Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w92 12/15 p. 5-7
  • Olee Ụzọ Oziọma ahụ Pụrụ Isi Baara Gị Uru?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Olee Ụzọ Oziọma ahụ Pụrụ Isi Baara Gị Uru?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ndị Oziọma ahụ Nyeere Aka
  • Gịnị ka Akụkọ Ọma ahụ Pụtara Taa?
  • Ike nke Ozi ọma ahụ Taa
  • Ngọzi Ndị Ka Dị n’Ihu
  • “Na-ezisa Ozi Ọma nke Ezi Ihe”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2005
  • Gịnị n’Ezie Bụ Ozi Ọma Ahụ?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
  • “Ozi Ọma”
    Jiri Ọṅụ Bụkuo Jehova Abụ
  • E Nwere Ozi Ọma Mmadụ Niile Kwesịrị Ịnụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
w92 12/15 p. 5-7

Olee Ụzọ Oziọma ahụ Pụrụ Isi Baara Gị Uru?

A NA-AKWANYERE Bible ùgwù nke ukwuu maka uru ya ná nkà ihe ọmụma—ọbụna site n’aka ụfọdụ ndị na-ekweghị na Chineke. Otú ọ dị, ole na ole n’ezie na-agụ ya iji tinye ihe o kwuru n’ọrụ. Ọzọkwa, ebe ọ bụ na e dere akụkọ ọma ndị dị na ya eri ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ puku afọ abụọ gara aga, ọtụtụ ndị yiri ka ha na-ekwere na e kwesịrị ime ka o kwekọọ n’ọnọdụ ọgbara ọhụrụ, mee ka o kwesị oge a. Oziọma ahụ ọ̀ bụ ihe mgbe ochie ma ọ bụ ihe oge ya gafeworo? Ọ bụghị ma ọlị.

E nwere ndị ikom na ndị inyom, ndị na-eto eto na ndị okenye, ndị ruru ọtụtụ nde, bụ́ ndị maara na Bible bụ isi iyi bara oké uru maka enyemaka. Ọ bụ dị ka okwu mmalite nke Today’s English Version si na-agụ: “Bible abụghị nanị oké akwụkwọ ọgụgụ a ga-enwe mmasị na ya ma na-asọpụrụ; ọ bụ Akụkọ Ọma maka mmadụ dum n’ebe nile—ozi a ga-aghọta, tinyekwa n’ọrụ ná ndụ a na-adị kwa ụbọchị.”

Gịnị ka Oziọma ahụ pụtara nye gị? Ị̀ na-eji ya eme ihe dị ka ihe nduzi ná ndụ ị na-adị kwa ụbọchị? Tụlee otú akụkọ ọma ahụ si baara ụfọdụ ndị ṅara ya ntị na narị afọ nke mbụ uru na otú ụfọdụ siworo rite uru n’oge anyị.

Ndị Oziọma ahụ Nyeere Aka

N’ụbọchị Jisọs, a dọọrọ mmasị ndị mmadụ dị ka ndị ọkụ azụ na ndị nwunye na-arụ ọrụ n’ụlọ gaa n’akụkọ ọma ahụ, ha mụtakwara eziokwu banyere nzube Chineke maka mmadụ. Akụkọ ọma ahụ gbanwere ndụ ha kpam kpam, ọtụtụ mgbe wetakwara ha ntụrụndụ na-enweghị atụ. Dị ka ihe atụ, a chụpụrụ mmụọ ọjọọ ji Meri Magdalin. Zakịọs, onye bụbu onye isi ndị na-anakọta ụtụ, hapụrụ ụzọ ndụ ya nke anyaukwu. (Luk 8:2, 19:1-10) E nyeere ndị kpuru ìsì na ndị ngwụrọ aka mgbe ha bịakwutere Jisọs, onye nke na-akọwa akụkọ ọma ahụ. (Luk 17:11-19; Jọn 9:1-7) Jisọs pụrụ ikwu n’ụzọ ziri ezi, sị: “Ndị isi na-ahụ ụzọ, ndị ngwụrọ na-eje ije, a na-eme ndị ekpenta ka ha dị ọcha, ndị ntị chiri na-anụ ihe, a na-eme ndị nwụrụ anwụ ka ha si n’ọnwụ bilie, a na-ezi ndị ogbenye ozi ọma.”—Matiu 11:5.

Otú ọ dị, ụzọ akụkọ ọma ahụ si gbanwee ọtụtụ ndị ahụ ihe na-adịghị agaziri dị ka ndị mmadụ dị mkpa karịa ọgwụgwọ a gwọrọ ha. E mere ka ndị obi ha ziri ezi jupụta n’olileanya maka ọdịnihu. Ha tụkwasịrị obi ha n’Alaeze Chineke—ihe dị mma karịa ozi ọrụ ebere ọ bụla. (Matiu 4:23) E kpughị olileanya ha ihu site n’ọnwụ Jisọs. N’ịkọwa ọnọdụ ọbụna mgbe ihe ahụ merenụ gasịrị, Ọrụ Ndị Ozi 5:42 na-ekwu banyere ndị ahụ na-eso ụzọ ya, sị: “Kwa ụbọchị, n’ụlọ ukwu Chineke na n’ụlọ nke aka ha, ha adịghị ahapụ izi ihe na izisa ozi ọma Jisọs, na ọ bụ Kraịst.” Na narị afọ mbụ, ndị mmadụ n’ọtụtụ ala natara enyemaka ime mmụọ n’ihi na ha nakweere nkwusa dị otú ahụ.

Alaeze ahụ bụ akụkọ kasị mma mgbe ahụ. Ozi Alaeze ahụ ọ̀ ka bụkwa akụkọ ọma?

Gịnị ka Akụkọ Ọma ahụ Pụtara Taa?

Ọ bụrụ na ọ na-agụ gị agụụ ka e nwee ụwa nke udo na ịnọ ná ntụkwasị obi, mgbe ahụ akụkọ banyere Alaeze ahụ bụ n’ezie nke ọma. N’eziokwu, n’ụwa nke nwere ọtụtụ narị nde ndị na-adịghị erizu nri na-edozi ahụ na ndị na-anwụ n’agụụ, nwee ọrịa ndị dị ụjọ ka ha na-eyi onye ọ bụla egwu, nwee mmụba ime mpụ bụ́ nke na-akpata ụjọ, nakwa mgbasa nke ọgba aghara ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ọ bụ ezi akụkọ ọma e nwere nanị ya na nke na-adịgide adịgide. Ọ bụ olileanya e nwere nanị ya maka ezi mmeziwanye ihe.

Ọ bụ ya mere Jisọs ji buo amụma banyere ụbọchị anyị: “A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze eluigwe n’elu ụwa dum mmadụ bi, ka ọ bụrụ àmà nye mba nile; mgbe ahụ ka ọgwụgwụ ihe nile ga-erukwa.” (Matiu 24:14) A na-emezu okwu ndị a n’ụzọ dị ịrịba ama ka Ndịàmà Jehova na-akọ akụkọ ọma ahụ n’ihe karịrị 200 ala. Otu akwụkwọ ndị Katọlik, bụ́ Nova Evangelização 2000, jara Ndịàmà mma maka nke a, na-asị: “Olee ebe ka anyị na-achọta Ndịàmà Jehova? N’ọnụ ụzọ ebe obibi dị iche iche. Ijikwa bụrụ Onyeàmà nke Jehova, e wezụga ịdịrị Jehova, mmadụ ga-abụ onye àmà. Ya mere, anyị na-ahụ ka ha na-arụ ọrụ, na-ama ọkwá, na-akpọsa, ihe ha nweworo ahụmahụ ya.”

Otú ọ dị, ọ dịghị onye na-erite uru site n’akụkọ ọma ahụ n’etinyeghị mgbalị. Ọ ga-enyere nanị ndị ṅara ntị ma rubere ya isi aka. Iji gosipụta isi ihe nke a, Jisọs tụrụ ilu nke a banyere nwoke nke na-apụ ịga ghaa mkpụrụ. Ụdị ala dị iche iche mkpụrụ ahụ dara na ha nyere ihe atụ nke ụdị ọnọdụ obi dị iche iche nke ndị na-anụ akụkọ ọma ahụ na-egosipụta. Jisọs sịrị: “Mgbe onye ọ bụla nụrụ okwu alaeze eluigwe, ma ọ ghọtaghị ya, ajọ onye ahụ abịa, pụnara ihe a ghaworo n’obi ya . . . Onye a ghakwara n’ala ahụ dị mma, mmadụ a bụ onye na-anụ okwu ahụ, wee ghọta ya; onye na-amị mkpụrụ n’ezie, mịpụta, otu [narị], ọzọ [iri isii], ọzọ [iri atọ].”—Matiu 13:18-23.

Dị ka ọ dị na narị afọ mbụ, ihe ka n’ọnụ ọgụgụ mmadụ taa na-etinye mgbalị dị nta n’ịghọta akụkọ ọma ahụ. Ha adịghị aghọta isi ya, n’ihi ya kwa uru ya na-efunarị ha. Ndị ọzọ na-aghọta uru nke akụkọ ọma ahụ wee mụta ụzọ isi mee ka ndụ ha kwekọọ n’uche Chineke. N’ụzọ dị otú a a na-agọzi ha. Olee ìgwè nke i so na ya?

Ike nke Ozi ọma ahụ Taa

Ahụmahụ dị iche iche na-agba akaebe na ịghọta akụkọ ọma ahụ na-enyere ndị “na-enweghị olileanya, ndị na-amaghịkwa Chineke,” aka. (Ndị Efesọs 2:12; 4:22-24) Roberto nke si Rio de Janeiro chọrọ enyemaka. Kemgbe ọ bụ ntorobịa, o biwo ndụ rụrụ arụ, na-etinye aka n’ọgwụ ọjọọ, omume rụrụ arụ, na izu ohi. N’ikpeazụ ọ chọtara onwe ya n’ụlọ mkpọrọ. Ka ọ nọ n’ebe ahụ, Roberto so Onyeàmà bịara ime nleta mụọ Bible. O nwere ọganihu nke ukwuu n’ụzọ ime mmụọ nke na e weturu oge ọ ga-anọ n’ụlọ mkpọrọ nke ukwuu.

Mgbe a tọhapụrụ ya, Roberto zutere otu nwa agbọghọ ọ pụnaara ihe na mbụ ma jiri égbè yie ya egwu. Ya onwe ya sokwa Ndịàmà Jehova na-amụ Bible. Gịnị mere? Ihe na-esonụ bụ akụkọ nke akwụkwọ ozi kọrọ ihe ahụ merenụ: “Ha zutere onwe ha n’Ụlọ Nzukọ Alaeze nke mbụ ya mgbe mwakpo ahụ gasịrị. Nzute ahụ na-emetụ n’obi. Anya mmiri nke mmetụta uche gbara ha abụọ, ha wee makụọ dị ka nwanna nwoke na nwanna nwanyị. Ugbu a ma onye ahụ bụbu onye ohi ma onye ahụ o zuru ohi na-eto Jehova.”

Onye ọzọ, bụ́ Isabel, chọkwara enyemaka, n’ihi na a ma ya ama maka iwe ọkụ ya. O mikpuru emikpu ná mgbaasị na iri amoosu, ndị mmụọ ọjọọ na-emekpakwa ya ahụ. Ka o so Ndịàmà Jehova na-amụ Bible, ọ chọpụtara na akụkọ ọma ahụ nyeere ya aka n’ezie. Mgbe oge ụfọdụ gasịrị, ọ gbụpụrụ site ná nchịkwa nke ndị mmụọ ọjọọ wee gbanwee ụdị mmadụ ya—n’ikpeazụ na-amụta ịchịkwa iwe ya. Ugbu a ọ bụ onye Kraịst na-ekwesị ntụkwasị obi, nke a maara dị ka onye nwere obi ọma n’otú o si emeso ndị ọzọ.

Ee, akụkọ ọma ahụ abụghị ihe a na-ekwu nanị n’ọnụ. O nwere ike dị ukwuu ịgbanwe ndụ. (1 Ndị Kọrint 6:9-11) Ọ na-eme ihe karịrị nke ahụ. Ọ na-ezokwa aka ná ngọzi ndị na-abịa n’ihu.

Ngọzi Ndị Ka Dị n’Ihu

Dị ka Okwu Chineke na-ekwu, ihe ndị dị ebube dị n’ihu. Anyị ga-ahụ mmezu nke ekpere Jisọs maka Alaeze Chineke ịbịa na maka ime uche Ya n’ụwa dị ka e si eme ya n’eluigwe. (Matiu 6:10) N’isi nso, a ga-ewepụ usoro ihe dị ugbu a na ịrụ arụ ya na-egbu mgbu n’obi na ime ihe ike, gọọmenti eluigwe nke Chineke, Alaeze ya, ga-achịzi ndị nwere obi ziri ezi bụ́ ndị dị njikere ige ntị na irube isi n’akụkọ ọma ahụ.—Daniel 2:44.

A ga-enwe oké mmeziwanye ihe dị iche iche ka a na-eduzi ụmụ mmadụ na-ekwesị ntụkwasị obi inwogha ụwa ịbụ paradaịs ebe ndị dị umeala n’obi ga-ebi ruo mgbe ebighị ebi. (Abụ Ọma 37:11, 29) N’ezie, ọ bụ akụkọ ọma ná mpụ, ọrịa, ụnwụ nri, mmetọ, na agha ga-apụ n’anya ruo mgbe ebighị ebi! Ị̀ pụrụ iji uche hụ onwe gị na ezinụlọ gị ka unu na-ebi n’ụwa ọhụrụ ahụ nke udo na ahụ ike zuru okè n’enweghị egwu maka ọrịa ma ọ bụ ọnwụ?—Mkpughe 21:4.

N’ikwu eziokwu, ọtụtụ na-ele akụkọ ọma dị otú ahụ anya dị ka ihe egwuregwu ma ọ bụ nrọ. Ma ha ezighị ezi. Akụkọ ọma ahụ dabeere n’ihe àmà kasị sie ike, ọ gbanwewokwarị ndụ ọtụtụ nde mmadụ. Ya mere, ya adịla mgbe a kụdara mmụọ gị ma ọ bụrụ na ndị ọzọ ekwenyeghị.

Cheedị echiche onye maara ihe nke zụrụ ala n’ebe ka na-emepe emepe, na-ele anya irite uru site n’ego o tinyere. Ọ̀ dị onye ga-ata ya ụta n’ihi itinye ego ya n’ọrụ n’ụzọ dị otú a? Ee e. O yikarịrị ka ndị mmadụ ga-asị na o ji amamihe na-eme ihe. Mgbe ahụ, gịnị mere ị gaghị elepụ anya n’oge dị anya n’ihu n’ihe banyere Alaeze ahụ wee tinye ihe onwunwe gị, dị ka a pụrụ isi kwuo ya, n’akụkọ ọma ahụ? Ebe ọ bụ na ịnakwere akụkọ ọma ahụ pụtara nzọpụta, ọ dịghị ntinye akụ ọzọ na-eweta uru ka mma.—Ndị Rom 1:16.

Olee otú ị pụrụ isi tinye ihe onwunwe gị n’akụkọ ọma ahụ? Nke mbụ, dị njikere ịbụ onye Chineke ziri ihe. Mgbe ahụ mee ihe n’ụzọ kwekọrọ n’ihe ị mụtara. Gbasoo isi ihe ndị a chọrọ, dị ka onye amụma oge ochie bụ onye Hibru depụtara ha, sị: “Gịnị ka Jehova na-achọ n’aka gị, ma ọ bụghị nanị ime ihe e kpere n’ikpe, na ịhụ ebere n’anya, na iji obi umeala soro Chineke gị na-eje ije?” (Maịka 6:8) Ịmụ isoro Chineke na-eje ije na-ewe oge na mgbalị. Ka o sina dị, Ndịàmà Jehova, bụ́ ndị nyeere Roberto na Isabel aka, ga-enwe obi ụtọ inyere gị aka na nke a—dị ka ha nyewooro ọtụtụ nde mmadụ aka n’ọtụtụ afọ gafeworonụ.

Ka ị na-echere mmezu nke nkwa nile nke Chineke, zụlite akụ i tinyere site n’ibi ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’akụkọ ọma ahụ, na-enwe udo nke uche ma na-ewulite mmekọrịta chiri anya n’ebe Chineke nọ. Ọ dịghị ihe ga-eme akụ gị—ọ dịghị ndakpọ ọnọdụ akụ na ụba ma ọ bụ ọgba aghara ndọrọ ndọrọ ọchịchị ga-eyi ya egwu. N’ikpeazụkwa, ọ ga-ewetara gị uru dị ebube. Gịnị bụ uru ahụ? Jọn onyeozi dere, sị: “Ụwa na-agabigakwa, ya na agụụ ihe ọjọọ ya: ma onye na-eme ihe Chineke na-achọ na-anọgide ruo mgbe ebighị ebi.”—1 Jọn 2:17.

[Foto dị na peeji nke 7]

Mkpụrụ nke akụkọ ọma ahụ na-ada n’ụdị ala dị iche iche

[Ebe E Si Nweta Foto]

Garo Nalbandian

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya