‘M̀ Kwesịrị Ịbụ Onye E Mere Baptism?’
N’IME mkpebi nile a kpọrọ anyị ka anyị mee ná ndụ, ma eleghị anya ọ dịghị nke ọ bụla dị mkpa karịa nke a: ‘M̀ kwesịrị ịbụ onye e mere baptism?’ N’ihi gịnị ka nke ahụ ji dị oké mkpa? N’ihi na mkpebi anyị n’ihe banyere ajụjụ nke a nwere mmetụta kpọmkwem ọ bụghị nanị n’ụzọ anyị si adị ndụ ugbu a kamakwa n’ọdịmma ebighị ebi anyị.
Mkpebi nke a ọ̀ na-eche gị ihu? Ma eleghị anya, ị nọwo na-eso Ndịàmà Jehova na-amụ Bible ruo oge ụfọdụ. Ma ọ bụ ndị mụrụ gị pụrụ ịnọwo na-akụziri gị Akwụkwọ Nsọ site na nwata. Ugbu a, i ruwo ebe ị na-aghaghị ime mkpebi banyere ihe i kwesịrị ime. Ka i wee mee mkpebi ziri ezi, ọ dị mkpa ka ị ghọta ihe baptism gụnyere na onye e kwesịrị ime baptism.
Ihe Baptism Gụnyere
Dị ka ihe yiri agbamakwụkwọ, baptism bụ ememe nke na-eme ka mmekọrịta sie ike. N’ọnọdụ nke agbamakwụkwọ, nwoke na nwanyị na-eme ya azụliteworị mmekọrịta chiri anya. Ememe agbamakwụkwọ na-eme nanị ka ọha mara ihe e kwekọrịtaworo na nzuzo, ya bụ, na ha abụọ na-abanye ugbu a ná njikọ alụmdi na nwunye kpọmkwem. Ọ na-emeghekwa ihe ùgwù ndị di na nwunye ahụ ga-enwe, na-ewetakwa ibu ọrụ ndị ha na-aghaghị ibukọ ná ndụ ha.
Ọnọdụ ahụ na baptism yiritara. Ka anyị na-amụ Bible, anyị na-amụta ihe ịhụnanya ndị Jehova mewooro anyị. O nyewo anyị ọ bụghị nanị ndụ anyị na ihe nile dị anyị mkpa iji na-adị ndụ kamakwa Ọkpara ọ mụrụ nanị ya iji meghee ụzọ maka ihe a kpọrọ mmadụ na-emehie emehie iso Ya nwee mmekọrịta na inweta ndụ ebighị ebi na paradaịs elu ala. Mgbe anyị chere echiche banyere ihe ndị a nile, ọ̀ bụ na a dịghị akpali anyị ime ihe?
Gịnị ka anyị pụrụ ime? Ọkpara Chineke, bụ́ Jisọs Kraịst, na-agwa anyị, sị: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla chọrọ iso m n’azụ, ya jụ onwe ya, ma bulie osisi ịta ahụhụ ya, nọgidekwa na-eso m.” (Matiu 16:24, NW) Ee, anyị pụrụ ịghọ ndị na-eso ụzọ Jisọs Kraịst, na-agbaso ihe nlereanya ya n’ijere ọdịmma nke Nna ya, bụ́ Jehova, ozi. Otú ọ dị, iji mee otú ahụ, ọ dị mkpa anyị ‘ịjụ’ onwe anyị, ya bụ, iji afọ ofufo kpebie idebe uche Chineke n’ihu nke anyị; nke a gụnyere inyefe, ma ọ bụ ịrara ndụ anyị nye, ime uche ya. Iji mee ka a mara mkpebi afọ ofufo na nke nzuzo nke a, a na-enwe ememe ihu ọha. Baptism ime mmiri bụ ememe ahụ iji gosipụta n’ihu ọha nrara anyị raara onwe anyị nye Chineke.
Ònye Ka E Kwesịrị Ime Baptism?
Jisọs Kraịst nyere ndị na-eso ụzọ ya ntụziaka ‘ịga mee ndị nke mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ, na-eme ha baptism n’aha nke Nna na nke Ọkpara na nke mmụọ nsọ, na-ezi ha ka ha debe ihe nile o nyeworo ha n’iwu.’ (Matiu 28:19, 20) N’ụzọ doro anya, ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ nke ntozu okè nke uche na obi dị mkpa n’aka ndị ahụ a ga-eme baptism. Site n’ọmụmụ ihe onwe ha nke Okwu Chineke, ha aghọtawo mkpa ọ dị ‘ichegharị na ichigharị’ site n’ụzọ ndụ ha mbụ. (Ọrụ 3:19) Mgbe ahụ, ha ahụwo mkpa ọ dị iwere ọrụ nke izisa ozi ọma nke Jisọs Kraịst rụrụ, na-aghọ ndị na-eso ụzọ ya. Ihe ndị a nile ewerewo ọnọdụ tupu nzọụkwụ nke ime baptism.
Ì ruwo n’ọnọdụ nke a n’uto ime mmụọ gị? Ì nwere ọchịchọ ijere Chineke ozi? Ya bụrụ otú ahụ, jiri ekpere tụlee ihe ndekọ Bible nke onye ọnọzi Etiopịa, dị ka e dekọrọ n’Ọrụ Ndị Ozi isi nke 8. Mgbe a kọwara amụma ndị ahụ banyere Jisọs ahụ bụ Mesaịa nye nwoke nke a, o nyochara uche na obi ya, mgbe ahụ jụọkwa, sị: “Gịnị na-anapụ ime m baptism?” O doro anya na ọ dịghị ihe na-egbochi ya; ya mere e mere ya baptism.—Ọrụ 8:26-38.
Taa, ọtụtụ na-ajụ otu ajụjụ ahụ bụ́: “Gịnị na-anapụ ime m baptism?” Dị ka ihe si na ya pụta, e mere 300,945 ndị ọhụrụ raara onwe ha nye baptism na 1991. Nke a wetara oké ọṅụ nye ndị Jehova nile, ndị okenye nọ n’ọgbakọ na-enwekwa obi ụtọ inyere ndị ọzọ obi ha ziri ezi aka inwe ọganihu na inweta iru eru nile maka baptism.
Otú ọ dị, ọ pụrụ ịbụ na ndị okenye nọ n’ọgbakọ unu tụrụ aro ka i chere. Ma ọ bụ, ọ bụrụ na ị bụ onye ntorobịa, ndị mụrụ gị pụrụ ịgwa gị ka i chere. Mgbe ahụ, gịnị ka ị ga-eme? Enwela nkụda mmụọ. Buru n’uche na ịbanye ná mmekọrịta onwe onye nke gị na Onye Kasị Elu bụ ihe dị oké mkpa. A ghaghị idebe na ijigide ụkpụrụ ndị dị elu. Ya mere, gee ntị n’aro ndị a tụrụ ma jiri obi gị nile tinye ha n’ọrụ. Ọ bụrụ na ị ghọtachaghị ihe ndị mere e ji tụọ aro ndị ahụ, ihere emela gị, kama jụọ ajụjụ ruo mgbe ị ghọtara n’ezie nkwadebe ndị ọ dị mkpa ka i mee.
N’aka nke ọzọ, ndị ụfọdụ pụrụ ịla azụ iwere nzọụkwụ ahụ buru ibu, dị ka ha si akpọ ya. Ị̀ bụ otu onye n’ime ha? N’ezie, a pụrụ inwe ezi ihe ndị mere na ị ghaghị idebe nraranye na baptism ruo mgbe ọzọ. Ma ọ bụrụ na i ruwo eru ma ka na-ala azụ, ọ dị mma ka ị jụọ onwe gị, sị: “Gịnị na-anapụ ime m baptism?” Jiri ekpere nyochaa ọnọdụ gị ma hụ ma e nwere n’ezie ezi ihe mere ị ga-eji debe ịzaghachi n’ọkpụkpọ òkù nke Jehova ịbata ná mmekọrịta onwe onye nke gị na ya ruo mgbe ọzọ.
‘M Ka Bụ Nwatakịrị’
Ọ bụrụ na ị bụ onye na-eto eto, ị pụrụ ịdị na-eche, sị, ‘M ka bụ nwatakịrị.’ Ọ bụ ezie na ọ bụrụhaala na ndị na-eto eto nọgidere na-erube isi ma na-azaghachi n’ihe ndị Kraịst mụrụ ha na-agwa ha, na-etinye Akwụkwọ Nsọ n’ọrụ ruo n’ókè ha nwere ike, ha pụrụ inwe obi ike na Jehova na-ele ha anya dị ka ndị dị “nsọ.” N’ezie, Bible na-agwa anyị na nnwapụta Chineke nwapụtara ndị mụrụ ụmụ na-eme ezi omume na-erutere ụmụ ha ndị dabeere n’ebe ha nọ. (1 Ndị Kọrint 7:14) Otú ọ dị, ọ dịghị afọ ndụ ọ bụla e nyere na Bible dị ka mgbe ndabere nke a ga-akwụsị. Ya mere, ọ dị mkpa ka ndị Kraịst bụ́ ndị ntorobịa tụlee ajụjụ ahụ dị ka ihe dị oké mkpa, nke bụ: ‘M̀ kwesịrị ịbụ onye e mere baptism?’
Bible na-agba ndị ntorobịa ume ka ‘ha cheta Onye Keworo ha n’ụbọchị nile ha dị n’okorobịa.’ (Eklisiastis 12:1) N’ihe banyere nke a, anyị nwere ihe nlereanya nke Samuel ahụ na-eto eto, bụ́ onye “na-eje ozi n’ihu Jehova, bụrụ nwata.” E nwekwara ihe nlereanya nke Timoti, bụ́ onye sitere na nwata jiri obi ya nara eziokwu nke nne ya na nne nne ya kụziiri ya.—1 Samuel 2:18; 2 Timoti 1:5; 3:14, 15.
N’otu aka ahụ taa, ọtụtụ ndị na-eto eto ararawo ndụ ha nye ijere Jehova ozi. Akifusa, bụ́ onye dị afọ 15, kwuru na otu ihe omume e mere ná Nzukọ Ije Ozi nyeere ya aka ime mkpebi ịbụ onye e mere baptism. Ayumi mere baptism mgbe ọ dị afọ iri. Ọ chọrọ ijere Jehova ozi n’ihi na ọ hụrụ ya n’anya n’ezie. Ugbu a ọ dị afọ 13, n’oge na-adịbeghị anya, o nwere ahụmahụ nke ịhụ ka e mere onye ọ na-eduziri ọmụmụ Bible baptism, n’oge ọ dị afọ 12. E mekwara nwanne Ayumi nke nwoke ọ tọrọ, bụ́ Hikaru, baptism n’oge ọ dị afọ iri. “Ụfọdụ sịrị na m ka bụ nwatakịrị nke ukwuu,” ka o chetara, “ma Jehova maara ihe bụ mmetụta m. Ekpebisiri m ike ịbụ onye e mere baptism ozugbo m kpebiri ịrara ndụ m nye iji ihe nile m nwere jeere ya ozi.”
Ihe nlereanya ndị mụrụ ụmụ bụkwa ihe ọzọ, dị ka a pụrụ ịhụ site n’ahụmahụ nke otu nwanna nwanyị na-eto eto. Nna ya machibidoro nne ya isoro ya na nwanne ya nwoke na nwanne ya nwanyị mụọ Bible. Ọ na-eti ha ihe ma suo akwụkwọ ha ọkụ. Ma n’ihi ntachi obi na okwukwe nke onye ahụ bụ́ nne, ụmụaka ahụ pụrụ ịhụ ịdị mkpa nke ijere Jehova Chineke ozi. E mere nwa agbọghọ nke a baptism n’afọ ndụ nke 13, nwanne ya nwoke na nwanne ya nwanyị ndị ọ tọrọ gbasokwara ihe nlereanya ya.
‘Emewo M Agadi nke Ukwuu’
Onye ọbụ abụ ahụ kwuru, sị: “Ndị agadi, ha na ụmụntakịrị . . . ha too aha Jehova.” (Abụ Ọma 148:12, 13) Ee, ndị meworo agadi aghaghịkwa ịghọta mkpa ọ dị ha iguzo n’akụkụ Jehova. Otú ọ dị, ọ na-eyi ka ụfọdụ ndị meworo agadi na-ezere ime mgbanwe. Ha na-eche na “mmadụ anaghị amụ aka ekpe ná nká.” Ma, cheta na Abraham ahụ kwesịrị ntụkwasị obi dị 75 afọ mgbe Jehova gwara ya, sị: “Si n’ala gị, sikwa n’ụmụnna gị, sikwa n’ụlọ nna gị, jee nke gị ruo ala ahụ nke m ga-eme ka ị hụ ya anya.” (Ọrụ 7:3; Jenesis 12:1, 4) Mosis dị 80 afọ mgbe Jehova nyere ya ọrụ, sị: “Meekwa ka ndị m . . . si n’Ijipt pụta.” (Ọpụpụ 3:10) Ndị ikom ndị a na ndị ọzọ agbawo mkpọrọgwụ n’ụzọ ndụ ha mgbe Jehova gwara ha ka ha gosipụta ịhụnanya ha na nraranye ha nye ya. Ha alaghị azụ ịzaghachi n’òkù nke Jehova.
Gịnị banyere n’oge a? Shizumu abụwo onye okpukpe Buddha ruo 78 afọ mgbe ọ malitere ọmụmụ Bible. Ezinụlọ ya megidere ya, n’ekweghị ya ọbụna ka ọ nọrọ n’ebe obibi nke ya mụọ ihe. Mgbe nanị otu afọ gasịrị, ọ hụrụ mkpa ọ dị ịrara onwe ya nye Jehova, e mekwara ya baptism. N’ihi gịnị ka o ji mee mgbanwe ahụ? Ọ sịrị: “Ruo ọtụtụ afọ anọwo m bụrụ onye a ghọgburu n’okpukpe ụgha, achọkwara m ịnọgide na-anata eziokwu sitere n’aka Jehova ruo mgbe ebighị ebi.”
‘Nke Na-azọpụta Unu Ugbu A’
Oge na-agabiga agabiga. Ndụ a na-adị, tinyere nke gị, nọ n’ihe ize ndụ. Ọ dị ngwa ka i jiri ịdị mkpa tụlee ihe metụtara ime nrara nye Jehova na igosipụta ya site n’ime baptism ime mmiri. Pita onyeozi mesiri nke a ike site n’ikwu, sị: “Nke na-azọpụtakwa unu ugbu a . . . ya bụ baptism.” Ọ gara n’ihu ịkọwa na baptism ‘abụghị ịtụpụ unyi nke ahụ’ (mmadụ ga-emeworị nke ahụ tupu o ruo eru maka baptism) “kama ọ bụ ajụjụ nke ezi akọ na uche n’ebe Chineke nọ.”—1 Pita 3:21.
Ebe o mezuworo ihe Jehova chọrọ ya n’aka, onye ahụ na-eso ụzọ e mere baptism na-enwe ezi akọ na uche. Site n’ịnọgide na-eme ike ya nile n’ijere Jehova ozi, ọ na-enwe udo nke uche na afọ ojuju. (Jemes 1:25) Karịsịa, ọ pụrụ iji obi ike lepụ anya n’ọdịnihu gaa ná ngọzi ndị na-adịghị agwụ agwụ sitere n’aka Jehova n’ime usoro ihe ọhụrụ ahụ gaje ịbịa. Ka nke ahụ bụrụ òkè gị ka ị na-azaghachi nke ọma n’ajụjụ ahụ bụ: ‘M̀ kwesịrị ịbụ onye e mere baptism?’
[Foto dị na peeji nke 21]
Dị ka nwatakịrị, Samuel jere ozi n’ihu Jehova
[Foto dị na peeji nke 22]
Mosis dị 80 afọ mgbe Jehova nyere ya ọrụ
[Foto ndị dị na peeji nke 23]
Taa ma ndị na-eto eto ma ndị meworo agadi bụ́ ndị a na-eme baptism pụrụ ilepụ anya n’ọdịnihu gaa ná ngọzi ndị na-adịghị agwụ agwụ n’usoro ihe ọhụrụ nke Chineke