Ụzọ nke Jehova Bụ Ụzọ Kasị Mma Isi Bie Ndụ
DỊ KA ERKKI KANKAANPÄÄ SI KỌỌ
SITE n’oge m bụ nwata, ihe mgbaru ọsọ m bụ ije ozi n’alaka ụlọ ọrụ Finland nke Ndịàmà Jehova, ma ọ bụ Betel dị ka e si akpọ ya. Ya mere mgbe otu onye nlekọta na-ejegharị ejegharị jụrụ m n’oge okpomọkụ nke afọ 1941, “Olee atụmatụ ndị i nwere maka ọdịnihu?” azara m, sị: “Anọwo m na-achọ ịga Betel.”
“Ọ kaara gị mma ịhapụ ịrọ nrọ ndị ahụ; o nweghị ihe mere ka a kpọọ gị,” ka o kwuru. Ná mbụ, enwere m oké nkụda mmụọ, ma mgbe ahụ ekpebiri m nanị ịhapụ okwu ahụ n’aka Jehova. N’ọnwa ole na ole nke ahụ gasịrị, anatara m akwụkwọ ịkpọ òkù ije ozi na Betel.
Abụ m nwa okoro dị afọ 17 nke na-eme ihere, mgbe m pịrị mgbịrịgba ọnụ ụzọ alaka ụlọ ọrụ ahụ dị na Helsinki n’ụbọchi oké oyi, nke na-amụ anwụ na November 1941. Ngwa ngwa Kaarlo Harteva, bụ́ onye nlekọta alaka ụlọ ọrụ ahụ, nabatara m. N’oge ahụ alaka ụlọ ọrụ ahụ na-elekọta 1,135 Ndịàmà e nwere na Finland.
Ihe Nketa Onye Kraịst
Na 1914 nna m enwetaworịị otu akwụkwọ ndị Watch Tower bụ́ The Divine Plan of the Ages. Otú ọ dị, agha ụwa mbụ tiwapụrụ ngwa ngwa nke ahụ gasịrị, o nwekwaghị ike ịgụ ya.
Mgba Finland na-agba inweta nnwere onwe mba ha kpatara ọtụtụ nsogbu. E guzobere òtù abụọ siri ike—ndị Na-acha Ọcha na ndị Na-acha Ọbara Ọbara. Ndị Na-acha Ọcha nọchitere anya ndị oké ozu na ndị nwetụrụ ihe, ebe ndị Na-acha Ọbara Ọbara nọchitere anya ndị ọrụ. Nna m nwara ịnọpụ iche, na-ewepụ onwe ya kpam kpam n’òtù abụọ ahụ. Ma, ha abụọ denyere aha ya dị ka onye a na-enyo enyo.
Dị ka o si dapụta, a mara Papa m ikpe ọnwụ ugbo abụọ, nke mbụ site n’aka ndị Na-acha Ọcha na e mesịa n’aka ndị Na-acha Ọbara Ọbara. Otu oge mgbe e gburu otu onye, a pụghịkwa ijide onye gburu ya, a mara ndị ikom iri na-eto eto, gụnyere nna m, ikpe ọnwụ. Otu n’ime ndị nkụzi nna m, bụ́ onye so n’òtù ikpe ahụ, kwuru ka a hapụ nna m, e kwerekwa. E gburu ndị ntorobịa itoolu ndị ọzọ ahụ.
N’oge ọzọ a hapụkwara Papa m site n’ọmụma ikpe ọnwụ. Mgbe nke ahụ gasịrị, o kpebiri izo n’ime ala, n’ụzọ nkịtị! Ya na nwanne ya nwoke gwuru ebe nzuzo n’ime ala, bụ́ ebe ha biri ruo mgbe agha ahụ kwụsịrị. Iji debe ha ndụ, nwanne ha nwoke nke nta na-ewetara ha nri na ihe ọṅụṅụ.
Mgbe agha ahụ kwụsịrị na 1918, Papa m lụrụ nwunye ma wuo ebe obibi ná nso ebe nzuzo ahụ. E mesịrị m mara ebe ahụ nke ọma, ebe o jere ozi dị ka ala egwuregwu nye m. Nna m gwara m na ya ekpewo ọtụtụ ekpere mgbe ọ na-ezo n’ebe ahụ n’okpuru ala. O kwere Chineke nkwa na ọ bụrụ na ya emesịa mụta ụzọ isi jeere Ya ozi, na ya ga-eme ya.
N’oge dị mkpirikpi ka ọ lụsịrị nwunye, Papa m kpebiri iwere ihe ọ ga-agụ ná njem azụmahịa. N’uko ụlọ, ọ chọtara akwụkwọ The Divine Plan of the Ages nke ọ zụtaworo n’ọtụtụ afọ gara aga. Ọ sapere ya n’isiakwụkwọ nke bụ́ “Ụbọchị Jehova” wee gụọ ya. Ọ nọgidere na-agwa onwe ya: ‘Nke a bụ eziokwu ahụ, nke a bụ eziokwu ahụ.’ Ka ọ na-arịtu site n’uko ụlọ ahụ, ọ gwara nne m, sị: “Achọtawo m ezi okpukpe ahụ.”
N’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ozugbo ahụ Papa m malitere ikwusara ndị ọzọ banyere ihe ndị ọ na-amụta, buru ụzọ na-agwa ndị ikwu na ndị agbata obi ya okwu. Mgbe ahụ ọ malitere ikwu okwu ihu ọha. Ngwa ngwa ndị ọzọ n’ógbè ahụ sonyeere ya. Ka ya na Ndị Mmụta Bible zutesịrị, dị ka a na-akpọ Ndịàmà Jehova mgbe ahụ, e mere Papa m baptism na 1923. Mgbe a mụrụ anyị bụ ụmụaka—anyị mesịrị dị anọ—Papa m elegharaghị ịkụziri anyị ihe anya. N’ezie, mgbe e guzobere otu ọgbakọ, a chọrọ anyị n’aka ịga nzukọ nke ọ bụla.
Ncheta nke Ihe Ndị Mere ná Mbụ
Ihe mere ná mbụ nke m na-echeta bụ mgbakọ e dokwara n’ọgbakọ dị n’obodo anyị na 1929, mgbe m dị afọ ise. Ọtụtụ ndị mmadụ zukọrọ site n’ọgbakọ ndị dị nso, onye nnọchianya sitere n’alaka ụlọ ọrụ nọkwa ya. N’ụbọchị ndị ahụ ọ bụ omenala, ma ọ dịghị ihe ọzọ na Finland, ịgọzi ụmụaka ná mgbakọ. Ya mere nwanna ahụ si Betel gọziri ụmụaka, dị nnọọ ka Jisọs mere n’oge ije ozi ya. Echezọbeghị m nke ahụ ma ọlị.—Mak 10:16.
Ihe ọzọ mere ná mbụ nke m na-echeta bụ nnabata nke aha ahụ bụ Ndịàmà Jehova na 1931. Nna m, n’ịmata ịdị mkpa nke oge ahụ, ji nsọpụrụ Chineke gụpụtara ọgbakọ ọkwa ahụ banyere aha ọhụrụ anyị.
Laa nnọọ azụ n’oge m pụrụ icheta, m ga-esonyere nna m n’ọrụ nkwusa. Iji malite, m ga-ege ya nanị ntị, ma emesịrị m na-arụ ọrụ ahụ nanị m. Na 1935, mgbe otu onye nlekọta na-ejegharị ejegharị letara anyị, m gakwuuru ndị agbata obi anyị nile ma kpọọ ha òkù ịbịa nzukọ. M nyekwara ha akwụkwọ nta dị iche iche, ụfọdụ ndị natakwara ndị a.
Ụlọ Akwụkwọ na Mkpebi Dị Mkpa
Anyị bụ́ ụmụaka anọ agwụla ndị nọ n’ụlọ akwụkwọ nwere nne na nna bụ́ Ndịàmà, ọtụtụ mgbe a na-akwa anyị emo n’ihi esonyereghị ndị ntorobịa ndị ọzọ n’omume na-abụghị nke ndị Kraịst. Ọ bụ ezie na ụmụ akwụkwọ ibe anyị nwara ịrafu anyị gaa n’ise siga, ọ dịghị mgbe m mere ya. E jikwa ịkwa emo na-akpọ anyị ndị Russell (Russell bụ onye isi oche mbụ nke Watch Tower Society) ma ọ bụ ndị Harteva (Harteva bụ mgbe ahụ onye nlekọta alaka ụlọ ọrụ Finland). Obi dị m ụtọ ikwu na ụfọdụ ndị ntorobịa bụ́ ndị na-akwabu anyị emo mesịrị ghọọ Ndịàmà.
Onye nkụzi m gbara m ume ịgakwu akwụkwọ, n’otu oge m tụlekwara ịghọ injinia. Ma mgbe ahụ e nwere mgbakọ Ndịàmà Jehova na Pori n’oge opupu ihe ubi nke 1939, nke wetara oké mgbanwe ná ndụ m. Mụ na nwanne m nwoke nke nta bụ́ Tuomo, raara onwe anyị nye Jehova ma gosipụta nke a site na baptism ime mmiri ná mgbakọ ahụ, na May 28, 1939. Mgbe ahụ, ná mmalite September, Agha Ụwa nke Abụọ tiwapụrụ.
Ọnọdụ ndị e nwere na Europe gbanwere nke ukwuu. Ọnọdụ dị n’etiti Finland na Soviet Union dịrị njọ. Nna m mesiri ya ike na Amagedọn na-eruwanye nso ma gbaa anyị ume ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ. Ya mere, na December 1940, mụ na nwanne m nwoke malitere ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ n’ebe ugwu Finland.
Ọrụ Ọsụ Ụzọ na Ozi Betel
Mgbe anyị na-arụ ọrụ ọsụ ụzọ, anyị na Yrjö Kallio bi n’akụkụ ka ukwuu nke oge ahụ. Ọ bụ nwanna nwoke onye, n’ihe dị ka 30 afọ tupu mgbe ahụ, ghọworo Onye Mmụta Bible na Pennsylvania dị na United States. Yrjö nweere mmụọ ịbụ enyi dị ukwuu, o mekwara ihe nile ọ pụrụ ime iji mee ka ọnọdụ dịrị anyị mma. Nwanne ya nwoke nne ji ha abụọ, bụ́ Kyösti Kallio, jere ozi dị ka onye isi ala nke Finland site 1937 ruo 1940. Yrjö gwara anyị na ya agbaworo nwanne ya nwoke àmà n’ụzọ zuru ezu, na-akọwara ya na Alaeze Chineke bụ olileanya e nwere nanị ya maka ọchịchị ọma na udo na-adịgide adịgide, nke zuru ụwa ọnụ.
Ka oge na-agafe, ọchịchọ m isonye n’ezinụlọ Betel rịrị elu. N’obi ụtọ, n’agbanyeghị ịdọ aka ná ntị onye nlekọta ahụ na-ejegharị ejegharị megide ime ka olileanya m rịa elu, a nabatara akwụkwọ m tinyere ije ozi na Betel. Ọrụ mbụ m rụrụ n’ebe ahụ bụ nke ibugharị ozi. Otú ọ dị, ngwa ngwa enwere m ihe ùgwù nke ịrụ ọrụ n’ebe obibi akwụkwọ. N’ebe ahụ m rụrụ ọrụ n’ọtụtụ ngalaba ọrụ, gụnyere ebe obibi akwụkwọ nta anyị na Ngalaba Mbupụ Akwụkwọ.
Ijigide Nnọpụiche
Na 1942, n’oge m dị afọ 18, a kpọrọ m ije ozi agha. Ebe m jụrụ idenye aha m, a gbara m ajụjụ ọnụ dị ogologo ọtụtụ mgbe, n’oge abụọ a tụdoro m égbè. N’oge ndị ọzọ e mesoro m ihe ike. Ọzọ, n’oge ịgba ajụjụ ọnụ, e debere m n’ọnụ ụlọ mkpọrọ a na-adịghị eme ka o kpoo ọkụ bụ́ ebe oyi na-atụru n’ọkpụkpụ.
N’ikpeazụ, na January 1943, oge ruru ka a tụọ mụ na Ndịàmà ndị ọzọ mkpọrọ. Ọchịagha nke gbaworo anyị ajụjụ ọnụ kwuru ka mkpọrọ anyị ghara ịdị ala karịa afọ iri. Ụkọchukwu ndị agha chọrọ ka a maa anyị ikpe siri ike ọbụna karị, na-ekwu n’otu akwụkwọ ozi ka ọ bụrụ ‘ọmụma ikpe ọnwụ ma ọ bụ iziga ndị a na-agba mgba okpuru na Russia dị ka ndị nledo si n’ụgbọ elu awụda [ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ọnwụ e ji n’aka], bụ́ ihe nke kwesịrị ha.’
E dokwara nnọkọ ikpe ụgha. A kpọpụtara m n’ihu nnọkọ ikpe ma maa m ikpe ọnwụ. Otú ọ dị, nke a mesịrị bụrụ mgbalị ọzọ e mere iji menye anyị egwu, ebe ọ bụ na mgbe e mesịrị n’ụbọchị ahụ a kpọkwara m n’ihu nnọkọ ikpe ahụ ọzọ ma maa m ikpe ịnọ afọ atọ na ọkara n’ebe ndebe ndị mkpọrọ. M tinyere akwụkwọ mkpegharị ikpe ahụ, e wee wetuo ya n’afọ abụọ.
N’ụlọ mkpọrọ, nri dị ụkọ, e nwekwara ajọ iyi egwu site n’aka ndị mkpọrọ ndị ọzọ. Ugbu abụọ ndị na-edina ụdị onwe ha wakporo m, ma ọ bụ ihe ndabara ọma na m nwere ike ịlanarị. Otu n’ime ha yiri egwu igbu m ma ọ bụrụ na m kwereghị ihe ọ chọrọ. Ma dị ka m mere n’ule m nile, akpọkuru m Jehova, o nyekwaara m aka. N’ezie, ihe iyi egwu onye mkpọrọ ahụ abụghị ihe nta, n’ihi na o gbuwo mmadụ mbụ. Mgbe a tọhapụsịrị ya, nwoke ahụ gburu onye ọzọ, e weghachikwa ya n’ụlọ mkpọrọ.
Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ọ bụ n’ihi na a maara Ndịàmà Jehova maka ịbụ ndị a pụrụ ịtụkwasị obi ka e ji mee m ngwa ngwa onye a na-atụkwasị obi. Ọrụ m bụ ikenye ndị mkpọrọ ndị ọzọ nri, e nyekwara m ohere ịgagharị gburugburu ụlọ mkpọrọ ahụ n’enweghị nsogbu. Ya mere, ọ bụghị nanị na m nwere nri zuru ezu maka onwe m kama m nwekwara ike ịhụ na e lekọtara ụmụnna m ndị Kraịst anya nke ọma. Ọbụna na otu nwanna buwanyere nnọọ ibu n’ụlọ mkpọrọ, bụ́ ihe a na-adịghị ahụkebe n’ihi ụkọ nri ahụ!
A tọhapụrụ m site n’ụlọ mkpọrọ na September 1944, n’otu ụbọchị ahụ a tọhapụrụ Nwanna Harteva. Ntọhapụ m pụtara ịlọghachi n’ozi Betel. Echere m n’onwe m sị, ‘Ịrụsi ọrụ ike hour 16 kwa ụbọchị na Betel dị nnọọ mma karịa ndụ a na-adị n’ụlọ mkpọrọ.’ Ajụbeghị m ọrụ mgbe ọ bụla eri mgbe ahụ!
Ihe Ùgwù Ije Ozi Dị Iche Iche
E mesịa na 1944, m zutere Margit, onye na-eto eto mara mma nke na-arụ ọrụ ọsụ ụzọ, onye zaghachiri mmasị m nwere n’ebe ọ nọ, anyị wee lụọ di na nwunye na February 9, 1946. N’ime afọ mbụ anyị dị ka di na nwunye, ejere m ozi na Betel ebe Margit rụrụ ọrụ na Helsinki dị ka ọsụ ụzọ. Mgbe ahụ na January 1947, e kenyere anyị ọrụ sekit.
N’ọrụ njegharị, ọtụtụ mgbe anyị na-anọnyere ezinụlọ dị iche iche ma soro ha biri n’otu ọnụ ụlọ. Anyị maara na ha na-enye ihe kasị mma ha pụrụ inye, ọ dịghịkwa mgbe anyị mere mkpesa. Sekit ndị ahụ pere mpe n’ụbọchị ndị ahụ, ọgbakọ ụfọdụ enweghịkwa Ndịàmà ọ bụla e mere baptism!
Na 1948 a kpọrọ anyị ịlọghachi n’ozi Betel. N’afọ abụọ n’ihu, Wallace Endres si United States bịa Finland, ngwa ngwa kwa a họpụtara ya dị ka onye nlekọta alaka ụlọ ọrụ. O ji ịnụ ọkụ gbaa anyị ume ịnọgide na-amụ Bekee, bụ́ nke anyị mere. Otú a, a kpọrọ anyị òkù ịbịa sonye na klasị ndị ozi ala ọzọ nke 19 nke Watchtower Bible School of Gilead, nke malitere na South Lansing, New York, na February 1952.
Mgbe anyị gụsịrị akwụkwọ e kenyere anyị ọrụ ịlaghachi Finland. Otú ọ dị, tupu anyị ahapụ United States, a zụrụ m iji ígwè obibi akwụkwọ ndị e nwere n’isi ụlọ ọrụ ụwa nile nke Ndịàmà Jehova na Brooklyn, New York, arụ ọrụ.
Ka anyị lọghachiri Finland, e kenyere anyị ọrụ njegharị, ma mgbe ahụ na 1955 a kpọghachiri anyị n’alaka Finland. N’afọ ahụ aghọrọ m onye nlekọta ebe obibi akwụkwọ, mgbe afọ abụọ gasịkwara, na 1957, a họpụtara ịbụ onye nlekọta alaka ụlọ ọrụ. Eri 1976, ejewo m ozi dị ka onye nchịkọta ọrụ nke Kọmitii Alaka Ụlọ Ọrụ nke Finland.
Ọ bụ ihe obi ụtọ na nne m na nna m nọgidere na-ekwesị ntụkwasị obi nye Jehova ruo ọnwụ ha. Mgbe oge na-aga, ihe karịrị otu narị ndị ikwu nna m ghọrọ Ndịàmà. Ruokwa taa, ụmụnne m ndị nwoke na ndị nwanyị na ezinụlọ ha nile na-ejere Jehova ozi, otu n’ime ụmụnne m ndị nwanyị bụkwa onye ọsụ ụzọ.
Ndụ Bara Uru, Na-enyeghachi Ụgwọ Ọrụ
Afọ ndị a abụrụwo nke jupụtara n’ọrụ, ma ọrụ ahụ, n’ihi na ọ bụ ọrụ Chineke, abụwo nke bara uru na nke na-enyeghachi ụgwọ ọrụ n’ezie. (1 Ndị Kọrint 3:6-9) Ndụ m abụbeghị ma ọlị nke gara were were mgbe nile na nke obi ụtọ. E nwewokwa ọtụtụ nsogbu na ihe isi ike. Ná mmalite ndụ m, amatara m na ị ghaghị ịmụta inye onwe gị ọzụzụ. Ị pụghị ime ihe mgbe nile kpọmkwem otú ị chọrọ. Ọtụtụ mgbe a gbaziri m olu, nwayọọ nwayọọ kwa, amụtara m ụzọ nke bụ ezie isi bie ndụ.
Dị ka ihe atụ, ule na ụkọ ndị e nwere n’oge agha kụziiri m ibi ndụ n’enweghị ihe okomoko. Amụtara m ịmata ma ihe ọ̀ dị mkpa n’ezie ma ọ bụ na ọ dịghị. M ka nwere àgwà nke ịdị na-ajụ onwe m ma ihe a ma ọ bụ nke ọzọ ọ̀ dị m mkpa. Mgbe ahụ kwa, ọ bụrụ na mụ achọpụta na ọ dịchaghị nnọọ mkpa, m gaghị azụ ya.
Nduzi Jehova nyeworo site ná nzukọ ya apụtawo ìhè. Enwewo m ọṅụ nke ịhụ ọnụ ọgụgụ Ndịàmà Jehova ka ọ rịrị elu n’oge m nọrọ n’alaka ụlọ ọrụ Finland site na 1,135 mmadụ ruo ihe karịrị 18,000! N’eziokwu, apụrụ m ịhụ na a gọziwo ọrụ m, ma amaara m na a gọziwo ya n’ihi na ọrụ ahụ bụ nke Jehova, ọ bụghị nke anyị. (1 Ndị Kọrint 3:6, 7) Ná mmalite ndụ m ahọọrọ m ụzọ Jehova, ọ bụrụwokwa n’ezie ụzọ kasị mma isi bie ndụ.
[Foto dị na peeji nke 23]
Erkki Kankaanpää na nwunye ya bụ́ Margit taa