Ị Pụrụ Inweta Nkasi Obi n’Oge Nchegbu
OLEE otú anyị kwesịrị isi lee mmetụta nke nchegbu anya? Ọ bụrụ na anyị raara onwe anyị nye Jehova, ànyị kwesịrị ile ha anya dị ka ihe iju anya n’ihi olileanya anyị dị ebube na ndokwa ime mmụọ anyị dị iche iche? Mmetụta ndị dị otú ahụ hà na-egosi na n’ụzọ ime mmụọ anyị ekwesịghị ekwesị maka ozi Chineke?
“Elaịja bụ mmadụ yiri anyị n’ahụ ya,” ka onye na-eso ụzọ bụ Jemes dere. (Jemes 5:17) Ọ bụ ezie na Chineke jiri Elaịja mee ihe n’ụzọ pụrụ iche, ọbụna onye amụma ahụ kwesịrị ntụkwasị obi nwere nchegbu. “O zuwo,” ka Elaịja tiri ná mkpu n’otu oge. “Ugbu a, Jehova, wepụ ndụ m; n’ihi na mụ onwe m adịghị mma karị nna m ha.” (1 Ndị Eze 19:4) Nwoke ahụ bụ Job nke na-eguzosi ike n’ezi ihe, nwanyị ahụ bụ Hana nke na-ekwesi ntụkwasị obi, na ndị ọzọ bụ́ ndị ohu Jehova na-eguzosi ike n’ihe nwechara nchegbu. Ọbụna onye ọbụ abụ ahụ na-asọpụrụ Chineke bụ Devid kpere ekpere, sị: “Ahụhụ nile nke obi m sara mbara: mee ka m si ná mkpa m nile pụta.”—Abụ Ọma 25:17.
Ojiji Jehova ji ndị mmadụ na-eme ihe n’ozi ya emeghị ka ha nwere onwe ha kpam kpam pụọ ná nchegbu. Ha ka nwere adịghị ike na mmetụta dị iche iche nke mmadụ, ha pụkwara inwe nchegbu n’okpuru ọnwụnwa. (Ọrụ 14:15) Otú o sina dị, ndị ohu Chineke nwere enyemaka ka mma karịa ndị ọzọ n’ịnagide nchegbu nke uche. Ka anyị tụlee ihe atụ Bible ole na ole iji hụ ihe nyeere ụfọdụ ndị aka imeri ịda mba nke uche ha na mmetụta dị iche iche nke nchegbu.
Onye Ozi Nwere Nchegbu Enweta Nkasi Obi
Pọl onyeozi maara ihe ọ dị ka ya ịbụ onye dara mba n’obi. “N’ihi na,” ka o kwuru, “mgbe anyị bịakwara na Masedonia, anụ ahụ anyị adịghị nfe ma ọlị . . . ịlụ ọgụ dị n’ezí, egwu dị n’ime. Otú ọ dị, onye ahụ nke na-akasị ndị dị ala n’obi, bụ́ Chineke, were ọbịbịa Taịtọs kasị anyị obi.” (2 Ndị Kọrint 7:5, 6) Ihe kpatara ịda mba n’obi Pọl bụ ọtụtụ ọnọdụ ndị na-akpata nchegbu, ndị na-eme n’otu mgbe. E nwere “ịlụ ọgụ dị n’ezí”—oké mkpagbu nke na-etinye ndụ n’onwe ya n’ihe ize ndụ. (Tụlee 2 Ndị Kọrint 1:8.) Ọzọkwa, e nwere “egwu n’ime” n’ụdị nke nchegbu banyere ọgbakọ dị iche iche, dị ka nke ahụ dị na Kọrint.
Ọnwa ole na ole tupu nke a, Pọl edegaworo ndị Kraịst nọ na Kọrint akwụkwọ ozi mbụ ya. N’ime ya ọ katọwo ọtụtụ ọnọdụ ọjọọ dị n’ọgbakọ ahụ, o dokwara anya na o chegburu onwe ya banyere otú ndị Kọrint ga-esi meghachi omume n’ebe akwụkwọ ozi ya dị. Otú ọ dị, a kasiri Pọl obi mgbe Taịtọs siri na Kọrint bịa na-eji akụkọ ọma banyere mmeghachi omume ha. N’otu aka ahụ, Jehova pụrụ iji otu n’ime ndị ohu ya nke oge a mee ihe iwetere anyị ozi ọma ma belata nchegbu anyị.
Otú A Ga-esi Lee Ọrụ Chineke Nyere Anya
N’ihe banyere ije ozi ha, ụfọdụ ndị Kraịst nwere ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ nke nchegbu. N’ezie, ụfọdụ n’ime ndị ohu Jehova echewo na ọrụ nke Chineke nyere ga-achọ ihe dị ukwuu n’aka ha gabiga ókè imezu. Dị ka ihe atụ, Mosis chere na ya erughị eru ịbụ onye nnọchianya Chineke n’ihi ụmụ Israel n’Ijipt. Tinyere ọtụtụ ihe ndị ọzọ, o kwuru na ya adịghị ekwu okwu nke ọma. (Ọpụpụ 3:11; 4:10) Ma site n’ịtụkwasị Chineke obi na inwe Erọn dị ka ọnụ na-ekwuru ya, Mosis malitere ịrụzu ọrụ ya.
Ka oge na-aga, Mosis adịghịkwa adabere n’ebe Erọn nọ ọzọ. N’otu aka ahụ, n’isi mbụ ụfọdụ na-ahụ ije ozi ndị Kraịst dị ka ihe siri ike, ma ha na-anata ọzụzụ wee bụrụ ndị na-ekwusa ozi ọma nwere nkà. Dị ka ihe atụ, ọtụtụ ndị na-eto eto bụ Ndịàmà nke Jehova etowo ịbụ ndị nkwusa oge nile dị ka ndị ọsụ ụzọ na ndị ozi ala ọzọ. Ọ bụ ihe nkasi obi ịmara na Jehova bụ onye a pụrụ ịdabere na ya mgbe nile ime ka ndị Kraịst na-eje ozi ruo eruo ma nye ha ike ịrụzu ọrụ ha nke Chineke nyere.—Zekaraịa 4:6; 2 Ndị Kọrint 2:14-17; Ndị Filipaị 4:13.
Nkasi Obi Mgbe E Nwere Nchegbu n’Ihi Mwute
Anyị pụrụ ịda mba n’obi n’ihi inwe mwute na anyị emebeghị ihe ka ukwuu n’ozi Chineke. Otu nwanna nwoke na-adịghị ejekwa ozi ruo ọtụtụ afọ malitekwara ọzọ ikere òkè n’ozi ubi. Mgbe na-adịghị anya ka nke a gasịrị, ọ dara ọrịa siri ike wee taparazie n’elu àkwà n’ebilighị ebili. Nwanna nwoke ahụ dara mba n’obi kwuru, sị: “Ná mbụ, mgbe m pụrụ ịrụsiworịị ọrụ ike, m hapụrụ ibu ọrụ m. Ugbu a, mgbe m chọrọ ịrụsi ọrụ ike, enweghị m ike.”
Ọ̀ gaghị abụ ihe amamihe ime ihe kasị mma anyị pụrụ ime ugbu a kama imefusị ike nke uche n’ihe nke mere n’oge gara aga? Ụmụnne Jisọs ndị nne ji ha na ya, bụ́ Jemes na Jud aghọghị ndị kwere ekwe ruo mgbe ọnwụ na mbilite n’ọnwụ ya gasịrị. Ọ bụrụ na ha nwere mwute n’ihi nke a, o meghị ka ha ghara ịbụkwa ndị ohu Chineke na ọbụna ndị dere Bible.
Elegharala Ekpere Anya Mgbe Ọ Bụla
Mgbe ndị Chineke dara mba n’obi, ha kwesịrị ikpesi ekpere ike. N’ezie, Akwụkwọ nsọ nwere ọtụtụ ekpere ndị e kpere n’oge nchegbu. (1 Samuel 1:4-20; Abụ Ọma 42:8) Ụfọdụ pụrụ iche, sị: ‘Adara m mba n’obi nke ukwuu nke na apụghị m ikpe ekpere.’ Mgbe ahụ, gịnị mere ị tụleghị ihe banyere Jona? Mgbe ọ ka nọ n’afọ azụ, o kwuru, sị: “Mgbe mkpụrụ obi m na-enweghị ike n’ime m, Jehova ka m chetara: Ekpere m wee bakwute gị, baa n’ụlọ ukwuu gị dị nsọ. . . . Ma mụ onwe m ga-eji olu ekele chụọrọ gị àjà; ihe nke m kweworo ná nkwa ka m ga-akwụghachi. Nzọpụta dịịrị Jehova.” (Jona 2:4-9) Ee, Jona kpere ekpere, Chineke kasikwara ya obi ma zọpụta ya.
Ọ bụ ezie na otu nwanna nwanyị na Sweden abụwo onye ọsụ ụzọ ruo ọtụtụ afọ, ọ dara mba ná mmụọ ma nwee ike ọgwụgwụ n’agbanyeghị ije ozi ya nke na-enyeghachi ụgwọ ọrụ. Ọ kpọtụrụ ịda mba n’obi ya aha n’ekpere nye Jehova. Ụbọchị ole na ole mgbe nke a gasịrị, ọ natara ịkpọ òkù telifon site n’aka otu nwanna nwoke nọ n’alaka ụlọ ọrụ Watch Tower Society. Ọ jụrụ ma ọ pụrụ inye aka n’ebe ahụ otu ugbo n’otu izu n’ebe a na-arụnyekwu ihe na Betel. Nwanna nwanyị a mesịrị kwuo, sị: “Ọnọdụ dị gburugburu Betel na inwe ohere nke ịhụ ọrụ ahụ e ji arụnyekwu ihe na ikere òkè na ya nyere m ume ọzọ ahụ dị m mkpa.”
Ọ bụrụ na anyị dara mba n’obi, ọ dị mma icheta na ekpere bụ otu ụzọ e si alụso ịda mba n’obi ọgụ. (Ndị Kọlọsi 4:2) N’ịza ekpere anyị, Jehova pụrụ imepe ọnụ ụzọ nke na-eduga n’ọrụ ka ukwuu n’ozi ya, ma ọ bụ ọ pụrụ ịgọzi ọrụ anyị site n’ime ka anyị rụpụtakwuo ihe. (1 Ndị Kọrint 16:8, 9) Nke ọ masịrị ya bụrụ, “ngọzi Jehova, nke ahụ na-eme mmadụ ọgaranya, ọ dịghị atụkwasịkwa ya ihe mwute.” (Ilu 10:22) E ji n’aka na nke a ga-ebuli mmụọ anyị elu.
Ị̀ Nọ ná Nchegbu n’Ihi Obi Abụọ?
Site ná mgbe ruo ná mgbe, otu n’ime ndị ohu Jehova pụrụ inwe obi abụọ. Ọ bụrụ na nke ahụ emee anyị, anyị ekwesịghị ikwubi ozugbo ahụ na anyị atụfuwo ihu ọma nke Chineke. Jisọs ajụghị onyeozi bụ Tọmas n’ihi ịrụ ụka n’akụkọ ndị ji anya ha hụ kọrọ banyere mbilite n’ọnwụ nke Onyenwe ya. Kama nke ahụ, Jisọs jiri ịhụnanya nyere Tọmas aka imeri obi abụọ ya. Leekwa oké mkpali Tọmas nwere mgbe ọ ghọtara na Jisọs dị ndụ!—Jọn 20:24-29.
Site n’ozizi ụgha ha, ịtamu ntamu, na ihe ndị ọzọ, “ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke,” bụ́ ndị gbebatara n’ọgbakọ ndị Kraịst nke narị afọ mbụ na-akpatara ụfọdụ ndị inwe obi abụọ nke na-akpata nchegbu. N’ihi ya, onye na-eso ụzọ bụ́ Jud dere, sị: “Na-emekwaranụ ụfọdụ ebere, bụ́ ndị nwere obi abụọ; na-azọpụtakwanụ ụfọdụ, na-agụpụta ha n’ọkụ.” (Jud 3, 4, 16, 22, 23) Iji nọgide na-enweta nlebara anya obi ebere nke Chineke, ọ dị ndị ha na Jud na-efekọ ofufe mkpa—karịsịa ndị okenye ọgbakọ—igosi ndị nwere obi abụọ ebere, bụ́ ndị o kwesịrị. (Jemes 2:13) Ndụ ebighị ebi ha nọ n’ihe ize ndụ, n’ihi na ha nọ n’ihe ize ndụ nke “ọkụ” nke mbibi ebighị ebi. (Tụlee Matiu 18:8, 9; 25:31-33, 41-46.) Leekwa ihe ọṅụ ọ bụ mgbe e ji obi ọma nyere ndị kwere ekwe ibe anyị aka, bụ́ ndị nwere obi abụọ, ha wee sie ike n’ime mmụọ!
Ọ bụrụ na ọnwụnwa siri ike emee ka anyị nwee obi abụọ ma Chineke ọ̀ nọnyekwaara anyị, ọ dị anyị mkpa ịkpọ ihe aha kpọmkwem n’ekpere anyị. N’okpuru ọnọdụ dị otú ahụ, ka anyị nọgidesie ike ịrịọ Jehova maka amamihe. Ọ na-enye n’ụba n’ataghị anyị ụta n’ihi enweghị amamihe ma na-arịọ maka ya. Anyị aghaghị ‘ịrịọ n’okwukwe, ghara inwe obi abụọ,’ n’ihi na ndị nwere obi abụọ “yiri ebili mmiri nke oké osimiri mgbe ifufe na-efegharị ya, a na-atụlikwa ya elu” gaa n’ebe ọ bụla. Ndị dị otú ahụ adịghị enweta ihe ọ bụla site n’aka Chineke n’ihi na ha adịghị enwe mkpebi, ha bụ ndị “na-adịghị eguzo n’otu ebe” n’ekpere ha na n’ụzọ ha nile. (Jemes 1:5-8) Ya mere, ka anyị nwee okwukwe na Jehova ga-enyere anyị aka ile ọnwụnwa anyị anya n’ụzọ dị mma ma tachie obi na ha. A pụrụ ịdọrọ uche anyị gaa n’Akwụkwọ nsọ site n’aka ndị kwere ekwe ibe anyị ma ọ bụ n’oge anyị na-amụ Bible. Ihe omume ndị Chineke jiri aka ya hazie pụrụ inyere anyị aka ịhụ ihe anyị kwesịrị ime. Ndị mmụọ ozi pụrụ inye aka n’iduzi anyị, ma ọ bụ anyị pụrụ ịnata nduzi sitere na mmụọ nsọ. (Ndị Hibru 1:14) Ihe bụ isi bụ iji ntụkwasị obi zuru ezu n’ebe Chineke anyị na-ahụ n’anya nọ kpee ekpere maka amamihe.—Ilu 3:5, 6.
Cheta na Jehova Na-enye Nkasi Obi
Pọl jiri ekpere dabere n’ebe Jehova nọ wee mata ya ịbụ Isi Iyi nke nkasi obi. Onyeozi ahụ dere, sị: “Onye a gọziri agọzi ka ọ bụ, bụ́ Chineke na Nna nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, bụ́ Nna nke obi ebere nile na Chineke nke nkasi obi nile; onye na-akasi anyị obi ná mkpagbu anyị nile, ka anyị wee pụ isite ná nkasi obi nke Chineke ji kasie anyị onwe anyị obi kasie ndị ahụ obi ndị nọ ná mkpagbu ọ bụla.”—2 Ndị Kọrint 1:3, 4.
Chineke nke nkasi obi nile maara banyere nchegbu nke ndị ohu ya na-enwe, ọ chọkwara inye ha nnwere onwe. N’ihe banyere nchegbu Pọl maka ndị Kọrint, nnwere onwe bịara site n’onye Kraịst ibe ya bụ́ Taịtọs. Nke a bụ otu ụzọ nke a pụrụ isi kasie anyị obi taa. N’ihi ya, mgbe anyị nwere nchegbu, anyị kwesịrị izere ikewapụ onwe anyị iche. (Ilu 18:1) Isoro ndị Kraịst ibe anyị na-akpakọ bụ otu ụzọ nke Chineke sị akasi anyị obi. Anyị pụrụ iche, sị: ‘Enwere m ịda mba n’obi nke ukwuu nke na esighi m ike ruo ókè o kwesịrị mụ na ndị enyi m bụ ndị Kraịst ịnọkọ.’ Otú ọ dị, anyị kwesịrị ịlụ ọgụ megide mmetụta ndị dị otú ahụ ma ghara ịnapụ onwe anyị nkasi obi ahụ nke ndị kwere ekwe ibe anyị pụrụ inye.
Ike Agwụla Gị!
Ọ pụrụ ịbụ na ụfọdụ n’ime anyị enwebeghị ọnwụnwa nke nwere mmetụta dị otú ahụ nke na anyị atawo ahụhụ nke oké ịda mba n’obi. Ma ọrịa nke na-amịkọrọ ume mmadụ, ọnwụ nke di ma ọ bụ nwunye, ma ọ bụ ọnọdụ ọzọ nke na-akpata ọnwụnwa pụrụ iweta nsogbu nke uche. Ọ bụrụ na nke ahụ emee, ka anyị ghara ikwubi na anyị na-arịa nnọọ ọrịa n’ime mmụọ. Onye dara mba n’obi pụrụ iru eru maka ozi Chineke, ọbụna inwe ike inyere ndị ọzọ aka n’ụzọ ime mmụọ. Pọl gbara ụmụnna ume ka ha ‘na-agụgụ ndị dara mba n’obi,’ ọ bụghị na-eche n’ụzọ inyo ha enyo na ha emewo ihe na-adịghị mma wee na-arịa ọrịa n’ime mmụọ. (1 Ndị Tesalọnaịka 5:14) Ọ bụ ezie na mgbe ụfọdụ nchegbu na-enwe ihe jikọrọ ya na omume ọjọọ na obi ọmụma ikpe, nke ahụ abụghị otú ọ dị n’ebe ndị ahụ ji obi dị ọcha na-ejere Chineke ozi dị. Ofufe ha, nke ma eleghị anya e fere n’okpuru oké ihe isi ike, bụ nke Jehova na-anara. Ọ hụrụ ha n’anya, jirikwa enyemaka na nkasi obi di ha mkpa na-agbatakwara ha ọsọ enyemaka.—Abụ Ọma 121:1-3.
Ndị ahụ mejupụtara ihe ahụ fọdụrụ nke Israel ime mmụọ nwere nchegbu dị ilu n’ihi ule n’afọ 1918. (Tụlee Ndị Galetia 6:16.) Ọ fọrọ nke nta ka e bibie nhazi nkwusa ha, a tụrụ ụfọdụ n’ime ha mkpọrọ n’ụzọ na-ezighị ezi, ụfọdụ n’ime ndị na-esonyere ha ná mbụ ghọrọ ndị na-adịghị eguzosi ike n’ihe, ndị mmegide si n’ezi ofufe dapụ. Ọzọkwa, ndị ahụ e tere mmanụ kwesịrị ntụkwasị obi aghọtaghị ihe mere Chineke jiworo kwere ka ihe a nile mee. Ruo oge ụfọdụ ‘ha jiri anya mmiri ghaa mkpụrụ,’ ma ike agwụghị ha. Ha nọgidere na-ejere Jehova ozi ma nyochaakwa onwe ha. Gịnị si n’ime ya pụta? Ha ‘weere iti mkpu ọṅụ bịaghachi, na-ebu ùkwù ọka ya nile.’ (Abụ Ọma 126:5, 6) Ndị ahụ e tere mmanụ ghọtara ugbu a na Chineke kwere ka ụdị ọnwụnwa ahụ dịrị iji nụchaa ha maka ọrụ ha nke iwe ihe ubi zuru ụwa ọnụ na-abịanụ.
Ọ bụrụ na anyị nwere nchegbu n’ihi na anyị na-ezute ọtụtụ ọnwụnwa, anyị pụrụ irite uru site n’ahụmahụ nke ihe ahụ fọdụrụ e tere mmanụ. Kama ike ịgwụ anyị, ka anyị nọgide na-eme ihe ziri ezi, ọbụna ma ọ bụrụ na anyị aghaghị iji ịkwa ákwá na-eme otú a. Mgbe oge ruru, a ga-enwe ụzọ mgbapụ site n’ọnwụnwa anyị, anyị ga-ejikwa ‘iti mkpu ọṅụ wee bata.’ Ee, ọṅụ—otu n’ime mkpụrụ nke mmụọ nsọ Chineke—ga-abụ nke anyị n’ihi anyị ịbụ ndị tachiworo obi n’ọnwụnwa anyị. Nye anyị, Jehova ga-abụ n’ezie “Chineke nke nkasi obi nile.”