Ịnabata Ụwa Ọhụrụ Chineke nke Nnwere Onwe
“[Chineke] ga-ehichapụkwa anya mmiri nile ọ bụla n’anya ha; ọnwụ agaghị adịkwa ọzọ; iru újú ma ọ bụ ịkwa ákwá ma ọbụ ahụ ụfụ agaghị adịkwa ọzọ.”—MKPUGHE 21:4.
1, 2. Ọ̀ bụ nanị onye pụrụ iweta ezi nnwere onwe, gịnịkwa ka anyị pụrụ ịmụta site na Bible banyere Ya?
AKỤKỌ ihe mere eme egosiwo ịbụ eziokwu nke ihe onye amụma bụ́ Jeremaịa kwuru: “Ọ bụghị n’aka ya onwe ya ka ụzọ mmadụ dị: ọ bụghị onye ọ bụla nke na-eje ije nwe ime ka nzọụkwụ ya guzosie ike.” Ọ̀ bụ nanị onye pụrụ ime ka ụzọ mmadụ guzosie ike? Jeremaịa gara n’ihu ikwu, sị: “Dọọ m aka ná ntị, Jehovah.” (Jeremaịa 10:23, 24) Ee, ọ bụ nanị Jehova pụrụ iweta ezi nnwere onwe site ná nsogbu ndị na-eti ezinụlọ ụmụ mmadụ ihe otiti.
2 Bible nwere ọtụtụ ihe atụ nke ikike Jehova nwere iwetara ndị na-ejere ya ozi nnwere onwe. “Ka ha hà bụ́ ihe e dere n’akwụkwọ nsọ n’oge gara aga, e dere ha izi anyị ihe, ka anyị wee were ntachi obi na nkasi obi nke ihe nile e deworo n’akwụkwọ nsọ nwee olileanya.” (Ndị Rom 15:4) E dekọkwara ikpe nile nke Jehova megide okpukpe ụgha, ndị a jekwara ozi dị ka “ihe ịdụ anyị ọdụ, ndị ọgwụgwụ oge ndị a ruteworo.”—1 Ndị Kọrint 10:11.
Ịgbapụta Ndị Ya
3. Olee otú Jehova si gosi ikike o nwere ịtọhapụ ndị ya n’Ijipt?
3 Ihe atụ nke ikike Chineke nwere imezu ihe e kpere n’ikpe megide ofufe ụgha na ịgbapụta ndị na-eme uche ya weere ọnọdụ mgbe e mere ndị ya nke oge ochie ohu n’Ijipt. Ọpụpụ 2:23-25 na-asị: “Ntiku ha tikuru Chineke wee rịgoruo Chineke ntị, n’ihi ofufe [“ịgba ohu,” NW] ahụ. Chineke wee nụ ịsụ ude ha.” N’otu ngosipụta dị ebube nke ịdị elu ya n’ebe chi ụgha dị iche iche nke Ijipt dị, Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Nile wetaara mba ahụ ihe otiti iri. A haziri ihe otiti nke ọ bụla iji wedaa otu chi dị iche iche nke Ijipt ala, na-egosi na ha bụ ụgha nakwa na ha apụghị inyere ndị Ijipt na-efe ha aka. N’ụzọ dị otú a, Chineke gbapụtara ndị ya ma bibie Fero na ndị agha ya n’Osimiri Uhie ahụ.—Ọpụpụ, isi 7 ruo 14.
4. N’ihi gịnị ka o ji ghara ịbụ ikpe na-ezighị ezi ka Chineke mezuo ihe o kpere n’ikpe megide ndị Kenean?
4 Mgbe Chineke kpọbatara Israel na Kenean, e bibiri ndị bi na ya na-efe ndị mmụọ ọjọọ, e werekwa ala ahụ nye ndị Chineke. Dị ka Ọkaaka Eluigwe na Ala, Jehova nwere ikike imezu ihe o kpere n’ikpe n’isi okpukpe ndị rụrụ arụ. (Jenesis 15:16) Metụtakwa okpukpe ndị Kenean, akwụkwọ bụ́ Bible Handbook nke Halley dere na-asị: “Ofufe nke . . . chi nile nke ndị Kenean jupụtara n’imebiga ihe arụ ókè. Ụlọ nsọ ha nile bụ ogige nke ajọ omume. . . . Ndị Kenean fere ofufe, site n’itinye aka n’ihe omume rụrụ arụ, dị ka ememe okpukpe, n’ihu chi ha; mgbe ahụkwa, site n’igbu ụmụ ha ndị e buru ụzọ mụọ, dị ka àjà nyekwa chi ndị ahụ. O yiri ka, n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị ukwuu, ala Kenean aghọwo nke yiri Sọdọm na Gọmọra n’ọ̀tụ̀tụ̀ zuru mba ọnụ.” O kwukwara, sị: “Mmepeanya nke omume rụrụ arụ na nke ime ihe ike jọgburu onwe ya dị otú ahụ ọ̀ ka kwesịrị ịnọ na-adịgide? . . . Ọ tụrụ ndị ọkà n’igwupụta ihe mgbe ochie bụ́ ndị gwuru ihe ná mkpọmkpọ ebe ndị ahụ nke obodo ndị Kenean n’anya na Chineke ebibighị ha n’oge karịa ka o mere.”
5. Olee otú Chineke ịtọhapụ ndị ya n’oge ochie si eje ozi dị ka ihe atụ nye oge anyị?
5 Ihe ndekọ a nke Chineke ime ihe megide ofufe ụgha, ịgbapụta ndị ya na ha gbara ndụ, na inye ha ala ahụ e kwere ná nkwa nọ dị ka ihe atụ nke ihe ndị gaje ịbịa. Ọ na-atụ aka n’ọdịnihu dị nnọọ nso mgbe Chineke ga-etipịa okpukpe ụgha nile nke ụwa nke a na ndị nkwado ha wee webata ndị na-ejere ya ozi n’oge ndị a n’ime ụwa ọhụrụ nke ezi omume.—Mkpughe 7:9, 10, 13, 14; 2 Pita 3:10-13.
Ezi Nnwere Onwe n’Ụwa Ọhụrụ Chineke
6. Gịnị bụ ụfọdụ n’ime nnwere onwe ndị dị ebube nke Chineke ga-eweta n’ụwa ọhụrụ?
6 N’ụwa ọhụrụ ahụ, Chineke ga-eji akụkụ nile dị ebube nke nnwere onwe nke o zubeworo maka ezinụlọ ụmụ mmadụ gọzie ndị ya. A ga-enwe nnwere onwe pụọ ná mmegbu ndọrọ ndọrọ ọchịchị, akụ na ụba, na nke ihe ndị metụtara okpukpe ụgha. A ga-enwe nnwere onwe pụọ ná mmehie na ọnwụ, ndị mmadụ ga-enwe olileanya ịdị ndụ ebighị ebi n’elu ụwa. “Ndị ezi omume ga-enweta ala, birikwa n’elu ya ruo mgbe ebighị ebi.”—Abụ Ọma 37:29; Matiu 5:5.
7, 8. Ahụmahụ dị aṅaa ka a ga-enwe n’inwetaghachi ahụ ike zuru okè n’ụwa ọhụrụ?
7 Ngwa ngwa mgbe e webatasịrị ụwa ọhụrụ ahụ, a ga-esite n’ụzọ ọrụ ebube weghachi ndị bi n’ime ya n’ahụ ike zuru okè. Job 33:25 na-asị: “Anụ ahụ ya ga-adị ọhụrụ karị nke nwata; ọ na-alaghachiru ụbọchị okorobịa ya.” Aịsaịa 35:5, 6 na-ekwe nkwa, sị: “Mgbe ahụ ka a ga-emeghe anya ndị ìsì, ọ bụkwa ntị nke ndị ntị chiri ka a ga-emeghe. Mgbe ahụ ka onye ngwụrọ ga-amali dị ka ele, ire onye ogbi ga-etikwa mkpu ọṅụ.”
8 Unu ndị nwere adịghị ike nke anụ ahụ n’ihi ịka nká ma ọ bụ ahụ esighị ike, cheedị echiche gị onwe gị ịnọ n’ime ụwa ọhụrụ ahụ, na-eteta ụra n’ụtụtụ ọ bụla na-enwe ahụ ike na ume. Anụ ahụ gị nke dọlịrị adọlị enyewo ohere maka anụ ahụ dị mụrụ mụrụ—e nwekwaghị mkpa ude ndị ahụ e ji edozi akpụkpọ ahụ. E weghachiwo anya gị abụọ nke na-adịghị ahụchakwa ụzọ nke ọma ma ọ bụ nke kpuru ìsì gaa n’ịhụ ụzọ zuru okè—e nwekwaghị mkpa maka ugegbe anya. E weghachiwo ịnụ ihe n’ụzọ zuru ezu—tụfuo ihe ndị ahụ na-enye aka ịnụ ihe. Ụkwụ ndị dara ngwụrọ adịwo ike ugbu a ma zuo ezu—tụfuo mkpọrọ, mkpara, na oche mbugharị ndị ahụ. Ọrịa adịkwaghị—tụfusịa ọgwụ ndị ahụ. Otú a, Aịsaịa 33:24 na-ebu amụma sị: “Onye obibi ya agaghị asị, Ana m arịa ọrịa.” O kwukwara, sị: “Obi ụtọ na ọṅụ ka ha ga-abịarute, iru újú na ize ume ewee gbalaga.”—Aịsaịa 35:10.
9. Olee otú a ga-esi weta agha n’isi njedebe ruo mgbe ebighị ebi?
9 Ọ dịghị mgbe a ga-achụkwa onye ọ bụla n’àjà ọzọ nye agha. “[Chineke] na-eme ka agha nile kwụsị ruo nsọtụ ụwa; ọ na-agbaji ụta, gbupịakwa ube; ọ na-esure ụgbọ ala nile n’ọkụ.” (Abụ Ọma 46:9) Ọ dịkwaghị mgbe Onye Ọchịchị Alaeze Chineke, Kraịst Jisọs, bụ́ onye Aịsaịa 9:6 kpọrọ “Onye Isi Udo,” ga-ekwekwa ka ihe ndị e ji ebu agha dịrị. Amaokwu nke 7 na-agbakwụnye, sị: “Ọ dịghị ọgwụgwụ ọ bụla ịba ụba nke ịbụ onye isi ya na udo ya ga-agwụ.”
10, 11. Gịnị ka udo zuru ezu ga-apụtara ụwa?
10 Lee aha ngọzi ọ ga-abụrụ ihe a kpọrọ mmadụ, na ụwa nke a, inwere onwe ha site n’ihe ndị e ji ebu agha! Ee, n’oge dị ugbu a, ngwá agha ndị e jiri mee ihe n’agha ndị e buru n’oge gara aga ka na-ebibi ndị mmadụ. N’otu mba, France, e gbuwo ihe karịrị 600 ndị nwere nkà n’ibibisị bọmbụ e liri n’ala kemgbe 1945 ebe ha na-agbalị ibibi bọmbụ ndị a hapụrụ site n’agha ndị a lụburu na mbụ. Onye isi ndị na-ahụ maka ibibisị bọmbụ e liri n’ala n’ebe ahụ kwuru sị: “Anyị ka nọ na-achọpụta ogbunigwe ndị a na-agbaghị agba site n’agha France na Prussia nke afọ 1870. E nwere ọdọ mmiri ndị jupụtara na bọmbụ e ji aka atụ ndị na-egbu egbu bụ́ ndị e ji mee ihe n’Agha Ụwa Mbụ. Mgbe mgbe, onye ọrụ ugbo na-anya traktọ e ji akọ ugbo na-arịfe ebe e liri ogbunigwe e ji ebibi ụgbọ agha tankị ndị e ji mee ihe n’Agha Ụwa nke Abụọ, nke ahụ na-agbawakwa, gbuo onye ahụ. Ihe ndị a jupụtara n’ebe nile.” N’afọ abụọ gara aga, The New York Times kwuru, sị: “N’ime 45 afọ kemgbe a lụsịrị Agha Ụwa nke Abụọ [ụlọ ọrụ ndị na-ebibisị bọmbụ ndị e liri n’ala] egwupụtawo nde 16 nke ogbunigwe shell n’ala [ndị France], 490,000 bọmbụ na 600,000 bọmbụ ndị e liri n’okpuru mmiri. . . . A ka gbachibidoro ọtụtụ nde eka ogige, bụ́ ndị jupụtara ná ngwá agha na ndị a gbara gburugburu site n’ihe odide ndị na-adọ aka ná ntị, sị: ‘Emetụla Aka. Ọ Na-egbu Egbu!’”
11 Lee ka ụwa ọhụrụ ahụ ga-esi dị iche! Onye ọ bụla ga-enwe ụlọ dị mma, nri n’ụba, ọrụ na-enyeghachi ụgwọ ọrụ, nke udo, nke ime ka ụwa dum ghọọ paradaịs. (Abụ Ọma 72:16; Aịsaịa 25:6; 65:17-25) Ọ dịghị mgbe ndị mmadụ, na ụwa, ga-abụ nke e ji ọtụtụ nde ihe ndị na-agbọwa agbọwa gbarisịa. Ụwa ọhụrụ dị otú ahụ bụ ihe Jisọs bu n’uche mgbe ọ gwara otu onye gosipụtara okwukwe n’ebe ọ nọ, sị: “Mụ na gị ga-anọ na Paradaịs.”—Luk 23:43, NW.
Nkụzi Zuru Ụwa Ọnụ Maka Ndụ
12, 13. Ọrụ nkụzi dị aṅaa ka Jisọs na Aịsaịa buru amụma ya maka oge anyị?
12 Mgbe mmadụ mụrụ banyere ụwa ọhụrụ Chineke, ọ na-amụtakwa na n’ụbọchị anyị, Jehova emepụtawo otu ọgbakọ zuru ụwa ọnụ a haziri maka ezi ofufe. Ọ ga-abụ akụkụ bụ isi nke ụwa ọhụrụ ahụ, Chineke jikwa ya eme ihe ugbu a izi ndị ọzọ banyere nzube ya nile. Nzukọ ndị Kraịst nke a na-arụ ọrụ nkụzi zuru ụwa ọnụ nke ụdịdị ya na ókè ya bụ ihe a na-ahụtụbeghị mbụ. Jisọs buru amụma na a ga-eme nke a. Ọ sịrị: “A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze eluigwe n’elu ụwa dum mmadụ bi, ka ọ bụrụ àmà nye mba nile; mgbe ahụ ka ọgwụgwụ ihe nile ga-erukwa.”—Matiu 24:14.
13 Aịsaịa kwukwara banyere ọrụ nkụzi nke a zuru ụwa ọnụ, sị: “Ọ ga-erukwa n’ikpeazụ nke ụbọchị ndị a [n’oge anyị], na ugwu nke ụlọ Jehova [ezi ofufe ya e buliri elu] ga na-eguzosi ike . . . mba nile ga-eruba n’ime ya dị ka osimiri. Ọtụtụ ndị dị iche iche ga-ejekwa, sị, Bịanụ, ka anyị rịgoruo ugwu Jehova . . . ọ ga-ezikwa anyị ụzọ ya ụfọdụ, anyị ga-ejekwa ije n’okporo ụzọ ya nile.”—Aịsaịa 2:2, 3.
14. Olee otú anyị pụrụ isi mata ndị Chineke taa?
14 Ya mere, ọrụ zuru ụwa ọnụ nke ịgba àmà banyere Alaeze Chineke bụ ihe àmà siri ike na anyị nọ nso n’ọgwụgwụ nke ajọ usoro ihe nke a nakwa na ezi nnwere onwe na-eru nso. Ndị ji ozi ahụ jupụtara n’olileanya nke ụwa ọhụrụ Chineke na-akpọtụrụ ndị mmadụ ka a kọwara n’Ọrụ 15:14 dị ka ‘otu ndị maka aha Chineke.’ Olee ndị na-ebu aha Jehova ma na-agba àmà gburugburu ụwa banyere Jehova na Alaeze ya? Ihe ndekọ akụkọ ihe mere eme nke narị afọ nke 20 na-aza: nanị Ndịàmà Jehova. Taa ọnu ọgụgụ ha karịrị nde mmadụ anọ n’ihe karịrị 66,000 ọgbakọ gburugburu ụwa.—Aịsaịa 43:10-12; Ọrụ 2:21.
15. N’ihe banyere ihe omume nile nke ndọrọ ndọrọ ọchịchị, olee otú anyị pụrụ isi mata ezi ndị na-ejere Chineke ozi?
15 Ihe àmà ọzọ nke na Ndịàmà Jehova na-emezu amụma ndị ahụ banyere ọrụ nkwusa Alaeze ka a na-ahụta n’Aịsaịa 2:4: “Ha ga-akpụgharịkwa mma agha ha nile ka ha bụrụ mma ogè, na ube ha nile ka ha bụrụ mma ịkwa osisi: mba agaghị ebuli mma agha megide mba, ha agaghị amụtakwa agha ọzọ.” Ya mere, ndị ahụ na-arụ ọrụ nkwusa ahụ zuru ụwa ọnụ banyere ịchịisi Alaeze Chineke aghaghị ịhapụ ‘ịmụtakwa agha ọzọ.’ Jisọs sịrị na ha ‘agaghị abụ akụkụ nke ụwa.’ (Jọn 17:16) Nke a pụtara na ha aghaghị ịnọpụ iche n’ihe omume ndọrọ ndọrọ ọchịchị nile, na-akwụnyereghị akụkụ ọ bụla n’esemokwu na agha nile nke mba nile. Òle ndị bụ ndị na-abụghị akụkụ nke ụwa, gharakwa ịdị na-amụta agha ọzọ? Ọzọ, ihe ndekọ akụkọ ihe mere eme nke narị afọ nke 20 na-agba akaebe sị: nanị Ndịàmà Jehova.
16. Ruo ókè hà aṅaa ka ọrụ nkụzi zuru ụwa ọnụ nke Chineke ga-ezu ezu?
16 Ọrụ nkụzi zuru ụwa ọnụ nke Ndịàmà Jehova na-arụ ga-anọgide na-aga n’ihu ọbụna mgbe Chineke wetasịrị ajọ ụwa nke dị ugbu n’isi njedebe. Aịsaịa 54:13 na-asị: “Ụmụ gị nile ga-abụ ndị mmụta Jehova.” Nkụzi nke a ga-eru nnọọ ala nke na Aịsaịa 11:9 na-ebu amụma, sị: “Ihe ọmụma Jehova ga-ejupụta ụwa, dị ka mmiri si ekpuchi oké osimiri.” Ọ ga-adị mkpa ịnọgide na-ezi ihe ọ bụghị nanị maka ndị lanarịrị ọgwụgwụ nke ụwa ochie nke a na ụmụ a pụrụ ịmụta n’ụwa ọhụrụ ahụ, kamakwa maka ọtụtụ ijeri ndị ga-alọghachi ná ndụ site ná mbilite n’ọnwụ. N’ikpeazụ, a ga-akụziri onye ọ bụla bi n’ụwa iji nnwere onwe ya ime nhọrọ mee ihe n’ụzọ kwesịrị ekwesị gburugburu ihe ndị Chineke nyere n’iwu. Gịnị ga-esi na nke ahụ pụta? “Ndị dị umeala n’obi ga-enweta ala; ịba ụba nke udo ga-atọkwa ha ụtọ.”—Abụ Ọma 37:11.
Nnwere Onwe Ndị Buru Ibu Ọbụna Ugbu A
17. Gịnị ka Mosis gwara ndị Chineke n’oge ochie ka ha mee?
17 Mgbe ndị Israel oge ochie na-achọ ịbanye n’Ala Nkwa ahụ, Mosis gwara ha okwu wee sị: “Eziwo m unu ụkpụrụ dị iche iche na ikpe dị iche iche, dị ka Jehova, bụ́ Chineke m, nyere m iwu, ka unu wee mee otú a n’etiti ala ahụ ebe unu onwe unu na-aba inweta ya. Debekwanụ ha, meekwa ha; n’ihi na nke a bụ amamihe unu na nghọta unu n’anya ndị nile, ndị ga-anụ ụkpụrụ ndị a nile, wee sị, Otú ọ dị, ndị maara ihe na ndị nwere nghọta ka mba ukwu a bụ. N’ihi na olee mba ukwu dị, nke nwere chi dị ya nso dị ka Jehova, bụ́ Chineke anyị, si dị n’ihe nile anyị kpọkuworo ya?”—Deuterọnọmi 4:5-7.
18. Ọbụna ugbu a, oké nnwere onwe ndị dị aṅaa na-abịara ndị na-ejere Chineke ozi?
18 Taa, ọtụtụ nde ndị na-efe Jehova na-achọkwa ịbanye n’otu ala e kwere ná nkwa—ụwa ọhụrụ ahụ. N’ihi na ha na-erubere iwu nile nke Chineke isi, ọ nọ ha nso, ha guzopụkwara iche site ná ndị nile. Ka ọ dị ugbu a, Chineke agbapụtawo ha site n’echiche nile nke okpukpe ụgha, ịkpọasị agbụrụ, iji ọgwụ eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi, ịhụ mba n’anya, agha, na njupụta ebe nile nke ọrịa ndị a na-ebute site ná mmekọahụ. Ọzọkwa, o jikọwo ha n’òtù ụmụnna ịhụnanya nke zuru ụwa ọnụ bụ́ nke a na-apụghị ikewa ekewa. (Jọn 13:35) Ọdịnihu adịghị enye ha nsogbu n’obi kama ha ‘na-eti mkpu ọṅụ n’ihi obi ịdị mma.’ (Aịsaịa 65:14) Lee aha oké nnwere onwe ha na-enwe ọbụna ugbu a site n’ijere Chineke ozi dị ka Onye Na-achị Achị!—Ọrụ 5:29, 32; 2 Ndị Kọrint 4:7; 1 Jọn 5:3.
Ịtọhapụ Ndị Ọzọ Site ná Nkwenkwe Ụgha Dị Iche Iche
19, 20. Olee otú e si atọhapụ ndị mmadụ site ná nkụzi Bible banyere ọnọdụ ndị nwụrụ anwụ?
19 Ọtụtụ ndị Ndịàmà Jehova na-ekwusara ozi ọma na-abịakwa inweta nnwere onwe ndị a. Dị ka ihe atụ, n’ala ebe e nwere ofufe ndị nna ochie, Ndịàmà Jehova na-eme ka ndị ọzọ mara na ndị nwụrụ anwụ adịghị ndụ n’ebe ọ bụla, na ha apụghịkwa imerụ ndị dị ndụ ahụ. Ndịàmà ahụ na-ehota Eklisiastis 9:5, nke na-asị na “ndị dị ndụ maara na ha ga-anwụ: ma ndị nwụrụ anwụ adịghị ama ihe ọ bụla.” Ha na-ezokwa aka n’Abụ Ọma 146:4, nke na-asị na mgbe mmadụ nwụrụ, “o wee laghachi n’ala o si pụta; n’ụbọchị ahụ echiche ya nile alawo n’iyi.” Ya mere Bible na-egosi na e nweghị mmụọ nke ndị nwụrụ anwụ ma ọ bụ mkpụrụ obi na-adịghị anwụ anwụ nke na-agwọ ọrịa ma ọ bụ na-eyi ndị dị ndụ egwu. Ya mere, ọ dịghị mkpa imefu ego a tara ahụhụ kpata iji kwụọ ndị dibịa amoosu ma ọ bụ ndị ụkọchukwu ụgwọ ije ozi ha.
20 Ezi ihe ọmụma dị otú ahụ nke Bible na-atọhapụ ndị mmadụ site n’ozizi ụgha nke ọkụ ala mmụọ na pọgatrị. Mgbe ndị mmadụ mụtara eziokwu Bible nke na ndị nwụrụ anwụ adịghị ama ihe ọ bụla, dị ka hà nọ n’oké ụra, ha adịghị echegbukwa onwe ha ọzọ banyere ihe meworo ndị ha hụrụ n’anya nwụrụ anwụ. Kama nke ahụ, ha na-elepụ anya gaa n’oge ahụ dị ebube nke Pọl onyeozi kwuru okwu banyere ya mgbe ọ sịrị: “Mbilite n’ọnwụ nke ndị ezi omume na nke ndị ajọ omume kwa gaje ịdị.”—Ọrụ 24:15.
21. Òle ndị ka ihe ịrụ ụka na-adịghị ya na ha ga-eso ná ndị a ga-akpọlite, gịnịkwa ka o yiri ka ọ ga-abụ mmeghachi omume ha?
21 Ná mbilite n’ọnwụ ahụ, ndị nwụrụ anwụ ga-alọghachite ná ndụ n’ụwa nke a tọhapụrụ ruo mgbe ebighị ebi site n’ọnwụ e ketara n’aka Adam. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ndị a kpọlitere ga-agụnye ụmụaka a chụrụ n’àjà nye chi ndị Kenean, dị ka Mọlek, ndị ikom na-eto eto a chụrụ n’àjà nye chi nile nke Aztec, na ọtụtụ nde a na-apụghị ịgụta ọnụ nke ndị a chụrụ n’àjà nye chi nke agha. Lee ka ọ ga-esi bụrụ ihe ijuanya na ihe obi ụtọ nye ndị a nkwenkwe ụgha dị iche iche jichiburu! Ndị dị otú ahụ a kpọlitere ga-enwezi ike iji obi ụtọ kwupụta, sị: ‘Olee ebe ajọ ọrịa gị nile nke na-efe efe dị, gị ọnwụ? Olee ebe mbipụ gị dị, gị Sheol?’—Hosea 13:14.
Chọọ Jehova
22. Ọ bụrụ na anyị chọrọ ibi n’ụwa ọhụrụ Chineke, gịnị ka ọ dị anyị mkpa iburu n’uche?
22 Ị̀ chọrọ ịdị ndụ n’ime ụwa ọhụrụ nke ezi omume Chineke, ebe a ga-enwe ezi nnwere onwe? Ya bụrụ otú ahụ, mgbe ahụ buru n’obi okwu ndị ahụ dị na 2 Ihe Emere 15:2, nke na-asị: “Jehova nọnyeere unu, mgbe unu nọnyeere ya; ọ bụrụkwa na unu achọọ ya, ọ ga-eme ka unu chọta ya; ma ọ bụrụ na unu ahapụ ya, ọ ga-ahapụ unu.” Burukwa n’uche na mgbalị nile i ji ezi obi na-eme ịmụta banyere Chineke na ime ihe na-atọ ya ụtọ agaghị efu ọhịa. Ndị Hibru 11:6 na-asị na Chineke bụ “onye na-enyeghachi ndị na-achọ ya ụgwọ ọrụ.” Ndị Rom 10:11 na-asịkwa: “A gaghị ekwe ka ihere mee onye ọ bụla nke kwere na ya.”
23. N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji nabata ụwa ọhụrụ Chineke nke nnwere onwe?
23 Na nso nso, a ga-enwe ụwa ọhụrụ Chineke nke nnwere onwe. N’ebe ahụ “a ga-eme ka ihe e kere eke onwe ya pụọkwa n’ịbụ ohu mmebi baa n’ọnọdụ inwe onwe ya nke ebube nke ụmụ Chineke.” “[Chineke] ga-ehichapụkwa anya mmiri nile ọ bụla n’anya ha; ọnwụ agaghị adịkwa ọzọ; iru újú ma ọ bụ ịkwa ákwá ma ọ bụ ahụ ụfụ agaghị adịkwa ọzọ.” (Ndị Rom 8:21; Mkpughe 21:4) Mgbe ahụ, ndị nile na-ejere Jehova ozi ga-eweli isi ha elu ma jiri ọṅụ nabata ụwa ọhụrụ Chineke nke nnwere onwe site n’ikwupụta, sị, ‘Ekele dịrị gị, Jehova, maka iweta ezi nnwere onwe n’ikpeazụ!’
Olee Otú Ị Ga-esi Zaa?
◻ Olee otú Jehova si gosipụta ikike o nwere ịtọhapụ ndị ya?
◻ Nnwere onwe ndị dị aṅaa dị ebube ka a ga-enwe n’ụwa ọhụrụ Chineke?
◻ Olee otú Jehova si akụziri ndị mmadụ ihe maka ndụ?
◻ Olee nnwere onwe ụfọdụ nke ndị Chineke na-enwe ọbụna ugbu a site n’ijere Jehova ozi?
[Foto dị na peeji nke 10]
Jehova gosipụtara ọkaaka ya n’isi chi ụgha dị iche iche nke Ijipt, na-atọhapụ ndị na-efe ya ofufe
[Foto ndị dị na peeji nke 13]
Taa, ezi ndị na-ejere Chineke ozi bụ ndị a na-amata site n’ịrụ ọrụ nkụzi ya zuru ụwa ọnụ na iburu aha ya