Chọọchị Oge Gboo Ọ̀ Kụziri na Chineke Bụ Atọ n’Ime Otu?
Akụkụ nke 4—Olee Mgbe, Ọ̀ Bụkwa n’Ụzọ Dị Aṅaa Ka Ozizi Atọ n’Ime Otu Si Malite?
Isiokwu atọ ndị mbụ nke usoro isiokwu nke a gosiri na Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya ma ọ bụ Ndị Nna Chọọchị oge gboo akụzighị ozizi Atọ n’Ime Otu. (Ụlọ Nche nke November 1, 1991; February 1, 1992; na April 1, 1992) Isiokwu ikpeazụ nke a ga-akọwa ụzọ ozizi Atọ n’Ime Otu si malite nakwa òkè nke Kansụl nke Nicaea keere n’afọ 325 O.A.
N’AFỌ 325 O.A., onye ọchịchị alaeze ukwu Rom bụ́ Constantine kpọkọrọ kansụl ndị bishọp n’obodo Nicaea dị n’Asia Minor. Nzube ya bụ iji dozie esemokwu okpukpe ahụ na-aga n’ihu banyere ihe bụ mmekọrịta nke Ọkpara Chineke n’ebe Chineke Onye Pụrụ Ime Nile nọ. Banyere ihe si na kansụl ahụ pụta, akwụkwọ Encyclopædia Britannica kwuru, sị:
“Constantine n’onwe ya bụ onye isi oche, na-eduzi ihe nile na-aga ná mkparịta ụka ahụ, ma jirikwa aka ya wepụta . . . ụkpụrụ ahụ dị oké mkpa nke na-akọwa njikọ dị n’etiti Kraịst na Chineke n’ụkpụrụ okwukwe ahụ bụ́ nke nzukọ ahụ wepụtara, ‘ya na Nna ahụ nwere otu ụdịdị [ho·mo·ouʹsi·os].’ . . . N’ihi oké egwu ha na-atụ onye ọchịchị ahụ, ndị bishọp ahụ nile ma e wezụga mmadụ abụọ nanị bịanyere aka n’ụkpụrụ okwukwe ahụ, bụ́ nke megidere echiche nke ọtụtụ n’ime ha n’ụzọ dị ukwuu.”1
Onye ọchịchị nke a na-agọ mmụọ ò tinyere ọnụ n’okwu a n’ihi nghọta ya nke Bible? Ee e. Akwụkwọ bụ A Short History of Christian Doctrine kwuru, sị: “N’ụzọ bụ isi, Constantine enweghị nghọta ọ bụla ma ọlị banyere ajụjụ ndị ahụ a na-ajụ n’ọkà mmụta okpukpe Grik.“2 Ihe ọ ghọtara bụ na nkewa okpukpe bụ ihe iyi egwu n’ebe alaeze ukwu ya dị, ọ chọkwara ka e dozie ha.
Ò Guzobere Ozizi Atọ n’Ime Otu?
Kansụl nke Nicaea ò guzobere, ma ọ bụ kwupụta, Atọ n’Ime Otu dị ka ozizi nke Krisendọm? Ọtụtụ na-eche na nke a bụ otú o si mee. Ma eziokwu na-egosi na ọ dịghị otú ahụ.
Ụkpụrụ okwukwe ahụ nke kansụl ahụ wepụtara kwuru ihe ụfọdụ banyere Ọkpara Chineke nke ga-enye ndị ụkọchukwu dị iche iche ohere ile ya anya dị ka onye hà ka Chineke Nna n’ụzọ ụfọdụ. Ma, ọ bụ ihe na-enye nghọta ịhụ ihe Ụkpụrụ Okwukwe Nicene ahụ na-ekwughị. Dị ka e bipụtara ya na mbụ, ụkpụrụ okwukwe ahụ dum kwuru, sị:
“Anyị kwere n’otu Chineke, Nna nke pụrụ ime ihe nile, onye mere ihe nile a na-ahụ anya na ihe a na-adịghị ahụ anya;
“Na n’otu Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, Ọkpara Chineke, onye Nna ahụ mụrụ, onye a mụrụ nanị ya, ya bụ, site n’ụdịdị nke Nna ahụ, Chineke sitere na Chineke, ìhè sitere n’ìhè, ezi Chineke sitere n’ezi Chineke, onye a mụrụ amụ ọ bụghị onye e mere eme, onye ya na Nna ahụ bụ otu ụdịdị, Onye ihe nile sitere n’aka ya, ihe ndị dị n’eluigwe na ihe ndị dị n’elu ala, Onye, n’ihi anyị bụ ụmụ mmadụ nakwa n’ihi nzọpụta anyị, gbadatara wee ghọọ Chineke n’ụdị mmadụ, na-aghọ mmadụ, nwụọ ma bilie ọzọ n’ụbọchị nke atọ, rịgoo n’eluigwe, ọ ga-abịakwa ikpe ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ ikpe;
“Nakwa ná Mmụọ Nsọ.”3
Ụkpụrụ okwukwe nke a ọ̀ na-ekwu na Nna, Ọkpara, na mmụọ nsọ bụ mmadụ atọ n’otu Chineke? Ọ̀ na-ekwu na ha atọ hà nhata n’ebighị ebi, ike, ọnọdụ, na amamihe? Ee e, ọ dịghị. E nweghị ụkpụrụ atọ n’ime otu ọ bụla n’ebe a. Ụkpụrụ Okwukwe Nicene nke mbụ eguzobeghị ma ọ bụ kwupụta Atọ n’Ime Otu.
Ụkpụrụ okwukwe ahụ, ya karịsịa, mere ka Ọkpara ahụ na Nna hara nhata n’ịbụ “otu ụdịdị.” Ma o kwughị ihe dị otú ahụ banyere mmụọ nsọ. Nanị ihe o kwuru bụ na “anyị kwere . . . na Mmụọ Nsọ.” Nke ahụ abụghị ozizi Atọ n’Ime Otu Krisendọm.
Ọbụna ahịrị okwu ahụ bụ isi “bụ otu ụdịdị” (ho·mo·ouʹsi·os) apụtachaghị na kansụl ahụ kwetara n’ịha nhata n’ọnụ ọgụgụ nke Nna na Ọkpara. Akwụkwọ New Catholic Encyclopedia kwuru, sị:
“Ma ihe Kansụl ahụ bu n’uche ọ̀ bụ ikwupụta nkọwa ọnụ ọgụgụ nke ụdịdị nke Nna na Ọkpara bụ ihe a na-arụ ụka.”4
Ọ bụrụ na kansụl ahụ bu n’uche na Ọkpara ahụ na Nna bụ otu n’ọnụ ọgụgụ, ọ gaghị abụkwa Atọ n’Ime Otu. Ọ ga-abụ nanị Chineke abụọ n’ime otu, ọ bụghị atọ n’ime otu dị ka ozizi Atọ n’Ime Otu si chọọ ya.
“Echiche nke Ndị A Ka n’Ọnụ Ọgụgụ”
Na Nicaea, ndị bishọp n’ozuzu ha hà kwetara na Ọkpara ahụ hà ka Chineke? Ee e, e nwere echiche ndị na-emegiderịta onwe ha. Dị ka ihe atụ, otu bụ nke Arius nọchiri anya ya, bụ́ onye kụziri na Ọkpara ahụ nwere mgbe ọ malitere kpọmkwem wee si otú ahụ ghara ịha ka Chineke, kama ọ na-edo onwe ya n’okpuru n’ihe nile. Athanasius, n’aka nke ọzọ, kwetara na Ọkpara ahụ hà ka Chineke n’ụzọ ụfọdụ. E nwekwara echiche ndị ọzọ.
Banyere mkpebi kansụl ahụ mere iwere Ọkpara ahụ dị ka onye bụ otu ihe (onye dị n’ụdịdị) dị ka Chineke, Martin Marty kwuru, sị: “N’ezie Nicaea nọchiri anya echiche nke ndị a ka n’ọnụ ọgụgụ; idozi okwu ahụ adịghị mfe, ọ bụkwa nke ọtụtụ ndị kwadoro echiche Arius na-anabataghị.” N’otu aka ahụ, akwụkwọ ahụ bụ A Select Library of Nicene and Post-Nicene Fathers of the Christian Church rịbara ama na “mkpebi ụkpụrụ ozizi doro anya nke megidere echiche Arius bụ nke nanị ndị a ka n’ọnụ ọgụgụ nabatara, ọ bụ ezie na ndị a a ka n’ọnụ ọgụgụ meriri.”6 Akwụkwọ bụ́ A Short History of Christian Doctrine rịbara ama, sị:
“Ihe yikarịsịrị ka ọ bụ ihe ọtụtụ ndị bishọp na ndị ọkà mmụta okpukpe nke Ebe Ọwụwa Anyanwụ na-arụ ụka banyere ya bụ echiche ahụ nke Constantine n’onwe ya tinyere ụkpụrụ okwukwe ahụ, homoousios ahụ [“bụ otu ụdịdị”], bụ́ nke, n’esemokwu ahụ mesịrị bilite n’etiti okpukpe ọdịnala na ịjụ okwukwe, ghọrọ ihe na-akpata nkewa.”7
Mgbe kansụl ahụ gasịrị, esemokwu nọgidere na-aga n’ihu ruo ọtụtụ iri afọ. Ndị kwadoro echiche nke ime ka Ọkpara ahụ na Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Nile hara nhata ghọrọ ọbụna ndị a na-adịghị anụ olu ha ruo nwa oge. Dị ka ihe atụ, Martin Marty kwuru banyere Athanasius, sị: “Owuwu o wuru biliri ma daa, a chụlakwara ya n’ala ọzọ ọtụtụ mgbe [n’ọtụtụ afọ mgbe kansụl ahụ gasịrị] nke na ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ onye ji ụkwụ akpagharị.”8 Athanasius nọrọ ọtụtụ afọ n’ala ọzọ n’ihi na ndị isi ndọrọ ndọrọ ọchịchị na nke chọọchị megidere echiche ya nke mere ka Ọkpara ahụ na Chineke hara nhata.
Ya mere ikwu na Kansụl nke Nicaea n’afọ 325 O.A. guzobere ma ọ bụ kwupụtara ozizi Atọ n’Ime Otu abụghị eziokwu. Ihe mesịrị ghọọ ozizi Atọ n’Ime Otu adịghị adị n’oge ahụ. Echiche ahụ nke bụ na Nna, Ọkpara, na mmụọ nsọ bụ ezi Chineke n’otu n’otu, harakwa nhata n’ebighị ebi, ike, ọnọdụ, na amamihe, ma bụrụ otu Chineke—Chineke atọ n’ime otu—abụghị nke kansụl ahụ wepụtara, ọ bụghịkwa nke Ndị Nna Chọọchị wepụtara. Dị ka akwụkwọ bụ́ The Church of the First Three Centuries si kwuo:
“Ozizi ọgbara ọhụrụ na-ewu ewu nke Atọ n’Ime Otu . . . adịghị enweta nkwado ọ bụla site n’okwu nile nke Justin [Martyr]: a pụkwara iji nghọta nke a mee ihe banyere Ndị Nna Chọọchị nile tupu oge Nicaea; ya bụ, banyere ndị Kraịst nile dere akwụkwọ na narị afọ nke atọ mgbe ọmụmụ Kraịst gasịrị. Ọ bụ eziokwu na ha na-ekwu banyere Nna, Ọkpara, na Mmụọ ahụ nke na-ebu amụma ma ọ bụ nke dị nsọ, ma ọ bụghị dị ka nke hà nhata, ọ bụghị dị ka nke bụ otu ihe n’ọnụ ọgụgụ, ọ bụghị dị ka Atọ n’Ime Otu, n’echiche ọ bụla ndị nkwado Atọ n’Ime Otu na-ekweta ugbu a. Nke a abụghị ezie ma ọlị. Ozizi Atọ n’Ime Otu, dị ka Ndị Nna ndị a kọwara ya, dị iche n’ụzọ bụ isi site n’ozizi ọgbara ọhụrụ. Nke a ka anyị na-ekwu dị ka ihe bụ eziokwu nke ga-eguzosi ike n’ihu nnwapụta ọ bụla dị ka ihe ọ bụla bụ ezie n’akụkọ ihe mere eme nke echiche ụmụ mmadụ.”
“Anyị na-ama onye ọ bụla aka ịkpọpụta otu onye na-ede ihe a rịbara ama, n’oge narị afọ atọ ndị mbụ, bụ́ onye kwetara n’ozizi [Atọ n’Ime Otu] nke a dị ka e si kwere ya ugbu a.”9
Otú ọ dị, Nicaea ghọrọ oge ntụgharị. O meghere ụzọ nye nnabata chọọchị nabatara Ọkpara ahụ dị ka onye ya na Nna ahụ hà nhata, nke ahụ mepekwara ụzọ maka echiche Atọ n’Ime Otu nke oge ikpeazụ a. Akwụkwọ ahụ bụ́ Second Century Orthodoxy, nke J. A. Buckley dere, rịbara ama, sị:
“Ma ọ dịghị ihe ọzọ, ruo ná ngwụsị nke narị afọ nke abụọ, Chọọchị ahụ n’ozuzu ya nọgidere n’ịdị n’otu n’echiche ahụ nke bụ isi; ha nakweere ọkaaka nke Nna ahụ. Ha nile weere Chineke Nna nke Pụrụ Ime Ihe Nile dị ka onye nanị ya bụ ọkaaka, onye na-adịghị agbanwe agbanwe, onye a na-apụghị ịkọwa akọwa na onye na-enweghị mmalite. . . .
“Site ná ngabiga nke ndị ahụ na-ede ihe na ndị ndú na narị afọ nke abụọ, Chọọchị ahụ hụrụ onwe ya . . . ka ọ na-akpafu nwayọọ nwayọọ ma nọgide na-eru n’ọ̀tụ̀tụ̀ . . . ebe, na Kansụl nke Nicaea, ọgwụgwụ nke mwakwasị nile e ji nke nta nke nta wakwasị okwukwe mbụ bịara ná ngwụsị. N’ebe ahụ, ntakịrị ọnụ ọgụgụ nke ndị dị ike, manyere ọnụ ọgụgụ ka ukwuu nke ndị na-anakwere ihe e kwuru ịnabata ịjụ okwukwe ya, sitekwa n’ike ndọrọ ndọrọ ọchịchị o nwetara, ọ manyere, nweekwa ike n’ahụ ndị gbalịrị ijigide ịdị ọcha mbụ nke okwukwe ha a na-emerụghị emerụ.”10
Kansụl nke Constantinople
N’afọ 381 O.A., Kansụl nke Constantinople kwupụtara Ụkpụrụ Okwukwe Nicene. O tinyekwara ihe ọzọ. Ọ kpọrọ mmụọ nsọ “Onyenwe anyị” na “onye na-enye ndụ.” Ụkpụrụ okwukwe ahụ e mere ka ọ saa mbara nke afọ 381 O.A. (nke e ji akụkụ ka ukwuu na ya na-eme ihe taa na chọọchị dị iche iche, nke a na-akpọkwa “Ụkpụrụ Okwukwe Nicene”) na-egosi na Krisendọm adịwo njikere ichepụta ozizi Atọ n’Ime Otu zuru ezu. Ma, ọ bụghịdị kansụl nke a chepụtazuru ozizi nke a. Akwụkwọ bụ́ The Catholic Encyclopedia kwuru, sị:
“Ọ bụ ihe na-akpali mmasị na 60 afọ mgbe e nwesịrị Nicaea nke Mbụ, Kansụl nke Constantinople nke Mbụ [381 O.A.] zeere okwu ahụ bụ homoousios ná nkọwa ya nke ịbụ Chineke nke Mmụọ Nsọ.”11
“Ndị ọkà mmụta enwewo ihe ijuanya site n’ụzọ ụkpụrụ okwukwe nke a si ghara ikwupụta ihe ọ bụla hoo haa; dị ka ihe atụ, ojiji ọ na-ejighị okwu ahụ bụ homoousios nke Mmụọ Nsọ mee ihe dị ka nke ya na Nna ahụ na Ọkpara nwere otu ụdịdị.”12
Otu akwụkwọ nkà ihe ọmụma ahụ kwetara, sị: “Homoousios apụtaghị n’Akwụkwọ nsọ.”13 Ee e, Bible ejighị okwu ahụ mee ihe maka mmụọ nsọ ma ọ bụ maka Ọkpara ahụ dị ka ndị nwere otu ụdịdị nke Chineke. Ọ bụ okwu na-adịghị na Bible nke nyere aka iduga n’ozizi Atọ n’Ime Otu nke na-adịghị na Bible, n’ezie nke na-emegide Bible.
Ọbụna mgbe e nwesịrị nzukọ Constantinople ahụ, o were ọtụtụ narị afọ tupu a nakwere ozizi Atọ n’Ime Otu n’akụkụ nile nke Krisendọm. Akwụkwọ bụ́ New Catholic Encyclopedia kwuru, sị: “N’Ebe Ọdịda Anyanwụ . . . o yiri ka mmadụ nile gbachiri nkịtị n’ihe banyere Constantinople nke Mbụ na ụkpụrụ okwukwe ya.”14 Akwụkwọ ahụ na-egosi na a mataghị ụkpụrụ okwukwe ahụ n’Ebe Ọdịda Anyanwụ ruo na narị afọ nke asaa ma ọ bụ nke asatọ.
Ọzọkwa, ndị ọkà mmụta na-ekwu na Ụkpụrụ Okwukwe Athanasius, nke a na-ehotakarị dị ka ihe e ji akọwa ma na-akwado Atọ n’Ime Otu, abụghị nke Athanasius dere kama ọ bụ onye a na-amaghị dere ya mgbe ọtụtụ oge gasịrị. Akwụkwọ bụ́ The New Encyclopædia Britannica na-ekwu, sị:
“Chọọchị ndị Ebe Ọwụwa Anyanwụ amataghị ụkpụrụ okwukwe ahụ ruokwa narị afọ nke iri na abụọ. Malite na narị afọ nke iri na asaa, ndị mmụta kwekọrịtara na ọ bụghị Athanasius (onye nwụrụ na 373) dere Ụkpụrụ Okwukwe Athanasius ahụ kama, e dere ya ma eleghị anya n’ebe ndịda France n’oge narị afọ nke ise. . . . Mmetụta nke usoro okwukwe ahụ yiri ka ọ bụ isi n’ebe ndịda France na Spain na narị afọ nke isii na asaa. E ji ya mee ihe n’usoro ofufe ndị chọọchị na Germany na narị afọ nke itoolu nakwa na Rom ka oge na-aga.”15
Ụzọ O Si Malite
Ozizi Atọ n’Ime Otu malitere nwayọọ nwayọọ n’ime ogologo oge dị ọtụtụ narị afọ. Echiche atọ n’ime otu nke ndị Grik bụ ọkà ihe ọmụma dị ka Plato, onye dịrị ndụ ọtụtụ narị afọ tupu Kraịst, jiri nwayọọ nwayọọ gbebata n’ime ozizi nile nke chọọchị. Dị akwụkwọ bụ́ The Church of the First Three Centuries si kwuo:
“Anyị na-ekwu na ozizi nke Atọ n’Ime Otu bụ nke bịara nke nta nke nta nakwa mgbe oge gasịrị; na mmalite ya sitere kpam kpam n’ebe dị iche pụọ n’Akwụkwọ nsọ ndị Juu na nke ndị Kristian; na o tolitere, e wee webata ya n’Iso Ụzọ Kraịst, site n’aka Ndị Nna ahụ na-agbaso echiche Plato; na n’oge Justin, nakwa ogologo oge mgbe nke ahụ gasịrị, a kụziri ọdịdị na ịdị ala pụtara ìhè nke Ọkpara ahụ n’elu ụwa nile; na ọ bụkwa nanị nkọwa mbụ na-edochaghị anya nke Atọ n’Ime Otu pụtara ìhè n’oge ahụ.”16
Tupu oge Plato, chi atọ, ma ọ bụ atọ n’ime otu dị iche iche, jupụtara na Babilọn na Ijipt. Mgbalị ndị na-eje chọọchị mere ịdọrọ mmasị ndị na-ekweghị ekwe ná mba Rom dugara ná mwebata e ji nwayọọ nwayọọ webata ụfọdụ n’ime echiche ndị ahụ n’Iso Ụzọ Kraịst. Nke a mesịrị duga n’ịnakwere nkwenkwe ahụ bụ na Ọkpara ahụ na mmụọ nsọ na Nna ahụ hà nhata.a
Ọbụna okwu ahụ bụ́ “Atọ n’Ime Otu” bụ nke e ji nnọọ nwayọọ nwayọọ nabata. Ọ bụ n’ọkara nke ikpeazụ nke narị afọ nke abụọ ka Theophilus, bụ́ bishọp nke Antiọk dị na Siria, dere akwụkwọ n’asụsụ Grik wee webata okwu ahụ bụ tri·asʹ, nke pụtara “chi atọ,” ma ọ bụ “atọ n’ime otu.” Mgbe ahụ, onye na-ede akwụkwọ n’asụsụ Latin bụ́ Tertullian nọ na Carthage, Ebe Ugwu Africa, webatara n’ihe odide ya okwu ahụ bụ́ trinitas, nke pụtara “atọ n’ime otu”b Ma adịghị achọta okwu ahụ bụ tri·asʹ n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst e dere n’ike mmụọ nsọ, a dịghị achọtakwa okwu ahụ bụ trinitas ná nsụgharị a sụgharịrị Bible n’asụsụ Latin, bụ́ nke a kpọrọ Vulgate. Ọ dịghị nke ọ bụla n’ime okwu ndị ahụ dị na Bible. Ma okwu ahụ bụ “Atọ n’Ime Otu,” nke dabeere n’echiche ndị ọgọ mmụọ, gbebatara n’akwụkwọ ọgụgụ chọọchị dị iche iche, mgbe narị afọ nke anọ gasịrị, ọ ghọrọ akụkụ nke ozizi ha.
Otú a, ọ bụghị na ndị ọkà mmụta nyochara Bible nke ọma iji hụ ma à kụziri ozizi dị otú a na ya. Kama nke ahụ, ndọrọ ndọrọ ọchịchị ụwa na nke chọọchị kpebiri ozizi ahụ n’ụzọ bụ isi. N’akwụkwọ ahụ bụ́ The Christian Tradition, onye na-ede akwụkwọ bụ Jaroslav Pelikan kpọtụrụ uche “n’ihe ndị na-emetụtaghị nkà mmụta okpukpe n’arụmụka ahụ, nke ọtụtụ n’ime ha yiri ka hà dị njikere mgbe nile ikpebi ihe ga-esi n’ime ya pụta, nanị ịbụ nke ike ndị ọzọ ya na ha hà n’ịdị mkpa na-emebi. O yiri ka ozizi ọ̀ bụ ihe a na-emetụta—ma ọ bụ ihe a na-emepụta—site ná ndọrọ ndọrọ chọọchị nakwa ịdị iche nke ọdịdị mmadụ.”17 Onye prọfesọ ụlọ akwụkwọ Yale bụ́ E. Washburn Hopkins kọwara ya otú a, sị: “Nkọwa ọdịnala ikpeazụ nke atọ n’ime otu bụ n’ụzọ dị ukwuu okwu metụtara ndọrọ ndọrọ chọọchị.”18
Lee ka o si bụrụ ihe ezi uche na-adịghị na ya na e ji ozizi Atọ n’Ime Otu tụnyere ozizi Bible dị mfe nke na Chineke bụ ọkaaka, o nweghịkwa onye ya na ya hà! Dị ka Chineke kwuru, “ònye ka unu ga-asị na m yiri ya, na mụ na ya hara nhata, na mụ dị ka ya, ka anyị wee yie?”—Aịsaịa 46:5.
Ihe Ọ Nọchiri Anya Ya
Gịnị ka ntolite nke echiche Atọ n’Ime Otu ji nwayọọ nwayọọ tolite na-anọchi anya ya? Ọ bụ akụkụ nke isi n’ezi Iso Ụzọ Kraịst dapụ nke Jisọs buru n’amụma. (Matiu 13:24-43) Pọl onyeozi ebuwokwa amụma banyere ndapụ n’ezi ofufe na-abịa abịa:
“Oge gaje ịbịa n’ezie mgbe, kama ịbụ ndị nwere afọ ojuju n’ozizi dị mma, ndị mmadụ ga-enwe ọchịchọ ịnụ ihe ọhụrụ, kpọtakwara onwe ha ìgwè buru ibu nke ndị nkụzi dị ka agụụ nke aka ha si dị; mgbe ahụkwa, kama ịṅa ntị n’eziokwu ahụ, ha ga-aṅa ntị n’akụkọ ifo.”—2 Timoti 4:3, 4, Jerusalem Bible nke ndị Katọlik.
Otu n’ime akụkọ ifo ndị a bụ ozizi Atọ n’Ime otu. Ụfọdụ akụkọ ifo ndị ọzọ nke bụ ihe ọhụrụ nye Iso Ụzọ Kraịst, bụ́ ndị ji nwayọọ nwayọọ bilite bụ: mkpụrụ obi na-adịghị anwụ anwụ nke dị n’ime mmadụ, pọgatrị, Limbo, na ịta ahụhụ ebighị ebi n’ọkụ ala mmụọ.
Ya mere, gịnị ka ozizi Atọ n’Ime Otu bụ? N’ezie ọ bụ ozizi ndị ọgọ mmụọ nke kpuchiri onwe ya dị ka nke ndị Kraịst. Ọ bụ Setan kwalitere ya iji duhie ndị mmadụ, iji mee ka Chineke bụrụ ihe mgbagwoju anya na ihe dị omimi nye ha. Nke a na-eme ka ha dịkwuo njikere ịnakwere echiche okpukpe ụgha na ajọ omume ndị ọzọ.
‘Site ná Mkpụrụ Ha’
Na Matiu 7:15-19, Jisọs kwuru na ị pụrụ ịmata ọdịiche dị n’etiti okpukpe ụgha na ezi okpukpe n’ụzọ dị otú a:
“Na-ezenụ ndị amụma ụgha, ndị na-abịakwute unu n’ihe oyiyi atụrụ, ma n’ime ha bụ agụ na-apụnara atụrụ. Unu ga-esite ná mkpụrụ ha mazuo ha. Mmadụ [ọ̀] na-ekpokọpụta mkpụrụ vine n’ogwu, ma ọ bụ fig n’uké? Otú a ezi osisi ọ bụla na-amị mkpụrụ ọma; ma osisi na-abaghị n’ihe na-amị ajọ mkpụrụ osisi . . . A na-egbutu osisi ọ bụla nke na-amịghị mkpụrụ ọma, tụbakwa ya n’ime ọkụ.”
Tụlee otu ihe atụ, Jisọs kwuru na Jọn 13:35, sị: “Mmadụ nile ga-eji nke a mara na unu bụ ndị na-eso ụzọ m, ọ bụrụ na unu enwerịta ịhụnanya n’ebe ibe unu nọ.” Ọzọkwa, na 1 Jọn 4:20 na 21, Okwu Chineke e ji ike mmụọ dee na-ekwu, sị:
“Ọ bụrụ na onye ọ bụla ga-asị, Ana m ahụ Chineke n’anya, ma ọ na-akpọ nwanne ya asị, ọ bụ onye ụgha: n’ihi na onye na-adịghị ahụ nwanna ya n’anya, bụ́ onye ọ hụworo, ọ pụghị ịhụ Chineke n’anya, bụ́ onye ọ na-ahụghị mgbe ọ bụla. Ihe a e nyere n’iwu ka anyị nwekwara site n’ebe ọ nọ, ka onye na-ahụ Chineke n’anya, ka ọ hụkwa nwanna ya n’anya.”
Jiri ụkpụrụ ahụ bụ isi nke na ezi ndị Kraịst aghaghị inwe ịhụnanya n’etiti onwe ha mee ihe n’ihe mere n’agha ụwa abụọ nke narị afọ nke a, tinyekwara n’esemokwu ndị ọzọ. Ndị nọ n’otu okpukpe nke Krisendọm zutere n’ọgbọ agha ma gbuo ibe ha n’ihi na mba ha dị iche iche. Akụkụ nke ọ bụla kwuru na ha bụ ndị Kristian, akụkụ ọ bụla nwetakwara nkwado nke ndị ụkọchukwu ya, bụ́ ndị kwuru na Chineke nọ n’akụkụ nke ha. Ogbugbu ahụ “ndị Kristian” gburu “ndị Kristian” bụ ajọ mkpụrụ. Ọ bụ imebi ịhụnanya ndị Kraịst, ịgọpụ iwu nile nke Chineke.—Leekwa 1 Jọn 3:10-12.
Ụbọchị Ime Mpịazi
Otú a, ịdapụ n’Iso Ụzọ Kraịst dugara ọ bụghị nanị n’ikwenye n’ihe ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke, dị ka ozizi Atọ n’Ime Otu, kamakwa n’omume ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke. Ma, ụbọchị ime mpịazi na-abịa, n’ihi na Jisọs kwuru, sị: “A na-egbutu osisi ọ bụla nke na-amịghị mkpụrụ ọma, tụbakwa ya n’ime ọkụ.” Nke ahụ mere Okwu Chineke ji na-agba ume, sị:
“Ndị nke m sinụ n’ime ya [okpukpe ụgha] pụta, ka unu wee ghara iso ya nwekọọ mmehie ya nile, gharakwa ịnata ụfọdụ n’ime ihe otiti ya nile: n’ihi na mmehie ya nile rapakọrọ n’otu ruo eluigwe, Chineke chetakwara ajọ omume ya nile.”—Mkpughe 18:4, 5.
N’oge na-adịghị anya Chineke ‘ga-etinye ya n’obi’ nke ndị isi ndọrọ ndọrọ ọchịchị ịtụgharị megide okpukpe ụgha. Ha ga-eme “ka ọ bụrụ onye tọgbọrọ n’efu . . . ha ga-erikwa anụ ahụ ya, rechapụkwa ya n’ọkụ.” (Mkpughe 17:16, 17) Ihe a ga-ebibi ruo mgbe ebighị ebi bụ okpukpe ụgha, ya na nkà ihe ọmụma ọgọ mmụọ ya nile banyere Chineke. N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, Chineke ga-agwa ndị nọ n’okpukpe ụgha dị ka Jisọs kwuru n’ụbọchị ya, sị: “A na-ahapụrụ unu ụlọ unu ka ọ tọgbọrọ n’efu.”—Matiu 23:38.
Ezi okpukpe ga-alanarị ikpe Chineke, ka e wee nye Onye ahụ nke Jisọs kwuru na ọ bụ ‘nanị ezi Chineke ahụ’ nsọpụrụ na otuto nile n’ikpeazụ. Ọ bụ Onye a kọwara site n’ọnụ onye ọ bụ abụ ahụ bụ́ onye kwupụtara, sị: “Onye aha gị bụ Jehova, nanị gị, bụ Onye Kachasị Ihe Nile Elu n’elu ụwa nile.”—Jọn 17:3; Abụ Ọma 83:18.
Ntụaka:
1. Encyclopædia Britannica, 1971, Mpịakọta 6, peji nke 386.
2. A Short History of Christian Doctrine, nke Bernhard Lohse dere, 1963, peji nke 51.
3. Ibid., peji nke 52-53.
4. New Catholic Encyclopedia, 1967, Mpịakọta nke Asaa, peji nke 115.
5. A Short History of Christianity, nke Martin E. Marty dere, 1959, peji nke 91.
6. A Select Library of Nicene and Post-Nicene Fathers of the Christian Church, nke Philip Schaff na Henry Wace dere, 1892, Mpịakọta nke Anọ, peji nke iri na asaa.
7. A Short History of Christian Doctrine, peji nke 53.
8. A Short History of Christianity, peji nke 91.
9. The Church of the First Three Centuries, nke Alvan Lamson dere, 1869, peji nke 75-76, 341.
10. Second Century Orthodoxy, nke J. A. Buckley, 1978, peji nke 114-115.
11. New Catholic Encyclopedia, 1967, Mpịakọta nke Asaa, peji nke 115.
12. Ibid., Mpịakọta nke Anọ, peji nke 436.
13. Ibid., peji nke 251.
14. Ibid., peji nke 436.
15. The New Encyclopædia Britannica, 1985, Mbipụta nke 15, Micropædia, Mpịakọta nke 1, peji nke 665.
16. The Church of the First Three Centuries, peji nke 52.
17. The Christian Tradition, nke Jaroslav Pelikan dere, 1971, peji nke 173.
18. Origin and Evolution of Religion, nke E. Washburn Hopkins dere, 1923, peji nke 339.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Iji nwetakwuo ihe ọmụma, lee akwụkwọ nta bụ́ Ì kwesịrị Ikwere n’Atọ n’Ime Otu? nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., na-ebipụta.
b Dị ka e gosiworo n’isiokwu ndị bu ụzọ n’usoro isiokwu nke a, ọ bụ ezie na Theophilus na Tertullian ji okwu ndị a mee ihe, ha ebughị n’uche Atọ n’Ime Otu nke Krisendọm kwenyere na ya taa.
[Foto dị na peeji nke 22]
Chineke ga-eme ka ndị isi ndọrọ ndọrọ ọchịchị tụgharịa megide okpukpe ụgha
[Foto dị na peeji nke 24]
Ezi okpukpe ga-alanarị ikpe Chineke