Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w92 4/15 p. 30
  • Ị̀ Na-echeta?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ị̀ Na-echeta?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
  • Ndị Nkwado—Okwukwe Hà Bụ Ndị Gbachiteere Ozizi Ndị Kraịst Ka Hà Bụ Ndị Na-aga Ịghọ Ndị Ọkà Ihe Ọmụma?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
  • Jee Leta Ala Ahụ, Jee Leta Atụrụ Ndị Ahụ!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
  • “Hụkwanụ Eziokwu na Udo n’Anya”!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
w92 4/15 p. 30

Ị̀ Na-echeta?

Ị̀ chọpụtawo mbipụta ndị na-adịghị anya nke Ụlọ Nche ịbụ ndị baara gị oké uru? Mgbe ahụ gịnị ma ị nwalee ma ị ga-echeta ihe ndị a sonụ:

▫ Gịnị bụ nzube bụ isi dị n’ọgwụgwọ Jisọs gwọrọ ọrịa? Ha gosipụtara, maka agbamume nke oké ìgwè nke ndị yiri atụrụ taa, na a ga-agwọ ndị lanarịrị Amagedọn ọrịa n’oge na-adịchaghị anya mgbe Amagedọn gasịrị. (Aịsaịa 33:24; 35:5, 6)—12/15, peji 12.

▫ N’ihi gịnị ka ihe ncheta ahụ ji dị anyị mkpa mgbe nile, nke bụ: ‘Na-anọgidesinụ ike n’ikpere’? (Ndị Rom 12:12) Ihe nrụgide nke ndụ na ibu ọrụ dị iche iche pụrụ ịnyịgbu anyị nke ukwuu mgbe ụfọdụ nke na anyị pụrụ ichefu ikpe ekpere. Ma ọ bụ nsogbu pụrụ ịdị ike karịa anyị, na-eme ka anyị kwụsị inwe ọṅụ n’olileanya nke Alaeze ahụ, ọbụna na-akwụsị ikpe ekpere. Otú a, ihe ncheta dị anyị mkpa bụ́ ndị na-agba anyị ume ikpe ekpere ma si n’ụzọ dị otú a na-eme ka anyị bịaruo Jehova nso karị mgbe nile.—12/15, peji 14.

▫ Gịnị na-egosi na Iju Mmiri nke ụbọchị Noa bụ ihe agbụrụ mmadụ na-agaghị echefu echefu? E mewo atụmatụ na ihe karịrị 250 agbụrụ na ndị dị iche iche na-akọ ihe karịrị 500 akụkọ ifo Iju Mmiri. A na-ahụta myirịta ndị bụ isi n’akụkọ ifo ndị a nile.—1/15, peji 5.

▫ Olee otú ndị amụma ụgha e nwere n’oge a si yie ndị ahụ e nwere n’oge Jeremaịa? Ndị amụma ụgha nke oge a na-ekwu na ha na-anọchi anya Chineke, ma ha na-ezuru okwu Chineke n’ohi site n’ikwusa ihe ndị na-adọpụ uche ndị mmadụ pụọ n’ihe Bible na-ekwu n’ezie. Nke a bụ eziokwu karịsịa n’ihe banyere ozizi Alaeze ahụ. (Jeremaịa 23:30)—2/1, peji 4.

▫ Gịnị ka ọ pụtara mgbe e mere mmadụ baptism n’aha nke mmụọ nsọ? Nke a pụtara na onye ahụ a na-eme baptism kpebisiri ike ịkwado mmụọ nsọ, ghara ime ihe ọ bụla nke ga-egbochi ọrụ ọ na-arụ n’etiti ndị Jehova. Ya mere, onye ahụ aghaghị ịkwado ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche na ndokwa nke ndị okenye n’ọgbakọ. (Ndị Hibru 13:7, 17; 1 Pita 5:1-4)—2/1, peji 18.

▫ N’ihi gịnị ka ife ihe oyiyi ofufe ji bụrụ ihe na-emerụ ahụ nke ukwuu nye onye na-efe ya? Bible na-egosi na ihe oyiyi bụ ihe arụ n’anya Jehova Chineke, bụrụkwa ihe na-adịghị enyere ndị na-efe ya aka ịbịaru Chineke nso karị. (Deuterọnọmi 7:25; Abụ Ọma 115:4-8) Setan bụ́ Ekwensu ‘emewo ka anya uche’ nke ndị mmadụ “kpuo ìsì” ka eziokwu wee ghara “ịwakwasị ha.” (2 Ndị Kọrint 4:4) Ya mere mgbe mmadụ na-asọpụrụ ihe oyiyi, onye ahụ na-eme ihe na-amasị ndị mmụọ ọjọọ n’ezie. (1 Ndị Kọrint 10:19, 20)—2/15, peji 6-7.

▫ N’ihi gịnị ka e ji lee atụrụ anya dị ka ihe onwunwe bara uru n’oge Bible? Ajị ya bụ ihe onwunwe a pụrụ ịgbanwe agbanwe, a pụrụ iji ya kwatara ezinụlọ ákwà ha ga na-eyi ma ọ bụ a pụrụ ire ya ere. A pụrụ iji mpi ebulu mee ihe ịma ọkwa Jubile ma ọ bụ a pụrụ iji ya maa ọkwa banyere ihe ize ndụ ma ọ bụ duzie otú agha ga-esi gaa. Ebe ọ bụ na atụrụ bụ otu n’ime anụmanụ ndị dị ọcha ndị Israel pụrụ iri, inwe ìgwè atụrụ bụ inwe ihe oriri, e sikwa na ya enweta mmiri ara maka ịṅụ aṅụ ma ọ bụ maka iji mee cheese.—3/1, peji 24-25.

▫ Gịnị ka ndị hụrụ Chineke n’anya na-arịọ maka ya mgbe ha na-ekpe ekpere ka Alaeze Chineke bịa? (Matiu 6:10) Ha na-arịọ ka Alaeze eluigwe Chineke mee ihe e kpere n’ikpe site n’ibibi usoro ọchịchị nke mmadụ, bụ́ nke daworo ada n’imezu nkwa nke iweta udo na ịnọ ná ntụkwasị obi. (Daniel 2:44)—3/15, peji 6.

▫ Olee ndị bụ Ndị Nkwado Okwukwe, hà kụzikwara Atọ n’Ime Otu? Ndị Nkwado Okwukwe bụ ndị chọọchị dịrị ndụ n’akụkụ ikpeazụ nke narị afọ nke abụọ. Ha dere akwụkwọ iji zọchitere Iso Ụzọ Kraịst ahụ nke ha maara megide ajọ nkà ihe ọmụma jupụtara n’akụkụ ụwa bụ Rom. Ọ dịghị onye ọ bụla n’ime ha kụziri Atọ n’Ime Otu.—4/1, peji 24-29.

▫ È mere Zekaraịa, bụ́ nna Jọn Onye na-eme baptism, onye ntị chiri na onye dara ogbi, dị ka Luk 1:62 yiri ka ọ̀ na-egosi? Gebriel kwuru na ikike ikwu okwu Zekaraịa ga-enwe nsogbu, ọ bụghị ikike ịnụ ihe ya. (Luk 1:18-20) Luk 1:64 na-ekwu, sị: “Ngwa ngwa ọnụ ya [nke Zekaraịa] wee saghee, ire ya tọpụkwa, o wee na-ekwu okwu.” Rịba ama, ọ dịghị ihe ọ bụla e kwuru n’ebe a banyere ọnụnụ ihe ya inwe nsogbu n’ụzọ ọ bụla. Nhota ahụ e hotara ‘ife aka’ na Luk 1:62 pụrụ ịpụta na e mere ihe ụfọdụ iji kpalie Zekaraịa ime mkpebi.—4/1, peji 31.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya