Ihe Nlereanya Si n’Ike Mmụọ Nsọ nke Ọrụ Ije Ozi Ala Ọzọ nke Ndị Kraịst
“Ghọọnụ ndị na-eṅomi m, dị ka mụ onwe m bụkwa onye na-eṅomi Kraịst.”—1 NDỊ KỌRINT 11:1.
1. Olee ụzọ ụfọdụ Jisọs si setịpụ ihe nlereanya pụrụ iche nye ndị na-eso ụzọ ya iṅomi? (Ndị Filipaị 2:5-9)
LEE aha ihe nlereanya pụrụ iche Jisọs setịpụụrụ ndị na-eso ụzọ ya! O ji ọṅụ hapụ ebube eluigwe ya ịgbadata n’elu ala ma biri n’etiti ụmụ mmadụ na-emehie emehie. Ọ dị njikere ịta oké ahụhụ maka nzọpụta nke ihe a kpọrọ mmadụ na, karịsịa, maka ido aha nke Nna ya nke eluigwe nsọ. (Jọn 3:16; 17:4) Mgbe a na-ekpe ya ikpe maka ndụ ya, Jisọs ji obi ike kwupụta, sị: “A mụwo mụ onwe m ime ihe a, abịawokwa m n’ime ụwa ime ihe a, ka m wee gbaara eziokwu àmà.”—Jọn 18:37.
2. N’ihi gịnị ka Jisọs ahụ e mere ka o si n’ọnwụ bilie pụrụ iji nye ndị na-eso ụzọ ya iwu ịga n’ihu n’ọrụ ahụ ọ maliteworo?
2 Tupu ọnwụ ya, Jisọs nyere ndị na-eso ụzọ ya ọzụzụ mara mma ka ha wee nwee ike ịga n’ihu n’ọrụ ahụ nke ịgba àmà nye eziokwu nke Alaeze. (Matiu 10:5-23; Luk 10:1-16) Otú a, mgbe o bilitesịrị n’ọnwụ, Jisọs nwere ike inye iwu ahụ bụ: “Gaanụ, mee [“ndị nke,” NW] mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m, na-eme ha baptism baa n’aha nke Nna, na nke Ọkpara, na nke mmụọ nsọ: na-ezi ha ka ha debe ihe nile, ka ha hà, bụ́ nke m nyere unu n’iwu.”—Matiu 28:19, 20.
3. Olee ụzọ ọrụ ahụ nke ime ndị na-eso ụzọ si mụbaa, ma n’ógbè ndị dị aṅaa ka e lekwasịrị anya n’ụzọ bụ isi?
3 Ruo afọ atọ na ọkara na-esonụ, ndị na-eso ụzọ Jisọs rubere isi n’iwu nke a ma kpaara ime ndị na-eso ụzọ ha ókè nye ndị Juu, ndị na-eso ụzọ ndị Juu, na ndị Sameria e bere úgwù. Mgbe ahụ, n’afọ 36 O.A., Chineke nyere ntụziaka ka e kwusaa ozi ọma ahụ gwa otu nwoke a na-ebighị úgwù, bụ́ Kọniliọs, na ezinụlọ ya. N’ime afọ iri na-esonụ, e webatara ndị Jentaịl ndị ọzọ n’ọgbakọ ahụ. Otú ọ dị, o yiri ka a rụrụ ihe ka ukwuu n’ọrụ ahụ nanị n’ógbè nke ebe ọwụwa anyanwụ Mediterranea.—Ọrụ 10:24, 44-48; 11:19-21.
4. Ihe omume dị aṅaa dị mkpa weere ọnọdụ n’ihe dị ka afọ 47-48 O.A.?
4 Otu ihe dị mkpa iji kpalie ma ọ bụ mee ka ndị Kraịst mee ndị Juu na ndị Jentaịl nọ n’ógbè ebe ndị dị anya karị ndị na-eso ụzọ. Ya mere, n’ihe dị ka afọ 47-48 O.A., ndị okenye nke ọgbakọ Antiọk ahụ dị na Siria natara ozi Chineke nke a: “Kewapụtara m Banabas na Sọl ịrụ ọrụ nke m kpọworo ha ka ha rụọ.” (Ọrụ 13:2) Rịba ama na mgbe ahụ a maara Pọl site n’aha ọ na-aza na mbụ, bụ́ Sọl. Rịbakwa ama, na Chineke kpọrọ aha Banabas tupu nke Pọl, ma eleghị anya n’ihi na n’oge ahụ a na-ele Banabas anya dị ka onye nke ka n’ime ha abụọ.
5. N’ihi gịnị ka ihe ndekọ nke njem ozi ala ọzọ Pọl na Banabas ji bụrụ ihe bara oké uru nye ndị Kraịst n’oge a?
5 Ihe ndekọ zuru ezu nke njem ozi ala ọzọ Pọl na Banabas bụ oké ihe agbamume nye Ndịàmà Jehova, karịsịa nye ndị ozi ala ọzọ na ndị ọsụ ụzọ bụ́ ndị hapụworo obodo ha ijere Chineke ozi n’obodo ọzọ. Ọzọkwa, ịtụleghachi Ọrụ Ndị Ozi isi nke 13 na 14 ga-akpali ọtụtụ ndị karị n’ezie iṅomi Pọl na Banabas na ịmụba òkè ha na-ekere n’ọrụ ahụ nke ka ọrụ nile dịrị mkpa nke ime ndị na-eso ụzọ.
Agwaetiti nke Saịprọs
6. Ihe nlereanya dị aṅaa ka ndị ozi ala ọzọ ahụ setịpụrụ na Saịprọs?
6 N’egbughị oge, ndị ozi ala ọzọ ahụ ji ụgbọ mmiri site n’ọdụ mmiri Siria nke Seleucia gaa n’agwaetiti nke Saịprọs. Mgbe ha rutesịrị na Salamis, ihe ọ bụla adọpụghị uche ha kama ha ‘kwusara okwu Chineke n’ụlọ nzukọ nile nke ndị Juu.’ N’ịgbaso ihe nlereanya nke Kraịst, o zughịrị ha ịnọrọ n’obodo ahụ ma chere ka ndị bi n’agwaetiti ahụ bịakwute ha. Kama nke ahụ, ha rụrụ ọrụ ‘gabiga n’agwaetiti ahụ dum.’ Ihe ịrụ ụka adịghị ya na nke a gụnyere iji ụkwụ gaa ọtụtụ ebe na ịgbanwe ebe obibi ha ọtụtụ mgbe, ebe ọ bụ na Saịprọs bụ agwaetiti buru ibu, njem ha kpọgakwara ha n’ogologo akụkụ kasị ibu na ya.—Ọrụ 13:5, 6.
7. (a) Ihe omume dị aṅaa pụrụ iche weere ọnọdụ na Pafọs? (b) Ihe ndekọ nke a na-agba anyị ume inwe ụdị àgwà dị aṅaa?
7 Ná ngwụsị nke ọnụnọ ha, a kwụghachiri ndị ikom abụọ ahụ ụgwọ site n’ahụmahụ dị ebube ha nwere n’obodo nke Pafọs. Onye na-achị agwaetiti ahụ, bụ́ Sajiọs Pọlọs, ṅara ntị n’ozi ha wee ‘ghọọ onye kwere ekwe.’ (Ọrụ 13:7, 12) Pọl mesịrị dee, sị: “Leenụ ọkpụkpọ unu, ụmụnna m, na ọ dịghị ọtụtụ ndị maara ihe dị ka anụ ahụ si mara ihe, ọ dịghị ọtụtụ ndị ike, ọ dịghị ọtụtụ ndị a mazuru aha ha, ka a kpọrọ.” (1 Ndị Kọrint 1:26) Otú o sina dị, otu onye so ná ndị dị ike meghachiri omume bụ Sajiọs Pọlọs. Ahụmahụ nke a kwesịrị ịgba anyị nile ume, karịsịa ndị ozi ala ọzọ, inwe àgwà ziri ezi banyere ịgbara ndị isi ọchịchị àmà, ọbụna dị ka a gbara anyị ume ime na 1 Timoti 2:1-4. Ndị ikom nọ n’isi ọchịchị enyeworo ndị ohu Chineke aka mgbe ụfọdụ.—Nehemaịa 2:4-8.
8. (a) Mgbanwe dị aṅaa ná mmekọrịta dị n’etiti Banabas na Pọl pụtara ìhè malite n’oge a gaa n’ihu? (b) N’ụzọ dị aṅaa ka Banabas si bụrụ ezi ihe nlereanya?
8 N’okpuru mmetụta nke mmụọ Jehova, Pọl keere òkè dị ukwuu ná ntọghata nke Sajiọs Pọlọs. (Ọrụ 13:8-12) Ọzọkwa, malite n’oge a gaa n’ihu, o yiri ka Pọl butere ụzọ. (Jiri Ọrụ Ndị Ozi 13:7 tụlee Ọrụ Ndị Ozi 13:15, 16, 43.) Nke a kwekọrọ n’ọrụ Chineke ahụ nke Pọl natara n’oge ntọghata ya. (Ọrụ 9:15) Ma eleghị anya, mgbanwe dị otú ahụ tinyere ịdị umeala n’obi nke Banabas n’ule. Otú ọ dị, kama ile mgbanwe nke a anya dị ka ịkparị ya, o yikarịrị ka Banabas o mere ihe kwekọrọ n’ihe aha ya pụtara, “Nwa nke Nkasi Obi,” wee jiri iguzosi ike n’ihe nye Pọl nkwado ná njem ozi ala ọzọ ahụ nile nakwa mgbe e mesịrị, mgbe ụfọdụ ndị Juu bụ́ ndị Kraịst megidere ozi ha na-eje n’etiti ndị Jentaịl a na-ebighị úgwù. (Ọrụ 15:1, 2) Lee aha ezi ihe nlereanye nke a bụụrụ anyị nile, gụnyere ndị bi n’ebe obibi ndị ozi ala ọzọ na Betel! Anyị kwesịrị ịdị njikere mgbe nile ịnakwere mgbanwe ndị dị n’usoro ọchịchị Chineke, nyekwa nkwado anyị zuru ezu maka ndị ahụ a họpụtara idu ndú n’etiti anyị.—Ndị Hibru 13:17.
Ala Elu Ugwu Dị Larịị nke Asia Minor
9. Gịnị ka anyị na-amụta site n’ịdị njikere nke Pọl na Banabas dị ịga n’Antiọk nke Pisidia?
9 Site na Saịprọs, Pọl na Banabas ji ụgbọ mmiri gaa n’ebe ugwu nke kọntinent Esia. N’ihi ihe ụfọdụ nke a na-ekpugheghị ekpughe, ndị ozi ala ọzọ ahụ anọdụghị n’ógbè ụsọ osimiri ahụ kama ha gara ogologo njem dịkwa ize ndụ nke ihe dị ka 180 kilomita ruo Antiọk dị na Pisidia, nke dị n’etiti ala elu ugwu dị larịị nke Asia Minor. Nke a gụnyere ịrị elu ugwu na ịgbada ndagwurugwu dị ihe dị ka 1,100 mita site n’ebe dị larịị. Onye ọkà mmụta Bible bụ́ J. S. Howson kwuru, sị: “Omume mmebi iwu na ime aghara nke ndị bi n’ugwu ndị ahụ nke kewapụrụ ala elu ugwu . . . na ndagwurugwu ndị ahụ dị n’ụsọ osimiri ebe ndịda, bụ nke a ma ama n’akụkụ nile nke akụkọ ihe mere eme oge ochie.” Tụkwasị na nke ahụ, ndị ozi ala ọzọ ahụ zutere ihe ize ndụ sitere n’okike. “Ọ dịghị ógbè ọ bụla n’Asia Minor,” ka Howson kwuru, “nke a maara nanị ya site ‘n’idei mmiri’ karịa ụzọ ugwu nke Pisidia, bụ́ ebe osimiri na-asọpụta n’okpuru oké nkume, ma ọ bụ na-eruda n’ike n’ike site n’ọwara ụzọ ndị na-adịghị obosara.” Ụmụ irighiri ihe ndị a na-enyere anyị aka iji anya nke uche anyị hụ ụdị njem ndị ozi ala ọzọ ahụ dị njikere ime iji wee gbasaa ozi ọma ahụ. (2 Ndị Kọrint 11:26) N’otu aka ahụ taa, ọtụtụ n’ime ndị ohu Jehova na-anagide ụdị nile nke ihe mgbochi iji wee rute ndị mmadụ ma soro ha kerịta ozi ọma ahụ.
10, 11. (a) Olee ụzọ Pọl si nọgide n’otu ihe nke ya na ndị na-ege ya ntị kwekọrịtara? (b) N’ihi gịnị ka o ji yie ka o juru ọtụtụ ndị Juu anya ịnụ banyere nhụjuanya nile nke Mesaịa ahụ? (ch) Ụdị nzọpụta dị aṅaa ka Pọl chere ndị na-ege ya ntị n’ihu?
10 Ebe ọ bụ na e nwere ụlọ nzukọ ndị Juu dị n’Antiọk nke Pisidia, ndị ozi ala ọzọ bu ụzọ gaa n’ebe ahụ iji wee nye ndị ahụ kasị mara banyere Okwu Chineke ohere ịnakwere ozi ọma ahụ. Mgbe a kpọrọ ha ka ha kwuo okwu, Pọl guzoro ọtọ ma kwuo okwu ihu ọha nke jupụtara n’ihe ọmụma. N’oge nile okwu ahụ na-aga n’ihu, ọ nọgidere na-ekwu otu ihe ya na ndị Juu na ndị na-eso ụzọ ha na-ege ntị kwekọrịtara na ya. (Ọrụ 13:13-16, 26) Mgbe o kwusịrị okwu mmeghe ya, Pọl tụleghachiri akụkọ ihe mere eme ahụ a ma ama nke ndị Juu, na-echetara ha na Jehova ahọrọwo ndị nna ha ochie, wee gbapụtakwa ha n’Ijipt, tinyekwara ụzọ o siworo nyere ha aka imeri ndị ahụ bi n’Ala Nkwa ahụ. Mgbe ahụ, Pọl mere ka mmeso Jehova mesoro Devid pụta ìhè. Ihe ọmụma dị otú ahụ ka dị n’uche nke ndị Juu na narị afọ mbụ ahụ n’ihi na ha na-atụ anya ka Chineke mee ka otu nwa Devid bilie dị ka onye nzọpụta na onye ọchịchị ruo mgbe ebighị ebi. Mgbe o kwururu n’ebe a, Pọl ji obi ike kwupụta, sị: “Site ná mkpụrụ nwoke a [Devid] ka Chineke wetaara Israel onye nzọpụta, bụ́ Jisọs, dị ka nkwa ya si dị.”—Ọrụ 13:17-23.
11 Otú ọ dị, ụdị onye nzọpụta ọtụtụ ndị Juu na-ele anya ya bụ onye bụ dike n’agha nke ga-agbapụta ha site n’aka ọchịchị ndị Rom ma bulie mba ndị Juu elu karịa ndị ọzọ nile. Ya mere, ihe ịrụ ụka adịghị ya na o juru ha anya ịnụ ka Pọl kwuru na e nyefewo Mesaịa ahụ maka ogbugbu site n’aka ndị ndú okpukpe ha. “Ma Chineke mere ka o si ná ndị nwụrụ anwụ bilie,” ka Pọl ji obi ike kwupụta. N’oge okwu ya na-agwụsị, o gosiri ndị na-ege ya ntị na ha pụrụ inweta ụdị nzọpụta nke a dị ebube. “Maranụ nke a,” ka o kwuru, “na a na-esite n’ọnụ Onye a kwusaa mgbaghara mmehie nile nye unu: ọ bụkwa n’ime Onye a ka a na-agụ onye ọ bụla nke kwere na ya n’onye ezi omume n’ihe nile, nke a na-apụghị ịgụ unu ná ndị ezi omume na ha n’ime iwu Mosis.” Pọl mechiri okwu ya site n’ịgba ndị na-ege ya ntị ume ka a ghara ịgụnye ha n’ìgwè nke ọtụtụ ndị Chineke buworo n’amụma na ha ga-eleghara ndokwa nke a dị ebube maka nzọpụta anya.—Ọrụ 13:30-41.
12. Gịnị si n’okwu Pọl kwuru pụta, oleekwa ụzọ nke a kwesịrị isi gbaa anyị ume?
12 Lee ka o si bụrụ okwu e kwuru nke ọma nke dabeere n’Akwụkwọ nsọ! Olee ụzọ ndị na-ege ntị si meghachi omume? “Ọtụtụ mmadụ n’etiti ndị Juu, na n’etiti ndị na-eso ụzọ ndị Juu ndị na-atụ egwu Chineke, sooro Pọl na Banabas.” (Ọrụ 13:43) Lee ka o si bụrụ ihe na-agba anyị ume taa! Ka anyị onwe anyị n’otu aka ahụ mee ihe nile anyị nwere ike iji kọwaa eziokwu ahụ n’ụzọ dị irè, ma ọ̀ bụ n’ozi ihu ọha anyị ma ọ bụ n’ịza ajụjụ na ikwu okwu ná nzukọ nile nke ọgbakọ.—1 Timoti 4:13-16.
13. N’ihi gịnị ka ndị ozi ala ọzọ ahụ ji hapụ Antiọk nke Pisidia, ajụjụ ndị dịgasịkwa aṅaa na-ebilite banyere ndị ọhụrụ na-eso ụzọ?
13 Ndị ahụ malitere inwe mmasị ọhụrụ n’Antiọk nke Pisidia apụghị izochi ozi ọma ahụ nanị maka onwe ha. Dị ka ihe si na nke ahụ pụta, “n’ụbọchị izu ike na-esonụ ọ fọdụrụ ihe nta ka obodo ahụ nile zukọọ ịnụ okwu Chineke [“Jehova,” NW].” N’oge na-adịghịkwa anya ozi ahụ gbasara gabiga obodo ahụ. N’ezie, ‘e buuru okwu Jehova jezuo ala ahụ dum.’ (Ọrụ 13:44, 49) Kama ịnabata eziokwu nke a, ndị Juu na-ekwo ekworo nwere ihe ịga nke ọma n’ịchụpụ ndị ozi ala ọzọ ahụ n’obodo ahụ. (Ọrụ 13:45, 50) Olee otú nke a si metụta ndị ọhụrụ ahụ na-eso ụzọ? Hà nwere nkụda aka wee daa mbà?
14. N’ihi gịnị ka ndị mmegide ahụ na-apụghị iji kwụsị ọrụ ahụ nke ndị ozi ala ọzọ ahụ maliteworo, gịnịkwa ka anyị na-amụta site na nke a?
14 Ee e, n’ihi na nke a bụ ọrụ Chineke. Ọzọkwa, ndị ozi ala ọzọ ahụ atọwo ntọala siri ike maka okwukwe n’ime Onyenwe anyị Jisọs Kraịst nke e mere ka o si n’ọnwụ bilie. Mgbe ahụ, o doro anya na ndị ọhụrụ ahụ na-eso ụzọ lere Kraịst, ọ bụghị ndị ozi ala ọzọ ahụ, anya dị ka Onye Ndú ha. Otú a, anyị na-agụ na ha “wee jupụta n’ọṅụ na mmụọ nsọ.” (Ọrụ 13:52) Lee ka nke a si bụrụ ihe na-agba ume nye ndị ozi ala ọzọ na ndị ọzọ na-eso ụzọ taa! Ọ bụrụ na anyị ejiri ịdị umeala na ịnụ ọkụ n’obi mee òkè anyị, Jehova Chineke na Jisọs Kraịst ga-agọzi ije ozi anyị.—1 Ndị Kọrint 3:9.
Aikọniọm, Listra, na Dabe
15. Ụkpụrụ dị aṅaa ka ndị ozi ala ọzọ ahụ gbasoro n’Aikọniọm, gịnịkwa ka ọ rụpụtara?
15 Ugbu a Pọl na Banabas mere njem dị ihe dị ka 140 kilomita n’ebe ndịda ọwụwa anyanwụ ruo n’obodo nke ọzọ, bụ́ Aikọniọm. Ụjọ mkpagbu egbochighị ha ịgbaso otu ụkpụrụ ahụ ha ji mee ihe n’Antiọk. Dị ka ihe si na nke ahụ pụta, Bible na-asị: ‘Oké ìgwè mmadụ, ma ndị Juu ma ndị Grik wee ghọọ ndị kwere ekwe.’ (Ọrụ 14:1) Ọzọkwa, ndị Juu na-anakwereghị eziokwu ahụ kpaliri mmegide. Ma ndị ozi ala ọzọ ahụ tachiri obi wee tinye oge dị ukwuu n’Aikọniọm, na-enyere ndị ọhụrụ ahụ na-eso ụzọ aka. Mgbe ahụ, mgbe ha matara na ndị Juu ahụ na-emegide emegide chọrọ ịtụ ha nkume, Pọl na Banabas ji amamihe gbaga n’ókèala nke ọzọ, “Listra na Dabe, na ala dị ha gburugburu.”—Ọrụ 14:2-6.
16, 17. (a) Gịnị mere Pọl na Listra? (b) Olee otú ụzọ Chineke si meso onyeozi ahụ omume si metụta otu nwa okorobịa sitere Listra?
16 N’ịbụ ndị nwere obi ike, “ha na-ezisakwa ozi ọma” n’ókèala ọhụrụ nke a, nke a na-akpabeghị aka. (Ọrụ 14:7) Mgbe ndị Juu nọ n’Antiọk nke Pisidia na Aikọniọm nụrụ banyere nke a, ha si ihe hà ka Listra wee bịa, kpaliekwa ìgwè ahụ ka ha tụọ Pọl nkume. N’ihi enweghị oge iji gbapụ, e ji nkume tụkaa Pọl ahụ, nke na ndị mmegide ya kwenyesiri ike na ọ nwụrụ anwụ. Ha kpụpụrụ ya n’azụ obodo.—Ọrụ 14:19.
17 Ị̀ pụrụ iche echiche banyere ihe isi ike nke a kpataara ndị ọhụrụ ahụ na-eso ụzọ? Ma lee oké ihe ijuanya nke a bụ, mgbe ha gbara Pọl gburugburu, o wee guzo ọtọ! Bible ekwughị ma otu nwa okorobịa aha ya bụ Timoti ò so ná ndị ọhụrụ a na-eso ụzọ. N’ezie, ụzọ Chineke si meso Pọl omume n’oge ụfọdụ pụtara ìhè nye ya, ọ kụnyekwara mmasị miri emi n’uche nwa okorobịa ya. Pọl dere n’akwụkwọ ozi ya nke abụọ o degaara Timoti, sị: “Gị onwe gị sooro ozizi m, omume m, . . . aha ihe dakwasịrị m n’Antiọk, n’Aikọniọm, na Listra; aha nsogbu m nagidere: Onyenwe anyị dọpụtakwara m n’ime ha nile.” (2 Timoti 3:10, 11) N’ihe dị ka otu afọ ma ọ bụ abụọ mgbe a tụsịrị Pọl nkume, ọ laghachiri na Listra wee chọpụta na nwa okoro ahụ bụ́ Timoti bụ onye Kraịst bụ́ ezi ihe nlereanya, ‘onye ụmụnna nọ na Listra na Aikọniọm gbaara ezi àmà.’ (Ọrụ 16:1, 2) Ya mere, Pọl họọrọ ya dị ka onye ya na ya ga-eso na-eme njem. Nke a nyeere Timoti aka ito eto n’ụzọ ime mmụọ, mgbe oge na-agakwa o ruru eru ịbụ onye Pọl zigara ileta ọgbakọ dị iche iche. (Ndị Filipaị 2:19, 20; 1 Timoti 1:3) N’otu aka ahụ, taa, ndị ohu Chineke na-anụ ọkụ n’obi na-enwe mmetụta dị ebube n’ahụ ndị na-eto eto, ndị ọtụtụ n’ime ha na-eto ịghọ ndị ohu dị oké ọnụ ahịa nke Chineke, dị ka Timoti.
18. (a) Gịnị mere ndị ozi ala ọzọ ahụ na Dabe? (b) Ohere dị aṅaa ka e meghere ugbu a nye ha, ma gịnị ka ha họọrọ ime?
18 N’ụtụtụ nke ụbọchị na-esote ọgbụgba ọ gbanahụrụ ọnwụ na Listra, Pọl gawara Dabe, ya na Banabas. N’oge nke a, ọ dịghị onye mmegide ọ bụla sochiri ha, Bible kwukwara na ‘ha mere ka ọtụtụ bụrụ ndị na-eso ụzọ.’ (Ọrụ 14:20, 21) Ebe ọ bụ na o guzobewo otu ọgbakọ na Dabe, Pọl na Banabas mere otu mkpebi. Otu ụzọ a na-ejikarị eme njem, nke ndị Rom wuru, gawara site Dabe ruo Tasọs. Site n’ebe ahụ, ụzọ ya adịghịkwa anya ruo Antiọk nke Siria. Eleghị anya, nke ahụ bụ ụzọ kasị mma isi laghachi, ndị ozi ala ọzọ ahụ pụkwara iche na ha kwesịrị izu ike ugbu a. Otú ọ dị, n’iṅomi Onyenwe ha, Pọl na Banabas chọpụtara na e nwere mkpa ka ukwuu.—Mak 6:31-34.
Ịrụ Ọrụ Chineke n’Ụzọ Zuru Ezu
19, 20. (a) Olee ụzọ Jehova si gọzie ndị ozi ala ọzọ ahụ maka ịlaghachi na Listra, Aikọniọm, na Antiọk? (b) Ihe mmụta dị aṅaa ka nke a na-enye ndị Jehova taa?
19 Kama isoro ụzọ ụla ahụ na-adịghị anya, ndị ozi ala ọzọ ahụ ji obi ike tụgharịa ma letaghachi obodo ahụ kpọmkwem ebe ndụ ha nọworo n’ihe ize ndụ. Jehova ọ̀ gọziri ha maka nchegbu nke a ọdịmma onwe onye na-adịghị na ya nke ha nwere maka atụrụ ọhụrụ ndị ahụ? Ee, n’ezie, n’ihi na ihe ndekọ ahụ kwuru na ha nwere ihe ịga nke ọma ‘n’ime ka mkpụrụ obi nke ndị ahụ na-eso ụzọ guzosie ike, na-agba ha ume ka ha nọgide n’okwukwe ahụ.’ N’ụzọ kwesịrị ekwesị, ha gwara ndị ọhụrụ ahụ na-eso ụzọ, sị: “Anyị aghaghị isite n’ọtụtụ mkpagbu baa n’alaeze Chineke.” (Ọrụ 14:21, 22) Pọl na Banabas chetakwaara ha banyere ọkpụkpọ ha dị ka ndị nketa n’Alaeze Chineke nke na-abịa abịa. Taa, anyị kwesịrị inye ndị ọhụrụ na-eso ụzọ agbamume yiri nke ahụ. Anyị pụrụ ịgba ha ume ka ha nwee ntachi obi n’ọnwụnwa nile site n’ijigide n’ihu ha olileanya nke ndụ ebighị ebi n’elu ala n’okpuru ọchịchị nke otu Alaeze Chineke ahụ nke Pọl na Banabas mere nkwusa ya.
20 Tupu ha ahapụ obodo nke ọ bụla, Pọl na Banabas nyeere ọgbakọ dị n’ebe ahụ aka ime nhazi ka mma. O doro anya na ha nyere ndị ikom ruru eru ọzụzụ ma họpụta ha idu ndú. (Ọrụ 14:23) Ihe ịrụ ụka adịghị ya na nke a nyere aka n’inwekwu mmụba. N’otu aka ahụ taa, ndị ozi ala ọzọ na ndị ọzọ, mgbe ha nyesịịrị ndị na-enweghị ahụmahụ aka inwe ọganihu ruo mgbe ha pụrụ ibu ibu ọrụ, mgbe ụfọdụ ha na-apụ ma nọgide n’ọrụ ọma ha n’ebe ndị ọzọ e nwere mkpa ka ukwuu.
21, 22. (a) Gịnị mere mgbe Pọl na Banabas jezuru njem ozi ala ọzọ ha? (b) Ajụjụ ndị dị aṅaa ka nke a na-ewelite?
21 Mgbe ndị ozi ala ọzọ ahụ mesịrị laghachi n’Antiọk nke Siria, ha pụrụ inwe afọ ojuju miri emi. N’ezie, ihe ndekọ Bible na-ekwu na ha “rụzuru” ọrụ nke Chineke nyeworo ha. (Ọrụ 14:26) N’ụzọ kwere nghọta, ahụmahụ ndị ha kọrọ mere ka ‘oké ọṅụ dịịrị ụmụnna nile.’ (Ọrụ 15:3) Ma gịnị banyere ọdịnihu ahụ? Ugbu a, hà ga-anọdụ ala ma na-anya nkụ ha kpara n’oge ọkọchị, dị ka e si ekwu ya? Ọ dịghị ma ọlị. Mgbe ha letasịrị òtù na-achị isi na Jerusalem ịnata mkpebi ha n’okwu banyere ibe úgwù, mmadụ abụọ ahụ malitekwara njem ozi ala ọzọ. N’oge ugbu a, ha gara n’ebe dị iche iche. Banabas kpọọrọ Jọn Mak wee gaa na Saịprọs, ebe Pọl chọtara onye ọhụrụ ya na ya ga-eso, bụ́ Saịlas, wee mee njem gabiga Siria na Silisia. (Ọrụ 15:39-41) Ọ bụ na njem nke a ka ọ họọrọ nwa okoro ahụ bụ́ Timoti wee kpọrọ ya.
22 Bible ekpugheghị ihe si na njem Banabas nke abụọ pụta. Banyere Pọl, ọ gara n’ókèala ọhụrụ ma guzobe ọgbakọ, na ọ dịkarịa ala, n’obodo ise—Filipaị, Beria, Tesalonaịka, Kọrint, na Efesọs. Gịnị bụ isi ihe dị n’inwe ihe ịga nke ọma pụrụ iche nke Pọl nwere? Otu ụdị ụkpụrụ ndị ahụ hà na-arụ ọrụ nye ndị Kraịst na-eme ndị na-eso ụzọ n’oge a?
Ị̀ Na-echeta?
◻ N’ihi gịnị ka Jisọs ji bụrụ ihe nlereanya pụrụ iche a ga-eṅomi?
◻ N’ụzọ dị aṅaa ka Banabas si bụrụ ihe nlereanya?
◻ Gịnị ka anyị na-amụta site n’okwu Pọl kwuru n’Antiọk nke Pisidia?
◻ Olee ụzọ Pọl na Banabas si rụzuo ọrụ e kenyere ha?
[Foto dị na peeji nke 15]
Ntachi obi Pọl tachiri n’oge mkpagbu kpaliri mmasị na-adịgide adịgide n’ahụ nwa okoro ahụ bụ́ Timoti