Ụdị Ịnọ Ná Ntụkwasị Obi Dị Aṅaa Ka Ị Chọsiri Ike Inwe?
NDỊ dị iche iche nwere echiche dị iche iche banyere ịnọ ná ntụkwasị obi. Ụfọdụ ndị na-ele ya anya dị ka nguzosi ike dị n’etiti usuu ndị agha na-emegiderịta onwe ha. Dị ka ihe atụ, mba ndị kasị sie ike n’ụwa, ha na mba ndị enyi ha nọ na Europe ekwekọwo n’ọtụtụ ihe dị iche iche a ga-eme iji belata ihe ize ndụ nke obere ihe omume dị iche iche ịmụba wee ghọọ agha nuklia zuru ụwa ọnụ. Akwụkwọ bụ́ Stockholm International Peace Research Institute Yearbook 1990 na-egosipụta ihe ijuanya o nwere na mba “ndị dị n’akụkụ ndị ọzọ nke ụwa” enweghị mmasị n’ihe omume ndị dị otú ahụ.
Otú ọ dị, nye ọtụtụ nde ndị bi ná mba ndị dara ogbenye, “ịnọ ná ntụkwasị obi” pụtara ihe oriri na nlekọta ahụ ike. “Mgbe a bịara n’iche echiche banyere ‘udo na ịnọ ná ntụkwasị obi,’” ka onye ọkà mmụta ihe banyere ndọrọ ndọrọ ọchịchị, bụ́ Yash Tandon kọwara, “echiche ọha mmadụ nke otú akụkụ Ọwụwa Anyanwụ Ụwa na-esi ele ihe anya na-emeri. . . . ‘Ịnọ ná ntụkwasị obi’ bụ nke a na-ahụ dị ka okwu banyere ngwá agha na ịchịsa ngwá agha, nke na-emetụtaghị nchegbu ịnọ ná ntụkwasị obi nke ndị na-enweghị ihe oriri na ndị na-enweghị ebe obibi bụ́ ndị mejupụtara ụzọ abụọ n’ụzọ atọ nke ọnụ ọgụgụ ndị bi n’ụwa.”
Ma n’ihe banyere Bible, ọ na-ekwe nkwa na n’okpuru Alaeze Chineke, a gaghị enwekwa agha ọzọ. “[Ọ] na-eme ka agha nile kwụsị ruo nsọtụ ụwa; ọ na-agbaji ụta, gbupịakwa ube; ọ na-esure ụgbọ ala nile n’ọkụ.” (Abụ Ọma 46:9; Aịsaịa 2:4) Ọrịa anụ ahụ ga-abụ ihe gabigara agabiga. “Onye obibi ya agaghị asị, Ana m arịa ọrịa: a ga-ebupụ ajọ omume nke ndị bi n’ime ya.”—Aịsaịa 33:24.
N’okpuru Alaeze ahụ, anọghị ná ntụkwasị obi nke akụ na ụba agaghị eyikwa onye ọ bụla egwu ọzọ. “Ha ga-ewukwa ụlọ, biri n’ime ha; ha ga-akụkwa ubi vine, rie mkpụrụ ha. Ha agaghị ewu ụlọ, onye ọzọ ebichie; ha agaghị akụ, onye ọzọ erie.”—Aịsaịa 65:21, 22.
Ma, nke ka mkpa bụ na Alaeze ahụ ga-ewepụ ihe bụ isi nke na-akpata enweghị udo na ịnọ ná ntụkwasị obi. Ònye nọworo na-akpali ogologo akụkọ ihe mere eme nke ọchịchị nchịgbu na-agabeghị nke ọma nke ụmụ mmadụ? Ọ bụ ezie na Chineke enwewo ezi ihe mere o ji kwere ka ha dịgide, onye ụta na-aghaghị ịdịrị bụ Setan, ebe Bible na-asị na ‘ụwa dum na-atọgbọ n’aka ya.’—1 Jọn 5:19.
Ya mere, lee ihe ntụsara ahụ ọ ga-abụ n’okpuru Alaeze Chineke, mgbe okwu Pọl gwara ndị Rom ga-emesịa mezuo: “Ma Chineke nke udo ga-azọpịa Setan n’okpuru ụkwụ unu ọsọ ọsọ”! (Ndị Rom 16:20) Ọ bụ nanị Alaeze eluigwe nke Chineke, n’okpuru Eze bụ Jisọs Kraịst, pụrụ imezu ihe dị otú ahụ. N’ihi ya, ọ bụ nanị n’okpuru Alaeze ahụ ka a ga-eme ka ụwa ghọọ paradaịs.—Jenesis 1:28; Luk 23:43.
Ee, ịnọ ná ntụkwasị obi nke e kwere nkwa ya na Bible dị mma nke ukwuu karị, nweekwa mmetụta dị ukwuu karịa ihe ọ bụla mmadụ chepụtaworo. Ee, anyị na-agụ na “ọnwụ agaghị adịkwa ọzọ; iru újú ma ọ bụ ịkwa ákwá ma ọ bụ ahụ ụfụ agaghị adịkwa ọzọ”! (Mkpughe 21:4) Ànyị pụrụ ịtụkwasị obi n’ụdị nkwa ndị dị otú ahụ? Ee, n’ihi na ha sitere n’ọnụ Onye Okike ahụ nke pụrụ ime ihe nile, bụ́ Jehova Chineke, onye kwukwara, sị: “Okwu m nke . . . na-esi n’ọnụ m pụta: ọ gaghị alaghachikwute m n’efu, ma ọ bụrụ na o bughị ụzọ mezuo ihe tọrọ m ụtọ, wee gaa nke ọma n’ihe m zigara ya.” (Aịsaịa 55:11) E ji n’aka na ha ga-aga nke ọma, bụ́ ihe ndị Jehova Chineke na-eme ọbụna ugbu a iji wetara ihe a kpọrọ mmadụ udo, ịnọ ná ntụkwasị obi, na ihe ịga nke ọma nke na-adịgide adịgide, na-enyekwa obi ụtọ iji wepụ ịbụ ọkaaka ebighị ebi Ya n’ụta.