Ndị Nkwusa Alaeze Na-akọ
Ijezu Ókèala Dịpụrụ Iche na Paraguay Amịpụta Mkpụrụ
ALAKA ụlọ ọrụ Paraguay nke Watch Tower Society matara nke ọma mkpa e nwere ikwusa ozi ọma Alaeze n’ókèala ya nile. (Ọrụ 1:8) Nke a bụ oge ka mmadụ nile mụta banyere Alaeze ahụ na ijere Jehova ozi tupu o weta ọgwụgwụ nye ajọ usoro ihe dị ugbu a ná “mkpagbu ukwu” ahụ na-abịanụ. (Matiu 24:21, 22) Ahụmahụ ndị na-esonụ na-egosi ihe a na-eme iji nyere ndị mmadụ n’ókèala ọ na-adịghị ndị e kenyere ha aka. Alaka ụlọ ọrụ ahụ na-akọ, sị:
E mere ndokwa ijezu ókèala nile ọ na-adịghị ndị e kenyere ha site ná ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche nwa oge. N’ime ọnwa November ruo January nke afọ ije ozi 1990, 39 ụmụnna ndị nwoke na ndị nwanyị jezuru ngụkọta nke narị obodo ukwu na obodo nta ebe ndị a na-enwebeghị ndị nkwusa Alaeze. Ha nwere ike ikesa 6,119 akwụkwọ ukwu, 4,262 akwụkwọ nta, na 5,144 magazin. Dị ka ihe sitere n’ihe omume nke a, a na-eguzobe ìgwè ndị ọhụrụ nke ndị nkwusa.
◻ Otu nwanyị natara n’aka otu nwanna nwanyị bụ onye ọsụ ụzọ nke na-arụ ọrụ n’ókèala ọ na-adịghị ndị e kenyere ya akwụkwọ Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala. Onye ọsụ ụzọ ahụ gwara ya ka ya duziere ya ọmụmụ Bible, o jikwara obi ụtọ nakwere! Mgbe onye ọsụ ụzọ ahụ lọghachiri, ọ bụghị nanị nwanyị ahụ na-echere ya kamakwa di ya na ụmụ ya iri. Ná nleta ya ọzọ, ezinụlọ ahụ nakwa ndị enyi na ndị agbata obi ha dị njikere maka ọmụmụ Bible ahụ! Nwanyị ahụ akpọwo ha òkù, na-ekwu na ọmụmụ ihe ahụ dị mma nke ukwuu nakwa na olileanya na ngọzi ndị Jehova na-enye dị ebube. Nke a bụ ihe ọ na-adịbeghị onye gwara ya na mbụ, ya mere o metụtara ya n’ahụ na ndị agbata obi na ndị enyi ya kwesịkwara ịnụ ozi ọma nke a.
Oge ọ bụla onye ọsụ ụzọ ahụ duziri ọmụmụ ihe ahụ, a na-enwe ọtụtụ ndị bịaranụ nke na o yiri ka ọ bụ obere ọgbakọ. Ndị a nwere mmasị jụrụ ọtụtụ ajụjụ kerekwa òkè n’ọmụmụ ihe ahụ. Mgbe onye ọsụ ụzọ ahụ kọwara na o zugbo e jezuru ókèala ahụ, ya na ndị ibe ya ga-apụ gaa n’ebe ọzọ, nwanyị ahụ ji nchekasị jụọ ihe ga-eme ha. E mere ndokwa ka ụmụnna ndị nọ n’ọgbakọ kasị nso ebe ahụ were ọmụmụ ihe ahụ gaa n’ihu. Ugbu a e kenyewo ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche ọrụ inyere ndị a nwere mmasị, bụ́ ndị yiri atụrụ, aka.
◻ Ka ọ na-aga site n’ụlọ ruo n’ụlọ n’ókèala ọzọ ọ na-adịghị ndị e kenyere ya, otu nwanna nwanyị chọtara otu nwoke onye nwetara n’ihe dị ka afọ iri gara aga akwụkwọ Ezi-Okwu Ahu Nke Nedubà ná Ndu Ebigh-Ebi. Eri mgbe ahụ ya na Ndịàmà Jehova enwekwaghị mkpakọrịta. Otú ọ dị, ọ maara na Jehova, onye ọ na-akpọ Jehova nke usuu nile nke ndị agha, bụ ezi Chineke e nwere nanị ya nakwa na ọ bụ nanị Ya ka a ga-efe ofufe. Site ná nchepụta nke onwe ya, ọ nọwo na-agwa onye ọ bụla ọ maara banyere Jehova. N’ezie, kwa izu ọ na-eji ụkwụ aga kilomita 3 ileta otu di na nwunye nwere mmasị iji gwa ha okwu banyere Chineke n’ihi na, dị ka o si kwuo ya, ‘Ọ bụrụ na mụ akwụsị ileta ha, ha ga-echezọ Jehova.’ Tinyere di na nwunye nke a, e nwere mmadụ iri ọzọ chọrọ ọmụmụ Bible—ha nile n’ihi na onye nke a nwere mmasị kwusaara ha ozi ọma.
E kwesịrị ịrịba ama na nanị n’ụbọchị ole na ole tupu onye ọsụ ụzọ ahụ akpọtụrụ ya, otu nwoke a ekweghị ka ụkọchukwu ógbè ahụ na ndị so ya jiri onyinyo nwa agbọghọ ahụ na-amaghị nwoke bata n’ụlọ ya, na-akọwa na ya ekweghị n’onyinyo dị iche iche. Iwe juru ụkọchukwu ahụ obi. N’abalị ahụ nwoke ahụ kpekuru Jehova ekpere maka enyemaka. Ya mere lee ka e si kpalie ya nke ukwuu, o nweekwa obi ụtọ mgbe onye ọsụ ụzọ ahụ kpọtụụrụ ya! E mere ndokwa ozugbo maka ọmụmụ Bible a haziri nke ọma, nwoke ahụ nọgidekwara na-enwe ọganihu ka ọ na-esonyere nzukọ ọchịchị Chineke.
N’eziokwu, Jehova na-agọzi ọrụ nchịkọbata ahụ na Paraguay ka ụmụnna ahụ na-agbalịsi ike ịgba àmà zuru ezu n’ókèala ndị a ọ na-adịghị ndị e kenyere ha.—Matiu 24:14.