Mụrụ Anya na “Mgbe Ọgwụgwụ”
“Lezienụ anya, mụrụnụ anya, na-ekpekwanụ ekpere: n’ihi na unu amataghị mgbe oge ahụ bụ.”—MAK 13:33.
1. Olee otú anyị kwesịrị isi meghachi omume ka ihe omume ndị na-akpali akpali na-ewere ọnọdụ na “mgbe ọgwụgwụ” a?
KA IHE omume ndị na-akpali akpali na-ewere ọnọdụ na “mgbe ọgwụ gwụ” a, olee otú ndị Kraịst kwesịrị isi na-emeghachi omume? (Daniel 12:4) A hapụghị ha n’obi abụọ. Jisọs Kraịst buru amụma ahụ nwere ọtụtụ ihe ịrịba ama nke nọworo na-enwe mmezu na narị afọ nke 20 anyị a. O buru amụma banyere ọtụtụ ihe ndị kaworo oge a akara eri 1914 dị ka nke pụrụ iche. Dị ka onye matara amụma Daniel banyere “mgbe ọgwụgwụ,” Jisọs gara n’ihu ibu oké amụma ya site n’ịgba ndị na-eso ụzọ ya ume ka ha ‘mụrụ anya.’—Luk 21:36.
2. N’ihi gịnị ka o ji dị oké mkpa ịmụrụ anya n’ụzọ ime mmụọ?
2 N’ihi gịnị ka a ga-eji mụrụ anya? N’ihi na oge a bụ oge kasị dị oké egwu n’akụkọ ihe mere eme nke mmadụ. Ndị Kraịst ịdaba n’iro ụra n’ụzọ ime mmụọ n’oge a ga-abụ ihe ọdachi. Ọ bụrụ na anyị ga-enwe omume nke ejighị ihe kpọrọ ihe ma ọ bụ anyị kwere ka e bogbuo obi anyị site ná nchegbu nke ndụ, anyị ga-anọ n’ihe ize ndụ. Na Luk 21:34, 35, Jisọs Kraịst dọrọ anyị aka ná ntị, sị: “Na-ezenụ onwe unu, ka a ghara iwere imebiga ajọ ihe ókè, na ịṅụbiga mmanya ókè, na nchegbu nke ndụ a, bogbuo obi unu ma eleghị anya, ụbọchị ahụ wee bịakwasị unu na mberede dị ka ọnyà: n’ihi na otú a ka ọ ga-abịakwasị ndị nile bi n’elu ụwa nile.”
3, 4. (a) Gịnị ka Jisọs bu n’uche site n’ikwu na ụbọchị oké iwe Chineke ga-abịakwasị ndị mmadụ na mberede “dị ka ọnyà”? (b) Ebe ọ bụ na Chineke adịghị agba ọnyà ahụ, n’ihi gịnị ka ụbọchị ahụ ga-eji bịakwasị ndị mmadụ n’ozuzu ha n’ụzọ ha na-atụghị anya?
3 Ọ bụ ezi ihe mere Jisọs ji kwuo na ụbọchị Jehova ‘ga-abịakwasị anyị na mberede dị ka ọnyà.’ A na-ejikarị eriri na-agba ọnyà, a na-ejikwa ya ejide nnụnụ na anụ ndị na-enye nwa ha ara. Ọnyà na-enwe ihe e ji akpaze ya, onye ọ bụla nke dabakwara n’ọnyà na-akpaze ya. Mgbe ahụ ọnyà ahụ na-akpachi, ọ na-ejidekwa ihe dabara na ya. Ihe ndị a nile na-eme n’otu ntabi anya. N’otu ụzọ ahụ, Jisọs sịrị, ndị na-adịghị arụsi ọrụ ike n’ụzọ ime mmụọ ga-enwe ihe ijuanya ‘n’ụbọchi iwe’ Chineke, ọ ga-abịakwasịkwa ha na mberede.—Ilu 11:4.
4 Ọ̀ bụ Jehova Chineke na-agbara ndị mmadụ ọnyà? Ee e, ọ dịghị echere ijide ndị mmadụ mgbe ha na-anọghị na nche ma bibie ha. Ma ụbọchị ahụ ga-eju ndị mmadụ n’ozuzu ha anya n’ihi na ha adịghị eche echiche n’ụzọ bụ isi banyere Alaeze Chineke. Ha na-agara onwe ha na-achụso ihe ndị a na-enweta ná ndụ, na-eleghara ihe ihe ndị na-eme na gburugburu ha pụtara. Otú ọ dị, nke a adịghị agbanwe nhazi oge ime ihe Chineke. O nwere oge ọ kara aka maka ime mpịazi. N’obi ebere, ọ dịghịkwa ahapụ ihe a kpọrọ mmadụ ka ha ghara ịma banyere ikpe ya nke na-abịanụ.—Mak 13:10.
5, 6. (a) N’ihi ikpe ọmụma ahụ na-abịanụ, ndokwa ịhụnanya dị aṅaa ka Onye Okike ahụ mewooro ụmụ mmadụ ndị o kere, ma ọ̀ bụ gịnị ka nke ahụ rụpụtara n’ozuzu ya? (b) Gịnị ka a ga-atụle nke ga-enyere anyị aka ịmụrụ anya?
5 Ịdọ aka ná ntị nke a e bu ụzọ na-adọ bụ ndokwa ịhụnanya n’akụkụ nke Onye Okike ukwu ahụ, bụ́ onye nwere mmasị n’ọdịmma nke ụmụ mmadụ o kere eke ndị nọ n’ebe a n’ihe mgbakwasị ụkwụ ya nke ihe atụ. (Aịsaịa 66:1) Ọ hụrụ ndị bi n’ebe a n’anya, bụ́ ebe a sịrị na ọ gbakwasịrị ụkwụ ya. Ya mere site n’aka ndị nnọchianya ya na ndị na-ejere ya ozi n’elu ala, ọ na-adọ ha aka ná ntị banyere ihe omume ahụ gaje ime n’ọdịnihu. (2 Ndị Kọrint 5:20) Ma, n’agbanyeghị ịdọ aka ná ntị nile e nyeworo, ihe omume ndị ahụ ga-abịakwasị ezinụlọ ụmụ mmadụ di ka ihe na-eleghị anya ya dị ka à ga-asị na ha zọbara ụkwụ n’ọnyà. N’ihi gịnị? N’ihi na ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ na-ehi ụra n’ụzọ ime mmụọ. (1 Ndị Tesalonaịka 5:6) Ọ bụ nanị ọnụ ọgụgụ dị nta ma e jiri ya tụnyere ndị ọzọ na-aṅa ntị n’ịdọ aka ná ntị ahụ, ọ bụkwa ha ga-alanarị baa n’ime ụwa ọhụrụ Chineke.—Matiu 7:13, 14.
6 Mgbe ahụ, olee ụzọ anyị pụrụ isi mụrụ anya n’oge ọgwụgwụ a ka anyị wee soro ná ndị a ga-azọpụta? Jehova ewetawo ihe inyeaka dị mkpa. Ka anyị rịba ama ihe asaa ndị anyị pụrụ ime.
Lụso Ndọpụ Uche Ọgụ
7. Ịdọ aka ná ntị dị aṅaa banyere ndọpụ uche ka Jisọs nyere?
7 Nke mbụ, anyị aghaghị ịlụ ọgụ megide ihe na-adọpụ uche. Na Matiu 24:42, 44, Jisọs sịrị: “Na-echenụ nche: n’ihi na unu amataghị ụbọchị Onyenwe anyị ga-abịa. N’ihi nke a unu onwe unu bụrụkwa ndị e doziworo: n’ihi na n’oge hour nke unu na-echeghị ka Nwa nke mmadụ ga-abịa.” Okwu Jisọs ji mee ihe n’ebe a na-egosi na n’oge a dị oké egwu, a ga-enwe ọtụtụ ihe na-adọpụ uche, ndọpụ uche pụkwara iduga ná mbibi. N’oge Noa, ọtụtụ ihe weere oge ndị mmadụ. Dị ka ihe si na nke ahụ pụta, ndị ahụ a dọpụrụ uche ha “amaghịkwa” ihe na-emenụ, Iju Mmiri ahụ kpochapụkwara ha nile. N’ụzọ kwekọrọ na nke ahụ, Jisọs dọrọ aka ná ntị, sị: “Otú a ka ọbịbịa [“ọnụnọ,” NW] Nwa nke mmadụ ga-adị.”—Matiu 24:37-39.
