“Ọnọdụ Ụwa Ọhụrụ” nke Mmadụ Ọ̀ Dị Nso?
1. Olee otú e siworo gosipụta ọchịchọ maka inwekwu nnwere onwe ndọrọ ndọrọ ọchịchị n’afọ ndị gara aga na-adịbeghị anya?
TAA, ọtụtụ nde mmadụ nọ n’agbụ okpukpe ụgha, ọtụtụ na-ahọrọkwa ịnọgide otú ahụ. N’otu oge ahụ, ọnụ ọgụgụ na-arịwanye elu na-achọ nnwere onwe dị iche iche nke ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Ihe ndị pụrụ iche mere n’oge na-adịbeghị anya gara aga n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Europe na n’ebe ndị ọzọ egosipụtawo na ndị mmadụ chọrọ ụdị ọchịchị ndị e nwere nnwere onwe na ha karị. Dị ka ihe si na ya pụta, ọtụtụ na-asị na ọgbọ ọhụrụ nke nnwere onwe dị nso. Onye isi ala United States kpọrọ ya “ọnọdụ ụwa ọhụrụ.” N’ezie, ndị ndú ụwa n’ebe nile na-asị na Agha Nzuzo ahụ na ịsọ mpí nkwakọba ngwá agha akwụsịwo, nakwa na ọgbọ ọhụrụ nke udo eruteworo ihe a kpọrọ mmadụ.—Tụlee 1 Ndị Tesalọnaịka 5:3.
2, 3. Ọnọdụ ndị dị aṅaa na-eme ihe megide ezi nnwere onwe?
2 Ma, ọbụna ma a sị na mgbalị ụmụ mmadụ eweta ọnụ ọgụgụ ngwá agha dị ala karị na ụdị ịchịisi ndị na-enye nnwere onwe ka ukwuu, ezi nnwere onwe ọ̀ ga-adị n’ezie? Ee e, n’ihi ajọ nsogbu ndị e nwere ná mba nile, gụnyere ndị nke nwere ọchịchị onye kwuo uche ya, ebe ọnụ ọgụgụ ndị ogbenye na-arị elu, ọtụtụ nde mmadụ na-enwe ihe isi ike inweta ihe e ji ebi ndụ. Otu akụkọ òtù United Nations kọrọ na-ekwu na n’agbanyeghị ọganihu ndị e nwere na sayensị na ná nkà ọgwụ, kwa ụbọchị nkezi nke 40,000 ụmụaka na-anwụ site n’erighị nri na-edozi ahụ ma ọbụ ọrịa ndị a pụrụ igbochi egbochi. Otu ọkachamara n’okwu a sịrị: “Ịda ogbenye na-aghọwanye ihe iyi egwu nye ọdịnihu nke ịdị adị ụmụ mmadụ.”
3 Ọzọkwa, ọtụtụ ndị mmadụ karịa ka ọ dịworo na mbụ na-abụ ndị imempụ nke nọgidere na-adị ụjọ karị dakwasịrị. Ịkpọ asị agbụrụ, ndọrọ ndọrọ ọchịchị na okpukpe na-etirisị mba dị iche iche. N’ebe ụfọdụ, ọnọdụ ahụ adịghị nnọọ iche pụọ n’oge dị n’ihu nke e buru amụma ya na Zekaraịa 14:13, mgbe ndị mmadụ ga-anọ “n’oké mgbagwoju anya na ụjọ nke na onye ọ bụla ga-ejide onye nọ ya n’akụkụ ma wakpo ya.” (Today’s English Version) Ịṅụ ọgwụ ọjọọ na ọrịa ndị a na-ebute site ná mmekọahụ jupụtara ebe nile. Ọtụtụ nde mmadụ bu ọrịa AIDS; n’ime United States nanị, ihe karịrị 120,000 anwụworị site na ya.
Ịnọ n’Agbụ nye Mmehie na Ọnwụ
4, 5. N’agbanyeghị nnwere onwe ndị e nwere taa, ụdị agbụ dị aṅaa jikpara mmadụ nile?
4 Otú ọ dị, ọbụna ma ọ bụrụ na ọ dịghị nke n’ime ajọ ọnọdụ ndị a dịnụ, ndị mmadụ agaraghịkwarị enwe ezi nnwere onwe. Mmadụ nile ga-anọ n’agbụ. N’ihi gịnị ka o ji dị otú ahụ? Iji maa atụ: Gịnị ma ọ bụrụ na onye ọchịchị aka ike emee ka onye ọ bụla nọ n’ụwa nọrọ n’ohu ma gbuo ha nile? N’ikwu ihe otú ọ dị, nke ahụ bụ ihe mere ihe a kpọrọ mmadụ mgbe nne na nna anyị mbụ nupụrụ isi megide Chineke ma banye n’ohu nye ịchịisi mmegbu nke Ekwensu.—2 Ndị Kọrint 4:4.
5 Mgbe Chineke kere ụmụ mmadụ, o zubere ka ha biri n’elu ụwa ruo mgbe ebighị ebi n’izu okè n’ime paradaịs, dị ka Jenesis isi 1 na 2 na-egosi. Ma n’ihi nnupụisi nna anyị mbụ bụ́ Adam megide Chineke, anyị nile nọ n’okpuru ọmụma ikpe nke ọnwụ site n’oge a tụụrụ ime anyị: “Dị ka mmehie si n’aka otu mmadụ [Adam, onye isi ezinụlọ nke ihe a kpọrọ mmadụ] baa n’ụwa, dị ka ọnwụ si n’aka mmehie baakwa; ọnwụ si otú a gabiga ruo mmadụ nile.” Dị ka Bible na-ekwu sị, ‘ọnwụ wee bụrụ eze.’ (Ndị Rom 5:12, 14) Ya mere n’agbanyeghị ókè nnwere onwe anyị pụrụ inwe n’onwe anyị, mmadụ nile nọ n’agbụ nye mmehie na ọnwụ.
6. N’ihi gịnị ka e ji nwee mmeziwanye ihe dị nta n’ogologo ndụ a na-atụ anya ịdị eri e desịrị Abụ Ọma 90:10?
6 N’ịgakwa n’ihu, ndụ anyị na-adị ugbu a bụ nke a kpaara ókè nke ukwuu. Ọbụna nye ndị ihe dabaara nke ọma, ọ bụ nanị iri afọ ole na ole. Nye ndị ihe na-adịghị adabara nke ọma, nanị afọ ole na ole ma ọ bụ ọ dị ala karị. Otu ihe ọmụmụ e mere ọhụrụ kọkwara, sị: “Nkà mmụta sayensị na ọgwụ ewetawo afọ ndụ mmadụ ruo n’ókè ọ ga-ejedebe.” Nke a bụ n’ihi na e wunyere ezughị okè na ọnwụ n’usoro mkpụrụ ndụ anyị dị ka ihe mmehie nke nne na nna anyị mbụ rụpụtara. Lee ka o si bụrụ ihe mwute na ọ bụrụ na anyị adịruo ndụ 70 ma ọ bụ 80 afọ, mgbe anyị kwesịrị ịdị na-enwe amamihe ma na-enwe ọṅụ ná ndụ karị, anụ ahụ anyị na-adakpọ, anyị na-aghọkwa ájá!—Abụ Ọma 90:10.
7. N’ihi gịnị ka ndị mmadụ ga-eji ghara ịbụ mgbe ọ bụla isi iyi nke ezi nnwere onwe ndị anyị na-achọ na ndị dị anyị mkpa?
7 Ụdị ọchịchị dị aṅaa nke mmadụ ga-enwe ike igbochi ịbụ ohu nke a nye mmehie na ọnwụ? Ọ dịghị nke ọ bụ. Ọ dịghị ndị ọchịchị ọ bụla, ndị ọkà mmụta sayensị ma ọ bụ dọkịta n’ebe ọ bụla nke pụrụ ime ka anyị nwere onwe anyị pụọ n’ọbụbụọnụ nile nke ọrịa, ịka nká, na ọnwụ, ọ dịghịkwa nke pụrụ iwepụ anọghị ná ntụkwasị obi, enweghị nnwere onwe, ikpe na-ezighị ezi, imempụ, agụụ na ịda ogbenye. (Abụ Ọma 89:48) N’agbanyeghị otú ebumnuche ụmụ mmadụ pụrụ isi dị mma, ọ bụ ihe na-agaghị ekwe ha omume ịbụ isi iyi nke ezi nnwere onwe ndị anyị chọrọ na ndị dị anyị mkpa.—Abụ Ọma 146:3.
Iji Nnwere Onwe Ime Nhọrọ Mee Ihe n’Ụzọ Na-ezighị Ezi
8, 9. Gịnị tinyere ihe a kpọrọ mmadụ n’ọnọdụ dị mwute ọ nọ na ya ugbu a.?
8 Ezinụlọ ụmụ mmadụ nọ n’ọnọdụ nke a dị mwute n’ihi na Adam na Iv ji inwe onwe ime nhọrọ ha mee ihe n’ụzọ na-ezighị ezi. Pita nke Mbụ 2:16 na-asị, dị ka The Jerusalem Bible si kwuo ya: “Na-emenụ omume dị ka ndị nweere onwe ha, unu ejikwala nnwere onwe unu mere ihe ngọpụ maka ajọ omume.” Ya mere, o doro anya na Chineke ezubeghị ka nnwere onwe mmadụ bụrụ nke a na-akparaghị ókè. Ọ gaje ịbụ nke e ji mee ihe n’ime usoro nke iwu Chineke nile, bụ́ ndị ziri ezi na ndị gaje ịrụpụtara mmadụ nile ihe bara uru. Usoro ndị ahụ buru ibu hie nne inye ohere maka nnwere onwe ime nhọrọ nke onwe onye, ka ọchịchị Chineke ghara ịbụ nke mmegbu.—Deuterọnọmi 32:4.
9 Otú ọ dị, nne na nna mbụ anyị họọrọ ikpebiri onwe ha ihe bụ ezi ihe na ihe bụ ihe ọjọọ. Ebe ọ bụ na ha kpachaara anya pụọ n’ọchịchị Chineke, o wepụrụ nkwado ya pụọ n’ebe ha nọ. (Jenesis 3:17-19) Ha si otú ahụ ghara izu okè, na-enwe ọrịa na ọnwụ dị ka ihe si na nke ahụ pụta. Kama nnwere onwe, ihe a kpọrọ mmadụ banyere n’ohu nye mmehie na ọnwụ. Anyị ghọkwara ndị nọ n’okpuru echiche nile nke ndị ọchịchị bụ mmadụ na-ezughị okè, ndị na-enwekarịkwa obi ọjọọ.—Deuterọnọmi 32:5.
10. Olee otu Jehova siworo jiri ịhụnanya lekọta ihe ndị na-emenụ?
10 Chineke ekwewo ka ụmụ mmadụ mee nnwale nke a nke ihe a sị na ọ bụ nnwere onwe zuru ezu ruo nanị ogologo oge a kpaara ókè. Ọ matara na ihe ga-esi na nke ahụ pụta ga-egosipụta n’enweghị ihe ịrụ ụka ọ bụla na ọchịchị mmadụ nke na-adabereghị n’ebe Chineke nọ apụghị inwe ihe ịga nke ọma. Ebe ọ bụ na inwe onwe ime nhọrọ, ma e jiri ya mee ihe nke ọma, bụ ihe dị oké ọnụ ahịa otú a, Chineke n’ịhụnanya ya kwere ná mkpirikpi oge ka ihe meworo mee kama iwepụ onyinye nke inwe onwe ime nhọrọ.
‘Mmadụ Apụghị Iduzi Nzọụkwụ Ya’
11. Olee otú akụkọ ihe mere eme si kwadoo izi ezi nke Bible?
11 Ihe ndekọ akụkọ ihe mere eme egosiwo izi ezi nke Jeremaịa isi nke 10, amaokwu nke 23 na 24, nke na-asị: “Ọ bụghị onye ọ bụla na-eje ije nwe ime ka nzọụkwụ ya guzosie ike. Dọọ m aka ná ntị, Jehova.” Akụkọ ihe mere eme egosiwokwa izi ezi nke Eklisiastis 8:9, nke na-ekwupụta, sị: “Mmadụ nwere ike n’ahụ mmadụ ibe ya imejọ ya.” Lee otú nke ahụ si bụrụ eziokwu! Ezinụlọ ụmụ mmadụ esiwo n’otu ọdachi gaa n’ọzọ, ili bụkwa ọgwụgwụ nke dịịrị mmadụ nile. Pọl onyeozi kọwara ọnọdụ ahụ nke ọma mgbe o kwuru, dị ka e dekọrọ ya ná Ndị Rom 8:22, sị: “Anyị matara na ihe e kere eke nile na-asụkọ ude, ime na-emekọkwa ha, ruo ugbu a.” Ee, adabereghị n’ebe iwu nile nke Chineke dị abụwo ọdachi.
12. Gịnị ka akwụkwọ ụfọdụ nke ụwa na-ekwu banyere nnwere onwe zuru ezu?
12 Akwụkwọ bụ́ Inquisition and Liberty kwuru okwu banyere nnwere onwe n’ụzọ dị otú a: “Ịnọrọ onwe onye abụkebeghị, n’onwe ya, ezi ihe: ọ bụghị ihe a pụrụ iji nyaa isi ma ọ bụrụ na e nweghị iru eru ndị ọzọ. N’ezie, ọ pụrụ nnọọ ịbụ otu n’ime ụdị ọchịchọ ọdịmma onwe onye ndị kasị njọ . . . Mmadụ abụghị, ọ pụghịkwa ma ọ bụghị n’ụzọ ezi echiche na-adịghị na ya ọbụna inwe ọchịchọ ịbụ, ihe e kere eke nọọrọ onwe ya kpam kpam.” Nwa eze bụ́ Prince Philip nke England kwukwara n’otu mgbe, sị: “Nnwere onwe ime ihe ọ bụla uche na mkpali mmadụ chọrọ ime pụrụ ịbụ ihe na-adọrọ mmasị, ma ahụmahụ na-akụzi ugboro ugboro na nnwere onwe nke na-enweghị mgbochi onwe onye . . . na ịkpa àgwà n’echebaraghị ndị ọzọ echiche bụ ụzọ a kasị jide n’aka e si ebibi ọdịdị nke ndụ a na-adị n’ógbè, n’agbanyeghị otú o nweruru akụ na ụba.”
Ònye Maara Ihe Kasị Mma?
13, 14. Ọ̀ bụ nanị onye pụrụ iweta ezi nnwere onwe maka ezinụlọ ụmụ mmadụ?
13 Ọ̀ bụ onye maara ụzọ kasị mma e kwesịrị isi hazie ebe obibi—nne na nna na-ahụ anya, ndị nwere ikike na ahụmahụ ka ọ bụ ụmụaka na-eto eto? Azịza ya doro anya. N’otu aka ahụ, Onye Okike nke ụmụ mmadụ, Nna anyị nke eluigwe, maara ihe kasị mma maka anyị. Ọ maara otú e kwesịrị isi hazie ma chịa òtù ụmụ mmadụ. Ọ maara otú e kwesịrị isi duzie inwe onwe ime nhọrọ iji wetara mmadụ nile abamuru nile nke ezi nnwere onwe. Nanị Chineke onye pụrụ ime ihe nile, bụ́ Jehova, maara ụzọ isi dọpụta ezinụlọ ụmụ mmadụ site n’agbụ e kere ya ma nye ezi nnwere onwe maka mmadụ nile.—Aịsaịa 48:17-19.
14 N’Okwu ya, ná Ndị Rom 8:21, Jehova na-ekwe nkwa nke a na-akpali akpali, sị: “A ga-eme ka ihe e kere eke onwe ya pụọkwa n’ịbụ ohu mmebi baa n’ọnọdụ inwe onwe ya nke ebube nke ụmụ Chineke.” Ee, Chineke na-ekwe nkwa ime ka ezinụlọ ụmụ mmadụ nwere onwe ya kpam kpam pụọ n’ọnọdụ ọjọọ ọ nọ na ya ugbu a. Isiokwu na-esonụ ga-atụle ụzọ nke a ga-esi mee.
Olee Otú Ị Ga-esi Zaa?
(Ịtụleghachi peji nke 3 ruo 8)
◻ N’ihi gịnị ka ụmụ mmadụ ji enwe mmetụta dị ike banyere nnwere onwe?
◻ N’ụzọ ndị dị aṅaa ka e siworo mee ndị mmadụ ohu n’akụkọ ihe mere eme nile?
◻ N’ihi gịnị ka Jehova jiworo kwere iji inwe onwe ime nhọrọ eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi dịgide ogologo oge otú a?
◻ Ọ̀ bụ nanị onye pụrụ inweta ezi nnwere onwe nye ihe nile a kpọrọ mmadụ, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị?
[Foto dị na peeji nke 7]
Ogologo ndụ mmadụ bụ nnọọ dị ka e kwuru ya 3,500 afọ gara aga n’Abụ Ọma 90:10
[Ebe E Si Nweta Foto]
Site n’ikike British Museum