“Anyị Ahụwo Mesaịa Anyị”!
“[Andru] buru ụzọ chọta nwanne nke aka ya, bụ́ Saịmọn, sị ya, Anyị ahụwo Mesaịa anyị (nke bụ, ma a sụgharịa ya, Kraịst).”—JỌN 1:41.
1. Gịnị ka Jọn Onye Na-eme Baptism gbara àmà ya banyere Jisọs onye Nazaret, gịnịkwa ka Andru kwubiri banyere ya?
ANDRU lere nwoke onye Juu ahụ a na-akpọ Jisọs onye Nazaret anya miri emi ruo ogologo oge. O yighị onye eze, ma ọ bụ onye amamihe, ma ọ bụ rabaị. O yighị uwe onye eze, o nweghịkwa isi awọ́, ma ọ bụ aka dị nro na akpụkpọ ahụ dị mma. Jisọs bụ onye na-eto eto—dị ihe dị ka 30 afọ—na-enwe aka kpọrọ nkụ na akpụkpọ ahụ chanwụrụ achanwụ nke onye na-arụ ọrụ aka. Ya mere, ọ pụrụ ịbụ na o jughị Andru anya ịmata na ọ bụ onye ọkwa nkà. Otú o sina dị, Jọn Onye Na-eme Baptism kwuru banyere nwoke nke a, sị: “Lee, Nwa Atụrụ Chineke!” N’ụbọchị bu nke ahụ ụzọ, Jọn ekwuwo otu ihe dị ịtụnanya ọbụna karị: “Onye a bụ Ọkpara Chineke.” Nke a ọ̀ pụrụ ịbụ eziokwu? Andru wepụtara oge na-ege Jisọs ntị n’ụbọchị ahụ. Anyị amaghị ihe Jisọs kwuru; anyị maara na ihe o kwuru gbanwere ndụ Andru. O ji ọsọ pụọ ije chọọ nwanne ya nwoke, bụ́ Saịmọn, wee tie, sị, “Anyị ahụwo Mesaịa anyị”!—Jọn 1:34-41.
2. N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa ịtụle ihe àmà ahụ banyere ma Jisọs ọ̀ bụ Mesaịa ahụ e kwere ná nkwa?
2 Andru na Saịmọn (bụ́ onye Jisọs gụgharịrị Pita) mesịrị ghọọ ndị ozi Jisọs. Mgbe ihe karịrị afọ abụọ nke o ji bụrụ onye na-eso ụzọ ya gasịrị, Pita gwara Jisọs, sị: “Gị onwe gị bụ Kraịst [Mesaịa] ahụ, Ọkpara Chineke dị ndụ.” (Matiu 16:16) Ndị ozi na ndị na-eso ụzọ kwesịrị ntụkwasị obi mesịrị bụrụ ndị dị njikere ịnwụ maka okwukwe ahụ. Taa, ọtụtụ nde ndị obi ha ziri ezi bụkwa ndị raara onwe ha nye. Ma ọ̀ bụ n’ihe àmà dị aṅaa? Ihe àmà, e kwuwerị, na-eme ka e nwee ọdịiche n’etiti okwukwe na nkwere nkịtị. (Lee Ndị Hibru 11:1.) Ya mere, ka anyị tụlee usoro ihe àmà atọ gbara ọkpụrụkpụ nke na-egosi na Jisọs bụ n’ezie Mesaịa ahụ.
Usoro Ọmụmụ Jisọs
3. Gịnị ka Oziọma ndị ahụ nke Matiu na Luk kọrọ n’ụzọ sara mbara banyere usoro ọmụmụ Jisọs?
3 Usoro ọmụmụ Jisọs bụ ihe àmà mbụ nke Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst na-enye iji kwadoo ịbụ Mesaịa ya. Bible buru amụma na Mesaịa ahụ ga-abịa site n’usoro ezinụlọ nke Eze Devid. (Abụ Ọma 132:11, 12; Aịsaịa 11:1, 10) Oziọma Matiu si otú a malite, sị: “Akwụkwọ osuso ọmụmụ Jisọs Kraịst, nwa nke Devid, nwa Abraham.” Matiu na-akwado nzọrọ obi ike nke a site n’ịchọpụta usoro ọmụmụ Jisọs site n’usoro nke nna ahụ kuchiri ya, bụ́ Josef. (Matiu 1:1-16) Oziọma nke Luk chọpụtara usoro ọmụmụ Jisọs site ná nne mụrụ ya, bụ́ Meri, laa azụ site na Devid na Abraham ruo Adam. (Luk 3:23-38)a Otú a, ndị so dee Oziọma ahụ weturu anya ala wee dekọọ nzọrọ ha nke na Jisọs bụ onye nketa Devid, ma n’ụzọ iwu ma n’ụzọ ọmụmụ.
4, 5. (a) Ndị biri n’oge Jisọs hà mara usoro ọmụmụ ya site na Devid aka, n’ihi gịnịkwa ka nke a ji dị mkpa? (b) Olee ụzọ akwụkwọ ntụaka ndị na-adabereghị na Bible si kwadoo usoro ọmụmụ Jisọs?
4 Ọbụna onye kasị na-enwe obi abụọ n’imegide ọbụbụ Jisọs bụ Mesaịa apụghị ịgbagha nzọrọ Jisọs nke ịbụ nwa Devid. N’ihi gịnị? E nwere ihe abụọ kpatara ya. Otu, e kwughachiri nzọrọ ahụ n’ebe nile na Jerusalem ruo ọtụtụ iri afọ tupu e bibie obodo ahụ n’afọ 70 O.A. (Tụlee Matiu 21:9; Ọrụ Ndị Ozi 4:27; 5:27, 28.) Ọ bụrụ na nzọrọ ahụ bụ okwu ụgha, nke ọ bụla n’ime ndị mmegide Jisọs—o nwekwara ọtụtụ—gaara egosiworị na Jisọs bụ onye aghụghọ nanị site n’inyocha usoro ọmụmụ ya n’ihe ndekọ usoro ọmụmụ nke dị n’ebe ndebe ihe ndekọ mgbe ochie nke ọha.b Ma akụkọ ihe mere eme edekọghị na ọ dị onye ọ bụla mara usoro ọmụmụ Jisọs site n’Eze Devid aka. O doro anya na nzọrọ ahụ enweghị ịrụ ụka ọ bụla. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na Matiu na Luk detara aha ndị dị mkpa maka ihe ndekọ ha kpọmkwem site n’ihe ndekọ ọha ahụ.
5 Nke abụọ, akwụkwọ ndị ọzọ e wezụga Bible na-emesi ike nnakwere ọha mmadụ nakweere usoro ọmụmụ Jisọs. Dị ka ihe atụ, Talmud dekọrọ banyere otu rabaị nke narị afọ nke anọ dị ka onye kwuru okwu mkparị megide Meri, bụ́ nne nke Jisọs, maka ‘isoro ndị ọkwa nkà na-akwa iko’; ma otu ihe odide ahụ kwetara na “o sitere n’usoro ọmụmụ nke ndị eze na ndị ọchịchị.” Otu ihe atụ bu ụzọ bụ nke ọkọ akụkọ ihe mere eme nke narị afọ nke abụọ, bụ́ Hegesippus. Ọ kọrọ na mgbe Caesar Domitian nke Rom chọrọ ikpochapụ onye ọ bụla sitere n’usoro ọmụmụ Devid, ụfọdụ ndị iro nke ndị Kraịst oge gboo kwugidere ụmụ ụmụ nke Jud, bụ́ nwanne Jisọs otu nne ji ya na ya, “dị ka ndị sitere n’ezinụlọ Devid.” Ọ bụrụ na a maara Jud dị ka onye sitere n’usoro ọmụmụ Devid, ọ̀ bụ na Jisọs abụghịkwa? Ihe ịrụ ụka adịghị ya!—Ndị Galetia 1:19; Jud 1.
Amụma Nile Banyere Mesaịa
6. Olee otú amụma ndị metụtara Mesaịa hà n’ọnụ ọgụgụ n’Akwụkwọ Nsọ Hibru?
6 Usoro ihe àmà ọzọ na-egosi na Jisọs bụ Mesaịa ahụ bụ amụma nwere mmezu. Amụma ndị metụtara Mesaịa ahụ bara ụba n’Akwụkwọ Nsọ Hibru. N’akwụkwọ ya bụ́ The Life and Times of Jesus the Messiah, Alfred Edersheim gụkọtara ihe ruru 456 ihe odide ndị dị n’Akwụkwọ Nsọ Hibru nke ndị rabaị oge ochie lere anya dị ka ndị metụtara mesaịa. Otú ọ dị, ndị rabaị nwere ọtụtụ echiche na-ezighị ezi banyere Mesaịa ahụ; ọtụtụ n’ime ihe odide ndị ha rụtụrụ aka emetụtaghị mesaịa ma ọlị. Ma, ya dịkarịa ala, e nwere ọtụtụ amụma ndị kọwara Jisọs dị ka Mesaịa ahụ.—Tụlee Mkpughe 19:10.
7. Olee ụfọdụ n’ime amụma ndị Jisọs mezuru mgbe o jegharịrị n’elu ala?
7 N’ime ha: obodo ebe a mụrụ ya (Maịka 5:2; Luk 2:4-11); ọdachi nke igbu ìgwè ụmụ ọhụrụ nke weere ọnọdụ mgbe a mụsịrị ya (Jeremaịa 31:15; Matiu 2:16-18); a ga-akpọpụ ya n’Ijipt (Hosea 11:1; Matiu 2:15); ndị ọchịchị ụwa ga-ejikọ aka ọnụ ibibi ya (Abụ Ọma 2:1, 2; Ọrụ 4:25-28); nraranye ya n’ọnụ ego 30 ọlaọcha (Zekaraịa 11:12; Matiu 26:15); ọbụna otú ọ ga-esi nwụọ.—Abụ Ọma 22:16; Jọn 19:18, 23; 20:25, 27.c
E Buru Amụma Ọbịbịa Ya
8. (a) Amụma dị aṅaa rụtụrụ aka kpọmkwem mgbe Mesaịa ahụ ga-abịa? (b) Ihe abụọ dị aṅaa ka a na-aghaghị ịmata iji wee ghọta amụma nke a?
8 Ka anyị lekwasị anya nanị n’otu amụma. Na Daniel 9:25, a gwara ndị Juu mgbe Mesaịa ahụ ga-abịa. Ọ na-agụ, sị: “Mara, werekwa uche mata, na site ná mpụta okwu ahụ iwughachi na iwuzi Jerusalem ruo mgbe Onye e tere mmanụ, bụ́ Onye ndú, ga-adị izu asaa, na [izu iri isii na abụọ].” Ọ bụrụ na e lee amụma nke a anya na mbụ, ọ pụrụ iyi ihe dị omimi. Ma n’echiche sara mbara, ọ chọrọ anyị n’aka ịchọta ọkpụrụkpụ ihe ọmụma abụọ: oge mmalite na ịdị ogologo nke oge. Iji maa atụ, ọ bụrụ na i ji map nke na-arụtụ aka gaa n’akụ̀ e liri “50 furlong n’ebe ọwụwa anyanwụ nke olulu mmiri dị n’ogige izu ike obodo,” ị pụrụ ịchọpụta na ntụziaka ahụ dị mgbagwoju anya—karịsịa ma ọ bụrụ na ị maghị ebe olulu mmiri nke a dị, ma ọ bụ otú otu ‘furlong’ hà n’ogologo. Ọ̀ bụ na ị gaghị achọpụta ihe abụọ ndị ahụ ka i wee nwee ike ịchọta akụ ahụ? Leenụ, amụma Daniel na nke ahụ bụ otu ihe, e wezụga na anyị na-achọ ịmata oge mmalite ma na-agụ oge ndị na-esonụ.
9, 10. (a) Gịnị bụ oge mmalite nke e ji malite ịgụ izu 69 ahụ? (b) Olee otú izu 69 ahụ hà n’ogologo, oleekwa ụzọ anyị si mara nke a?
9 Na nke mbụ, ọ dị mkpa anyị ịmata oge ọ malitere, ụbọchị mgbe ‘okwu ahụ pụtara ịga wughachi ma wuzie Jerusalem.’ Ọzọ, ọ dị mkpa anyị ịmara ịdị anya nke ahụ malite n’oge ahụ, kpọmkwem otú 69 (7 a gbakọnyere 62) izu ndị a hà n’ogologo. Ọ dịghị nke ọ bụla n’ime ọkpụrụkpụ ihe ọmụma ahụ siri ike inweta. Nehemaịa gwara anyị hoo haa na e kwupụtara okwu ịga wuzie mgbidi ahụ gbara Jerusalem gburugburu, na-eme ka o mesịa bụrụ obodo e wughachiri ewughachi, “n’afọ nke [iri abụọ] nke Ataksakses, bụ́ eze.” (Nehemaịa 2:1, 5, 7, 8) Nke ahụ na-eme ka oge anyị malite na 455 T.O.A.d
10 Ugbu a, banyere izu 69 ndị a, hà pụrụ ịbụ izu nkịtị nke ụbọchị asaa? Ee e, n’ihi na Mesaịa apụtaghị nanị n’ihe karịrị otu afọ mgbe 455 T.O.A gasịrị. Otú a, ihe ka ọtụtụ ná ndị ọkà mmụta Bible na ọtụtụ nsụgharị (gụnyere Tanakh nke ndị Juu n’ime ntụaka ala ala peji nke amaokwu nke a) kwetara na ndị a bụ izu “nke afọ.” Ozizi nke a nke ‘izu nke afọ,’ ma ọ bụ ọgụgụ afọ asaa, bụ ihe ndị Juu oge ochie maara. Dị nnọọ ka ha na-edebe ụbọchị izu ike kwa ụbọchị nke asaa ọ bụla, ha debere afọ izu ike kwa afọ nke asaa ọ bụla. (Ọpụpụ 20:8-11; 23:10, 11) Ya mere, izu 69 nke afọ ga-abụ ihe dị ka e weta 69 ụzọ afọ 7, ma ọ bụ 483 afọ. Nanị ihe ọ fọdụrụ ka anyị mee bụ ịgụkọ ya. Malite n’afọ 455 T.O.A., ịgụ 483 afọ na-eweta anyị n’afọ 29 O.A—bụ́ kpọmkwem afọ mgbe e mere Jisọs baptism, o wee ghọọ ma·shiʹach, Mesaịa ahụ!—Lee “Izu Iri Asaa,” Insight on the Scriptures, Mpịakọta nke 2, peji nke 899.
11. Olee ụzọ anyị pụrụ si zaghachi ndị ahụ na-ekwu na nke a bụ nanị ụzọ ọgbara ọhụrụ isi kọwaa amụma nke Daniel?
11 Ụfọdụ pụrụ ịrụ ụka na nke a bụ nanị ụzọ ọgbara ọhụrụ isi kọwaa amụma ahụ iji kwekọọ n’akụkọ ihe mere eme. Ya bụrụ otú ahụ, n’ihi gịnị ka ndị mmadụ n’oge Jisọs ji na-atụ anya Mesaịa ahụ ịpụta n’oge ahụ? Onye Kraịst na-akọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Luk, ndị Rom na-akọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Tacitus na Suetonius, onye Juu na-akọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Josephus, na onye Juu bụ́ ọkà ihe ọmụma, bụ́ Philo, ha nile dịrị ndụ n’ihe dị ka oge ahụ ma gbaa àmà banyere ọnọdụ ịtụ anya nke a. (Luk 3:15) Ụfọdụ ndị ọkà mmụta n’oge a nọgidere na-ekwu na ọ bụ mmegbu ndị Rom mere ndị Juu ji nwee ọchịchọ maka ma tụọ anya Mesaịa ahụ n’ụbọchị ndị ahụ. Otú ọ dị, n’ihi gịnị ka ndị Juu ji tụọ anya Mesaịa ahụ mgbe ahụ kama ịbụ n’oge ajọ mkpagbu ndị Grik n’ọtụtụ narị afọ tupu mgbe ahụ? N’ihi gịnị ka Tacitus ji kwuo na ọ bụ “amụma ndị dị omimi” mere ndị Juu ji tụọ anya ndị ọchịchị dị ike ịbịa site na Judia ma “nweta alaeze ukwu zuru ụwa ọnụ”? Abba Hillel Silver, n’akwụkwọ ya bụ́ A History of Messianic Speculation in Israel, kwetara na “a tụrụ anya Mesaịa ahụ n’ihe dị ka agbata iri afọ abụọ na ise na iri afọ ise nke narị afọ mbụ O.A.,” ọ bụghị n’ihi mkpagbu ndị Rom, kama n’ihi “ọgụgụ oge na-ewu ewu nke ụbọchị ahụ,” nke e wetara akụkụ ụfọdụ ya site n’akwụkwọ nke Daniel.
A Kọwara Onye Ọ Bụ Site n’Elu
12. Olee ụzọ Jehova si kọwaa Jisọs dị ka Mesaịa ahụ?
12 Ụdị ihe àmà nke atọ nke ịbụ Mesaịa Jisọs bụ akaebe nke Chineke n’onwe ya. Dị ka Luk 3:21, 22 si kwuo, mgbe e mesịrị Jisọs baptism, e tere ya mmanụ site n’ike kasị dị nsọ, nke kasịkwa dị ike n’eluigwe na ala, bụ́ mmụọ nsọ nke Jehova Chineke. Sitekwa n’olu ya, Jehova kwetara na ya anwapụtawo Ọkpara ya, bụ́ Jisọs. N’ugboro abụọ ndị ọzọ, Jehova gwara Jisọs okwu kpọmkwem site n’eluigwe, si otú a na-egosipụta nnwapụta Ya: n’otu mgbe, n’ihu ndị ozi atọ Jisọs, n’oge ọzọkwa, n’ihu ìgwè ndị na-ekiri ihe na-emenụ. (Matiu 17:1-5; Jọn 12:28, 29) Ọzọkwa, e zitere ndị mmụọ ozi site n’elu imesi ọnọdụ Jisọs ike dị ka Kraịst, ma ọ bụ Mesaịa.—Luk 2:10, 11.
13, 14. Olee ụzọ Jehova si gosipụta nnwapụta ọ nwapụtara Jisọs dị ka Mesaịa?
13 Jehova gosipụtara nnwapụta ọ nwapụtara onye ya e tere mmanụ site n’inye ya ike ịrụ oké ọrụ dị iche iche. Dị ka ihe atụ, Jisọs buru amụma ndị kwupụtara ọtụtụ ihe ndị ga-eme n’ọdịnihu—ụfọdụ ruru n’oge anyị a.e Ọ rụkwara ọrụ ebube, dị ka inye ìgwè mmadụ agụụ na-agụ ihe oriri na ịgwọ ndị ọrịa. O mere ka ọbụna ndị nwụrụ anwụ si n’ọnwụ bilie. Ndị na-eso ụzọ ya hà chepụtara nnọọ akụkọ banyere ọrụ ndị a dị ike mgbe nke ahụ na-emeghị eme n’ezie? Lee, Jisọs rụrụ ọtụtụ n’ime ọrụ ebube ya n’ihu ndị ji anya ha hụ mgbe o mere, mgbe ụfọdụ n’ihu ọtụtụ puku mmadụ n’otu mgbe. Ọbụna ndị iro Jisọs apụghị ịrụ ụka na o mere ihe ndị a n’ezie. (Mak 6:2; Jọn 11:47) E wezụga nke ahụ, ọ bụrụ na ndị na-eso ụzọ Jisọs nwere ọchịchọ ichepụta ihe ndekọ ndị dị otú ahụ, mgbe ahụ n’ihi gịnị ka ha ga-eji kwuo nnọọ eziokwu mgbe a bịara n’adịghị ike nke ha? N’ezie, hà gaara adị njikere ịnwụ maka okwukwe nke dabeere nanị n’akụkọ ọdịbendị na-emeghị eme nke ha chepụtaworo n’onwe ha? Ee e. Ọrụ ebube nile nke Jisọs bụ eziokwu nke akụkọ ihe mere eme.
14 Akaebe nke Chineke banyere Jisọs dị ka Mesaịa akwụsịghị n’ebe ahụ. Site ná mmụọ nsọ, ọ hụrụ na e deturu ihe àmà nke ịbụ Mesaịa Jisọs n’akwụkwọ, o wee ghọọ akụkụ nke akwụkwọ a kasị sụgharịa ma kesaa n’akụkọ ihe mere eme nile.
N’ihi Gịnị Ka Ndị Juu Ji Ghara Ịnabata Jisọs?
15. (a) Olee otú iru eru Jisọs ndị na-akọwa ya dị ka Mesaịa si bụrụ ihe zuru ezu? (b) Olileanya ndị dị aṅaa nke ndị Juu dugara ọtụtụ n’ime ha n’ịjụ Jisọs dị ka Mesaịa ahụ?
15 Mgbe ahụ, n’ozuzu ha, usoro ihe àmà atọ ndị a gụnyere ọtụtụ narị eziokwu ndị na-akọwa Jisọs dị ka Mesaịa ahụ. Ọ̀ bụ na nke ahụ ezughị ezu? Cheedị nnọọ echiche banyere itinye akwụkwọ iji nweta akwụkwọ ikike ịkwọ ụgbọ ala ma ọ bụ kaadị ịzụta ihe n’aka na ịbụ onye a gwara na ihe atọ kọwara onye ị bụ ezughị ezu—ị ghaghị iweta ọtụtụ narị ihe. Lee ka ezi uche si ghara ịdị na nke ahụ! Mgbe ahụ, n’ezie, a kọwara Jisọs n’ụzọ zuru ezu na Bible. Otú ọ dị, n’ihi gịnị ka ọtụtụ n’ime ndị obodo Jisọs n’onwe ya ji gọnarị ihe àmà ndị a nile nke na ọ bụ Mesaịa ahụ? N’ihi na ihe àmà, n’agbanyeghị otú o si dị mkpa n’ezi okwukwe, adịghị eme ka e nwee okwukwe. N’ụzọ dị mwute, ọtụtụ ndị mmadụ na-ekwere ihe ha chọrọ ikwere, ọ bụ ezie na e nwere ihe àmà hiri nne. Mgbe a bịara n’ihe banyere Mesaịa, ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ndị Juu nwere ihe bụ echiche ha kpọmkwem banyere ihe ha chọrọ. Ha chọrọ mesaịa ndọrọ ndọrọ ọchịchị, onye ga-akwụsị mmegbu ndị Rom ma weghachi Israel n’otuto yiri n’ụzọ ihe onwunwe nke ụbọchị Solomọn. Mgbe ahụ, olee ụzọ ha pụrụ isi nabata nwa nke a dị umeala n’obi nke onye ọkwa nkà, onye Nazaret nke a bụ́ onye na-egosipụtaghị mmasị ọ bụla ná ndọrọ ndọrọ ọchịchị ma ọ bụ n’akụ na ụba? Karịsịa, olee ụzọ ọ pụrụ isi bụrụ Mesaịa mgbe ọ tasịrị ahụhụ ma nwụọ ọnwụ ihere n’elu osisi ịta ahụhụ?
16. N’ihi gịnị ka ndị na-eso ụzọ Jisọs ji mee mgbanwe n’olileanya nke ha banyere Mesaịa ahụ?
16 Ọnwụ nke Jisọs wutere ndị na-eso ụzọ ya. Mgbe mbilite n’ọnwụ ya dị ebube gasịrị, o doro anya na ha nwere olileanya na ọ ‘ga-enyeghachi Israel alaeze ahụ’ ozugbo. (Ọrụ 1:6) Ma ha ajụghị Jisọs dị ka Mesaịa nanị n’ihi na olileanya onwe onye nke a emezughị. Ha nwere okwukwe n’ebe ọ nọ nke dabeere n’ihe àmà zuru ezu e nwere, nghọta ha jikwa nwayọọ nwayọọ mụbaa; ọtụtụ ihe omimi doro anya. Ha mesịrị ghọta na Mesaịa apụghị imezu amụma nile banyere ya n’ime oge ya dị mkpirikpi dị ka mmadụ n’elu ụwa nke a. Leenụ, otu amụma kwuru banyere ya dị ka onye ga-abịa n’ịdị umeala, na-anọkwasị n’elu ịnyịnya ibu, ebe ọzọ kwuru okwu banyere ọbịbịa ya n’ebube n’igwe ojii! Olee ụzọ ha abụọ pụrụ isi bụrụ eziokwu? O doro anya na ọ gaje ịbịa nke ugbo abụọ.—Daniel 7:13; Zekaraịa 9:9.
Ihe Mere Mesaịa ahụ Na-aghaghị iji Nwụọ
17. Olee ụzọ amụma Daniel ji mee ka o doo anya na Mesaịa ahụ aghaghị ịnwụ, n’ihi gịnịkwa ka ọ ga-eji nwụọ?
17 Ọzọkwa, amụma ndị metụtara Mesaịa ahụ mere ka o doo anya na Mesaịa ahụ aghaghị ịnwụ anwụ. Dị ka ihe atụ, amụma nke ahụ kwuru kpọmkwem mgbe Mesaịa ahụ ga-abịa buru amụma n’amaokwu nke na-esonụ, sị: “Mgbe [izu iri isii na abụọ] ahụ gasịrị [nke sochiri izu asaa ahụ] a ga-ebipụ onye e tere mmanụ.” (Daniel 9:26) Okwu Hibru ahụ bụ ka·rathʹ nke e ji mee ihe n’ebe a maka ‘ibipụ’ bụ otu okwu ahụ e ji mee ihe maka ikpe ọnwụ n’okpuru Iwu Mosis. N’enweghị obi abụọ ọ bụla, Mesaịa ahụ aghaghị ịnwụ. N’ihi gịnị? Amaokwu nke 24 na-enye anyị azịza ya: “Ime ka mmehie gwụsịa, na ikpuchi ajọ omume, na ime ka ezi omume ebighị ebi bata.” Ndị Juu maara nke ọma na ọ bụ nanị àjà, ọnwụ, pụrụ ikpuchi ajọ omume.—Levitikọs 17:11; tụlee Ndị Hibru 9:22.
18. (a) Olee ụzọ Aịsaịa isi nke 53 si gosi na Mesaịa ahụ aghaghị ịta ahụhụ ma nwụọ? (b) Ihe dị aṅaa yiri ka ọ dị mgbagwoju anya ka amụma nke a na-ewelite?
18 Aịsaịa isi nke 53 na-ekwu okwu banyere Mesaịa dị ka Ohu pụrụ iche nke Jehova bụ́ onye na-aghaghị ịta ahụhụ ma nwụọ iji kpuchie mmehie nke ndị ọzọ. Amaokwu nke 5 na-ekwu, sị: “Ya onwe ya bụ onye a mapuworo site ná njehie nile nke anyị, onye a zọpịaworo site n’ajọ omume nile nke anyị.” Otu amụma ahụ, mgbe ọ gwasịrị anyị na Mesaịa nke a aghaghị ịnwụ dị ka “àjà ikpe ọmụma,” kpughere na otu Onye a ‘ga-eme ka ụbọchị ya nile dị ogologo, ihe nke na-atọ Jehova ụtọ ga-agakwa nke ọma n’aka ya.’ (Amaokwu nke 10) Ọ̀ bụ na nke ahụ adịghị mgbagwoju anya? Olee ụzọ Mesaịa ahụ ga-esi nwụọ, mgbe ahụ ‘meekwa ka ụbọchị ya nile dị ogologo’? Olee ụzọ ọ pụrụ isi bụrụ onye a chụrụ dị ka àjà, ma mesịa mee ‘ka ihe na-atọ Jehova ụtọ nwee ihe ịga nke ọma’? N’ezie, olee ụzọ ọ pụrụ isi nwụọ ma nọgide bụrụ onye nwụrụ anwụ n’emezughị amụma ndị kasị dị mkpa banyere ya, ya bụ na ọ ga-achị achị ruo mgbe ebighị ebi dị ka Eze, wetakwa udo na obi ụtọ n’elu ụwa dum?—Aịsaịa 9:6, 7.
19. Olee ụzọ mbilite n’ọnwụ Jisọs si jikọta amụma ndị yiri ka ha megiderịtara onwe ha banyere Mesaịa ahụ?
19 E doziri ihe nke a yiri ka ọ dị mgbagwoju anya site n’otu ọrụ ebube pụrụ iche. E mere ka Jisọs si n’ọnwụ bilie. Ọtụtụ narị ndị Juu obi ha ziri ezi ghọrọ ndị ji anya ha hụ ebube nke a bụ eziokwu. (1 Ndị Kọrint 15:6) Pọl onyeozi mesịrị dee, sị: “Onye ahụ [Jisọs Kraịst], mgbe o chererịị otu àjà n’ihu Chineke n’ihi mmehie, o wee nọdụ n’aka nri Chineke mgbe nile; na-ele anya [“na-echere,” NW] n’oge fọdụrụ ruo mgbe a ga-edo ndị iro ya dị ka ihe mgbakwasị ụkwụ nke ụkwụ ya abụọ.” (Ndị Hibru 10:10, 12, 13) Ee, ọ bụ mgbe e mesịrị, ka Jisọs si n’ọnwụ bilie gaa ná ndụ eluigwe, na mgbe o ‘cheere’ ruo oge ụfọdụ, ka a ga-emesịa mee ka ọ nọkwasị n’ocheeze dị ka Eze, meekwa ihe megide ndị iro nke Nna ya, bụ́ Jehova. N’ọrụ ya dị ka Eze nke eluigwe, Jisọs ahụ bụ́ Mesaịa na-emetụta ndụ nke onye ọ bụla na-adị ndụ ugbu a. N’ụzọ dị aṅaa? Isiokwu anyị ọzọ ga-atụle nke a.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Mgbe Luk 3:23 na-asị: ‘Josef, nwa Hili,’ o doro anya na ọ pụtara “nwa” n’echiche nke “ọgọ ya nwoke,” ebe Hili bụ nna mụrụ Meri.—Insight on the Scriptures, Mpịakọta nke 1, peji nke 913-917.
b Onye Juu na-akọ akụkọ ihe mere eme, bụ́ Josephus, mgbe ọ na-akọwa usoro ọmụmụ nke onwe ya, mere ka o doo anya na ihe ndekọ ndị dị otú ahụ dị adị tupu afọ 70 O.A. O yiri ka e bibiri ihe ndekọ ndị a na obodo Jerusalem, na-eme ka nzọrọ ndị malitere site n’oge ahụ banyere ịbụ Mesaịa bụrụ nke a na-apụghị ịnwapụta.
c Lee Insight on the Scriptures, Mpịakọta nke 2, peji nke 387.
d E nwere ihe àmà siri ike sitere n’akwụkwọ ndị Grik, Babilọn, na Peasia oge ochie ndị na-egosi na afọ mbụ nke ọchịchị Ataksakses bụ 474 T.O.A. Lee Insight on the Scriptures, Mpịakọta nke 2, peji nke 614-616, 900.
e N’otu n’ime amụma ndị ahụ, o buru amụma na ndị mesaịa ụgha ga-ebilite site n’ụbọchị ya gaa n’ihu. (Matiu 24:23-26) Lee isiokwu bu ụzọ.
Olee Ụzọ Ị Ga-esi Zaa?
◻ N’ihi gịnị ka a ga-eji nyochaa ihe àmà banyere ma Jisọs ọ̀ bụ Mesaịa ahụ e kwere ná nkwa?
◻ Olee ụzọ usoro ọmụmụ Jisọs si akwado ịbụ Mesaịa ya?
◻ Olee ụzọ amụma Bible dị iche iche si enye aka igosi na Jisọs bụ Mesaịa ahụ?
◻ N’ụzọ dịgasị aṅaa ka Jehova onwe ya si mesie ọbụbụ Jisọs bụ Mesaịa ike?
◻ N’ihi gịnị ka ọtụtụ ndị Juu ji jụ Jisọs dị ka Mesaịa ahụ, n’ihi gịnịkwa ka ihe ndị ahụ ji bụrụ ihe na-ezighị ezi?
[Foto dị na peeji nke 12]
Nke ọ bụla n’ime ọtụtụ ọrụ ebube Jisọs na-enyekwu ihe àmà nke ịbụ Mesaịa ya