Mesaịa Ọ̀ Dị Ihe A Kpọrọ Mmadụ Mkpa n’Ezie?
“ỤWA NỌ NÁ MKPA NKE MESAỊA, KA ONYE ISI ỌRỤ KWURU”
Isiokwu ahụ pụtara n’akwụkwọ akụkọ bụ́ The Financial Post nke Toronto, Canada, na 1980. Onye isi ọrụ ahụ e hotara okwu ya bụ Aurelio Peccei, bụ́ onye isi oche na onye malitere otu òtù a maara nke ọma na-enye ndụmọdụ nke a kpọrọ Club of Rome. Dị ka akwụkwọ akụkọ Post ahụ si kwuo, Peccei kwetara na “onye ndú nwere ebube—nke nkà mmụta sayensị, ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ma ọ bụ okpukpe—ga-abụ nanị nzọpụta nke ụwa pụọ n’ọgba aghara nke mmekọrịta mmadụ na ibe ya na ọnọdụ akụ na ụba ndị na-eyi egwu ibibi mmepeanya.” Gịnị ka i chere? Ụwa nke a ọ̀ nọ n’oké ihe isi ike dị otú ahụ nke na Mesaịa dị ihe a kpọrọ mmadụ mkpa? Tụlee nanị otu n’ime nsogbu ndị na-eche ụwa nke a ihu—agụụ.
ANYA abụọ gbara ọkpụ rụkpụ nke na-acha nchara nchara na-ele gị site n’otu foto dị n’akwụkwọ akụkọ ma ọ bụ magazin. Ha bụ anya nke otu nwata nwanyị na-erubeghị ọbụna afọ ise. Ma anya ndị a adịghị eme gị ọchị. Ọ dịghị ịma mma nke ndụ nwatakịrị dị na ha, mmetụta ihe ijuanya obi ụtọ adịghị ya, ntụkwasị obi onye na-amaghị ihe a na-akọ adịghị ya. Kama nke ahụ, ha jupụtara n’oké ihe mgbu, ahụ mgbu dị nro, agụụ nke olileanya na-adịghị. Nwa ahụ na-anwụ n’agụụ. Ihe mgbu na agụụ bụ nanị ihe ọ mawooro ná ndụ ya nile.
Ma eleghị anya, dị ka ọtụtụ ndị, ọ naghị amasị gị ịnọgide na-ele foto ndị dị otú ahụ, ya mere, ị safere peji ahụ ozugbo. Ọ bụghị na ọ dịghị emetụta gị, kama ị maghị ihe ị ga-eme n’ihi na ị na-aghọta na nke nwata nwanyị a agaala. Ụkwụ na aka bụ́ nanị ọkpụkpụ ọkpụkpụ na afọ koro eko bụ ihe àmà nke na ahụ ya amaliteworị iri onwe ya. Mgbe ahụ ị hụrụ foto ya, eleghị anya ọ nwụworị. Dịkwa ka nke ka njọ, ị maara na ọ bụghị nanị ya nọ n’ọnọdụ ahụ.
Olee kpọmkwem otú nsogbu ahụ haruru n’ibu? Ọ dị mma, ị̀ pụrụ iche echiche banyere nde ụmụaka 14? Ihe ka ọtụtụ n’ime anyị apụghị; ọnụ ọgụgụ ahụ dị elu nke ukwuu iche n’echiche. Mgbe ahụ, cheedị echiche banyere otu ámá egwuregwu nke na-abata 40,000 mmadụ. Ugbu a, cheedị echiche na o jupụtara n’ụmụaka—n’ahịrị nke ọ bụla, ná nkebi nke ọ bụla, bụrụ ọtụtụ ìgwè nke ihu mmadụ. Ọbụna nke ahụ siri ike iche n’echiche. Ma, ọ ga-ewe 350 ámá egwuregwu dị otú ahụ jupụtara n’ụmụaka iji ruo 14 nde. Dị ka òtù ọdịmma ụmụaka bụ́ UNICEF (United Nations Children’s Fund) si kwuo, nke ahụ bụ ọnụ ọgụgụ jọgburu onwe ya nke ụmụaka na-erubeghị afọ ise bụ́ ndị na-anwụ n’ihi erighị nri na-edozi ahụ nakwa ọrịa ndị dị mfe mgbochi kwa afọ ná mba ndị na-emepe emepe. Nke ahụ ruru ihe dị ka otu ámá egwuregwu jupụtara n’ụmụaka ịnwụ kwa ụbọchị! Ọ bụrụ na ị gbakọnyere nke a ọnụ ọgụgụ nke ndị toworo eto agụụ na-agụ, ị ga-enwetakwa ngụkọta zuru ụwa ọnụ nke ihe dị ka otu ijeri ndị ọ dịworo anya ha na-erighị nri na-edozi ahụ.
N’ihi Gịnị ka Ọtụtụ ji Nọrọ n’Agụụ?
Ka ọ dị ugbu a, ala na-emepụta nri karịrị nke ụmụ mmadụ na-ericha ugbu a, nweekwa ike imepụta karị. Ma, kwa minit ọ bụla, 26 ụmụaka na-anwụ site n’erighị nri na-edozi ahụ na ọrịa. N’ime otu minit ahụ, ụwa na-emefu ihe dị ka $2,000,000 n’ime nkwadebe agha. Ị̀ pụrụ iche echiche ihe ego hà otú ahụ—ma ọ bụ nanị ụfọdụ n’ime ya—pụrụ imere 26 ụmụaka ndị ahụ?
N’ụzọ doro anya, a pụghị ikwu na agụụ nke ụwa bụ n’ihi enweghị nri ma ọ bụ ego. Nsogbu ahụ karịrị nke ahụ. Dị ka Jorge E. Hardoy, onye Argentina bụ́ prọfesọ, si kwuo ya, “ụwa n’ozuzu ya enweghị ike isoro ndị nọ ná mkpa ihe ndị a karị nwekọọ ntụsara ahụ, ike, oge, ihe onwunwe, na ihe ọmụma.” Ee, ebe nsogbu dị abụghị n’ihe mmadụ nwere, kama ná mmadụ n’onwe ya. Anyaukwu na ọchịchọ ọdịmma onwe onye nanị yiri ka hà bụ mmetụta ndị na-achịkwa òtù ụmụ mmadụ. Otu ụzọ n’ime ụzọ ise nke ndị kasị baa ọgaranya n’etiti ọnụ ọgụgụ ndị bi n’ụwa na-enweta ihe dị ka 60 okpukpu ngwá ahịa na ije ozi karịa otu ụzọ n’ime ụzọ ise nke ndị kasị daa ogbenye.
N’eziokwu, ụfọdụ ji obi eziokwu na-agbalị ime ka ihe oriri rutere ndị agụụ na-agụ, ma ihe ka ọtụtụ ná mgbalị ha na-akpụ afọ n’ala n’ihi ihe ndị ha na-apụghị ịchịkwa. Ụnwụ nri na-adakwasịkarị mba ndị e tisara site n’agha obodo ma ọ bụ nnupụisi, ọ bụkwa ihe na-eme mgbe mgbe na òtù agha ndị na-emegide ibe ha na-egbochi ihe inyeaka irutere ndị nọ ná mkpa. Òtù abụọ ahụ na-atụ egwu na site n’ikwe ka ihe oriri rutere ndị nkịtị na-anwụ n’agụụ n’ókèala ndị iro ha, ha na-enye ndị iro ha ihe oriri. Gọọmenti n’onwe ha na-ejikwa agụụ eme ihe dị ka ngwá ọgụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị.
Ihe Ngwọta Ọ̀ Dịghị?
Ọ bụ ihe mwute na nsogbu nke ọtụtụ nde ndị na-anwụ n’agụụ abụghị nanị ọgba aghara na-adakwasị mmadụ n’oge a. Mbibi oge nile na ime gburugburu ebe obibi nsí, ndịgide nke ihe otiti nke agha bụ́ nke na-ebibi ọtụtụ nde ndụ, ntiwapụ nke imempụ ihe ike nke na-akpata ụjọ na enweghị ntụkwasị obi n’ebe nile, na ndakpọ nke ọnọdụ omume ọma nọgidere na-adakpọ bụ́ nke yiri ka ọ̀ bụ ya kpatara ọtụtụ n’ime nsogbu ndị a—ọgba aghara ndị a nile nke ụwa jikọrọ aka, dị ka a pụrụ isi kwuo ya, na-emesikwa otu eziokwu ahụ na-enweghị mgbagha ike—mmadụ apụghị inwe ihe ịga nke ọma n’ịchị onwe ya.
Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ọ bụ nke ahụ mere ka ọtụtụ mmadụ nwee ndakpọ olileanya banyere ịchọta ihe ngwọta nye nsogbu nile nke ụwa. Ndị ọzọ na-eche echiche dị ka Aurelio Peccei chere, bụ́ onye ọkà mmụta Itali ahụ e hotara ná mmalite. Ọ bụrụ na a ga-enwe ihe ngwọta ọ bụla, ka ha na-eche, ọ ghaghị isite n’ebe pụrụ iche—ma eleghị anya—ọbụna site n’ike karịrị nke mmadụ. Otú a, ozizi banyere mesaịa na-adọrọ mmasị dị ike. Ma ọ̀ bụ ihe ezi uche dị na ya inwe olileanya na mesaịa? Ka olileanya dị otú ahụ ọ̀ bụ nanị echiche efu?
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 2]
Foto ihu akwụkwọ: Elu: Foto nke U.S. Naval Observatory; Ala: Foto nke NASA
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 3]
Foto WHO nke P. Almasy sere
[Ebe E Si Nweta Foto Ndi Dị na peeji 4]
Foto WHO nke P. Almasy sere
Foto nke U.S. Navy