Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w92 9/1 p. 8
  • Krisendọm na Ịzụ Ahịa Ohu

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Krisendọm na Ịzụ Ahịa Ohu
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Owuwe Ihe Ubi nke Krisendọm n’Africa
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
  • Ọgụ A Nọworo Na-alụso Ịgba Ohu Eri Ogologo Oge
    Teta!—2002
  • Ụzọ E Si Akpụpụ Ndị Ohu Ofesi N’oge Gboo
    Teta!—2011
  • “E Nwere Ọnụ Ahịa A Zụtara Unu”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2005
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
w92 9/1 p. 8

Krisendọm na Ịzụ Ahịa Ohu

N’IME narị afọ nke 19, ndị ozi ala ọzọ nke Katọlik na Protestant jikọrọ aka ọnụ ná mmegide ha megidere ịzụ ahịa ohu. Otú ọ dị, nke ahụ abụghị ọnọdụ ha mgbe nile. Na narị afọ ndị bu ụzọ, ha kwadoro ma kere òkè n’ịzụ ahịa ohu n’agbanyeghị oké nhụjuanya nke a kpatara.

Ndị ozi ala ọzọ malitere ịbịa n’ebe ọwụwa anyanwụ nke ụsọ osimiri tinyekwara n’ebe ọdịda anyanwụ nke ụsọ osimiri Africa mgbe a chọpụtara ụzọ azụmahịa ahụ gawara n’osimiri nke dị na gburugburu Cape of Good Hope na narị afọ nke 15. Otú ọ dị, mgbe narị afọ atọ gasịrị, ọrụ ozi ala ọzọ fọrọ nke nta ka ọ bịa n’isi njedebe. E nwere ndị Africa ole na ole a tọghatara. Otu ihe kpatara ọdịda nke a bụ aka Krisendọm tinyere n’ịzụ ahịa ohu. C. P. Groves kọwara n’akwụkwọ bụ́ The Planting of Christianity in Africa, sị:

“Oké nchụso nke ịzụ ahịa ohu weere ọnọdụ n’ozi ndị Kristian, e cheghịkwa na ọ dị njọ. N’ezie, ogige okpukpe ahụ kpọmkwem nwere ndị ohu nke ya; otu ogige ndị mọnk nke okpukpe Jesuit dị na Loanda [nke bụ Luanda ugbu a, bụ́ isi obodo nke Angola] nwere 12,000. Mgbe ịzụ ahịa ohu malitere n’etiti Angola na Brazil, bishọp nke Loanda, n’oche nkume dị n’elu ala e si arịtu n’ime ụgbọ mmiri, nyere ngọzi ya dị ka onye bishọp n’isi ndị e bu n’ụgbọ mmiri ndị ahụ na-apụ apụ, na-ekwe ha nkwa inweta ọdịnihu nke obi ụtọ mgbe oge oké ifufe ọnwụnwa nile nke ndụ kwụsịrị.”

Ndị ozi ala ọzọ nke okpukpe Jesuit egosipụtaghị “ọjụjụ ọ bụla megide ịgba ohu Ndị Isi Ojii,” ka C. R. Boxer kwupụtara dị ka e hotara n’akwụkwọ ahụ bụ́ Africa From Early Times to 1800. Na Luanda, tupu ndị ohu abanye n’ụgbọ mmiri ndị na-aga mba Spain na Portugal, Boxer kwukwara, sị, “a kpọgara ha n’otu chọọchị dị nso . . . n’ebe ahụ onye ụkọchukwu parish ahụ mekwara ha baptism n’ìgwè nke ọtụtụ narị n’otu oge.” Mgbe ahụ, mgbe e fesasịrị ha “mmiri nsọ,” a gwara ndị ohu ahụ, sị: “Lee unu bụzi ụmụ Chineke ugbu a; unu na-aga n’ala ndị Spain ebe unu ga-amụta ihe banyere Okpukpe a. Unu echekwala echiche ọzọ banyere ebe unu si bịa . . . Jirinụ ezi obi gaa.”

Otú ọ dị, ọ bụghị nanị ndị ozi ala ọzọ nke Krisendọm kwadoro ịzụ ahịa ohu. “Ruo n’ọkara ikpeazụ nke narị afọ nke iri na asatọ,” ka Geoffery Moorhouse kọwara n’akwụkwọ ya bụ́ The Missionaries, “ọ bụ nnọọ omume nke ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ụmụ mmadụ.” Moorhouse kpọtụrụ uche n’ihe atụ nke onye ozi ala ọzọ ndị Protestant na narị afọ nke 18, bụ́ Thomas Thompson, bụ́ onye dere otu traktị a kpọrọ The African Trade for Negro Slaves Shown to Be Consistent With the Principles of Humanity and With the Laws of Revealed Religion.

Otú o sina dị, site n’aka o tinyere na ya, Krisendọm na-eketa òkè maka iso kpata oké nhụjuanya nke e wetaara ọtụtụ nde ndị Africa bụ́ ohu. “E wezụga ndị ohu ahụ nwụrụ tupu ụgbọ mmiri ebupụ ha n’Africa,” ka akwụkwọ bụ́ The Encyclopædia Britannica kwuru, “121/2% nwụrụ n’oge ha na-agafe West Indies; na Jamaica, 41/2% nwụrụ n’oge a ka nọ n’ọdụ ụgbọ mmiri ndị ahụ ma ọ bụ tupu e repụ ha, otu ụzọ n’ụzọ atọ n’ime ha nwụrụ mgbe a na-enye ha ‘ọzụzụ ndị ọhụrụ.’”

N’oge na-adịghị anya, Jehova Chineke ga-akpọ ma Krisendọm ma ụdị okpukpe ụgha ndị ọzọ òkù ime mpịazi maka ajọ omume nile nke ikpe ọmụma ọbara nke ha kwadoworo ma ọbụna gọzie.—Mkpughe 18:8, 24.

[Ihe Osise on peeji 8]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

Ihe osise nke ụzọ e si chịbajuo ndị ohu n’ime otu ụgbọ mmiri ndị ohu

[Ebe E Si Nweta Foto]

Schomburg Center for Research in Black Culture / The New York Public Library / Astor, Lenox and Tilden Foundations

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya