Obe—Ọ̀ Bụ Ihe Ịrịba Ama nke Iso Ụzọ Kraịst?
RUO ọtụtụ narị afọ ọtụtụ ìgwè mmadụ ana kwerewo obe dị ka ihe e ji amata Iso Ụzọ kraịst. Ma ọ̀ bụ ya n’ezie? Ọtụtụ ndị ji obi eziokwu kwere ya na-enwe nnọọ ihe ijuanya ịmụta na obe abụghị ma ọlị ihe dịịrị nanị Krisendọm. N’ụzọ megidere nke ahụ, e jiwo ya mee ihe nke ukwuu n’okpukpe ndị na-abụghị ndị Kristian gburugburu ụwa.
Dị ka ihe atụ, ná mmalite afọ ndị 1500, ka Hernán Cortés na ndị agha ya bụ “ndị Kraịst” na-akwadebe ịwakpo Alaeze Ukwu Aztec, ha bu ọkọlọtọ ndị na-akpọsa sị, “Ka anyị gbasoo ihe ịrịba ama nke Obe Dị Nsọ n’okwukwe bụ ezie, n’ihi na n’okpuru ihe ịrịba ama nke a anyị ga-emeri.” Ọ ghaghị ijuworị ha anya ịhụ na ndị iro ha bụ ndị ọgọ mmụọ na-edo obe na-adịghị iche na nke ha nsọ. Akwụkwọ bụ́ Great Religions of the World na-asị: “Cortés na ndị so ya nwere mwute n’ihi ndị Aztec ịchụ ụmụ mmadụ n’àjà na n’ihi ihe yiri ajọ nṅomi Setan ṅomiri Iso Ụzọ Kraịst: . . . na-edo ihe ịrịba ama ndị yiri obe nke chi ikuku na mmiri ozuzo nsọ.”
N’otu uche akwụkwọ akụkọ dị n’akwụkwọ akụkọ La Nación, José Alberto Furque na-ede akwụkwọ mere ka ọ pụta ìhè na n’ọkara nke abụọ nke narị afọ nke 18, a malitere “arụmụka kpụ ọkụ n’ọnụ, nke na-akpali mmasị n’etiti ndị ọkà n’ihe mgbe ochie na ndị ọkà n’ihe mgbe ochie e gwupụtara n’ala banyere mmalite na ihe ihe ịrịba ama nke ihe mkpọgbu ahụ pụtara” bụ́ nke ha na-achọta n’akụkụ ka ukwuu nke Ebe Etiti na Ọdịda America. O doro anya na ụfọdụ enwewo ịnụ ọkụ n’obi n’ichebe ọkwá nke obe dị ka ihe ịrịba ama dịịrị nanị “ndị Kraịst” nke na ha wepụtara otu echiche nke na n’ụzọ ụfọdụ, e kwusawo okwuchukwu n’America tupu mbata nke njem ụgbọ mmiri Columbus ghọrọ ihe akụkọ! Ọ dịrị mkpa ịtụfu echiche nke a na-eyitụghị eziokwu dị ka nke na-enweghị ihe mgbakwasị ụkwụ.
Ka oge na-aga, nchọpụta ndị e mekwuru n’okwu a kwụsịrị arụmụka nile dị otú ahụ. Furque na-ekwu, sị: “N’akwụkwọ òtù Smithsonian Institution bipụtara na 1893, e mere ka o doo anya na a nọworị na-edo obe nsọ . . . ogologo oge tupu nrute nke ndị Europe mbụ n’Ebe Ugwu America, bụ́ ihe nke na-emesi echiche ahụ ike . . . nke bụ na ihe ịrịba ama dị otú ahụ dịrị n’ógbè nile dị ka akụkụ nke ofufe ido ikike ndị malitere ndụ nsọ.”
Bible na-egosi na e gbughị Jisọs n’elu obe ma ọlị, kama, n’elu osisi nkịtị, ma ọ bụ stau·rosʹ. Okwu Grik nke a, nke puṭara na Matiu 27:40‚ pụtara n’ụzọ bụ isi otu ogologo osisi kwụtịsịrị akwụtị, ma ọ bụ poolu, dị ka ndị e ji eme ihe n’iwu ntọala ụlọ. Ya mere, ọ dịghị mgbe obe nọchiri anya ezi Iso Ụzọ Kraịst. Jisọs Kraịst mere ka a mata ihe ịrịba ama nke bụ ezie, ma ọ bụ “akara” nke ezi Iso Ụzọ Kraịst mgbe ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya: “Mmadụ nile ga-eji nke a mara na unu bụ ndị na-eso ụzọ m, ọ bụrụ na unu enwerịta ịhụnanya n’ebe ibe unu nọ.”—Jọn 13:35.