Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w93 1/15 p. 25-30
  • Nọrọ Na Nche Megide Ụdị Ikpere Arụsị Ọ Bụla

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Nọrọ Na Nche Megide Ụdị Ikpere Arụsị Ọ Bụla
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • E Sere Onyinyo Ikpere Arụsị nke Krisendọm
  • Ụdị Ikpere Arụsị Ndị Ọzọ
  • Zere Anyaukwu na Ọchịchọ Ọjọọ
  • Nọrọ na Nche Megide Ife Onwe Onye Dị Ka Chi
  • Nọgide na Nche!
  • N’ihi Gịnị Ka A Ga-eji Nọrọ Na Nche Megide Ikpere Arụsị?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • “Hụ Ezigbote Arụ Ha Na-akpa”
    A Maliteghachila Ife Jehova Ezigbo Ofufe
  • ‘Tụkwasị Obi Gị’ N’ụlọukwu Chineke!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • ‘Kọọ Otú Ụlọ Nsọ A Dị’
    A Maliteghachila Ife Jehova Ezigbo Ofufe
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
w93 1/15 p. 25-30

Nọrọ Na Nche Megide Ụdị Ikpere Arụsị Ọ Bụla

“Olee nkwekọ ụlọ nsọ nke Chineke na arụsị na-ekwekọ?”​—⁠2 NDỊ KỌRINT 6:⁠16.

1. Gịnị ka e sere onyinyo ya site n’ụlọ ikwuu na ụlọ nsọ nke Israel?

JEHOVA nwere ụlọ nsọ nke arụsị na-adịghị n’ime ya. A nọchiri anya ya site n’ụlọ ikwuu nke Israel nke Mosis wuru na ụlọ nsọ nke e mesịrị wuo na Jerusalem. Ihe owuwu ndị ahụ nọchiri anya ‘ezi ụlọ ikwuu ahụ,’ bụ́ oké ụlọ nsọ ime mmụọ nke Jehova. (Ndị Hibru 8:​1-⁠5) Ụlọ nsọ ahụ bụ ndokwa nke iji bịakwute Chineke n’ofufe ná ndabere nke àjà mgbapụta Jisọs Kraịst.​—⁠Ndị Hibru 9:​2-10, 23.

2. Olee ndị ghọrọ ide ná nnukwu ụlọ nsọ ime mmụọ nke Chineke, ọnọdụ dịkwa aṅaa ka oké ìgwè mmadụ nwere?

2 Onye Kraịst ọ bụla e tere mmanụ na-aghọ “ide n’ụlọ nsọ nke Chineke,” na-enweta ọnọdụ n’eluigwe. “Oké ìgwè mmadụ” nke ndị ọzọ na-efe Jehova “na-efekwa [Chineke] ofufe” n’ime ihe a nọchiri anya ya site n’ogige mpụta nke ndị Jentaịl n’ụlọ nsọ ahụ Herọd wughachiri. N’ihi okwukwe ha nwere n’àjà Jisọs, ha nwere nguzo ezi omume nke na-arụpụta ná nchebe gabiga ‘oké mkpagbu ahụ.’​—⁠Mkpughe 3:12; 7:9-⁠15.

3, 4. Gịnị ka e ji tụnyere ọgbakọ nke ndị Kraịst e tere mmanụ nọ n’elu ala, mmerụ dịkwa aṅaa ka ọ na-aghaghị izere?

3 N’ụzọ ihe atụ, e jikwa ọgbakọ nke ndị Kraịst e tere mmanụ dị n’elu ala tụnyere ụlọ nsọ ọzọ nke na-adịghị ekpere arụsị. Nye ndị dị otú ahụ ‘a kara akara site na mmụọ nsọ,’ Pọl onyeozi kwuru, sị: “E wukwara unu dị ka ụlọ n’elu ntọala nke bụ ndị ozi na ndị amụma, nke isi nkume n’ime nkuku ntọala ahụ bụ Kraịst Jisọs onwe ya; ọ bụkwa n’ime ya ka ụlọ nile ọ bụla a na-ewu n’ụlọ ahụ, ebe a na-ejikọ ha nke ọma, na-aba ụba wee bụrụ ụlọ nsọ n’ime Onyenwe anyị; onye a na-ewukọkwa unu onwe unu n’ime ya ka unu wee bụrụ ebe obibi nke Chineke n’ime mmụọ nsọ.” (Ndị Efesọs 1:13; 2:20-⁠22) Ndị 144,000 ndị a a kara akara bụ “nkume dị ndụ” nke ‘e wuru ịbụ ụlọ nke mmụọ nsọ, ka unu wee bụrụ òtù ndị nchụàjà dị nsọ.’​—⁠1 Pita 2:5; Mkpughe 7:4; 14:1.

4 Ebe ndị nchụàjà a bụ “ụlọ Chineke,” ọ dịghị ekwe ka e merụọ ụlọ nsọ nke a. (1 Ndị Kọrint 3:​9, 16, 17) “Unu na ndị na-ekweghị ekwe ekekọtala onwe unu,” ka Pọl dọrọ aka ná ntị. “N’ihi na olee nkekọ ezi omume na imebi iwu na-ekekọ? Ma ọ bụ olee nnwekọ ìhè na ọchịchịrị na-enwekọ? Ọzọ, olee nnwekọ otu olu Kraịst na Belial na-enwekọ? Ma ọ bụ olee òkè onye kwere ekwe na onye na-ekweghị ekwe na-ekerịta? Ọzọ, olee nkwekọ ụlọ nsọ nke Chineke na arụsị na-ekwekọ?” Ndị Kraịst e tere mmanụ, bụ́ ndị dịịrị ‘Jehova, Onye Pụrụ Ime Ihe Nile,’ aghaghị izere ikpere arụsị. (2 Ndị Kọrint 6:​14-⁠18) Ndị so n’oké ìgwè mmadụ aghaghịkwa izere ụdị ikpere arụsị ọ bụla.

5. N’ịmara na Jehova chọrọ ofufe a na-akpaghịrị ókè, ezi ndị Kraịst na-eme gịnị?

5 E nwere ma ụdị pụtara ìhè ma ụdị zoro ezo nke ikpere arụsị. Ee e, ikpere arụsị akwụsịghị n’ofufe nke ọtụtụ chi na chi nwanyị ụgha dị iche iche. Ọ bụ ofufe nke ihe ọ bụla ma ọ bụ onye ọ bụla e wezụga Jehova. Dị ka Ọkaaka Eluigwe na Ala, n’ụzọ ziri ezi ọ chọrọ ma kwesịkwa inweta ofufe a na-akpaghịrị ókè. (Deuteronomi 4:24) N’ịma banyere nke a, ezi ndị Kraịst na-aṅa ntị n’ịdọ aka ná ntị Akwụkwọ Nsọ megide ikpere arụsị nile. (1 Ndị Kọrint 10:7) Ka anyị tụlee ụdị ụfọdụ nke ikpere arụsị ndị ohu Jehova ga-ezere.

E Sere Onyinyo Ikpere Arụsị nke Krisendọm

6. Ihe arụ ndị dị aṅaa ka Ezikiel hụrụ n’ọhụụ?

6 Mgbe ọ nọ ná ndọta n’agha Babilọn n’afọ 612 T.O.A., Ezikiel onye amụma hụrụ ọhụụ nke ihe arụ nile nke ndị Juu si n’ezi ofufe dapụ na-eme n’ụlọ nsọ Jehova dị na Jerusalem. Ezikiel hụrụ “ihe oyiyi nke ekworo.” A hụrụ 70 ndị okenye ka ha na-amụnye ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ n’ụlọ nsọ ahụ. A hụrụ ka ndị inyom na-akwa ákwá maka otu chi ụgha. Iri ndị ikom abụọ na ise na-efekwa anyanwụ. Gịnị ka omume ndapụ n’ezi ofufe ndị a pụtara?

7, 8. ‘Ihe oyiyi nke ekworo’ pụrụ ịbụworị gịnị, n’ihi gịnịkwa ka o ji kpalie Jehova inwe ekworo?

7 E sere onyinyo nke ikpere arụsị nke Krisendọm site n’ihe arụ ndị Ezikiel hụrụ n’ọhụụ. Dị ka ihe atụ, ọ sịrị: “Lee, n’akụkụ ugwu nke ọnụ ụzọ ama nke ebe ịchụàjà ka ihe oyiyi a nke ekworo dị n’ime mbata. [Jehova Chineke] wee sị m, Nwa nke mmadụ, gị onwe gị [ị̀] na-ahụ ihe ha onwe ha na-eme? bụ́ ihe arụ nile dị ukwuu nke ụlọ Israel na-eme n’ebe a, ka m wee si n’ebe nsọ m jee n’ebe dị anya?”​—⁠Ezikiel 8:​1-⁠6.

8 Ihe oyiyi ekworo nke ikpere arụsị pụrụ ịbụworị polu dị nsọ nke na-anọchi anya chi nwanyị ụgha nke ndị Kenean lere anya dị ka nwunye nke chi ha bụ́ Beal. N’agbanyeghị ihe ihe oyiyi ahụ bụ, ọ kpaliri Jehova inwe ekworo n’ihi na o kewara ofufe a na-akpaghịrị ókè nke Israel na-enye ya ná mmebi nke iwu ya bụ: “Mụ onwe m bụ Jehova Chineke gị . . . Gị enwela chi ọzọ tinyere m. Gị emerela onwe gị arụsị a pịrị apị, ma ọ bụ oyiyi nke ụdị ọ bụla nke dị n’eluigwe n’elu, ma ọ bụ nke dị n’ụwa n’okpuru ya, ma ọ bụ nke dị na mmiri n’okpuru ụwa: gị akpọla isiala nye ha, efekwala ha ofufe: n’ihi na mụ onwe m, bụ́ Jehova Chineke gị, bụ Chineke ekworo.”​—⁠Ọpụpụ 20:​2-⁠5.

9. Olee ụzọ Krisendọm siworo kpalie Chineke inwe ekworo?

9 Ife ihe oyiyi nke ekworo ofufe n’ụlọ nsọ Chineke bụ otu n’ime oké ihe arụ ndị dị njọ nke ndị Israel si n’ezi ofufe dapụ na-eme. N’otu aka ahụ, a na-emerụ chọọchị nile nke Krisendọm site n’ihe oyiyi na onyinyo ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke nke na-ekewa ofufe a na-akpaghịrị ókè nke ha na-azọrọ na ha na-enye Onye ahụ nke ha na-asị na ha na-ejere ozi. A na-akpalikwa Chineke inwe ekworo n’ihi na ndị ụkọchukwu na-ajụ Alaeze ya dị ka nanị olileanya dịịrị ihe a kpọrọ mmadụ ma na-eme Mba Ndị Dị n’Otu ihe a na-efe efe​—⁠“ihe arụ . . . na-eguzo n’ebe nsọ,” bụ́ ebe ọ na-ekwesịghị iguzo.​—⁠Matiu 24:​15, 16; Mak 13:14.

10. Gịnị ka Ezikiel hụrụ n’ime ụlọ nsọ ahụ, oleekwa ụzọ nke a si yie ihe a rịbaworo ama na Krisendọm?

10 Mgbe ọ na-abanye n’ụlọ nsọ ahụ, Ezikiel kọrọ, sị: “Lee, ụdị nile ọ bụla nke ihe na-akpụ akpụ, na anụmanụ nke bụ ihe arụ, na arụsị nile nke ụlọ Israel, dị, akara ná mgbidi ahụ gburugburu n’ebe nile. Ma [ndị ikom iri asaa] n’ime ndị okenye nke ụlọ Israel . . . na-eguzokwa n’etiti ha, onye ọ bụla o jide ihe ya iji esure ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ n’aka ya; ísì ụtọ nke igwe ojii nke ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ a na-esure wee rịgoo.” Cheedị echiche! Ndị okenye Israel nọ n’ụlọ nsọ Jehova, na-amụnye ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ nye chi ụgha dị iche iche, nke ihe arụ ndị a pịrị apị n’ahụ mgbidi nọchiri anya ha. (Ezikiel 8:​10-⁠12) Iji wee tụnyere nke ahụ, a na-eji ụmụ nnunu na ụmụ anụ ọhịa na-ese onyinyo mba Krisendọm dị iche iche, bụ́ nke ndị mmadụ na-efe ofufe. Ọzọkwa, ọtụtụ n’ime ndị ụkọchukwu nwere ikpe ọmụma nke inye aka n’iduhie ụmụ mmadụ site n’ịkpọsa ozizi ahụ hiere ụzọ nke mmadụ ịpụta site n’ụdị ndụ anụmanụ dị ala karịa mmadụ kama ịkwado ezi ihe ndekọ Bible nke okike sitere n’aka Jehova Chineke.​—⁠Ọrụ 17:​24-⁠28.

11. N’ihi gịnị ka ndị inyom Israel si n’ezi ofufe dapụ ji na-akwa ákwá banyere Tammuz?

11 N’ụzọ mbata nke ọnụ ụzọ nke ụlọ Jehova, Ezikiel hụrụ ndị inyom Israel si n’ezi ofufe dapụ ka ha na-akwa ákwá banyere Tammuz. (Ezikiel 8:​13, 14) Ndị Babilọn na ndị Siria lere Tammuz anya dị ka chi nke ihe ọkụkụ nke na-eto n’oge udu mmiri ma na-anwụ n’oge ọkọchị. Ọnwụ ya na-egosipụta ọnwụ nke Tammuz, bụ́ nke ndị na-efe ya na-akwara ákwá kwa afọ n’oge okpomọkụ kasị ukwuu. Mgbe ihe ọkụkụ pụtaghachiri ọzọ n’oge udu mmiri, a na-eche na Tammuz esiwo n’ógbè ndị bụ mmụọ laghachi. E jiri mkpụrụ okwu mbụ dị n’aha ya nọchie anya ya, bụ́ tau oge ochie ahụ nke bụ ụdị nke obe. Nke a pụrụ ichetara anyị nke ọma banyere nsọpụrụ ikpere arụsị nke Krisendọm nwere maka obe.

12. Gịnị ka Ezikiel hụrụ ka 25 ndị ikom Israel si n’ezi ofufe dapụ na-eme, omume dịkwa aṅaa yiri nke ahụ na-ewere ọnọdụ na Krisendọm?

12 N’ime ogige nke dị n’ebe ime nke ụlọ nsọ, ihe ọzọ Ezikiel hụrụ bụ 25 ndị ikom Israel si n’ezi ofufe dapụ ka ha na-efe anyanwụ​—⁠nke bụ imebi iwu Jehova megide ikpere arụsị dị otú ahụ. (Deuteronomi 4:​15-⁠19) Ndị ahụ na-ekpere arụsị setịpụrụ alaka rụrụ arụ n’imi Chineke, ma eleghị anya nke na-anọchi anya ihe mmadụ ji bụrụ nwoke. Ka a sịkwa ihe mere na Chineke azaghị ekpere ha, ọbụna dị ka Krisendọm ga-achọ enyemaka ya n’oge “mkpagbu ukwu” ahụ, ma ọ ga-abụ n’efu. (Matiu 24:21) Otú ahụ ndị Israel ahụ si n’ezi ofufe dapụ si na-efe anyanwụ nke na-enye ìhè site n’iche azụ ha n’ụlọ nsọ Jehova, otú ahụ ka Krisendọm na-eche azụ ya n’ìhè nke sitere na Chineke, na-akụzi ozizi ụgha, na-eme amamihe ụwa ka ọ bụrụ chi a na-efe efe, na-akwadokwa omume rụrụ arụ.​—⁠Ezikiel 8:​15-⁠18.

13. N’ụzọ ndị dị aṅaa ka Ndịàmà Jehova na-esi ezere ụdị nile nke ikpere arụsị a na-ahụ n’ọhụụ nke Ezikiel?

13 Ndịàmà Jehova na-ezere ụdị nile nke ikpere arụsị a na-eme na Krisendọm, ma ọ bụ ihe Jerusalem nọchiri anya ya, dị ka Ezikiel hụrụ n’amụma. Anyị adịghị eme ihe oyiyi ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke ihe a na-efe efe. Ọ bụ ezie na anyị na-egosi nsọpụrụ maka “ndị na-achị isi” nke gọọmenti, ido onwe anyị n’okpuru ha bụ nke a kpaara ókè. (Ndị Rom 13:​1-⁠7; Mak 12:17; Ọrụ 5:29) Anyị na-enyefe nraranye nke obi anyị n’aka Chineke na Alaeze ya. Anyị adịghị eji ozizi evolushọn edochi anya Onye Okike na ihe o kere eke. (Mkpughe 4:11) Anyị adịghị asọpụrụ obe ma ọlị ma ọ bụ na-eme ka ọgụgụ isi, nkà ihe ọmụma ụwa, ma ọ bụ ụdị ọ bụla ọzọ nke amamihe ụwa bụrụ ihe a na-efe efe. (1 Timoti 6:​20, 21) Anyị na-anọkwa na nche megide ụdị ndị ọzọ nile nke ikpere arụsị. Gịnị ka ụfọdụ n’ime ihe ndị a bụ?

Ụdị Ikpere Arụsị Ndị Ọzọ

14. Ọnọdụ dị aṅaa ka ndị ohu Jehova na-ewere n’ihe banyere “anụ ọhịa” ahụ nke Mkpughe 13:1?

14 Ndị Kraịst adịghị esonyere ihe a kpọrọ mmadụ n’ime ka otu “anụ ọhịa” ihe atụ bụrụ ihe a na-efe efe. Jọn onyeozi kwuru, sị: “M wee hụ anụ ọhịa ka ọ na-esi n’oké osimiri rịgopụta, na-enwe mpi iri na isi asaa, na-ekpukwa okpueze iri n’elu mpi ya . . . Ndị nile ndị bi n’elu ụwa ga-akpọkwa isiala nye ya.” (Mkpughe 13:​1, 8) Anụ ọhịa pụrụ ịnọchi anya “ndị eze,” ma ọ bụ ike ndọrọ ndọrọ ọchịchị. (Daniel 7:17; 8:3-⁠8, 20-⁠25) Ya mere isi asaa ahụ nke anụ ọhịa ihe atụ ahụ na-anọchi anya ike ọchịchị ụwa dị iche iche​—⁠Ijipt, Asiria, Babilọn, Midia na Peasia, Gris, Rom, na Anglo-America nke jikọtara Britain na United States of America. Ndị ụkọchukwu Krisendọm na-egosi enweghị nkwanye ùgwù dị ukwuu maka Chineke na Kraịst site n’iduru ihe a kpọrọ mmadụ gaa n’ime usoro ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke Setan, bụ́ “onye isi ụwa nke a,” ihe a na-efe efe. (Jọn 12:31) Otú ọ dị, dị ka ndị Kraịst nọpụrụ iche na ndị na-akwado Alaeze, ndị ohu Jehova na-ajụ ikpere arụsị dị otú ahụ.​—⁠Jemes 1:27.

15. Olee ụzọ ndị Jehova si ele ndị a na-anụ aha ha n’ụwa anya, gịnị ka otu Onyeàmà kwuru banyere nke a?

15 Ndị Chineke na-ezerekwa ime ka ndị a na-anụ aha ha ná ntụrụndụ nakwa n’egwuregwu nke ụwa ghọọ chi a na-efe efe. Mgbe ọ ghọsịrị Onyeàmà Jehova, otu onye na-akụ egwú sịrị: “Egwú maka ntụrụndụ nakwa nke a na-agba agba pụrụ ịkpali ọchịchọ ọjọọ . . . Onye egwú ahụ na-agụ banyere obi ụtọ na ịdị nro nke ọtụtụ ndị na-ege ntị na-eche na ndị ha na-alụ enweghị. Ọtụtụ mgbe a na-eji ihe onye egwú ahụ na-agụ mara ya. Ụfọdụ ndị m maara dị ka ndị ịkụ egwú bụ ọrụ ha ejiwo n’ihi nke a ghọọ ndị ihe ha na-amasị ndị inyom. Ozugbo mmadụ mikpuru onwe ya n’echiche efu nke a, ọ pụrụ iduga n’onye ahụ ime ka onye egwú ahụ ghọọ chi a na-efe efe. Ọ pụrụ ịmalite nnọọ dị ka ihe na-adịghị njọ site na mmadụ ịrịọ ka e nye ya foto dị ka ihe ncheta. Ma ụfọdụ na-ele onye egwú ahụ anya dị ka ụdị onye ha chọrọ, sitekwa n’ịkwanyere ya ùgwù na-ekwesịghị ekwesị, ha na-eme ya ka ọ ghọọ chi. Ha pụrụ ikowe foto nke onye ahụ a na-anụ aha ya n’ahụ àjà ma malite na-eyi uwe ma na-ejikwa ejiji dị ka o si eme. Ndị Kraịst kwesịrị iburu n’uche na nsọpụrụ ofufe dịịrị nanị Chineke.”

16. Gịnị na-egosi na ndị mmụọ ozi na-eme ezi omume na-ajụ ikpere arụsị?

16 Ee, nanị Chineke ka e kwesịrị inye nsọpụrụ ofufe ma ọ bụ kpọọrọ isiala. Mgbe Jọn ‘dara n’ala ịkpọ isiala n’ihu ụkwụ mmụọ ozi’ nke gosiri ya ihe ndị juru ya anya, mmụọ ahụ e kere eke jụrụ ịnakwere ofufe n’ụzọ ọ bụla wee sị: “Lezie anya ka ị ghara ime ya: abụ m ohu ibe gị, bụrụkwa ohu ibe nke ụmụnna gị, bụ́ ndị amụma, ha na ndị na-edebe okwu nile nke akwụkwọ a: kpọọ isiala nye Chineke.” (Mkpughe 22:​8, 9) Egwu Jehova, ma ọ bụ nsọpụrụ dị omimi maka ya, na-eme ka anyị na-efe nanị ya. (Mkpughe 14:7) Otú a, ezi nsọpụrụ Chineke na-echebe anyị pụọ n’ikpere arụsị.​—⁠1 Timoti 4:8.

17. Olee ụzọ anyị pụrụ isi nọrọ na nche megide mmekọahụ rụrụ arụ nke bụ ikpere arụsị?

17 Mmekọahụ rụrụ arụ bụ ụdị ọzọ nke ikpere arụsị nke ndị ohu Jehova na-ajụ. Ha maara na “ọ dịghị onye ọ bụla nke bụ onye na-akwa iko, ma ọ bụ onye na-adịghị ọcha, ma ọ bụ onye anyaukwu, nke isi ya bụ onye na-ekpere arụsị, nwere ihe nketa n’alaeze nke Kraịst na Chineke.” (Ndị Efesọs 5:5) O metụtara ikpere arụsị n’ihi na inwe ọchịchọ maka ihe ụtọ rụrụ arụ na-aghọ ihe a na-enye ofufe. A na-etinye àgwà dị iche iche nke Chineke n’ihe ize ndụ site n’inwe ọchịchọ mmekọahụ na-ezighị ezi. Site n’iwere anya na ntị ya tụkwasị n’ihe na-akpali mmekọahụ, mmadụ na-etinye mmekọrịta ọ bụla ọ pụrụ inwe n’ebe Chineke ahụ dị nsọ, bụ́ Jehova, nọ n’ihe ize ndụ. (Aịsaịa 6:3) Mgbe ahụ, iji nọrọ na nche megide ikpere arụsị dị otú ahụ, ndị ohu Chineke aghaghị izere ihe na-akpali mmekọahụ na egwú rụrụ arụ. Ọ dị mkpa ka ha rapara n’uru ihe ime mmụọ ndị siri ike bụ́ ndị dabeere n’Akwụkwọ Nsọ, ha aghaghịkwa ịnọgide na-enwe ‘mmadụ ọhụrụ ahụ nke e kere dị ka Chineke si chọọ n’ezi omume na ịdị ọcha nke eziokwu.’​—⁠Ndị Efesọs 4:​22-⁠24.

Zere Anyaukwu na Ọchịchọ Ọjọọ

18, 19. (a) Gịnị bụ anyaukwu na ọchịchọ ọjọọ? (b) Olee ụzọ anyị pụrụ isi nọrọ na nche megide anyaukwu na ọchịchọ ọjọọ nke bụ ikpere arụsị?

18 Ndị Kraịst na-anọkwa na nche megide anyaukwu na ọchịchọ ọjọọ, bụ́ ụdị ndị yiri ikpere arụsị nke ọma. Anyaukwu bụ ọchịchọ na-adịghị mma ma ọ bụ nke gabigara ókè, ọchịchọ ọjọọ bụ inwe anyaukwu maka ihe ọ bụla nke onye ọzọ nwe. Jisọs dọrọ aka ná ntị megide ọchịchọ ọjọọ ma kwuo okwu banyere otu nwoke nwere ọchịchọ ọjọọ nke na-apụghị irite uru site n’akụ na ụba ya mgbe ọ nwụrụ, nọrọkwa n’ọnọdụ dị mwute nke ‘abụghị ọgaranya n’ebe Chineke nọ.’ (Luk 12:​15-⁠21) Pọl dụrụ ndị kwere ekwe ibe ya ọdụ n’ụzọ kwesịrị ekwesị, sị: “Meenụ ka ihe nile dị unu n’ahụ nke dị n’elu ụwa nwụọ . . . ọchịchọ ọjọọ . . . n’ihi na nke a bụ ikpere arụsị.”​—⁠Ndị Kọlọsi 3:5.

19 Ndị tinyebigara obi ha ókè n’ịhụnanya ego, nwee oké mmasị n’ihe oriri na ihe ọṅụṅụ, ma ọ bụ nwee ọchịchọ maka ike ịchị achị na-eme ọchịchọ ndị dị otú ahụ arụsị ha. Dị ka Pọl mere ka ọ pụta ìhè, onye anyaukwu bụ onye na-ekpere arụsị, ọ gaghịkwa eketa Alaeze Chineke. (1 Ndị Kọrint 6:​9, 10; Ndị Efesọs 5:5) Ya mere, a pụrụ ịchụpụ ndị e meworo baptism bụ́ ndị na-ekpere arụsị dị ka ndị anyaukwu n’ọgbakọ ndị Kraịst. Otú ọ dị, site n’iji Akwụkwọ Nsọ na-eme ihe na ikpesi ekpere ike, anyị pụrụ izere anyaukwu. Ilu 30:​7-⁠9 na-asị: “Ihe abụọ ka m rịọworo gị [Jehova Chineke]; ajụla m ha tupu mụ anwụọ: mee ka ihe efu na okwu ụgha dị anya n’ebe m nọ: enyela m ọnọdụ ogbenye ma ọ bụ akụ; mee ka m rie nri ruuru m: ka afọ wee ghara iju m, m wee gọọ agọ, sị, Ònye bụ Jehova? ma ọ bụ ka e wee ghara ịnapụ m ihe nile, m wee zuo ohi, wee were aha Chineke m mee ihe ọjọọ.” Mmụọ dị otú ahụ pụrụ inyere anyị aka ịnọ na nche megide anyaukwu na ọchịchọ ọjọọ ndị bụ ikpere arụsị.

Nọrọ na Nche Megide Ife Onwe Onye Dị Ka Chi

20, 21. Olee ụzọ ndị Jehova si anọ na nche megide ife onwe onye dị ka chi?

20 Ndị Jehova na-anọkwa na nche megide ife onwe ha dị ka chi. N’ime ụwa nke a, ọ bụ ihe a na-ahụkarị bụ́ mmadụ ime onwe ya na ọchịchọ nke onwe ya chi ọ na-efe. Ọchịchọ maka oké aha na ebube na-eme ka ọtụtụ ndị na-eme omume n’ụzọ aghụghọ. Ha chọrọ ka e mee uche ha, ọ bụghị nke Chineke. Ma anyị apụghị inwe mmekọrịta ọ bụla n’ebe Chineke nọ ma ọ bụrụ na anyị adaba n’ife onwe anyị dị ka chi site n’iji ụzọ aghụghọ na-achọ inweta ihe anyị chọrọ ma na-agbalị ime ka anyị bụrụ ndị nwe ndị ọzọ. (Ilu 3:32; Matiu 20:20-⁠28; 1 Pita 5:​2, 3) Dị ka ndị na-eso ụzọ Jisọs, anyị ajụwo ihe nzuzo nile na-eweta ihere nke ụwa.​—⁠2 Ndị Kọrint 4:​1, 2.

21 Kama ịchọ oké aha, ndị Chineke na-eme ihe kwekọrọ ná ndụmọdụ Pọl: “Ma unu na-eri ihe, ma unu na-aṅụ ihe, ma unu na-eme ihe ọ bụla, na-emenụ ihe nile ka e wee nye Chineke otuto.” (1 Ndị Kọrint 10:31) Ebe anyị bụ ndị ohu Jehova, anyị adịghị esi ọnwụ n’ụzọ nke ife onwe onye ka e mee ihe anyị chọrọ kama anyị na-eji ọṅụ eme uche Chineke, na-anakwere ntụziaka sitere n’aka “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche” ma na-akwado nzukọ Jehova n’ụzọ zuru ezu.​—⁠Matiu 24:​45-⁠47.

Nọgide na Nche!

22, 23. Olee ụzọ anyị pụrụ isi nọrọ na nche megide ụdị ikpere arụsị ọ bụla?

22 Dị ka ndị Jehova, anyị adịghị akpọ isiala n’ihu arụsị nkịtị. Anyị na-anọkwa na nche megide ụdị nzuzo nile nke ikpere arụsị. N’ezie, anyị aghaghị ịnọgide na-ezere ụdị ikpere arụsị ọ bụla. Ya mere anyị na-eme ihe kwekọrọ na ndụmọdụ Jọn: “Cheenụ onwe unu nche ka unu ghara ikpere arụsị.”​—⁠1 Jọn 5:21.

23 Ọ bụrụ na ị bụ otu n’ime ndị ohu Jehova, nọgide na-eji akọ na uche gị e ji Bible zụọ na ike nghọta gị na-eme ihe mgbe nile. (Ndị Hibru 5:14) Mgbe ahụ, ị gaghị abụ onye e merụrụ site ná mmụọ ikpere arụsị nke ụwa kama ị ga-adị ka ndị Hibru atọ ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi nakwa ndị Kraịst oge mbụ na-anọgidesi ike n’ihe. Ị ga-enye Jehova ofufe a na⁠-akpaghịrị ókè, ọ ga-enyekwara gị aka ịnọgide na-anọ na nche megide ụdị ikpere arụsị ọ bụla.

Gịnị Bụ Uche Gị?

◻ Olee ụzọ Ndịàmà Jehova si ezere ụdị nile nke ikpere arụsị a hụrụ n’ọhụụ Ezikiel?

◻ Gịnị bụ “anụ ọhịa” ahụ nke Mkpughe 13:1, ọnọdụ dịkwa aṅaa ka ndị ohu Jehova na-ewere banyere ya?

◻ N’ihi gịnị ka a ga-eji nọrọ na nche megide ime ka ndị a na-anụ aha ha ná ntụrụndụ nakwa n’egwuregwu ghọọ chi ndị a na-efe efe?

◻ Olee ụzọ anyị pụrụ isi nọrọ na nche megide ife onwe onye dị ka chi?

◻ N’ihi gịnị ka a ga-eji nọrọ na nche megide ụdị ikpere arụsị ọ bụla?

[Foto ndị dị na peeji nke 26]

Ị̀ maara ụzọ ihe arụ ndị ahụ a hụrụ n’ọhụụ Ezikiel si see onyinyo ikpere arụsị nke Krisendọm?

[Ebe E Si Nweta Foto]

Ihe osise (aka ekpe nke elu) dabeere na foto nke Ralph Crane/Bardo Museum

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya