Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w92 11/1 p. 8-9
  • Ịga Shaịlo—Ụmụ Ọma na Ndị nke Ọjọọ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ịga Shaịlo—Ụmụ Ọma na Ndị nke Ọjọọ
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • O “Wee Na-eto n’Ebe Jehova Nọ”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
  • O “Wee Na-eto n’Ebe Jehova Nọ”
    Ṅomie Okwukwe Ha
  • Samuel Kwalitere Ezi Ofufe
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
  • Nwatakịrị Nke Na-ejere Chineke Ozi
    Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
w92 11/1 p. 8-9

Ihe Ndị A Hụrụ N’ala Nkwa ahụ

Ịga Shaịlo—Ụmụ Ọma na Ndị nke Ọjọọ

MGBE i chere echiche banyere obodo, obodo ukwu, na ebe dị iche iche n’Ala Nkwa ahụ, ọ̀ dị ndị ikom na ndị inyom kwesịrị ịrịba ama na-abata gị n’uche? Ma eleghị anya ọ dị otú ahụ, n’ihi na ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’ihe ndekọ Bible metụtara ndị toruworo ogo mmadụ. Ma gịnị banyere ụmụaka laa azụ n’oge ahụ? Ị̀ na-eche echiche banyere ha n’ihe ndị dị n’ebe ahụ?

Ihe e sere n’elu pụrụ inyere anyị aka ilekwasị anya n’ihe ndekọ ndị metụtara ndị ntorobịa, nke ụfọdụ n’ime ha bụ ezi ihe nlereanya maka ndị Kraịst na ndị ọzọ ndị bụ ihe nlereanya nke ịdọ aka ná ntị. Ugwu nke dị gburugburu n’etiti yiri ka ọ bụ ebe Shaịlo oge ochie dị.a

Ma eleghị anya i chetara na mgbe Israel banyere n’Ala Nkwa ahụ, ha wuru ụlọ ikwuu Chineke mbụ na Gilgal nke dị nso na Jeriko. (Joshua 4:19) Ma mgbe a na-eke ala ahụ, ụlọ ntu a dị nsọ—ebe ofufe Israel gbakwasịrị ụkwụ—ka e bufere n’ebe a na Shaịlo. (Joshua 18:1) Nke a bụ ihe dị ka 30 kilomita n’ebe ugwu Jerusalem n’ala ugwu ugwu nke Efraim. Ndị ikom na ndị inyom site n’akụkụ nile nke Israel gara Shaịlo; ìgwè ndị buru ibu pụrụ izukọta ná ndagwurugwu dị n’ebe ndịda nke ebe o yiri ka ụlọ ikwuu ahụ guzoro. (Joshua 22:12) Ị̀ pụrụ ise onyinyo nke ụmụaka na-abịa ebe a?

Ụfọdụ bịara. Ihe nlereanya kasị dị ịrịba ama anyị kwesịrị ịma banyere ya bụ Samuel na-eto eto. Ndị mụrụ ya, Elkana na Hana, bi n’obodo dị n’akụkụ ugwu ahụ n’ebe ọdịda anyanwụ. Kwa afọ ha na-aga ebe a, ma eleghị anya na-akpọrọ ụmụ ụfọdụ nke nwunye nke ọzọ Elkana nwere. E mesịa Jehova ji otu nwa nwoke, nke a kpọrọ Samuel, gọzie Hana. Mgbe oge na-aga, ndị mụrụ ya kpọtara ya ka o biri na Shaịlo ka o wee soro onye isi nchụàjà bụ Elaị jee ozi n’ụlọ ikwuu ahụ.—1 Samuel 1:1–2:11.

Nwatakịrị nwoke ahụ nwere ọrụ ndị ọ na-arụ n’ụlọ Chineke, ọ ghaghị inwewokwa ọtụtụ ohere igwuri egwu n’ugwu ndị ahụ dị nso. (1 Samuel 3:1, 15) Ụfọdụ n’ime ha dị n’ọgba n’ọgba, jupụtakwa n’osisi olive, dị ka a na-ahụ na foto dị na peji nke 9. Lee obere ụlọ nche ahụ e ji nkume wuo. Ndị ọrụ ugbo nọ nanị ha ma ọ bụ ndị na-azụ atụrụ pụrụ isi n’ụlọ nche dị otú a na-elepụ anya, ma ị pụrụ iche echiche banyere Samuel na-eto eto ka o rịgooro iji lepụkwa anya. (Tụlee 2 Ihe Emere 20:24.) Nke a ga-abụ ebe dị mma isi lepụ anya maka anụ ọhịa dị iche iche.

Laa azụ n’oge ahụ, e nwere ọtụtụ osisi karịa ka e nwere ugbu a, ọbụna oké ahịa ebe anụ ọhịa dị iche iche na-enugharị. (Joshua 17:15, 18) Anyị maara nke a site n’ihe mere mgbe Elaịsha ghọworo onye amụma bụ isi nke Chineke. Elaịsha si Jeriko na-aga Betel, ya mere ọ nọ n’ebe a, ihe dị ka kilomita iri na isii n’ebe ndịda Shaịlo. Nnabata dị aṅaa ka ndị Betel ga-enye ya, bụ́ ebe ghọworo ebe a nọ na-efe ofufe nwa ehi ọlaedo? (1 Ndị Eze 12:27-33; 2 Ndị Eze 10:29) O yiri ka ndị toruworo ogo mmadụ hà na-ewesa ndị amụma Jehova iwe, àgwà ha yikwara ka o fewo ụmụ ha.

Ndị Eze nke Abụọ 2:23, 24 na-agwa anyị na otu ìgwè ndị ntorobịa chịrị onye amụma Chineke ọchị ịkwa emo, sị: “Rịgoo, onye isi nkwọcha; rịgoo, onye isi nkwọcha!” Ná nzaghachi, Elaịsha ‘kọchara ha n’aha Jehova. Nne anụ ọhịa bear abụọ wee si n’oké ọhịa pụta, dọkaa [iri ụmụ okoro anọ na abụọ] n’ime ha.’ Anụ ọhịa bear ndị dị otú ahụ na-acha nchara nchara nke Siria pụrụ ịdị oké egwu mgbe a kpasuru ha n’ike ma ọ bụ mgbe o yiri ka e yiri ụmụ ha egwu. (2 Samuel 17:8; Ilu 17:12; 28:15) Chineke jiri ha mezuo ikpe ziri ezi ya megide ndị ahụ ledara onye nnọchianya ya anya n’ụzọ dị oké njọ, wee si otú ahụ ledaa Jehova n’onwe ya anya.

Na nwatakịrị pụrụ izute anụ ọhịa ndị dị otú ahụ n’ugwu ndị dị gburugburu Shaịlo kwesịrị inyere anyị aka ịghọta nke ọma karị okwukwe nke nne na nna Samuel gosipụtara n’ịkpọta ya ije ozi n’ụlọ ikwuu ahụ.

Onye ọzọ na-efe ezi ofufe ebuwo ụzọ gosipụta nraranye na okwukwe yiri nke ahụ—Onyeikpe bụ Jefta. O biri ná mba jupụtara n’ugwu nke Gilead n’akụkụ ọwụwa anyanwụ nke Jọdan. Site n’ịnụ ọkụ n’obi maka Jehova megide ndị Amọn bụ́ ndị iro, Jefta ṅụrụ iyi na a ga-eji ihe mbụ ọ bụla si n’ụlọ ya bịa izute ya chụọ àjà nye Jehova. Nwa ya nwanyị na-amaghị nwoke ghọrọ ihe mbụ ahụ. Ya mere ọ kpọtara nwa o nwere nanị ya n’ụlọ nsọ Chineke na Shaịlo, ebe o biri ma jee ozi n’ikwesị ntụkwasị obi ruo ọtụtụ afọ.—Ndị Ikpe 11:30-40.

Nraranye nke ikwesị ntụkwasị obi nke Samuel na nwa nwanyị Jefta gosipụtara n’ókèala Shaịlo bụ n’ezie ihe ọma dị iche n’ihe nlereanya na-adịghị mma nke 42 ndị nnupụisi ahụ kwara onye amụma Jehova emo n’otu ógbè nke a.—Tụlee 1 Ndị Kọrint 10:6, 11.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a  Maka ihe osise buru ibu karị, lee 1992 Calendar of Jehovah’s Witnesses.

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 8]

Pictorial Archive (Near Eastern History) Est.

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 9]

Pictorial Archive (Near Eastern History) Est.

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 9]

Safari Zoo, Ramat-Gan, Tel Aviv

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya