Ndị Nkwusa Alaeze Na-akọ
Ikwe Ka Ìhè Ha Na-enwupụta n’India
A NA-EKWUSA ozi ọma nke Alaeze ahụ n’India site n’ọnụ nke 11,524 Ndịàmà na-enwe ọṅụ. (Matiu 24:14) Otu puku na iri isii na isii ndị e mere baptism n’afọ ije ozi 1991 bụ ndị nkwusa Alaeze, na-ekwere ka ìhè ha na-enwupụtara ndị ọzọ. Lee aha obi ụtọ mmadụ nile nwere ịhụ ka 28,866 bịara ememe Ncheta nke ọnwụ Kraịst!
◻ Ọtụtụ mụtara banyere olileanya nke Alaeze na mbụ site n’ịgba àmà mberede. Dị ka ihe atụ, otu Onyeàmà gwara ndị ọrụ ibe ya, ndị bụkwa ndị kapenta, banyere Alaeze ahụ. Otu onye ọrụ ibe ya zaghachiri wee malite ikwe ka ìhè ya na-enwupụtara ezinụlọ ya na ndị enyi ya. Ndị a ji ọṅụ bufeere ndị ọzọ ozi Alaeze a nke dị ebube. Dị ka akụkọ a natara si kwuo, n’ime nanị afọ ole na ole, ‘ihe karịrị 30 ndị mmadụ nakweere eziokwu ahụ.’ Jehova gọziri ya na ụmụnna ime mmụọ ọhụrụ ya maka ikwere ka ìhè ha nwupụta.
◻ Otu nwa okorobịa nọ n’ọgbakọ ọzọ kwere ka ìhè ya nwupụta site n’ịgbara ụmụ akwụkwọ ibe ya àmà mberede n’ụlọ akwụkwọ. Ụfọdụ n’ime ha nwere mmasị n’olileanya Alaeze ahụ, mgbe mgbe ọ na-akọwakwara ha Bible ruo mgbe ọ gafere etiti abalị. Otu, bụ́ onye Katọlik, guzosiri ike maka eziokwu n’agbanyeghị ịdọ aka ná ntị nke onye ụkọchukwu dọrọ ya banyere ihe ọjọọ ga-esi na ya dapụta ma ọ bụrụ na ọ nọgide na-esoro Onyeàmà ahụ na-akpakọ. Otú ọ dị, o doro onye mmụta ahụ anya na ọ na-amụta eziokwu Bible site n’aka Ndịàmà ahụ, ọ nọgidekwara na-anara ihe ọmụma. E mesịa, e mere ya baptism, ọ na-ejekwa ozi ugbu a dị ka ohu na-eje ozi n’ọgbakọ. Ọ na-enwe obi ụtọ n’olileanya nke na-abịa site n’ìhè dị ebube nke eziokwu!—Ndị Rom 12:12.
◻ Onye ọzọ gere Onyeàmà nke a na-eto eto ntị bụ otu nwa akwụkwọ a maara nke ọma, bụ́ onye na-ekweghị na Chineke, onye na-akwabu ndị na-ekwu na ha kwere na Chineke emo, ma otu ụbọchị o sonyere ná nkwurịta okwu ahụ, jụọkwa ọtụtụ ajụjụ. O juru ya anya mgbe o nwetara azịza ezi uche dị na ha n’ajụjụ ya nile, o wee kwubie na Bible bụ Okwu Chineke. O nwere ọganihu n’ihe ọmụma Bible ma mesịa bụrụ onye e mere baptism. Nna ya bụ́ onye okpukpe Hindu megidere ya ruo n’ókè nke na ọ chụpụrụ ya n’ụlọ ya. Otú ọ dị, nguzosi ike nke nwa okorobịa ahụ guzoro maka eziokwu ahụ nwetara nkwụghachi ụgwọ mgbe ụmụnne ya ndị nwoke abụọ na mmadụ abụọ n’ime ndị enyi ya nakweere eziokwu ahụ, e wee mee ha baptism. Otu n’ime ụmụnne ya nwoke na-eje ozi ugbu a n’alaka ụlọ ọrụ dị na n’India.
◻ Otu nwata akwụkwọ na-ahazi ihe omume sonyekwara ná nkwurịta okwu ahụ nke Onyeàmà ahụ na-eto eto na-enwe. Ọ bụ onye na-adịghị esepụ aka n’ise siga na onye na-aṅụ oké mmanya. N’otu mgbe, ọ chọrọ iti ụmụ akwụkwọ ibe ya abụọ ihe bụ́ ndị mụtaworo eziokwu ahụ site n’aka Onyeàmà ahụ. N’ihi ịnakwere eziokwu ahụ, ha jụrụ isonyere n’ime ngagharị iwe nke ụlọ akwụkwọ kọleji, ha agaghị enye ọbara n’oge mkpọsa ịnakọta ọbara nke nwata akwụkwọ ahụ na-ahazi ihe omume nọ n’isi ya. Nwa okorobịa nke a nwere obi ụtọ ugbu a ịbụ Onyeàmà na-enye ìhè nke Jehova.
◻ Na ha nile, nwata akwụkwọ ahụ nke bu ụzọ kwere ka ìhè ya nwupụta abụwo ngwá ọrụ n’inyere ndị enyi ya 15 aka ime nraranye na baptism site n’ịgbara ha àmà mberede.
Ọ bụ ihe na-enye ọṅụ ịhụ ọtụtụ ndị n’ala ahụ buru oké ibu ka ha na-anakwere olileanya Bible nke ụwa ọhụrụ Chineke ma na-esonyere òtù ụmụnna zuru ụwa ọnụ nke Jehova Chineke na-achịkọta ibi ndụ ebighị ebi n’okpuru Alaeze ya.