ na Kraịst akwụwo ụgwọ mgbapụta ahụ n’ozuzu ya, Chineke adịkwaghị anara àjà ụmụ anụmanụ. Ya mere, gịnị ka ndị Kraịst pụrụ ịchụ n’àjà bụ́ nke a ga-anakwere? Pọl na-ede ná Ndị Rom 12:1, sị: “Ya mere, ụmụnna m, eji m obi ebere nile nke Chineke na-arịọ unu, ka unu chee ahụ unu n’ihu Chineke, dị ka àjà dị ndụ, dị nsọ, nke dị Chineke ezi ụtọ, nke bụ ikpe ekpere unu dị ka uche si dị.” Lee oké mgbanwe ọ bụ! Kama ịchụ ahụ ihe ndị nwụrụ anwụ n’àjà, ndị Kraịst ga-eji onwe ha chụọ àjà dị ndụ—ume ọrụ ha, ihe onwunwe ha, na ikike ha nile. Dịkwa ka ọ dị n’Israel, Jehova agaghị anakwere àjà ndị “gwọrọ ngwụrọ,” ma ọ bụ ndị e ji obi abụọ chụọ. Ọ na-achọ ka ndị na-efe ya ofufe nye ihe kasị mma ha nwere, ka ha jiri obi dum, mkpụrụ obi, uche, na ike ha dum, jeere ya ozi.—Mak 12:30.
Mmụọ nke iji onwe onye achụ àjà si otú a na-agụnye iha karịrị nnọọ mmadụ itinye onwe ya n’otu usoro ihe omume nke ịga nzukọ na ihe omume nke ozi ndị Kraịst. Ọ pụtara mkpebi siri ike ime uche Chineke n’agbanyeghị ihe ọ ga-efu. Ọ pụtara ịdị njikere ịnagide ihe isi ike na ahụ mgbakasị. “Ọ bụrụ na onye ọ bụla chọrọ iso m n’azụ,” ka Jisọs sịrị, “ya jụ onwe ya, ma bulie osisi ịta ahụhụ ya, nọgidekwa na-eso m.” (Matiu 16:24, NW) Onye Kraịst adịghị eme oké ọchịchọ onwe onye ma ọ bụ ihe mgbaru ọsọ dị iche iche nke anụ ahụ ihe ndị bụ isi na-echegbu ya. Ndụ ya dabeere kpọmkwem n’ibu ụzọ chọọ Alaeze Chineke na ezi omume Ya. (Matiu 6:33) Ọ bụrụ na ọ dị mkpa, ọ dị njikere ‘ibuli osisi ịta ahụhụ ya,’ nagide mkpagbu, ihe ihere, ma ọ bụ ọbụna ọnwụ!
Ngọzi Ndị Na-abịa Site ná Mmụọ Iji Onwe Onye Achụ Àjà
N’ịbụ onye ihe mwute ndị dị otú ahụ pụrụ ịdakwasị, mmadụ pụrụ nnọọ ịdị na-eche echiche ma iji onwe onye achụ àjà ọ̀ na-akwụghachi ihe ọ na-efu. Nye ndị ahụ hụrụ Jehova Chineke n’anya ma chọọ ịhụ na a sọpụụrụ aha ya, ọ na-akwụghachi ụgwọ n’ezie. (Matiu 22:37) Tụlee ihe nlereanya zuru okè nke Jisọs Kraịst setịpụrụ. Tupu ọ bịa n’elu ụwa, o nwere ọkwa dị elu n’eluigwe dị ka mmụọ e kere eke. Otú ọ dị, dị ka ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, ọ chọrọ ime ‘ọ bụghị uche nke ya, kama uche Chineke, onye zitere ya.’ (Jọn 5:30) Ya mere, o ji ọchịchọ onwe ya ‘wụpụ onwe ya wee were ọdịdị nke ohu, wee bịa dịrị n’oyiyi nke mmadụ. Karịakwa nke ahụ, mgbe ọ chọtara onwe ya n’ụdị nke mmadụ, o wedara onwe ya n’ala ma rube isi ruo ọnwụ, ee, ọnwụ n’elu osisi ịta ahụhụ.’—Ndị Filipaị 2:7, 8, NW.
Àjà ndị dị otú ahụ aghọghị ihe na-adịghị amị mkpụrụ. N’ihi na Jisọs dị njikere ‘ịtọgbọ ndụ ya n’ihi ndị enyi ya,’ ọ pụrụ ịkwụ ụgwọ mgbapụta ahụ, na-eme ka o kwe ụmụ mmadụ na-ezughị okè omume inweta anwụghị anwụ n’eluigwe ma ọ bụ ndụ ebighị ebi n’elu ụwa. (Jọn 3:16; 15:13; 1 Jọn 2:2) Site n’ịnọgide na-eguzosi ike n’ezi ihe n’ụzọ zuru okè, o mere ka e too aha Jehova nke ukwuu. (Ilu 27:11) Ka a sịkwa ihe mere Jehova ji gọzie ya n’ihi ụzọ iji onwe onye achụ àjà nke ọ gbasoro! “Chineke welikwara ya elu nke ukwuu, werekwa amara nye ya aha ahụ nke karịrị aha nke ọ bụla elu.”—Ndị Filipaị 2:9.
Otú ọ dị, Jisọs bụ Ọkpara Chineke ọ mụrụ nanị ya. Chineke ọ̀ na-enyeghachikwa ndị chụrụ àjà maka ya ụgwọ ọrụ? Ee, e gosikwara nke a site n’ọtụtụ ihe atụ ma n’oge ochie ma n’oge ugbu a. Tụlee ihe ndekọ Bible banyere Rut, nwa agbọghọ si Moab. O yiri ka ọ mụtara banyere Jehova site n’aka di ya bụ onye Israel. Mgbe di ya nwụrụ, ọ dị mkpa ka o mee mkpebi. Ọ̀ ga-anọgide n’ala ikpere arụsị bụ́ ebe a mụrụ ya, ka ọ̀ ga-esoro nne di ya meworo agadi bụ́ Naomi, gaa n’Ala Nkwa ahụ? Rut họọrọ nke ikpeazụ, ọ bụ ezie na ọ pụtara iji iso ndị mụrụ ya na ma eleghị anya olileanya nke ịlụgharị di chụọ àjà. Ka o sina dị, Rut amatawo Jehova, ọchịchọ ya ife ya ofufe n’etiti ndị ya ọ họpụtara kpalikwara ya ịrapagide n’ahụ Naomi.
È nyeghachiri Rut ụgwọ ọrụ n’ihi iji onwe onye achụ àjà otú a? N’ezie, e nyeghachiri ya! Mgbe oge na-aga, otu onye nwere ala nke aha ya bụ Boaz weere ya dị ka nwunye, Rut ghọkwara nne nke otu nwa nwoke aha ya bụ Obed, nke mere ka ọ bụrụ nne nne ochie Jisọs Kraịst.—Matiu 1:5, 16.
N’otu aka ahụ, ndị na-ejere Chineke ozi n’oge ndị a bụ́ ndị na-eji onwe ha achụ àjà enwetawokwa ngọzi dị iche iche. Dị ka ihe atụ, na 1923, William R. Brown, nke a maara nke ọma karị dị ka “Bible” Brown, hapụrụ ebe obibi ya n’Ebe Ọdịda Anyanwụ India ịga malite ọrụ nkwusa ahụ n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Africa. Ndị so ya bụ nwunye ya na nwa ya nwanyị. O mesịrị gaa Nigeria, bụ́ ebe ọrụ nkwusa ahụ ka na-amalite amalite ịmị mkpụrụ. Tinyere otu onye isi ojii si America bụ́ Vincent Samuels na Onyeàmà ọzọ si n’Ebe Ọdịda Anyanwụ India nke aha ya bụ Claude Brown, “Bible” Brown keere òkè dị mkpa n’ọnọdụ mbụ nke ọrụ ahụ n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Africa.
Taa ihe karịrị 187,000 ndị nkwusa na-eje ozi na Sierra Leone, Liberia, Ghana, na Nigeria, ókèala ndị “Bible” Brown na ndị òtù ya malitere ọrụ na ha. Tupu ọnwụ ya n’afọ 1967, “Bible” Brown sịrị: “Lee ihe ọṅụ ọ bụ ịhụ ka ndị ikom na ndị inyom na-erubere ozi ọma Alaeze Chineke isi!” Ee, a gọziri ya n’ụba maka ụzọ iji onwe onye achụ àjà nke ọ gbasoro.
Ụzọ Dị Iche Iche Isi Jiri Onwe Onye Chụọ Àjà
Olee ụzọ ụfọdụ anyị pụrụ isi gosi otu mmụọ ahụ taa? Otu bụ ịdị na-ekere òkè kwa izu n’ozi ụlọ n’ụlọ. (Ọrụ 20:20) Ime otú ahụ, karịsịa mgbe izu ọrụ ego nke na-eweta ike ọgwụgwụ gasịrị, pụrụ ịbụ ihe na-adịghị mfe. Ọ pụrụ ịchọ ọzụzụ na ezi nhazi ihe omume. Ma ọṅụ ndị a na-enweta na-akarị ahụ mgbakasị a na-enwe. Leenụ, ị pụrụ inwe ihe ùgwù nke inyere otu onye aka ịghọ “akwụkwọ ozi Kraịst . . . nke a na-ejighị ink dee, kama ọ bụ mmụọ nke Chineke dị ndụ ka e ji dee ya; ọ bụghị n’elu mbadamba nkume, kama ọ bụ n’elu mbadamba ihe dị iche, bụ́ obi nke anụ ahụ.”—2 Ndị Kọrint 3:3.
Site n’iji nlezianya ‘zụchapụta oge,’ ma eleghị anya site n’ọrụ ego ma ọ bụ ntụrụndụ, ụfọdụ emewo ka òkè ha na-ekere n’ọrụ nkwusa ahụ ka elu. (Ndị Efesọs 5:16) Ọtụtụ na-ahazi usoro ihe omume ha ka ha wee nwee ike ije ozi ọsụ ụzọ inyeaka ma ọ dịkarịa ala otu ugbo n’afọ. Ndị ọzọ pụrụ ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ n’akwụsịghị akwụsị ma ọ bụ jee ozi dị ka ndị ọsụ ụzọ oge nile. Àjà ọzọ a ga-atụle bụ ịkwaga n’ebe ndị e nwekwuru mkpa maka ndị nkwusa Alaeze. Nke a na-achọkarị mgbanwe siri ike n’ụzọ e si ebi ndụ, ịnagide mgbakasị ahụ, ịhazigharị onwe onye gaa n’omenala na ọdịbendi ọhụrụ dị iche iche. Ma ngọzi nile nke ikere òkè zuru ezu karị n’inyere ndị ọzọ aka inweta ndụ na-eme ka àjà ndị dị otú a baa uru.
John Cutforth bụ nwa amaala Canada chọpụtara nke a n’onwe ya. Mgbe ọ gụsịrị akwụkwọ n’ụlọ akwụkwọ Watchtower Bible School of Gilead, e kenyere ya ọrụ dị ka onye ozi ala ọzọ n’Australia. “Lee ụzọ dị anya nke ahụ bụ site n’ụlọ!” ka Nwanna Cutforth na-echetaghachi. “Ọ̀ dị mgbe m ga-alọghachi Canada ọzọ ịhụ ndị mụrụ m na ndị enyi m ọzọ tupu Amagedọn? Nanị ụzọ e nwere isi chọpụta ya bụ ịga aga.” Nwanna Cutforth gara, ọ kwaghịkwa ụta n’ihi àjà ndị ọ chụrụ. N’afọ ndị sochirinụ, o butere ụzọ n’ọrụ ịgba àmà ahụ na Papua New Guinea, bụ́ ebe ọ ka nọ na-eje ozi n’ịnụ ọkụ n’obi, ebe ọ nọzuworo 50 afọ n’ije ozi oge nile. O kwuru n’otu oge, sị: “Ịdị na-achọ ịgbaso idu ndú Jehova mgbe nile, na-anakwere ọrụ ọ bụla masịrị ya inye anyị, na-eweta ọṅụ, obi ụtọ, afọ ojuju na ọtụtụ ndị enyi a na-apụghị ịgụta ọnụ.”
Otú ọ dị, ọnọdụ dị iche iche dị ka ahụ ike, ego, na ibu ọrụ ezinụlọ pụrụ ịkpara ihe mmadụ pụrụ ime ókè; ọ bụghị mmadụ nile ga-enwe ike ije ozi dị ka ndị ọsụ ụzọ ma ọ bụ ndị ozi ala ọzọ. Ka o sina dị, kpebisie ike ikere òkè zuru ezu ná nzukọ nile na n’ije ozi ubi ruo otú o kwere mee, na-ekweghị ka ahụ mgbakasị ndị dị nta, dị ka ihu igwe na-adịghị mma, gbochie gị. (Ndị Hibru 10:24, 25) Ị pụkwara inwe ike iji oge ka ukwuu chụọ àjà maka ọmụmụ ihe onwe onye nke Okwu Chineke. Ezinụlọ ụfọdụ na-eme otú ahụ site n’ibelata oge ha ji ekiri ihe omume TV, ma eleghị anya ọbụna na-enwe abalị nke “a na-adịghị ele TV” kwa izu ma ọ bụ ghara inwe TV ma ọlị. Site n’ịchọta oge maka ọmụmụ ihe onwe onye, “àjà, bụ́ otuto” nke i ji “na-ekwupụta nye aha ya” ná nzukọ nile na n’ozi ubi yikarịrị ka ọ ga-abụ àjà nke bara oké uru.—Ndị Hibru 13:15.
Cheta, ọrụ nkwusa ahụ nọ n’akụkụ ndị ikpeazụ ya. N’isi nso Chineke ga-eweta ikpe ọmụma ya n’isi ụwa nke a nke anyaukwu na imeju ọchịchọ onwe onye nanị. (Zefanaịa 2:3) Iji nọgide na-anata ihu ọma Chineke, anyị apụghị ịdị na-emere onwe anyị ebere. Anyị aghaghị ‘iche ahụ anyị n’ihu Chineke, dị ka àjà dị ndụ, dị nsọ, nke dị Chineke ezi ụtọ.’ (Ndị Rom 12:1) Mmụọ dị otú ahụ ga-eweta oké obi ụtọ na afọ ojuju. Ọ ga-enyere anyị aka inwe ọṅụ ka ukwuu n’ozi anyị. Ọ ga-emekwa ka obi Jehova Chineke ṅụrịa!—Ilu 27:11.
Ya mere nọgide na-enwe mmụọ nke iji onwe onye achụ àjà! Alala azụ n’itinye onwe gị ná nsogbu nke imere ndị ọzọ ihe na iji kwadoo ọdịmma nile nke Alaeze. Pọl na-agba ume, sị: “Echezọla ime ihe dị mma na ime ka ndị ọzọ nwekọọ ihe unu: n’ihi na àjà dị otú a na-atọ Chineke ezi ụtọ.”—Ndị Hibru 13:16.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a A gbanwewo aha ya.
[Foto dị na peeji nke 26]
Ịchọta oge maka ọmụmụ ihe onwe onye na ozi ubi pụrụ ịgụnye ịchụ ihe n’àjà, ma ọ na-enyeghachi ụgwọ ọrụ
[Foto dị na peeji nke 28]
A gọziri W. R. Brown na John Cutforth n’ụba n’ihi ụzọ iji onwe onye achụ àjà nke ha gbasoro