Jehova, Onye Na-eme Ihe Ndị Dị Ebube
“Onye ukwu ka ị bụ, ị na-arụkwa oké orụ dị iche iche: gị onwe gị bụ Chineke, nanị gị.”—ABỤ ỌMA 86:10.
1, 2. (a) Olee otú ihe ndị mmadụ mepụtara siworo metụta ụwa? (b) Olee ebe ka anyị pụrụ ịchọta olileanya maka ihe ka mma?
MMADỤ nke oge a pụrụ itu ọnụ na ihe ndị o mepụtara dị egwu—ihe ndị na-eji ikike eletrik arụ ọrụ, ìgwè mgbasa ozi, vidio, ụgbọ ala, ụgbọ elu jet, na nkà na ụzụ kọmputa. Ihe ndị a agbanwewo ụwa ịghọ otu ógbè. Ma lee ụdị ógbè ọ bụ! Kama mmadụ nile inwe udo, ọganihu, na ụba, e ji agha ndị na-eweta ọnwụ, mpụ, iyi ọha egwu, mmetọ, ọrịa, na ịda ogbenye na-eti ihe a kpọrọ mmadụ ihe otiti. Ngwá agha nuklia e dosasịrị gburugburu ụwa, ọ bụ ezie na e belatara ọnụ ọgụgụ ha, ka pụkwara ibibi agbụrụ mmadụ. Ndị ahịa ọnwụ, ndị na-akpụ ngwa agha, nọgidere na-azụ ahịa kasị ukwuu n’elu ala. Ndị ọgaranya na-abawanye ọgaranya, ndị ogbenye na-adawanyekwa ogbenye. Ọ̀ dị onye pụrụ ịchọta ụzọ mgbapụ?
2 Ee! N’ihi na ọ dị Onye na-ekwe nkwa mgbapụta, “onye nke dị elu karịa onye dị elu,” Jehova Chineke. (Eklisiastis 5:8) O nyere mmụọ e ji dee abụ ọma ndị ahụ, bụ́ ndị na-enye nkasi obi na ndụmọdụ amamihe dị ukwuu maka oge ihe mgbu. Abụ Ọma nke 86 so n’ime ha, bụ́ nke nwere okwu e dekwasịrị n’elu ya bụ́: “Ekpere Devid.” Ọ bụ ekpere ị pụrụ ime nke gị.
Mweda n’Ala ma Dị Ebere
3. N’oge ndị a, ihe nlereanya dị aṅaa na-agba ume ka Devid bụụrụ anyị?
3 Devid dere abụ ọma nke a mgbe ọ nọ ná mweda n’ala. Anyị taa, ndị na-ebi n’oge “mgbe ikpeazụ” ndị a nke usoro ihe Setan, ‘oge ndị a dị oké egwu,’ na-eche ule ndị yiri ha ihu. (2 Timoti 3:1; leekwa Matiu 24:9-13) Dị ka anyị, Devid tara ahụhụ nchekasị na nkụda mmụọ n’ihi nsogbu ndị na-emetụta ya. Ma ọ dịghị mgbe o kwere ka ule ndị ahụ mee ka obi o ji iguzosi ike n’ihe tụkwasị Onye Okike ya ghara isi ike. O bere ákwá kwuo, sị: “Jehova, tọọ ntị gị n’ala, za m; n’ihi na onye e wedara n’ala na ogbenye ka m bụ. Debe mkpụrụ obi m; n’ihi na onye ebere ka m bụ: gị onwe gị Chineke m, zọpụta ohu gị nke na-atụkwasị obi na gị.”—Abụ Ọma 86:1, 2.
4. Olee otú anyị kwesịrị isi gosipụta obi ike anyị?
4 Obi pụrụ isi anyị ike dị ka o siri Devid na “Chineke nke nkasi obi nile,” bụ́ Jehova, ga-eche ntị ya n’ụwa wee nụrụ ekpere obi umeala ndị anyị na-ekpe. (2 Ndị Kọrint 1:3, 4) N’ịtụkwasị Chineke anyị obi kpam kpam, anyị pụrụ ịgbaso okwu ndụmọdụ Devid, bụ́: “Tụkwasị Jehova ihe o nyeworo gị dị ka ibu, ya onwe ya ga-anagidekwa gị: ọ gaghị ekwe ka e wezụga onye ezi omume n’ọnọdụ ya ruo mgbe ebighị ebi.”—Abụ Ọma 55:22.
Ịnọ Jehova Nso
5. (a) Olee otú nsụgharị ụfọdụ e leziri anya mee siworo gbazie ihie ụzọ ndị odeakwụkwọ ndị Juu? (b) N’ụzọ dị aṅaa ka abụ ọma nke 85 na 86 si bulie Jehova elu? (Lee ntụaka ala ala peji.)
5 N’Abụ Ọma nke 86, Devid jiri okwu bụ “Jehova” mee ihe ugboro 11. Lee ka ekpere Devid si bụrụ nke sitere n’ala ala obi, leekwa ka o si nọrọ Jehova nso! Iji aha Chineke eme ihe otú ahụ iji gosi ịnọ nso mesịrị ghọọ ihe na-agbakasị ndị odeakwụkwọ ndị Juu ahụ, n’ụzọ pụtakarịsịrị ìhè ndị Sopherim. Ha zụlitere egwu nkwenkwe ụgha nke iji aha ahụ mee ihe n’ụzọ na-ezighị ezi. N’ilefuru eziokwu ahụ anya nke bụ na e kewo mmadụ n’oyiyi Chineke, ha jụrụ ajụ ikwu na Chineke nwere àgwà ndị ụmụ mmadụ na-egosipụtakwa. Ya mere ná mpụta 7 n’ime 11 nke aha nsọ ahụ n’ihe odide ndị Hibru nke otu abụ ọma a, ha ji ùtú aha bụ ʼAdho-naiʹ (Onyenwenụ) dochie aha ahụ bụ́ YHWH (Jehova). Anyị pụrụ inwe ekele na New World Translation of the Holy Scriptures, dịkwa ka ọtụtụ nsụgharị ndị ọzọ e leziri anya mee, eweghachiwo aha nsọ ahụ n’ọnọdụ ya ziri ezi n’Okwu Chineke. N’ihi ya, a na-emesi mmekọrịta anyị na Jehova ike dị ka o kwesịrị.a
6. N’ụzọ dịgasị aṅaa ka anyị pụrụ isi gosi na aha Jehova bụụrụ anyị ihe dị oké ọnụ ahịa?
6 Ekpere Devid na-aga n’ihu, sị: “Meere m amara, Onyenwe anyị [“Jehova,” “NW”]; N’ihi na gị ka m na-akpọku ogologo ụbọchị nile. Mee ka mkpụrụ obi ohu gị ṅụrịa; n’ihi na o bụ gị, Onyenwe anyị [“Jehova,” “NW”], ka m na-ebuli mkpụrụ obi m nye.” (Abụ Ọma 86:3, 4) Rịba ama na Devid nọgidere na-akpọku Jehova “ụbọchị nile.” N’ezie, ọtụtụ mgbe ọ na-ekpe ekpere n’ogologo abalị, dị ka mgbe ọ gbara ọsọ ndụ gbaga n’ọzara. (Abụ Ọma 63:6, 7) N’otu aka ahụ taa, mgbe e ji ndina n’ike na mwakpo ime mpụ ndị ọzọ yie Ndịàmà Jehova egwu, ha akpọkuwo Jehova. Mgbe ụfọdụ ihe ọma ọ rụpụtara atụwo ha n’anya.b Aha Jehova dị oké ọnụ ahịa nye anyị, ọbụna dị ka ọ dị nye “Jisọs Kraịst, nwa Devid” mgbe ọ nọ n’elu ụwa. Jisọs kụziiri ndị na-eso ụzọ ya ikpe ekpere maka ido aha Jehova nsọ, meekwa ka ha mara ihe aha ahụ na-eguzo maka ya.—Matiu 1:1; 6:9; Jọn 17:6, 25, 26.
7. Ihe atụ dịgasị aṅaa ka anyị nwere nke Jehova ibuli mkpụrụ obi nke ndị na-ejere ya ozi, oleekwa otú anyị kwesịrị isi zaghachi?
7 Devid buliri mkpụrụ obi ya, onwe ya dum, nye Jehova. Ọ na-agba anyị ume imekwa otú ahụ, na-asị n’Abụ Ọma 37:5: “Kpọree ụzọ gị ruo Jehova ahụ; tụkwasịkwa ya obi, ya onwe ya ga-emekwa ya.” Ya mere a ghaghị ịza arịrịọ anyị na-arịọ Jehova ka o mee ka mkpụrụ obi anyị ṅụrịa. Ọtụtụ ndị na-ejere Jehova ozi bụ́ ndị na-eguzosi ike n’ezi ihe na-anọgide na-enweta oké ọṅụ n’ozi ya—n’agbanyeghị ihe isi ike, mkpagbu, na ọrịa. Ụmụnna anyị n’ebe ndị agha tisasịrị n’Africa, dị ka Angola, Liberia, Mozambique, na Zaire, anọgidewo na-edebe ozi Jehova n’ọnọdụ mbụ ná ndụ ha.c N’ezie o mewo ka ha ṅụrịa n’owuwe ihe ubi ime mmụọ nke bara ụba. Dị ka ha tachiworo obi, otú a ka anyị na-aghaghị ime. (Ndị Rom 5:3-5) Mgbe anyị na-atachikwa obi, a na-emesi anyị obi ike na: “Ọhụụ ahụ na-adịru mgbe a kara aka, ọ na-ekusikwara ọgwụgwụ ya ume ike . . . ọ gaghị anọ ọdụ.” (Habakuk 2:3) Site n’obi ike zuru ezu na ntụkwasị obi na Jehova, anyị pụkwara ịnọgide “na-ekusiri ọgwụgwụ ya ume ike.”
Ịdị Mma Jehova
8. Ịnọ nso dị aṅaa ka anyị pụrụ inwe n’ebe Jehova nọ, oleekwa otú o siworo gosipụta ịdị mma ya?
8 Devid rịọkwara arịrịọ ahụ na-egosi oké mmetụta: “N’ihi na gị onwe gị, Onyenwe anyị [“Jehova,” “NW”], dị mma, ị bụkwa onye na-agbaghara mmehie, ị na-abakwa ụba n’ebere n’ahụ ndị nile na-akpọku gị. Jehova, gee ntị n’ekpere m; ṅaakwa ntị n’olu arịrịọ amara m nile. N’ụbọchị mkpa m m ga-akpọku gị; n’ihi na ị ga-aza m.” (Abụ Ọma 86:5-7) “Jehova”—ugboro ugboro ịnọ nso nke òkù a na-egosipụta na-adọrọ mmasị anyị! Ọ bụ ịnọ nso nke a pụrụ ịnọgide na-azụlite site n’ekpere. Devid kpere ekpere n’oge ọzọ, sị: “Echetala mmehie nile m mehiere n’okorobịa m, ha na njehie m nile: dị ka ebere gị si dị gị onwe gị cheta m, n’ihi ịdị mma gị, Jehova.” (Abụ Ọma 25:7) Jehova bụ ịdị mma n’onwe ya—n’inye ihe mgbapụta ahụ nke Jisọs, n’igosi ndị mmehie chegharịrịnụ ebere, na n’ịwụkwasị ezi ebere ya n’isi Ndịàmà ya na-eguzosi ike n’ihe ma na-enwe ekele.—Abụ Ọma 100:3-5; Malakaị 3:10.
9. Mmesi obi ike dị aṅaa ka ndị mmehie chegharịrịnụ kwesịrị iburu n’obi?
9 Ànyị kwesịrị ịdị na-echegbu onwe anyị n’ihi njehie ndị e mere n’oge gara aga? Ọ bụrụ na anyị na-emere ụkwụ anyị ụzọ ndị guzoziri eguzozi ugbu a, a na-ebuli anyị elu mgbe anyị chetara obi ike Pita onyeozi nyere ndị chegharịrịnụ na “oge inwe ume ndụ” ga-esi n’aka Jehova bịa. (Ọrụ 3:19) Ka anyị nọrọ Jehova nso n’ekpere site n’Onye Mgbapụta anyị, Jisọs, onye kwuru n’ịhụnanya, sị: “Bịakwutenụ m, unu nile ndị na-adọgbu onwe unu n’ọrụ, ndị e bowokwara ibu dị arọ, mụ onwe m ga-emekwa ka unu zuru ike. Nyaranụ yoke nke m n’olu unu, mụtakwanụ ihe n’ọnụ m; n’ihi na abụ m onye nwayọọ na onye wedatara onwe ya ala n’obi: unu ga-ahụkwa izu ike nye mkpụrụ obi unu.” Ka Ndịàmà na-eguzosi ike n’ihe na-ekpeku Jehova ekpere taa n’aha Jisọs nke dị oké ọnụ ahịa, ha na-achọta izu ike n’ezie.—Matiu 11:28, 29; Jọn 15:16.
10. Ọnọdụ dị aṅaa dị elu ka akwụkwọ Abụ Ọma nyere ebere Jehova?
10 Akwụkwọ Abụ Ọma na-ezo aka ‘n’ebere’ Jehova ihe karịrị otu narị ugboro. Ebere dị otú ahụ bara ụba n’ezie! N’amaokwu anọ ndị mbụ, Abụ Ọma nke 118 na-akpọku ndị na-ejere Chineke ozi ikele Jehova, na-ekwughachi ugboro anọ sị, “n’ihi na ruo mgbe ebighị ebi ka ebere ya dị.” Abụ Ọma nke 136 na-emesi àgwà nke “ebere” ya nke na-adọrọ mmasị ike ugboro 26. N’ụzọ ọ bụla anyị si hie ụzọ—dịkwa ka Jemes 3:2 na-ekwukwa, “anyị nile na-asụ ngọngọ n’ọtụtụ ihe”—ka anyị dị njikere ịchọ mgbaghara Jehova, na-enwe obi ike maka ọmịiko na ebere ya. Ebere ya bụ ngosipụta nke ezi ịhụnanya ya n’ebe anyị nọ. Ọ bụrụ na anyị anọgide jiri iguzosi ike n’ihe na-eme uche Chineke, ọ ga-egosi ezi ịhụnanya ya n’inye anyị ume iji nagide ule ọ bụla.—1 Ndị Kọrint 10:13
11. Olee otú ihe ndị okenye mere pụrụ isi nye aka iwepụ mmetụta nke obi ọmụma ikpe?
11 A pụrụ inwe mgbe ndị ọzọ mere ka anyị sụọ ngọngọ. Mmetọ ná mmetụta uche ma ọ bụ n’anụ ahụ n’oge a dị na nwata emewo ka ụfọdụ na-enwe mmetụta nke obi ọmụma ikpe ma ọ bụ nke oké abaghị uru. Onye ihe dị otú ahụ mere pụrụ ịkpọku Jehova, nwee obi ike na ọ ga-aza. (Abụ Ọma 55:16, 17) Onye okenye dị obi ọma pụrụ igosipụta mmasị n’inyere onye dị otú ahụ aka ịnakwere eziokwu ahụ bụ na ọ bụghị onye ihe ahụ dabaara kpatara nsogbu ahụ. Nke ahụ gasịa, onye okenye ahụ ịdị na-akpọ na fon site n’oge ruo n’oge pụrụ inyere onye ahụ aka ruo mgbe o nwere ike n’ikpeazụ ‘ibu ibu ahụ.’—Ndị Galetia 6:2, 5.
12. Olee otú ihe mgbu siworo mụbaa, ma olee otú anyị pụrụ isi nwee ihe ịga nke ọma ịnagide ha?
12 E nwere ọtụtụ ọnọdụ ndị ọzọ na-eweta ihe mgbu bụ́ ndị ndị Jehova na-aghaghị ịgbaso mgba taa. Na-amalite n’Agha Ụwa Mbụ na 1914, oké ọdachi dị iche iche bidoro iti ụwa a ihe otiti. Dị ka Jisọs buru n’amụma, ha bụ “mmalite ihe mgbu.” Ihe mgbu amụbawo ka anyị bamiworo n’ime “ọgwụgwụ oge a.” (Matiu 24:3, 8) “Nwa oge” Ekwensu nwere na-eru oké ọgwụgwụ ya nso. (Mkpughe 12:12) “Dị ka ọdụm na-agbọ ụja” na-achọ anụ ọ ga-eri, Onye Iro ukwu ahụ na-eji aghụghọ ọ bụla ruru ya aka eme ihe iji kewapụ anyị n’ìgwè atụrụ Chineke wee bibie anyị. (1 Pita 5:8) Ma ọ gaghị agara ya nke ọma! N’ihi na, dị ka Devid, anyị hidoro ntụkwasị obi anyị kpam kpam n’otu Chineke anyị, bụ́ Jehova.
13. Olee otú ndị nne na nna na ụmụ ha pụrụ isi jiri ịdị mma Jehova mee ihe?
13 Ihe ịrụ ụka adịghị ya na Devid kụnyere n’obi nwa ya nwoke bụ Solomọn mkpa nke ịdabere n’ịdị mma Jehova. N’ihi ya, Solomọn pụrụ ịdụ ụmụ nke ya ọdụ, sị: “Tụkwasị Jehova obi gị nile, adaberekwala nghọta gị: n’ụzọ gị nile mara ya, ya onwe ya ga-emekwa ka okporo ụzọ gị nile zie ezi. Abụla onye maara ihe n’anya gị onwe gị; tụọ egwu Jehova, wee si n’ihe ọjọọ wezụga onwe gị.” (Ilu 3:5-7) Ndị nne na nna taa kwesịkwara ịkụziri ụmụntakịrị ha n’otu aka ahụ otú e si eji ntụkwasị obi kpegara Jehova ekpere na otú e si anagide mwakpo nile nke ụwa obi tara mmiri—dị ka nrụgide ndị ọgbọ n’ụlọ akwụkwọ na ọnwụnwa nile nke ime omume rụrụ arụ. Gị na ụmụ gị ibi ndụ eziokwu kwa ụbọchị pụrụ imesi ike ezi ịhụnanya maka Jehova na ndabere n’ebe ọ nọ site n’ekpere n’obi ụmụntakịrị ha.—Deuterọnọmi 6:4-9; 11:18, 19.
Ọrụ Jehova Ndị Na-enweghị Atụ
14, 15. Olee ụfọdụ n’ime ọrụ ndị na-enweghị atụ nke Jehova?
14 Site n’obi ike dị omimi, Devid sịrị: “Ọ dịghị onye dị ka gị n’etiti chi nile, Onyenwe anyị [“Jehova,” “NW”], ọ dịghịkwa ọrụ dị ka ọrụ gị nile.” (Abụ Ọma 86:8) Ọrụ nile nke Jehova dị elu, dị ebube, dịkwa egwu karịa otú mmadụ ọ bụla pụrụ iche n’echiche. Dị ka nkà mmụta sayensị ọgbara ọhụrụ hụpeteworo, elu na ala nile e kere eke—ịsa mbara ya, ịdị n’otu ya, oké ịma mma ya—abụwo ihe na-atụ n’ọnụ nke ukwuu karịa ihe ọ bụla Devid hụworo. Ma, ọbụna na a kpaliri ya ikwu, sị: “Eluigwe na-akọ nsọpụrụ Chineke; ọ bụkwa ọrụ aka ya ka mbara eluigwe na-egosi.”—Abụ Ọma 19:1.
15 E gosipụtakwara ọrụ nile nke Jehova n’ụzọ dị ebube n’otú o si debe ma kwadebe ụwa, na-eweta ehihie na abalị, oge ihu igwe dị iche iche, oge ịgha mkpụrụ na iwe ihe ubi, na ụba nke ihe obi ụtọ maka ọṅụ mmadụ n’ọdịnihu. Leekwa ụzọ dị ebube e si mee anyị ma nye anyị ihe, ka anyị wee nwee ike ịnụ ụtọ ọrụ Jehova nile gbara anyị gburugburu!—Jenesis 2:7-9; 8:22; Abụ Ọma 139:14.
16. Gịnị bụ ngosipụta kasị ukwuu nke ịdị mma Jehova, na-eduga n’ọrụ ndị ọzọ dị aṅaa na-enweghị atụ?
16 Mgbe nne na nna anyị mbụ nupụsiiri Chineke isi, na-akpalite ihe mgbu ndị na-eti elu ala ihe otiti ruo ụbọchị a, Jehova site n’ịhụnanya ya rụrụ ọrụ dị ebube n’izite Ọkpara ya n’elu ala ikwusa Alaeze Chineke na ịnwụ dị ka ihe mgbapụta maka ihe a kpọrọ mmadụ. Ma lee oké ihe dị ebube nke a bụ! Mgbe ahụ Jehova mere ka Kraịst si n’ọnwụ bilie iji ghọọ onye ọ họpụtara dị ka onye ga-eso ya abụ Eze. (Matiu 20:28; Ọrụ 2:32, 34) Site n’ụmụ mmadụ dị ebere Chineke ahọrọwokwa ndị “e kere ọhụrụ” ga-eso Kraịst chịa ọchịchị dị ka “eluigwe ọhụrụ” n’elu ọha mmadụ “ụwa ọhụrụ” nke ga-agụnye ọtụtụ nde nke ndị mmadụ e mere ka ha si n’ọnwụ bilie. (2 Ndị Kọrint 5:17; Mkpughe 21:1, 5-7; 1 Ndị Kọrint 15:22-26) Ọrụ nile nke Jehova ga-esi otú gaa n’ihu iru mmezu dị ebube! N’ezie, anyị pụrụ iti mkpu sị: “Jehova, . . . lee ka ezi ihe gị si baa ụba, nke ị tụkọbaworo nye ndị na-atụ egwu gị!”—Abụ Ọma 31:17-19.
17. Banyere ọrụ nile nke Jehova, olee otú e si na-emezu Abụ Ọma 86:9 ugbu a?
17 Ọrụ ndị Jehova na-arụ n’oge ndị a gụnyere ihe Devid kọwara n’Abụ Ọma 86:9: “Mba nile ndị i meworo ga-abịa kpọọ isiala n’ihu gị, Onyenwe anyị [“Jehova,” “NW“]; ha ga-asọpụrụkwa aha gị.” Mgbe o sisịworo n’etiti ihe a kpọrọ mmadụ kpọrọ ihe ahụ fọdụrụnụ n’ihe o kere ọhụrụ, bụ́ “ìgwè atụrụ nta” nke ndị nketa Alaeze, Jehova agawo n’ihu isi ná “mba nile” chịkọta “oké ìgwè mmadụ” nke “atụrụ ọzọ” ahụ, ọtụtụ nde ndị na-egosipụtakwa okwukwe n’ọbara Jisọs a wụfuru. Ndị a ka o wuliteworo ịbụ nzukọ na-aga n’ihu, òtù zuru ụwa ọnụ e nwere nanị ya nke ndị na-ahụ udo n’anya n’ụwa taa. N’ịhụta nke a, ìgwè ndị nọ n’eluigwe na-ada n’ala n’ihu Jehova, na-akpọsa, sị: “Ngọzi nile, na otuto nile, na amamihe nile, na ekele nile, na nsọpụrụ nile, na ike nile, na ume nile, dịrị Chineke anyị ruo mgbe nile ebighị ebi.” Oké ìgwè mmadụ ahụ na-etokwa aha Jehova, na-ejere ya ozi “ehihie na abalị,” n’olileanya nke ịlanarị ọgwụgwụ ụwa nke a na ibi ndụ ruo mgbe ebighị ebi na paradaịs elu ala.—Luk 12:32; Mkpughe 7:9-17; Jọn 10:16.
Ịdị Ukwuu Jehova
18. Olee otú Jehova siworo gosipụta na ya bụ ‘Chineke e nwere nanị ya’?
18 Ihe ọzọ Devid mere bụ ịdọrọ uche gaa n’ịbụ Chi nke Jehova, na-asị: “Onye ukwu ka ị bụ, ị na-arụkwa oké ọrụ dị iche iche: gị onwe gị bụ Chineke, nanị gị.” (Abụ Ọma 86:10) Site n’oge ochie, Jehova anọwo na-egosipụta na ya bụ, n’ezie ‘Chineke e nwere nanị ya.’ Ọ bụ Fero obi ọjọọ nke Ijipt bụ onye ji mkparị maa Mosis aka, sị: “Ònye bụ Jehova, na m ga-ege ntị n’olu ya izipụ Israel? Amaghị m Jehova.” Ma ngwa ngwa ọ mụtara ókè Jehova dịruru ukwuu! Chineke Pụrụ Ime Ihe Nile weturu chi na ndị nchụàjà nile na-eme majik ala site n’izipụ ihe otiti ndị na-eweta ọdachi, na-egbu ụmụ ndị ikom nile e bu ụzọ mụọ n’Ijipt, na-ekpochapụkwa Fero na ndị agha ya o ji eme ọnụ n’Osimiri Uhie. N’eziokwu, ọ dịghị onye dị ka Jehova n’etiti chi nile!—Ọpụpụ 5:2; 15:11, 12.
19, 20. (a) Olee mgbe a ga-abụ abụ nke Mkpughe 15:3, 4 n’ọ̀tụ̀tụ̀ ya kasị ebube? (b) Olee otú anyị pụrụ isi kere òkè n’ọrụ Jehova ọbụna ugbu a?
19 Dị ka Chineke e nwere nanị ya, Jehova agawo n’ihu ime ihe ndị dị ebube n’ịkwadebe maka ịnapụta ndị na-erube isi na-efe ya ofufe site n’Ijipt nke oge a—bụ́ ụwa Setan. O mewo ka a kpọsaa ọmụma ikpe ya sitere n’eluigwe n’ụwa nile dị ka ihe akaebe site ná mkpọsa kasị zuo ezu n’akụkọ ihe mere eme nile, si otú a na-emezu amụma Jisọs nke dị na Matiu 24:14. N’isi nso, “ọgwụgwụ” ahụ aghaghị ịbịa, mgbe Jehova ga-egosipụta ịdị ukwuu ya n’ọ̀tụ̀tụ̀ na-enweghị atụ site n’ihichapụ ajọ omume nile n’ụwa. (Abụ Ọma 145:20) Mgbe ahụ abụ Mosis na nke Nwa Atụrụ ahụ ga-eru ọ̀tụ̀tụ̀ ya kasị elu: “Ọrụ gị nile dị ukwuu dịkwa ebube, Onyenwe anyị [“Jehova,” NW] Chineke, Onye Pụrụ Ime Ihe Nile; ụzọ gị nile ziri ezi, bụrụkwa eziokwu, gị Eze nke mba nile. Ònye na-agaghị atụ egwu, Onyenwe anyị, tookwa aha gị? n’ihi na nanị gị dị ọcha n’obi.”—Mkpughe 15:3, 4.
20 Ka anyị n’akụkụ nke anyị na-anụ ọkụ n’obi n’ịgwa ndị ọzọ banyere nzube nile dị oké mma nke Chineke. (Tụlee Ọrụ Ndị Ozi 2:11.) Jehova ga-anọgide na-eme oké ihe na ndị dị ebube n’ụbọchị anyị na gaa n’ọdịnihu, dị ka isiokwu anyị na-esonụ ga-akọwa.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Otu okwu nkọwa Bible na 1874 hotara Andrew A. Bonar dị ka onye kwuru, sị: “E nwere nnọọ ọtụtụ ihe banyere ọdịdị pụrụ iche nke Chineke, aha ya dị ebube, nke e mere ka ọ pụta ìhè ná ngwụsị nke Abụ Ọma ikpeazụ [85]. Nke a pụrụ ịbụ ihe kpatara ọzọ, bụ́ ‘Ekpere Devid,’ ji sochie ya, bụ́ nke fọrọ nke nta ka o jupụtakwa n’ọdịdị nke Jehova n’ụzọ hà ka nke bu ụzọ. Isi ihe dị n’Abụ Ọma [86] nke a bụ aha Jehova.”
b Lee peji nke 28 nke mbipụta June 22, 1984, nke Teta! [Bekee] nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc. bipụtara.
c Maka nkọwa sara mbara, lee chaatị “Akụkọ Ije Ozi Afọ 1992 nke Ndịàmà Jehova Gburugburu Ụwa,” nke ga-apụta ná mbipụta Ụlọ Nche nke January 1, 1993.
Do You Recall?
◻N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji mee ekpere dị n’Abụ Ọma nke 86 nke anyị?
◻Olee otú anyị pụrụ isi nọrọ Jehova nso?
◻Olee otú Jehova si egosipụta ịdị mma ya n’ebe anyị nọ?
◻ Olee ụfọdụ n’ọrụ ndị na-enweghị atụ nke Jehova?
◻ Olee otú Jehova si bụrụ ‘Chineke e nwere nanị ya’ n’ihe banyere ịdị ukwuu?
[Foto dị na peeji nke 10]
N’ime “ụwa ọhụrụ” ahụ na-abịanụ, ọrụ ebube nile nke Jehova ga-agba akaebe maka ebube na ịdị mma ya