Àkụ́ Site n’Íkpó Ihe Mkpofu Dị n’Ijipt
Ị̀PỤRỤ ịtụ anya ịchọta ihe odide Bible dị oké ọnụ ahịa n’ikpó ahịhịa? N’etiti ájá nke Ijipt, ná ngwụsị nke narị afọ gara aga, nke ahụ bụ nnọọ ihe merenụ. Olee otú o si mee?
Malite na 1778 ma nọgide ruo ngwụsị nke narị afọ 19, a chọpụtara ọtụtụ ihe odide papyrus na mberede n’Ijipt. Otú ọ dị, e nwere ime nchọpụta na-eruchaghị ala ruo otu narị afọ gara aga. Ruo mgbe ahụ ndị ọrụ ugbo bi n’ime ime obodo na-ahụ ọtụtụ ihe ochie e dere ede ọtụtụ mgbe, òtù Egypt Exploration Fund (Òtù Na-ahụ Maka Ego E Ji Eme Nchọpụta) nke Britain na-akwado matakwara mkpa ọ dị izipụ ndị na-eme nchọpụta tupu oge agafe. Ha họọrọ ndị ọkà mmụta Oxford abụọ, Bernard P. Grenfell na Arthur S. Hunt, bụ́ ndị natara ike inyocha ebe ndịda nke akụkụ mpaghara a na-akọ ubi n’ógbè Faiyūm.
Otu ebe a kpọrọ Behnesa yiri Grenfell ebe a ga-achọta ihe n’ihi aha ochie Grik ya, bụ́ Oxyrhynchus. N’ịbụ ebe bụ isi maka Iso Ụzọ Kraịst ndị Ijipt, Oxyrhynchus bụ ebe dị mkpa n’oge narị afọ nke anọ na nke ise O.A. A chọtawo ọtụtụ mọnastri oge gboo n’ebe dị nso n’ebe ahụ, mkpọmkpọ ihe fọdụrụ n’obodo nta nke a dị ukwuu. Grenfell nwere olileanya ịchọta iberibe akwụkwọ ndị Kraịst ebe ahụ, ma nnyocha e nyochara ebe a na-eli ozu na ụlọ ndị bibiworo ebibi arụpụtaghị ihe ọ bụla. Nanị ikpó ahịhịa nke obodo ahụ fọrọ, ụfọdụ dị ihe dị ka mita itoolu n’ịdị elu. Igwu ala maka ịchọta papyri n’ebe ahụ yiri nkwenye nke ike ọgwụgwụ; ma ndị ahụ na-eme nchọpụta kpebiri ime mgbalị.
Nkwakọba nke Àkụ́
Na January 1897 e gwuru olulu nnwale, mgbe hour ole na ole na-agafela a hụrụ ihe odide papyrus ochie. Ha gụnyere akwụkwọ ozi, nkwekọrịta ọrụ ngo, na akwụkwọ ndị ọchịchị. Ájá ndị ikuku na-ebu ekpuchiwo ha, ọnọdụ ihu igwe kọrọ akọ echekwawo ha ruo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 2,000 afọ.
N’ime ihe karịrị nnọọ ọnwa atọ, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ tọn abụọ nke ihe e dere na papyri ka a chọtara site na Oxyrhynchus. E bujuru ma bughachi 25 igbe gaa England. Oge oyi ọ bụlakwa ruo afọ iri, ndị mmụta abụọ ndịa na-adịghị atụ egwu lọghachiri Ijipt ịbịa mewanye ka nkwakọba ha buo ibu.
N’otu mgbe, mgbe a na-egwu ala n’ebe a na-eli ozu dị na Tebtunis, ha gwupụtara nanị agụ iyi a kpụrụ akpụ. Otu onye ọrụ ji iwe kụrie otu. N’ihe ijuanya, ọ hụtara na e ji akwụkwọ nke papyrus kechie ya. Agụ iyi ndị ọzọ, dị ka ha chọpụtara, bụ ndị e mekwara otu ihe ahụ, a fanyekwara ụfọdụ mfụkọta nke papyrus n’olu ha. A chọtakwara akụkụ ụfọdụ nke ihe odide oge ochie, tinyekwara iwu ndị eze na nkwekọrịta ọrụ ngo e tinyekọtara ndekọ azụmahịa na akwụkwọ ozi onwe onye.
Olee uru akwụkwọ ndị a nile bara? Ha ghọrọ ihe na-akpali oké mmasị, n’ihi na ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ha abụrụwo ndị ndị nkịtị dere n’asụsụ Koine, asụsụ Grik a na-asụkarị n’oge ahụ. Ebe ọ bụ na ọtụtụ okwu ndị ha ji mee ihe pụtakwara n’ime Akwụkwọ nsọ Grik nke Bible, “Agba Ọhụrụ,” ọ pụtara ìhè n’otu ntabi anya na asụsụ dị n’ime Akwụkwọ nsọ ahụ abụghị Grik Bible pụrụ iche, dị ka ụfọdụ ndị ọkà mmụta kwuworo, kama ọ bụ asụsụ ndị nkịtị. Ya mere site n’ịtụle ụzọ e si jiri okwu na-eme ihe n’ọnọdụ dị iche iche nke ụbọchị ọ bụla, nghọta doro anya nke ihe ha pụtara n’ime Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst pụtara ìhè.
Ihe Odide Bible
A chọtakwara iberibe dị iche iche nke ihe odide Bible, ndị a kwa, a na-edekarị n’akwụkwọ hịkọrọ ahikọ nke na-enweghị ihe ịchọ mma nakwa n’elu akwụkwọ na-esighị ike, nọchịrị anya Bible nke ndị nkịtị. Ka anyị nyochaa ụfọdụ n’ime ihe ndị ha chọpụtara.
Hunt chọpụtara otu akwụkwọ nke isi mbụ nke Oziọma Matiu, amaokwu 1 ruo 9, 12, na 14 ruo 20, nke e dere na narị afọ nke atọ O.A. ná mkpụrụ akwụkwọ ukwu. Ọ ga-aghọ P1, ihe mbụ dị ná nchịkọta nke ihe odide papyrus sitere n’ọtụtụ ebe, nke fọrọ nke nta ka ọ bụrụ otu narị ihe odide ma ọ bụ akụkụ ụfọdụ nke ihe odide nke Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst. Gịnị ka a ga-eji amaokwu ole na ole nke Hunt hụrụ eme? Otú e si dee mkpụrụ okwu ya gosiri na ọ malitere na narị afọ nke atọ O.A., ọ bụrụkwa na a tụlee ihe ọgụgụ ya ọ na-egosi na o kwekọrọ n’ihe odide oge ahụ nke Westcott na Hort mepụtara na nso nso a. P1 dị ugbu a na University Museum dị na Philadelphia, Pennsylvania, U.S.A.
Ibe akwụkwọ papyrus sitere n’otu codex, ma ọ bụ akwụkwọ, nwere n’aka ekpe, akụkụ ibe akwụkwọ nke Jọn isi 1 na n’aka nri akụkụ ibe akwụkwọ nke Jọn isi 20. Mmezigharị nke akụkụ ndị ahụ furu efu na-egosi na e nweburu 25 ibe akwụkwọ maka Oziọma nile, sitekwa n’oge gboo, ndị a pụrụ ịgụnyeworị isi 21. E nyere ya nọmba bụ P5, nke malitere na narị afọ nke atọ O.A., ọ dịkwa ugbu a na British Library dị na London, England.
Otu iberibe nwere Ndị Rom 1:1-7 bụ nke e dere n’ụdị mkpụrụ akwụkwọ buru ibu ma bụrụ ndị dị aghara aghara nke na ụfọdụ ndị ọkà mmụta echewo na ma eleghị anya ọ bụ ihe omume nwata akwụkwọ. E nyere ya nọmba bụ P10 ugbu a ma bụrụ nke malitere site na narị afọ anọ O.A.
Ihe nchọpụta ka ukwu nwere ihe dị ka otu n’ime ụzọ atọ nke akwụkwọ ozi e degaara ndị Hibru. E dere ya n’azụ akwụkwọ mpịakọta nke nwere ihe odide nke ọkọ akụkọ ihe mere eme ndị Rom bụ Livy n’ihu ya. Gịnị kpatara ọdịiche nke ihe odide n’ihu na n’azụ? N’oge ndị ahụ ịkọ ụkọ na ịda oké ọnụ nke ihe e ji ede ihe pụtara na a gaghị emefusị papyri ochie. Ugbu a e debara ya dị ka P13, ọ malitere na narị afọ nke atọ ma ọ bụ anọ O.A.
Ibe akwụkwọ papyrus nwere akụkụ ụfọdụ nke Ndị Rom isi 8 na 9, nke e dere ná mkpụrụ akwụkwọ dị nta, pụtara site n’akwụkwọ dị ihe dị ka inch anọ na ọkara n’elu na nanị inch abụọ n’ibu. Mgbe ahụ, ọ pụrụ iyi ka mbipụta nke Akwụkwọ nsọ ga-abanye n’akpa uwe dị adị na narị afọ nke atọ O.A. Nke a ghọrọ P27 ma kwekọọ na Codex Vaticanus.
Akụkụ nke ibe akwụkwọ anọ nke ihe odide Grik Septuagint nwere akụkụ isiakwụkwọ isii nke Jenesis. Codex nke a dị mkpa n’ihi na ọ malitere na narị afọ nke abụọ ma ọ bụ atọ O.A. na n’ihi na isiakwụkwọ ndị a adịghị n’ime Codex Vaticanus ma nwekwa ntụpọ n’ime Codex Sinaiticus. Dị ka nke e nyere nọmba bụ Papyrus 656, ibe akwụkwọ ndị a dị ugbu a na Bodleian Library, Oxford, England.
Iberibe ndị a nile adịghị egosi ọdịiche bụ isi site n’ihe odide oge ochie dị adị, ya mere ha na-emesi ya ike na ihe odide Bible dị adị n’etiti ndị nkịtị n’oge gboo ahụ n’ime ime obodo nke Ijipt. Ha na-emesikwa okwukwe anyị ike n’ikwesị ndabere na izi ezi nke Okwu Chineke.
[Foto dị na peeji nke 27]
Papyri sitere n’aka Faiyūm nke nwere akụkụ nke Jọn, isi 1
[Ebe E Si Nweta Foto]
Site n’ikike nke British Library
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 26]
Pictorial Archive (Near Eastern History) Est.