Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w92 7/1 p. 4-7
  • Olileanya Na-emeri Ndakpọ Olileanya!

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Olileanya Na-emeri Ndakpọ Olileanya!
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Ndabere Maka Olileanya
  • Olileanya—“Ihe Ntụkwasị Obi na Ihe Na-eguzosi Ike”
  • Olileanya—“Arịlịka nke Mkpụrụ Obi”
  • ‘Jidesie Ike’!
  • Mee Ka Olileanya Gị Na-esikwu Ike
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2022
  • Olileanya I Nwere Maka Ọdịnihu Agaghị Emenye Gị Ihere
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2023
  • Olee Ebe Ị Pụrụ Inweta Olileanya Bụ́ Ezigbo Ya?
    Teta!—2004
  • Na-ele Anya Jehova Ma Nwee Obi Ike
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
w92 7/1 p. 4-7

Olileanya Na-emeri Ndakpọ Olileanya!

N’AKWỤKWỌ Webster’s Ninth New Collegiate Dictionary, a kọwara ndakpọ olileanya dị ka “enweghị olileanya kpam kpam.” Mgbe ahụ, o doro anya na iji merie ndakpọ olileanya, olileanya dị anyị mkpa!

Onye ihe na-adịghịrị mma nke a manyere ibi ndụ n’akụkụ ụzọ agaghị enwe ndakpọ olileanya kpam kpam ma ọ bụrụ na o nwere olileanya. Olileanya pụrụ ọbụna inye ndị na-enwe ihe mgbu nke ọrịa nkụda mmụọ obi ike na ume inwe ntachi obi. Ma olileanya ahụ aghaghị ịbụ nke a pụrụ ịdabere na ya! Gịnị ka nke a pụtara?

Ihe Ndabere Maka Olileanya

Tụlee ihe mere Sera, bụ́ nwunye nke nna ochie ahụ bụ́ Abraham. N’ịbụ onye afọ ndụ ya na-eru 90 afọ, ọ ka bụ nwanyị àgà, ọ dịwokwa anya ọ kwụsịrị inwe olileanya nke ịmụta nwa. Ma, mgbe di ya dị 99 afọ, Jehova kwupụtaghachiri nkwa o kweworo ya ọtụtụ afọ gara aga—Abraham gaje inwe “mkpụrụ,” ma ọ bụ onye nketa. Abraham maara na nke a bụ nkwa a pụrụ ịdabere na ya. Cheedị echiche otú Sera na-aghaghị isiworị nwee obi ụtọ mgbe, n’ụzọ ọrụ ebube, ihe obi ụtọ ahụ mere, o wee mụta Aịsak! (Jenesis 12:2, 3; 17:1-4, 19; 21:2) Ntụkwasị obi Abraham nwere n’ebe Chineke nọ abụghị na nkịtị, ọbụna dị ka Pọl onyeozi si kọwaa: “[Abraham] ejighị ekweghị ekwe nwee obi abụọ n’ebe nkwa Chineke dị, kama e jiri okwukwe ya mee ka o nwee ike, ọ na-enyekwa Chineke otuto.”—Ndị Rom 4:20.

N’idegara ndị Juu ghọworo ndị Kraịst akwụkwọ n’oge ya, Pọl tụgharịrị uche na ha pụrụ ịdabere ná nkwa Chineke nke nzọpụta site n’aka Jisọs n’ihi ihe abụọ ziri ezi. N’ịkpọtụ uche ná nkwa Chineke kwere Abraham na iyi Ọ ṅụrụ n’eluigwe, onyeozi ahụ rụrụ ụka, sị: “Mmadụ ji onye ka ha ukwuu aṅụ iyi: ịṅụ iyi bụkwaara ha nkwubi okwu nke okwu ọ bụla, ime ka o guzosie ike. N’otu ụzọ ahụ Chineke, ebe ọ na-ezube igosibiga ndị nketa nke nkwa ya ókè karị na izu ya bụ ihe na-adịghị agha agha, o weere ịṅụ iyi gboo okwu: ka anyị wee were ihe abụọ na-adịghị agha agha, nke Chineke na-apụghị ikwu okwu ụgha n’ime ha, nwee nkasi obi siri ike, anyị, bụ́ ndị gbabara ijidesi olileanya ahụ ike, bụ́ nke e debere n’ihu anyị.” (Ndị Hibru 6:16-18) Ee, nkwa nile nke Chineke bụ eziokwu ma bụrụ ndị a pụrụ ịdabere na ha. Jehova bụ onye pụrụ ime ihe nile, n’ụzọ pụkwara iche o nwere ike ime ka mmezu nke okwu ya guzosie ike.

Olileanya—“Ihe Ntụkwasị Obi na Ihe Na-eguzosi Ike”

Pọl dere na olileanya ndị Kraịst bụ “ihe ntụkwasị obi na ihe na-eguzosi ike.” (Ndị Hibru 6:19) Pọl maara ebe olileanya ya gbanyere mkpọrọgwụ. Ọ kọwara, sị: “[Olileanya] na-abakwa n’ime ebe ahụ nke dị n’ime ákwà mgbochi.” Gịnị ka nke a pụtara? Pọl na-ezo aka n’ụzọ doro anya n’ebe ụlọ nsọ oge ochie nke dị na Jerusalem dị. N’ime ebe a ka e nwere ogige Ebe Kasị Dị Nsọ, bụ́ nke e kebiri pụọ n’akụkụ ndị ọzọ nke ihe owuwu ahụ site n’ákwà mgbochi. (Ọpụpụ 26:31, 33; Matiu 27:51) N’ezie, ọ dịwo anya e bibiri ụlọ nsọ nkịtị ahụ dị na Jerusalem. Ya mere, taa, gịnị ka Ebe Kasị Dị Nsọ nke a na-anọchi anya ya?

Eluigwe n’onwe ya, bụ́ ebe Chineke onwe ya na-anọkwasị n’ocheeze! Pọl kọwara nke a mgbe o kwuru na Jisọs, mgbe ọ lagosịrị, “abaghị n’ebe nsọ e ji aka mee [n’ụlọ nsọ dị na Jerusalem], bụ́ ihe atụ yiri ebe nke bụ ebe nsọ n’ezie; kama ọ bara n’eluigwe onwe ya, igosi onwe ya n’ihu Chineke n’ihi anyị ugbu a.” (Ndị Hibru 9:24) Ya mere olileanya ndị Kraịst, bụ́ nke na-enyere anyị aka ịlụ ọgụ megide ndakpọ olileanya, adabereghị n’aka ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị bụ́ mmadụ kama ná ndokwa eluigwe. Ọ dabeere n’aka Onye ahụ Chineke họpụtara, bụ́ Jisọs Kraịst, onye nyere ndụ ya dị ka ihe mgbapụta maka mmehie anyị na onye gosiri onwe ya ugbu a n’ihu Chineke n’ihi anyị. (1 Jọn 2:1, 2) Ọzọkwa, dị ka e gosiworo ọtụtụ mgbe na kọlum nke magazin a, Jisọs nke a bụkwa onye Chineke họpụtaworo ịchị dị ka Eze nke Alaeze eluigwe Chineke, ọ nọwokwa na-eme otú ahụ kemgbe 1914. Alaeze eluigwe nke a ga-ewepụ ihe ndị na-akpatara ọtụtụ ndị ndakpọ olileanya n’oge na-adịghị anya.

Olileanya—“Arịlịka nke Mkpụrụ Obi”

Iji mee ka ndị na-agụ akwụkwọ ya kweta na olileanya ha nke nzọpụta site n’aka Jisọs dabeere n’ihe guzosiri ike, Pọl ji ihe atụ mee ihe. “Olileanya,” ka ọ kọwara, “nke anyị nwere dị ka arịlịka nke mkpụrụ obi.”—Ndị Hibru 6:19.

Arịlịka bụ ihe ndị njem dị ka Pọl maara nke ọma. Arịlịka oge ochie dịkwa nnọọ ka nke oge ugbu a, nke a na-arụkarị site n’iji ígwè nwere ọnụ ọnụ abụọ dị ka ézé iji jide ụgbọ ahụ n’okpuru mmiri. Mgbe ọ na-aga Rom n’ihe dị ka afọ 58 O.A., ụgbọ mmiri Pọl nọ n’ihe ize ndụ nke ikpu ná mmiri. Ma ka ụgbọ mmiri ahụ na-agaru n’ebe mmiri ahụ na-adịghị omimi karị, ndị ọrụ ụgbọ mmiri ahụ ‘radara arịlịka anọ n’isi ụgbọ ahụ.’ N’ihi arịlịka ndị ahụ, ụgbọ mmiri ahụ gabigara ebili mmiri ahụ n’udo.—Ọrụ 27:29, 39, 40, 44.

Mgbe ahụ, gịnị ka ị na-aghaghị ime iji mee ka olileanya gị dị ike dị ka arịlịka ka i wee nwee ike ịgabiga ihe isi ike akụ na ụba, ọrịa anụ ahụ ma ọ bụ nke uche, ma ọ bụ “ebili mmiri” ọ bụla nke pụrụ ịbịara gị? Na nke mbụ, mesie onwe gị obi ike na a pụrụ ịtụkwasị obi ná nkwa nile nke Bible. “Na-anwanụ ihe nile.” (1 Ndị Tesalọnaịka 5:21) Dị ka ihe atụ, mgbe ọzọ Ndịàmà Jehova ga-agwa gị okwu, gee ntị n’ihe ha na-ekwu. Ọ bụrụ na ha adịghị abịakarị n’ebe i bi, chọọ ha n’Ụlọ Nzukọ Alaeze kasị dịrị gị nso. A gaghị amanye gị amanye isonye ha, ma a ga-akpọ gị òkù ka ị nakwere ihe omume nke ọmụmụ Bible n’efu, nke a ga-eme ndokwa iduzi n’ebe ọ bụla na n’oge ọ bụla dị gị mma.

Ọmụmụ ihe dị otú ahụ ga-emesi gị obi ike na Chineke “na-enyeghachi ndị na-achọ ya ụgwọ ọrụ.” (Ndị Hibru 11:6) Ị ga-amụta na n’oge na-adịghị anya Alaeze Chineke n’okpuru Eze ahụ, bụ́ Kraịst Jisọs, ga-ewepụ omume rụrụ arụ na ahaghị nhata nile ndị na-akpatara ọtụtụ ndị ndakpọ olileanya taa. N’okpuru Alaeze ahụ, a ga-eweghachi ụwa nke a ịghọ paradaịs, Chineke ga-enyekwa ndị ahụ hụrụ ya n’anya ndụ ebighị ebi. (Abụ Ọma 37:29; Mkpughe 21:4) Lee aha olileanya dị ebube nke a bụ!

Jiri nlezianya gụọ Bible iji hụ na olileanya nke a bụ eziokwu. Mgbe ahụ rụọ ọrụ iwulite mmekọrịta chiri anya n’ebe Chineke nọ, na-aghọ enyi ya dị nnọọ ka Abraham bụ. (Jemes 2:23) Ebe ọ bụ na Jehova bụ “Onye na-anụ ekpere,” gwa ya ihe nile bụ nchegbu gị. Mgbe ị bịakwutere ya site n’ezi obi, ekpere gị ga-enyere gị aka iburu ibu gị nile ma merie ndakpọ olileanya gị. Mmụọ Chineke pụrụ imeghe ụzọ isi gbanwee ọnọdụ ahụ nke na-akpagbu gị.—Abụ Ọma 55:22; 65:2; 1 Jọn 5:14, 15.

‘Jidesie Ike’!

Mgbe ọ tụsịrị aro ka ndị na-eso ụzọ ibe ya ‘na-anwa ihe nile,’ Pọl kwukwara, sị: “Jidesienụ ihe ọma ike.” (1 Ndị Tesalonaịka 5:21) Otu ụzọ isi mee nke a bụ site n’isonyere ndị na-ejidesikwa olileanya ndị Kraịst ike. Eze onye amamihe ahụ bụ́ Solomọn dọrọ aka ná ntị, sị: “Na-ejeso ndị maara ihe, ị ga-amakwa ihe: ma enyi ndị nzuzu ka a ga-emejọ.” (Ilu 13:20) Ekwela ka ihe i cheburu ma ọ bụ mmetụta nke enweghị ohere gbochie gị ịchọ ndị mkpakọrịta dị mma. Dị ka ihe atụ, n’etiti Ndịàmà Jehova, e nwere ndị na-enweghị olileanya n’oge gara aga. Ma ọmụmụ Bible ha, tinyere mkpakọrịta obi ụtọ nke ndị kwere ekwe ibe ha, na-emesi mmekọrịta nke ha na Jehova ike, na-enyekwa ha olileanya yiri arịlịka, nke a pụrụ ịdabere na ya. Nke a ọ̀ na-emeri ndakpọ olileanya n’ezie? N’ezie ọ na-eme otú ahụ.

Tụlee ihe banyere Annmarie, bụ́ onye dabara ná ndakpọ olileanya n’ihi na o nwetara mmeso omume obi ọjọọ site n’aka di ya. “Ekpebiri m igbu onwe m,” ka ọ kọwara, “ma n’ihi ihe ụfọdụ ekpebiri m ibu ụzọ kpekuo Chineke ekpere. Echetara m na m sịrị, ‘N’ihi gịnị ka ị na-achọghị inyere m aka? Ruo ogologo oge anọwo m na-enwe olileanya n’ebe ị nọ, ma nke ahụ bụ n’efu.’ Ekpesịrị m ekpere m na-eche na e nweghị nzube ọ bụla ná ndụ, ya mere ọ ga-akara m mma na m nwụrụ. N’otu oge ahụ a kụrụ aka n’ọnụ ụzọ. Ekpebiri m ileghara ya anya, na-enwe olileanya na onye ọ bụla ọ bụ ga-emesịa pụọ.

“A nọgidere na-akụ aka ahụ, nke ahụ nyekwara m nsogbu n’obi. Ehichara m anya mmiri dị m n’anya wee gaa ịhụ onye nọ n’ọnụ ụzọ, na-enwe olileanya ịpụta ngwa ngwa ka m wee nwee ike ime ihe m bu n’uche. Ma,” ka Annmarie kwuru, “ekele dịrị Jehova, ọ bụghị otú ahụ ka o si mee, n’ihi na mgbe m mepere ụzọ, ahụrụ m ndị inyom abụọ ka ha guzo n’ebe ahụ. N’eziokwu, nke ahụ gbagwojuru m anya, aghọtaghịkwa m ihe ha na-ekwu n’ezie. Ma ha nyere m akwụkwọ ga-akọwa na ndụ nwere nzube. Ọ bụ nnọọ ihe dị m mkpa iji kpalie mmasị m ná ndụ ọzọ.” Ndị ọbịa ya mere ndokwa iso ya nwee ọmụmụ Bible chiri anya. Annmarie mụtara ka e si aghọ enyi Chineke. Nke a, n’aka nke ọzọ, nyere ya nzube ná ndụ. Ugbu a ọ na-enyere ndị ọzọ aka iwulite ntụkwasị obi n’ebe Chineke nọ.

Ma eleghị anya i nwewo olileanya maka ọgwụgwụ nke ndakpọ olileanya n’amataghị ihe nile ọ gụnyere. Ma ọ bụrụ na ọ dịwo mgbe i kpere ekpere, sị: “Ka alaeze gị bịa. Ka e mee ihe ị na-achọ, dị ka e si eme ya n’eluigwe, ka e meekwa otú ahụ n’ụwa,” mgbe ahụ ị na-ekpe ekpere maka ọbịbịa nke Alaeze Chineke n’okpuru Jisọs Kraịst, nke ga-ekpochapụ ihe ndị a nile na-akpatara ndị obi ha ziri ezi ndakpọ olileanya. (Matiu 6:10) Gị onwe gị ịmụ Bible na isoro ndị ọzọ nwere ụdị obi ike ahụ na-akpakọrịta ga-emesi olileanya i nwere ka Alaeze Jehova bịa ma weta Paradaịs n’elu ala anyị ike. (1 Timoti 6:12, 19) Nke a bụ olileanya dị ebube nke magazin nke a na-ekwupụta ná mbipụta ọ bụla. Jiri obi gị nile nabata olileanya ahụ iji lụọ ọgụ megide ndakpọ olileanya. N’ezie, olileanya “emeghịkwa ka ihere mee anyị.”—Ndị Rom 5:5.

[Foto dị na peeji nke 7]

Ịmụ Bible na-enye anyị olileanya nke na-arụ ọrụ dị ka “arịlịka nke mkpụrụ obi”

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya