Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w92 9/1 p. 24-25
  • Rie Nri—Rie Achịcha

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Rie Nri—Rie Achịcha
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ị̀ Tatụla Achịcha ahụ Na-enye Ndụ?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2014
  • Ihe Atụ nke Ọka Wit na Ata
    Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2018
  • “Gịnị Ka Anyị Ga-eri?”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
  • Ihe Ndị Mere n’Oge Baịbụl—Onye Ọrụ Ubi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
w92 9/1 p. 24-25

Ihe A Hụrụ n’Ala Nkwa Ahụ

Rie Nri—Rie Achịcha

N’OTU oge mgbe Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya nọ n’otu ụlọ, “ha apụghị ọbụna iri nri” n’ihi oké ìgwè mmadụ ahụ. (Mak 3:20) N’oge ọzọ, Jisọs banyere n’ụlọ otu onye Farisii “iri nri.” (Luk 14:1) Ụdị nri dị aṅaa na-abata gị n’uche?

Ma eleghị anya, ndị Israel oge ochie ga-eche banyere achịcha n’ihi na okwu Hibru na Grik maka “rie nri” pụtara n’ụzọ nkịrị “rie achịcha.” Nke a kwere nghọta, ebe ọ bụ na achịcha e ji ọka wheat ma ọ bụ barley mee bụ ihe ha na-erikarị.

Ọtụtụ ndị taa na-ewere ndị nna ochie bụ́ ndị Hibru dị ka ndị ọzụzụ atụrụ nakwa ndị na-eso ụzọ Jisọs dị ka ndị na-akụ azụ. Ụfọdụ rụkwara ụdị ọrụ dị otú ahụ ma n’ezie ọ bụghị ha nile. Ọka wheat bụ ihe ọtụtụ ji adị ndụ. O doro anya na otú ahụ ka ọ dị n’ọnọdụ Aịsak na Jekọb mgbe ụfọdụ, dị ka anyị na-aghọta site na Jenesis 26:12; 27:37; na 37:7. Ebe ọ bụkwa na ọrụ ugbo bụ ọrụ bụ isi a na-arụ na Galili n’oge Jisọs, ọ̀ pụrụ ịbụ na ụfọdụ ndị ghọrọ ndị ozi abụwo ndị na-akọ ọka wheat?

Nke ahụ pụrụ ịbụ ihe mere eme, n’ihi na ịkụ ọka wheat bụ ọrụ jupụtara n’ebe nile n’Ala Nkwa ahụ, aka Bible zokwara na ya dị ọtụtụ. (Deuterọnọmi 8:7-9; 1 Samuel 6:13) Gịnị ka ọ gụnyere?

Mgbe mmiri ozuzo mbụ na-ezo n’October na November mesịrị ka ala dị nro, onye na-akọ ọka wheat na-egwuri ala, mgbe ahụkwa kụọ mkpụrụ ya. Mmiri ozuzo ndị ga-emesịa zoo ga-enyere ihe ọkụkụ ya aka ito, mgbe ahụkwa, n’April na May, ọ na-eru oge òbìbì ya site n’ịcha ọlaedo ọlaedo tupu oge okpomọkụ. A maara owuwe ihe ubi nke ọka wheat nke ọma nke na ị na-agụ banyere ya dị ka ihe e ji amata oge. (Jenesis 30:14; Ndị Ikpe 15:1) Ị̀ pụrụ ịmata oge ọ bụ n’afọ mgbe e sere foto ahụ dị n’aka ekpe?a Oleekwa oge a nọ n’ime ya mgbe ndị na-eso ụzọ Jisọs ghọọrọ oko ọka ndụ?—Matiu 12:1.

Iwe ihe ubi ọka wheat pụtara oké ọrụ nye ndị ọrụ ugbo. Ndị na-ewe ihe ubi na-ebere okporo ọka ndị ahụ site n’iji mma iwe ihe ubi ma kee ha n’ùkwù n’ùkwù, dị ka ị na-ahụ n’okpuru. N’ezie, a pụrụ ileghara okporo ọka ụfọdụ anya ma ọ bụ ha pụrụ ịdapụ n’ala, bụ́ nke mere Rut ji bụrụ onye na-achịkọta ihe ubi nke ọma. (Rut 2:2, 7, 23; Mak 4:28, 29) Ihe na-esochi bụ ibuga ùkwù ọka wheat ndị ahụ n’ebe nzọcha ọka, dị ka na nke Arọna. Gịnị ka a na-eme n’ebe ahụ? Bible na-ehota “ihe nzọcha ọka nile na ihe ehi nile.” (2 Samuel 24:18-22; 1 Ihe Emere 21:23) A na-agbasa ọka wheat n’ala nkume dị larịị ma ọ bụ n’ala kpọrọ nkụ. Oké ehi ma ọ bụ anụmanụ ọzọ na-aga gburugburu n’elu ya, na-azọcha ọka wheat ahụ. Anụmanụ ahụ pụrụ ịdị na-adọkpụ nkụ nzọcha nke ga-enye aka ịzọpịa igbogbo ọka ahụ ma mee ka mkpụrụ ọka ahụ pụta.—Aịsaịa 41:15.

Mgbe ahụ oge eruwo maka ịfụcha mkpụrụ ọka ahụ, bụ́ nke a na-eme site n’iji shọvel ma ọ bụ ọgụ nwere eze na-ekuli ya n’ikuku, dị ka a na-ahụta n’elu. (Matiu 3:12) Onye ọrụ ugbo ahụ pụrụ ịfụcha ọka n’oge mgbede mgbe ikuku ga-ebupụ ahịhịa ọka ahụ (iberibe ahịhịa ọka sitere n’oko ọka ndị ahụ) ma bupụ igbogbo ahụ n’akụkụ. Ozugbo a chịkọtara mkpụrụ ọka ahụ ma yọcha ya iji wepụ mkpụrụ okwute ọ bụla, ọ dịwo mma maka nchekwa—ma ọ bụ iji ya mee ihe oriri ahụ dị mkpa nke ukwuu, achịcha.—Matiu 6:11.

Ọ bụrụ na ị bụ nwanyị a na-alụ alụ nke ọrụ ya bụ ime achịcha, kwa ụbọchị ị ga-eji ikwe na akaodo surie mkpụrụ ọka ahụ ịghọ ntu ọka flour, ma eleghị anya ọ pụrụ ịgba mkpụrụ mkpụrụ dị ka ntụ ọka flour wheat. Ma ọ bụ ị pụrụ igweri ya ịghọ ‘ntụ ọka flour ọma,’ dị ka nke Sera ji mee “ógbè achịcha” maka ndị mmụọ ozi ahụ nwoghara onwe ha ma ọ bụ nke ahụ ndị Israel ji mee ihe maka onyinye mkpụrụ ọka nke ịnata ihu ọma Jehova. (Jenesis 18:6; Ọpụpụ 29:2; Levitikọs 2:1-5; Ọnụ Ọgụgụ 28:12) Sera tinyere mmiri ná ntụ flour ọka wheat ahụ ma gwọọ ya ịghọ ógbè achịcha.

N’okpuru, ị pụrụ ịhụ ọtụtụ ógbè achịcha a kpụrụ akpụ na otu mbadamba ógbè achịcha dị pekepeke ndị a kpasara maka osisi. A pụrụ isi nnukwu achịcha dị otú ahụ dị okirikiri n’elu nkume ma ọ bụ n’ite ígwè, dị ka nwanyị ahụ na-eme. Nke a ọ̀ na-enyere gị aka iji anya nke uche gị hụ ihe Sera gara n’ihu imere ndị mmụọ ozi ahụ bịara na nke ha nakwa ihe ezinụlọ Lọt mesịrị mee? Anyị na-agụ, sị: “[Ndị mmụọ ozi ahụ] wee si n’ije ha wezụga onwe ha jekwuru ya, baa n’ụlọ ya; o wee meere ha oké oriri, sie achịcha ekoghị eko, ha rie.”—Jenesis 19:3.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Tụlee 1992 Calendar of Jehovah’s Witnesses.

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 24]

Pictorial Archive (Near Eastern History) Est.

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 24]

Pictorial Archive (Near Eastern History) Est.

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 25]

Pictorial Archive (Near Eastern History) Est.

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 25]

Garo Nalbandian

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya