Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
Ndịàmà Jehova hà na-ezere ime ememe ụbọchị ọmụmụ n’ihi na ihe omume ahụ nwere ihe ọ pụtara n’ụzọ okpukpe n’oge ochie?
Ime ememe ụbọchị ọmụmụ gbanyere mkpọrọ na nkwenkwe na-enweghị isi na n’okpukpe ụgha, ma nke ahụ abụghị nanị ma ọ bụ isi ihe mere Ndịàmà Jehova ji ezere ihe omume ahụ.
Ụfọdụ omenala ndị nweburu ọdịdị nke okpukpe adịkwaghị otú ahụ n’ọtụtụ ebe. Dị ka ihe atụ, mgbaaka agbamakwụkwọ nweburu ihe ọ pụtara n’ụzọ okpukpe, ma n’ọtụtụ ebe taa, ọ dịkwaghị otú ahụ. Ya mere, ọtụtụ ezi ndị Kraịst na-anakwere ọdịnala ógbè ha nke iyi mgbaaka agbamakwụkwọ iji nye ihe àmà na mmadụ bụ onye lụrụ di ma ọ bụ nwunye. N’ihe ndị dị otú ahụ, ihe na-abụkarị ihe dị mkpa bụ ma ihe omume ò nwere njikọ n’ebe okpukpe ụgha dị ugbu a.—Lee “Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ” ndị dị n’Ụlọ Nche nke January 15, 1972 (Bekee), na October 15, 1991.
Otú ọ dị, ihe ịrụ ụka adịghị ya na ọtụtụ akwụkwọ ntụaka na-ekpughe ihe ndị mere n’oge gboo n’ụzọ nkwenkwe na-enweghị isi na okpukpe banyere ime ememe ụbọchị ọmụmụ. Akwụkwọ bụ The Encyclopedia Americana (mbipụta 1991) kwuru, sị: “Akụkụ ụwa oge ochie bụ Ijipt, Gris, Rom, na Peasia mere ememe ụbọchị ọmụmụ nke chi dị iche iche, ndị eze, na ndị a maara aha ha.” Ọ sịrị na ndị Rom chetara ọmụmụ nke Artemis na ụbọchị nke Apollo. N’ụzọ megidere nke ahụ, “ọ bụ ezie na ndị Israel oge ochie dekọrọ afọ ndụ nke ụmụ amaala ha bụ ndị ikom, e nweghị ihe àmà ọ bụla na-egosi na ha mere ememe ọ bụla banyere ncheta kwa afọ nke ụbọchị ọmụmụ.”
Akwụkwọ ntụaka ndị ọzọ na-akọ ụmụ irighiri ihe banyere mmalite nke ememe ụbọchị ọmụmụ: ‘Ememe ụbọchị ọmụmụ malitere n’ọtụtụ afọ gara aga na Europe. Ndị mmadụ kwenyere ná mmụọ dị mma na nke dị njọ, bụ́ ndị a na-akpọ mgbe ụfọdụ mmụọ ọma na mmụọ ọjọọ. Onye ọ bụla na-atụ mmụọ ndị a ụjọ, na ha ga-emerụ onye ahụ na-eme ememe ụbọchị ọmụmụ ya ahụ, ya mere ndị enyi na ndị ikwu ya na-agbakwa ya gburugburu, bụ́ ndị ihe ọma ha na-echere onye ahụ, na ọnụnọ ha kpọmkwem, ga-echebe ya megide ihe ize ndụ ndị a na-amaghị banyere ya nke ememe ụbọchị ọmụmụ ji bịa. Inye onyinye na-eweta ọbụna nchebe dị ukwuu karị. Irikọ nri ọnụ na-ewetakwa nchebe ma nye aka iweta ngọzi nile nke ndị mmụọ ọma. Ya mere, ihe e bu n’uche na mbụ wee na-eme ememe ụbọchị ọmụmụ bụ ime ka ihe ọjọọ ghara ịdakwasị mmadụ, na ijide n’aka na afọ dị mma ga-abịa.’—Birthday Parties Around the World, 1967.
Akwụkwọ ahụ kọwakwara mmalite nke ọtụtụ omenala nke ememe ụbọchị ọmụmụ. Dị ka ihe atụ: “Ihe mere [e ji eji kandụl eme ihe] malitere n’oge ndị Grik na ndị Rom oge gboo bụ́ ndị chere na kandụl nwere ike majik. Ha ga-ekpe ekpere ma rịọ arịrịọ ndị ọkụ kandụl ahụ ga-ebugara chi ha dị iche iche. Mgbe ahụ, chi ndị ahụ ga-ezidata ngọzi ha, ma eleghị anya zaa ekpere ha.” A chịkọtara ihe ọmụma ndị ọzọ dị otú ahụ banyere otú ọdịnala ya ụfọdụ si malite na peji nke 69 na 70 nke akwụkwọ Reasoning From the Scriptures, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., na-ebipụta.
Otú ọ dị, dị ka e kwuworo, e nwere ihe dị n’ajụjụ a nke karịrị ma ime ememe ụbọchị ọmụmụ ò metụtara ma ọ bụ ọ̀ ka na-emetụta okpukpe. Bible na-ewelite isiokwu banyere ememe ụbọchị ọmụmụ, ndị Kraịst tozuru okè na-ejikwa amamihe na-echebara ihe ọ bụla o nwere ikwu echiche.
Ndị ohu Chineke n’oge ochie rịbara ama mgbe a mụrụ mmadụ, nke mere ka ha nwee ike ịmata afọ ndụ mmadụ. Anyị na-agụ, sị: “Noa wee gbaa [narị afọ ise]: Noa wee mụọ Shem, na Ham, na Jefet.” “N’afọ nke [narị isii] nke ndụ Noa, . . . a gbawara isi iyi nile nke oké ogbu mmiri.”—Jenesis 5:32; 7:11; 11:10-26.
Ọbụna dị ka Jisọs kwuru, n’etiti ndị Chineke, ịmụ nwa bụ ihe a gọziri agọzi, nke na-enye obi ụtọ. (Luk 1:57, 58; 2:9-14; Jọn 16:21) Ma, ndị Jehova emeghị ememe ncheta ụbọchị e ji mụọ mmadụ; ha mere ememe ndị ọzọ a na-eme kwa afọ, ma ọ bụghị ememe ụbọchị ọmụmụ. (Jọn 10:22, 23) Akwụkwọ bụ́ Encyclopaedia Judaica na-ekwu, sị: “Ememe ụbọchị ọmụmụ bụ nke a na-amaghị n’ememe ọdịnala ndị Juu.” Akwụkwọ bụ́ Customs and Traditions of Israel na-ekwu, sị: “A gbazitewo ememe ụbọchị ọmụmụ site n’ihe omume ndị mba ọzọ, ebe ọ bụ na ọ dịghị ihe ọ bụla e kwuru banyere omenala nke a n’etiti ndị Juu ma n’ime Bible, Talmud, ma ọ bụ n’ihe odide nke ndị mesịrị ghọọ nke Ndị Amamihe. N’ezie, ọ bụ omenala ndị Ijipt oge ochie.”
Njikọ ahụ dị n’etiti ya na Ijipt doro anya site n’otu ememe ụbọchị ọmụmụ a kọrọ na Bible, nke ọ na-abụghị ndị na-efe ezi ofufe mere. Ọ bụ nke oriri ụbọchị ọmụmụ nke Fero, bụ́ onye chịrị mgbe Josef nọ n’otu ụlọ mkpọrọ ndị Ijipt. Ụfọdụ n’ime ndị ọgọ mmụọ ahụ pụrụ inweworị obi ụtọ banyere oriri ahụ, ma e jikọrọ ememe ụbọchị ọmụmụ ahụ ná mbepụ e bepụrụ isi onye isi osi ite nke Fero.—Jenesis 40:1-22.
E gosipụtara omume ọjọọ yiri nke ahụ n’ememe ụbọchị ọmụmụ ọzọ a kọwara n’Akwụkwọ nsọ—nke Herọd Antipas, bụ́ nwa Herọd Onye Ukwu. E dekọghị nnọọ ememe ụbọchị ọmụmụ nke a na Bible dị ka nanị ime oriri efu dị mma. Kama nke ahụ, ọ bụ ya kpatara mbepụ e bepụrụ Jọn Onye na-eme baptism isi. Mgbe ahụ, “ndị na-eso ụzọ ya wee bịa, buru ozu ya, liekwa ya; ha wee jee kọrọ Jisọs,” bụ́ onye ‘si n’ebe ahụ wezụga onwe ya jee nọrọ iche.’ (Matiu 14:6-13) Ì chere na ndị ahụ na-eso ụzọ ma ọ bụ Jisọs ga-abụ ndị ememe ụbọchị ọmụmụ dọọrọ mmasị ha?
N’iburu n’uche ebe a maara ememe ụbọchị ọmụmụ si malite, na dị ka nke ka mkpa karị, otú e si dekọọ ya dị ka ihe na-adịghị mma n’ime Bible, Ndịàmà Jehova nwere oké ihe mere ha ga-eji zere ihe omume ahụ. Ọ dịghị mkpa ha ịgbaso omenala ụwa nke a, n’ihi na ha pụrụ inwe, ha na-enwekwa, oge iri ihe na-enye obi ụtọ n’oge ọ bụla n’afọ. Onyinye ndị ha na-enye abụghị n’ihi ibu ọrụ ma ọ bụ n’ihi nrụgide nke nnọkọ oriri; ọ bụ inyerịta onyinye nke na-adapụta n’oge ọ bụla site n’imesapụ aka na inwe ezi ịhụnanya.—Ilu 17:8; Eklisiastis 2:24; Luk 6:38; Ọrụ 9:36, 39; 1 Ndị Kọrint 16:2, 3.