8, 9. (a) Olee ụzọ ihe nkịtị ndị a na-achụso ná ndụ pụrụ isi dọpụ uche anyị n’ụzọ dị ize ndụ? (b) Ịdọ aka ná ntị dị aṅaa ka Pọl na Jisọs nyere anyị?
8 Burukwa n’uche, na n’ịdọ aka ná ntị ya na Luk 21:34, 35, Jisọs na-ekwu banyere ihe nkịtị ndị a na-eme ná ndụ, ndị dị ka iri ihe, ịṅụ ihe, na nchegbu nke inweta ihe ndị e ji ebi ndụ. Ha bụ ihe ndị na-emetụta mmadụ nile, gụnyere ndị na-eso ụzọ Onyenwe anyị Jisọs. (Tụlee Mak 6:31.) Ihe ndị a pụrụ ịdị mma n’onwe ha, ma ọ bụrụ na e nye ha ohere, ha pụrụ ịdọpụ uche anyị, na-ewere oge anyị, sikwa otú ahụ kpata iro ụra ime mmụọ nke dị ize ndụ n’ime anyị.
9 Ya mere, ka anyị ghara ileghara ihe kasị mkpa anya—inwe ịja mma nke Chineke. Kama imikpu onwe anyị n’ihe nkịtị ndị a na-eme ná ndụ, ka anyị jiri ha mee ihe nanị ruo n’ókè dị mkpa iji nọgide na-adị ndụ. (Ndị Filipaị 3:8) Ha ekwesịghị ịkpagbu ọdịmma nile nke Alaeze. Dị ka Ndị Rom 14:17 si kwuo, “alaeze Chineke abụghị oriri na ọṅụṅụ, kama ọ bụ ezi omume na udo na ọṅụ n’ime mmụọ nsọ.” Cheta okwu Jisọs mgbe ọ sịrị: “Ma burunụ ụzọ chọọ alaeze ya, na ezi omume ya; a ga-atụkwasịkwara unu ihe ndị a nile.” (Matiu 6:33) Ọzọ, na Luk 9:62, Jisọs kwupụtara, sị: “Ọ dịghị onye ọ bụla nke na-ele anya n’azụ, mgbe o tinyesịrị aka ya n’ọgụ anụ ụlọ na-adọkpụgharị, kwesịịrị alaeze Chineke.”
10. Ihe ize ndụ dị aṅaa ka e nwere ma ọ bụrụ na anyị elegideghị anya anyị n’ebe ihe mgbaru ọsọ ahụ dị?
10 N’ikwu ya n’ụzọ ihe atụ, mgbe ọ bụla anyị malitere ịkọ ihe, anyị aghaghị ịnọgide n’ahịrị kwụ ọtọ. Onye na-akọ ihe nke na-ele anya n’azụ agaghị akọ ahịrị kwụ ọtọ. A na-adọpụ uche ya, ọ pụkwara ịdị mfe uche ya ịpụ n’ihe ọ na-eme ma ọ bụ ịbụ onye ihe mgbochi ụfọdụ mere ka ọ kwụsị ihe ọ na-eme. Ka anyị ghara ịdị ka nwunye Lọt, bụ́ onye lere anya n’azụ wee ghara ịgbaru n’ebe nchebe. Ọ dị mkpa ka anyị nọgide na-ele anya n’ihu n’ebe ihe mgbaru ọsọ ahụ dị. Iji mee nke ahụ, anyị aghaghị ịlụso ihe ndọpụ uche ọgụ.—Jenesis 19:17, 26; Luk 17:32.
Na-ekpesi Ekpere Ike
11. Gịnị ka Jisọs mesiri ike mgbe ọ dọsịrị anyị aka ná ntị banyere ihe ize ndụ nke ndọpụ uche?
11 Otú ọ dị, e nwere ihe ọzọ anyị pụrụ ime iji mụrụ anya. Ihe nke abụọ dị mkpa bụ: Ikpesi Ekpere ike. Mgbe ọ dọsịrị anyị aka ná ntị banyere ịbụ ndị a dọpụrụ uche ha site n’ihe nkịtị ndị a na-achụso ná ndụ, Jisọs nyere ndụmọdụ nke a: “Ma mụrụnụ anya n’oge ọ bụla, na-arịọ arịrịọ, ka unu wee ka n’ike ịgbanarị ihe nile ndị a nke gaje ime, na iguzo n’ihu Nwa nke mmadụ.”—Luk 21:36.
12. Ụdị ekpere dị aṅaa dị mkpa, gịnịkwa ka ọ na-arụpụta?
12 Otú a, anyị aghaghị ịnọgide na-ekpesi ekpere ike banyere ihe ize ndụ nke ọnọdụ anyị na mkpa anyị nwere ịmụrụ anya. Ya mere ka anyị na-agakwuru Chineke n’ekpere site n’ịrịọsi ya arịrịọ ike. Pọl kwuru ná Ndị Rom 12:12, sị: ‘Na-anọgidesinụ ike n’ekpere.’ Ná Ndị Efesọs 6:18, anyị na-agụkwa, sị: “Sitekwanụ n’ekpere na arịrịọ nile na-ekpe ekpere n’oge nile n’ime mmụọ nsọ . . . na-amụ anya ime nke a.” Nke a abụghị nnọọ ikpe ekpere dị ka à ga-asị na ọ bụ ihe dapụtara na mberede nke na-enweghị oké ihe ga-esi na ya pụta. Ịdị ndụ anyị nọ n’ihe ize ndụ. Ya mere, ọ dị mkpa anyị ịrịọsi arịrịọ ike maka enyemaka nke Chineke. (Tụlee Ndị Hibru 5:7.) N’ụzọ dị otú ahụ anyị ga-anọgidesi ike n’akụkụ Jehova. Ọ dịghị ihe ga-enyere anyị aka bara uru karị n’imezu nke a karịa anyị ‘ịrịọ arịrịọ n’oge ọ bụla.’ Mgbe ahụ Jehova ga-edebe anyị n’ọnọdụ nke ịmụrụ anya ịmata ihe na-emenụ. Mgbe ahụ, lee nnọọ ka o si dị mkpa ịnọgidesi ike n’ekpere!
Rapagidesie Ike n’Ọgbakọ Chineke na Ọrụ A Na-arụ na Ya
13. Ụdị mkpakọrịta dị aṅaa dị mkpa iji mụrụ anya?
13 Anyị chọrọ ịgbanarị ihe ndị a nile ga-abịakwasị ụwa. Anyị chọrọ iguzo n’ihu Nwa nke mmadụ, na-enweta ịja mma ya. Iji mee nke ahụ, ọ dị ihe nke atọ anyị pụrụ ime: Rapagidesie ike n’ọgbakọ usoro ọchịchị Jehova. Ọ dị anyị mkpa isoro ọgbakọ ahụ na-akpakọrịta n’ụzọ a na-akpaghị ókè ma na-ekere òkè n’ihe omume ya nile. N’ụzọ dị otú a, anyị ga-egosipụta onwe anyị dị ka ndị Kraịst nọ na nche n’ụzọ pụtara ìhè.
14, 15. (a) Ikere òkè n’ọrụ dị aṅaa ga-enyere anyị aka ịmụrụ anya? (b) Ònye ga-ekpebi mgbe a rụzuru ọrụ nkwusa ahụ, oleekwa ihe kwesịrị ịbụ mmetụta anyị banyere ya? (ch) Mgbe oké mkpagbu ahụ gasịrị, gịnị ka anyị ga-aghọta mgbe anyị leghachiri anya azụ n’ọrụ nkwusa Alaeze nke a rụworo?
14 Nke e jikọtara ya na nke a n’ụzọ chiri anya bụ ihe nke anọ nke pụrụ inyere anyị aka ịmụrụ anya. Anyị aghaghị iso ná ndị ahụ na-adọ ndị mmadụ aka ná ntị banyere ọgwụgwụ na-abịanụ nke usoro ihe nke a. Ọgwụgwụ zuru ezu nke usoro ihe ochie nke a agaghị ewere ọnọdụ ruo mgbe e kwusaworo “ozi ọma nke a nke alaeze” ruo n’ókè Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Nile zubeworo. (Matiu 24:14) Ndịàmà Jehova abụghị ndị ga-ekpebi mgbe a rụzuworo ọrụ ime nkwusa ahụ. Jehova debeere onwe ya ikike nke ahụ. (Mak 13:32, 33) Otú ọ dị, anyị ekpebiwo ịrụsi ọrụ ruo ókè o kwere mee na ruo n’ogologo oge dị mkpa n’ikwusa banyere ọchịchị kasị mma nke ihe a kpọrọ mmadụ pụrụ inweworị, Alaeze Chineke. Ntiwapụ nke “mkpagbu ukwu” ahụ ga-abịa mgbe anyị ka na-ekere òkè n’ọrụ nke a. (Matiu 24:21) N’oge nile n’ọdịnihu, ndị a zọpụtara ga-enwe ike ileghachi anya azụ ma jiri obi ha nile kwupụta na Jisọs Kraịst abụghị onye amụma ụgha. (Mkpughe 19:11) A ga-arụzuworị ọrụ ime nkwusa ahụ ruo n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị ukwuu karịa ka ndị na-ekere òkè na ya tụworo anya ya.
15 N’ụzọ kwekọrọ na nke ahụ, n’oge oké ihe omume ahụ mgbe a ga-arụzuworị ọrụ nke a ruo n’ụzọ ga-eju Chineke afọ, o yiri ka ọtụtụ ndị ọzọ ga-ekere òkè na ya karịa ka e meworo n’oge ọ bụla bu ụzọ. Lee aha obi ekele anyị ga-enwe ịbụ ndị kerewooro òkè n’oké ọrụ nke a! Pita onyeozi na-emesi anyị obi ike na Jehova ‘ezubeghị ka ndị ọ bụla laa n’iyi, kama ka mmadụ nile bịaruo nchegharị.’ (2 Pita 3:9) Dị ka ihe si na nke ahụ pụta, ike ọrụ nke Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Nile na-arụsi ọrụ ike taa karịa mgbe ọ bụla ọzọ, Ndịàmà Jehova nwekwara ọchịchọ ịnọgide n’ọrụ nke a mmụọ nsọ na-akpali ha ịrụ. Ya mere rapagidesie ike n’ọgbakọ Jehova, na-arụsikwa ọrụ ike n’ije ozi ihu ọha ya. Nke a ga-enyere gị aka ịmụrụ anya.
Na-enyocha Onwe Gị
16. N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji nyochaa ọnọdụ ime mmụọ anyị nọ na ya ugbu a?
16 E nwere ihe nke ise anyị pụrụ ime iji wee mụrụ anya. N’otu n’otu, anyị kwesịrị inyocha ọnọdụ anyị onwe anyị nọ na ya ugbu a. Nke a kwesịrị ekwesị ugbu a karịa mgbe ọ bụla ọzọ. Ọ dị mkpa ka anyị gosipụta onye anyị na-eguzosi ike n’akụkụ ya. Ná Ndị Galetia 6:4, Pọl sịrị: “Ka onye ọ bụla nwapụta ọrụ nke aka ya.” Mee nnyocha onwe onye n’ikwekọ n’okwu Pọl ná 1 Ndị Tesalonaịka 5:6-8: “Ka anyị ghara ịrahụ ụra, dị ka ndị fọdụrụ, kama ka anyị na-eche nche nweekwa anya udo. N’ihi na ndị na-arahụ ụra na-arahụ ụra n’abalị; ndị na-aṅụbigakwa mmanya ókè na-aṅụbiga n’abalị. Ma anyị onwe anyị, ebe anyị bụ ndị nke ehihie, ka anyị nwee anya udo, yikwasịsịa ihe agha igbochi obi, bụ́ okwukwe na ịhụnanya; ya na okpu agha, bụ́ ile anya nzọpụta.”
17. Mgbe anyị na-eme nnyocha onwe onye, ajụjụ dịgasị aṅaa ka anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị?
17 Gịnị banyere anyị? Mgbe anyị na-enyocha onwe anyị site n’ìhè nke Akwụkwọ nsọ, ànyị na-achọpụta na anyị na-amụrụ anya, na-enwe olileanya nzọpụta dị ka okpu agha? Ànyị bụ ndị kewapụworo onwe anyị kpam kpam pụọ n’usoro ihe ochie nke a, ma bụrụ ndị na-adịghị enwe echiche ya ọ bụla ma ọlị? Ànyị nwere mmụọ nke ụwa ọhụrụ Chineke n’ezie? Ànyị bụ ndị mụ anya nke ọma n’ihe banyere ebe usoro ihe nke a na-eche ihu? Ya bụrụ otú ahụ, ụbọchị Jehova agaghị abịakwute anyị na mberede dị ka ànyị bụ ndị ohi.—1 Ndị Tesalonaịka 5:4.
18. Ajụjụ ndị ọzọ dịkwa aṅaa ka ọ pụrụ ịdị mkpa ka anyị jụọ onwe anyị, gịnịkwa ka nke ahụ pụrụ ịrụpụta?
18 Otú ọ dị, gịnị ma ọ bụrụ na nnyocha onwe anyị ekpughee na anyị na-agbalị inweta ụzọ ndụ mara mma, nke na-atọ ụtọ, nke na-enye ntụsara ahụ? Gịnị ma ànyị chọpụta na anya ime mmụọ anyị adịwo arọ site n’iro ụra na ihi ụra? Ànyị nọ n’ọnọdụ nke yiri ịrọ nrọ, na-achụso echiche efu ụfọdụ nke ụwa? Ya bụrụ otú ahụ, mgbe ahụ ka anyị teta n’ụra!—1 Ndị Kọrint 15:34.
Na-atụgharị Uche n’Amụma Ndị Mezuworo
19. Olee amụma ụfọdụ ndị anyị hụworo ka ha mezuru?
19 Anyị erutewo ugbu a n’ihe nke isii ga-enyere anyị aka ịmụrụ anya: Na-atụgharị uche n’ọtụtụ amụma ndị mezuworo na mgbe ikpeazụ nke a. Anyị agabigaworị afọ nke 77 kemgbe oge ahụ a kara aka nke ndị mba ọzọ gwụsịrị na 1914. Ka anyị na-eleghachi anya azụ gaa n’ihe karịrị iri afọ asaa na ise nke otu narị afọ, anyị pụrụ ịhụ ụzọ amụma ndị a siworo mezuo n’otu n’otu—mweghachi nke ezi ofufe; nnapụta nke ihe fọdụrụ ná ndị e tere mmanụ, tinyere ndị enyi ha, baa na paradaịs ime mmụọ; nkwusa nke ozi ọma ahụ nke Alaeze n’ụwa nile; mpụta nke oké ìgwè mmadụ ahụ. (Aịsaịa 2:2, 3; isi 35; Zekaraịa 8:23; Matiu 24:14; Mkpughe 7:9) E buliwo aha ukwu nke Jehova na ịbụ ọkaaka eluigwe na ala ya elu, tinyekwara mmụba nke onye nta ịghọ otu puku na onye dịkarịsịrị nta ịghọ mba nwere ume, nke Jehova na-eme ka ọ bịa ọsọ ọsọ na mgbe ya. (Aịsaịa 60:22; Ezikiel 38:23) Ọhụụ nile nke Jọn onyeozi n’ihe ndekọ nke Mkpughe na-abịarukwa ugbu a ná mmezu ha.
20. Nkwenye dị aṅaa ka Ndịàmà Jehova nwere, gịnịkwa ka ha gosipụtaworo na ha bụ n’ezie?
20 Ya mere, karịa ka ọ dịworo na mgbe ọ bụla ọzọ, Ndịàmà Jehova kwenyesiri ike n’izi ezi nke nghọta ha nwere banyere ihe ihe ndị na-eme n’ụwa kemgbe 1914 pụtara. N’inwe nkwenyesi ike dị otú ahụ, ha aghọwo ngwá ọrụ ndị Chineke Onye Kasị Ihe Nile Elu ji eme ihe. Ha bụ ndị e nyeworo ọrụ nke ikwusa ozi Chineke n’oge ndị a dị oké mkpa. (Ndị Rom 10:15, 18) Ee, ihe Jehova kwuru banyere mgbe ikpeazụ emezuwo. (Aịsaịa 55:11) N’aka nke ọzọ, nke a kwesịrị ịkpali anyị ịnọgide na-aga n’ihu ruo mgbe anyị hụrụ mmezu ikpeazụ nke nkwa nile Chineke kwere site n’aka Jisọs Kraịst.
Nzọpụta Dị Nso Karịa Mgbe Anyị Ghọrọ Ndị Kwere Ekwe
21. Ihe nke asaa dị aṅaa na-enye aka iji mụrụ anya n’ụzọ ime mmụọ ka anyị nwere?
21 N’ikpeazụ, ihe enyemaka nke asaa maka anyị ịmụrụ anya: Bụrụ n’uche mgbe nile na nzọpụta anyị adịwo nso karịa mgbe mbụ anyị ghọrọ ndị kwere ekwe. Dị ka nke ka mkpa karị, oge maka iwepụ ọkaaka eluigwe na ala nke Jehova n’ụta na ido aha ya nsọ dị nso karị. Ya mere mkpa ọ dị ịmụrụ anya chọrọ ime ngwa karịa mgbe ọ bụla ọzọ. Pọl onyeozi dere, sị: “Unu matara oge a, na oge hour eruwo ugbu a ka unu teta n’ụra: n’ihi na ugbu a nzọpụta anyị dị nso karị mgbe anyị kwere na mbụ. Chi ejimiwo, chi ọbụbọ dịkwa nso.”—Ndị Rom 13:11, 12.
22. Olee ụzọ ịdị nso nke nzọpụta anyị kwesịrị isi metụta anyị?
22 Ebe ọ bụ na nzọpụta anyị adịwo nso karị, anyị aghaghị ịmụrụ anya! Anyị agaghị ekwe ka mmasị ọ bụla anyị na-enwe n’ihe onwe onye ma ọ bụ n’ihe nke ụwa karịa obi ekele anyị nwere maka ihe Jehova na-emere ndị ya na mgbe ọgwụgwụ a. (Daniel 12:3) Ọ dị mkpa anyị ịnọgidesi ike karịa ka anyị meworo mgbe ọ bụla ka a ghara ichigharị anyị pụọ n’ụzọ nke Okwu Chineke na-esetịpụrụ anyị n’ụzọ doro anya. (Matiu 13:22) Ihe àmà na-egosi n’ụzọ doro anya na ụwa nke a nọ na mgbe ikpeazụ ya. N’isi nso a ga-ekpochapụ ya pụọ n’ịdị adị ruo mgbe ebighị ebi iji nye ohere ka ụwa ọhụrụ nke ezi omume bata.—2 Pita 3:13.
23. N’ụzọ dị aṅaa ka Jehova ga-esi nyere anyị aka, ngọzi dịkwa aṅaa ga-esi na ya pụta?
23 Mgbe ahụ, ka anyị nile jisi ike mụrụ anya. Dị ka ị na-emetụbeghị na mbụ, mụrụ anya n’ihe banyere ebe anyị nọ ná ngụkọ nke oge. Cheta, ọ dịghị mgbe Jehova ga-ehi ụra n’okwu a. Kama nke ahụ, ọ ga-anọgide na-enyere anyị aka na mgbe ọgwụgwụ a. Chi ejimiwo. Chi ọbụbọ na-eru nso. Ya mere mụrụnụ anya! N’oge na-adịghị anya anyị ga-ahụ ụbọchị kasị ụbọchị nile mma, ka Alaeze Mesaịa ahụ na-emezu nzube Jehova banyere elu ala!—Mkpughe 21:4, 5.
Gịnị Bụ Azịza Gị?
◻ Gịnị ka Jisọs bu n’uche mgbe ọ sịrị na ụbọchị oké iwe Chineke ga-abịakwasị ndị mmadụ “dị ka ọnyà”?
◻ N’ihi gịnị ka anyị na-aghaghị iji lụso ndọpụ uche ọgụ, oleekwa ụzọ anyị pụrụ isi mee otú ahụ?
◻ Ụdị ekpere dị aṅaa dị mkpa iji nwee ike ịmụrụ anya?
◻ Ụdị mkpakọrịta dị aṅaa dị mkpa?
◻ N’ihi gịnị ka anyị ga-eji mee nnyocha onwe onye banyere ọnọdụ ime mmụọ anyị?
◻ Òkè dị aṅaa ka amụma na-ekere n’ime ka anyị mụrụ anya?