Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w92 6/1 p. 3-4
  • Chineke Ọ̀ Na-akwado Iji Okwukwe Agwọ Ọrịa?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Chineke Ọ̀ Na-akwado Iji Okwukwe Agwọ Ọrịa?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Okwukwe—Ọ̀ Bụ Ihe A Chọrọ?
  • Ịgwọ Ọrịa n’Oge a Hà dị ka nke Jisọs?
  • Ọrịa Ndị A Sị na E Ji Ọrụ Ebube Agwọ Taa Ọ̀ Bụ Ike Chineke Ka E Ji Agwọ Ha?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
  • Ọgwụgwọ Ọrụ Ebube nke Ihe A Kpọrọ Mmadụ Dị Nso
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Ụzọ Okwukwe Pụrụ Isi Nyere Ndị Ọrịa Aka
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
  • Ndịàmà Jehova hà na-eji okwukwe agwọ ọrịa?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
w92 6/1 p. 3-4

Chineke Ọ̀ Na-akwado Iji Okwukwe Agwọ Ọrịa?

“ANYỊ ahụwo ihe ebube taa!” Ee, ndị hụrụ ihe merenụ nwere afọ ojuju. A nọwo n’ihu ha gwọọ onye ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ nke ukwuu. Onye ahụ na-agwọ ọrịa gwara nwoke ahụ, sị: “Bilie, chịrị ute gị, gaa ụlọ gị.” Nwoke ahụ mekwara nnọọ otú ahụ! Ọ bụghịkwa onye ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ ọzọ. Ka a sịkwa ihe mere ndị nọ n’ebe ahụ ji “wee too Chineke”! (Luk 5:18-26) Ọ pụtara ìhè na ọgwụgwọ ọrịa nke a, nke Jisọs Kraịst gwọrọ n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 2,000 afọ gara aga, nwere nkwado Chineke.

Gịnị banyere n’oge a? Ịgwọ ọrịa n’ụzọ ọrụ ebube ọ̀ ka ga-ekwe omume nye ndị ahụ a na-apụghị iji ọgwụ gwọta? Jisọs rụrụ ọrụ ebube nke ịgwọ ọrịa. Ndị ji okwukwe agwọ ọrịa taa na-ekwu na ha na-eṅomi ya. Olee otú anyị kwesịrị isi lee ihe ha na-ekwu anya?

A kọwara iji okwukwe agwọ ọrịa dị ka “usoro nke ịgwọ ọrịa site n’ekpere na inwe okwukwe na Chineke.” Akwụkwọ bụ́ Encyclopædia Britannica kwuru, sị: “Akụkọ ihe mere eme banyere iji okwukwe agwọ ọrịa n’Iso Ụzọ Kraịst malitere site n’ije ozi onwe onye ndị dị ịtụnanya nke Jisọs na ndị ozi ya.” Ee, Jisọs gwọrọ ọrịa ndị pụtara ìhè. Ndị ji okwukwe agwọ ọrịa taa hà na-arụ ọrụ ebube dị ka ọ rụrụ?

Okwukwe—Ọ̀ Bụ Ihe A Chọrọ?

Dị ka akwụkwọ bụ́ Black’s Bible Dictionary si kwuo, Jisọs “kpọtụrụ [okwukwe] aha dị ka ihe dị oké mkpa maka ọrụ ebube ya nke ịgwọ ọrịa.” Ma nke ahụ ọ̀ bụ otú ọ dị? Jisọs ọ̀ chọrọ ka onye ọrịa nwee okwukwe tupu ọ gwọọ ya? Azịza nke ahụ bụ ee e. Okwukwe dị mkpa n’akụkụ nke onye na-agwọ ọrịa ma ọ dịchaghị mkpa n’akụkụ nke onye ọrịa ahụ. N’otu oge ndị na-eso ụzọ Jisọs enweghị ike ịgwọ otu nwa okoro akwụkwụ na-eme. Jisọs gwọrọ nwa okoro ahụ ma mesịa gwa ndị na-eso ụzọ ya ihe mere ha ji ghara inwe ike ịgwọ ya. “O wee sị ha, N’ihi okwukwe nta unu.”—Matiu 17:14-20.

Dị ka Matiu 8:16, 17 si kwuo, Jisọs ‘mere ka ndị nile ahụ na-adịghị mma dị ike.’ N’eziokwu, ndị a nwere ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ nke okwukwe n’ebe Jisọs nọ nke mere ha ji bịakwute ya. (Matiu 8:13; 9:22, 29) N’ihe ka ọtụtụ oge, ha bịara ma rịọ ya tupu ọ gwọọ ha. Otú ọ dị, a chọghị nkwupụta nke okwukwe n’aka ha iji wee rụọ ọrụ ebube ahụ. N’otu oge Jisọs gwọrọ nwoke dara ngwụrọ nke na-amaghị ọbụna onye Jisọs bụ. (Jọn 5:5-9, 13) N’abalị ahụ e jidere ya, Jisọs tinyeghachiri ntị ohu nke onye isi nchụàjà e bepụrụ ebepụ, ọ bụ ezie na nwoke nke a so n’ìgwè ndị iro Jisọs, bụ́ ndị bịara ijide ya. (Luk 22:50, 51) N’ezie, n’otu oge, Jisọs kpọlitere ọbụna ndị nwụrụ anwụ!—Luk 8:54, 55; Jọn 11:43, 44.

Olee ụzọ Jisọs pụrụ isi rụọ ọrụ ebube ndị dị otú ahụ? N’ihi na ọ dabeere na mmụọ nsọ Chineke, ma ọ bụ ike ọrụ ya. Nke a bụ ihe gwọrọ ọrịa ahụ, ọ bụghị okwukwe onye ọrịa ahụ. Ọ bụrụ na ị gụọ ihe ndekọ ndị dị n’Oziọma ndị ahụ, ị ga-arịbakwa ama na Jisọs gwọrọ ọrịa n’emeghị oké mkpọtụ ọ bụla. E nweghị oké ihe ngosi ma ọ bụ ịkpali mmetụta uche n’ụzọ na-adịghị mma. Ọzọkwa, n’agbanyeghị ihe ọrịa ahụ bụ, ọ dịghị mgbe ọ nyịrị Jisọs. O nwere ihe ịga nke ọma mgbe nile, ọ dịghịkwa mgbe ọ naara ụgwọ ọrụ.—Matiu 15:30, 31.

Ịgwọ Ọrịa n’Oge a Hà dị ka nke Jisọs?

Ọrịa bụ oké nsogbu, mgbe ọ bịakwara, anyị na-achọkarị ka ahụ dị anyị mma. Otú ọ dị, gịnị ma ọ bụrụ na anyị bi n’ebe “ndị ọrụ ahụ ike maara ọrụ na-emeso ndị mmadụ, karịsịa ndị na-enweghị ka ọ hà ha, dị ka ihe, ọ bụghịkwa dị ka ndị mmadụ”? Nke ahụ bụ ọnọdụ nke otu onye dọkịta chọpụtara n’otu mba Latin America. Ma gịnị ma ọ bụrụ na anyị bi n’ebe, dịkwa ka ọ dị ná mba ahụ, ‘nanị 40 pasentị nke ndị dọkịta ahụ ike ruru eru ịrụ ọrụ ha’?

Ọ bụghị ihe ijuanya na ọtụtụ, n’amaghị ihe ọzọ ha ga-eme, na-ele iji okwukwe agwọ ọrịa anya dị ka ihe e kwesịrị ịnwale ma ọ dịghị ihe ọzọ. Ma, ndị ji okwukwe agwọ ọrịa ikwu na ha na-agwọta ọrịa bụ ihe a na-arụ ụka. Dị ka ihe atụ, ihe dị ka 70,000 bịara otu nzukọ e mere na São Paulo, Brazil, bụ́ ebe mmadụ abụọ na-agwọ ọrịa ‘zọpịasịrị ọtụtụ narị enyo anya nke ndị na-ege ntị tụhapụrụ, na-ekwe nkwa iweghachi ọhụhụ ụzọ nke ndị nwe ha bụ́ ndị kwere ekwe.’ Otu n’ime ndị ahụ na-agwọ ọrịa ji obi eziokwu kwuo n’ajụjụ ọnụ a gbara ya, sị: “Apụghị m ikwu na a ga-agwọta ndị ahụ na-arịa ọrịa anyị kpeere ekpere. Ọ dabeere n’okwukwe ha. Ọ bụrụ na mmadụ ekwere, a ga-agwọta ya.” Ọ sịrị na ọ bụ enweghị okwukwe nke onye ọrịa mere na a gwọtaghị ya. Otú ọ dị, cheta, dị ka anyị hụrụ ná mmalite, na Jisọs sịrị na ọ bụ enweghị okwukwe nke ndị ahụ na-agwọ ọrịa mere na ha enweghị ike ịgwọta ọrịa!

Onye ọzọ na-agwọ ọrịa kwere nkwa ịgwọta ọrịa cancer na ahụ mkpọnwụ. Gịnị mere? Dị ka magazin bụ́ Veja si kwuo, “ọ pụtara ìhè na e mezughị nkwa ahụ.” Geekwa ntị n’ụzọ nwoke ahụ si mee omume: “N’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ hour abụọ, [onye ahụ ji okwukwe agwọ ọrịa] gwara ndị na-ege ntị okwu site n’ikwu okwuchukwu, ikpe ekpere, iti mkpu, ịbụ abụ—ọbụna na-eti aka n’ihe, na-eburu n’uche ịchụpụ ndị mmụọ ọjọọ bi n’ahụ ndị kwere ekwe. N’ikpeazụ, ọ tụpụrụ eriri olu ya na hankachiif ya n’ebe ndị ahụ na-ege ntị jupụtara ná mmetụta nọ, o bugharịkwara efere iji nakọta ‘onyinye afọ ofufo.’” Ọ dịghị mgbe Jisọs na ndị ozi ya rịọrọ ka e nye ha ego maka ịgwọ ọrịa n’ụzọ ọrụ ebube, ọ dịghịkwa mgbe ha mere ihe nkiri ndị dị otú ahụ.

Mgbe ahụ, o doro anya na ndị dị otú ahụ ji okwukwe agwọ ọrịa n’oge a adịghị eme ihe Jisọs mere. O sikwara ike ịghọta na Chineke ga-akwado ihe ha na-eme. Otú ọ dị, ọ̀ na-akwado ịgwọ ọrịa ọ bụla n’ụzọ ọrụ ebube taa? Ma ọ bụ ọ̀ dị ụzọ ọ bụla okwukwe anyị pụrụ isi nyere anyị aka mgbe anyị ma ọ bụ ndị anyị hụrụ n’anya na-arịa ọrịa?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya