Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w93 2/1 p. 5-7
  • Ọ̀ Dị Mgbe Ihe Ọma Ga-emeri Ihe Ọjọọ?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ọ̀ Dị Mgbe Ihe Ọma Ga-emeri Ihe Ọjọọ?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ịlụso Ihe Ọjọọ Ọgụ na Dachau
  • Imeri Ihe Ọjọọ Dị n’Ime Anyị
  • Ime Ka Ekwensu Ghara Ịdị Irè
  • “Ha Agaghị Eme Ihe Ọjọọ”
  • Gịnị Na-eme Ka Mmadụ Bụrụ Ezigbo Mmadụ ma Ọ Bụ Ajọ Mmadụ?
    Teta!—2010
  • Ihe Ọma Megide Ihe Ọjọọ—Agha Nọworo Ogologo oge
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Otú Ezi Ihe Ga-esi Merie Ihe Ọjọọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
  • “Unu Ejila Ihe Ọjọọ Akwụghachi Onye Ọ Bụla n’Ọnọdụ Ihe Ọjọọ”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
w93 2/1 p. 5-7

Ọ̀ Dị Mgbe Ihe Ọma Ga-emeri Ihe Ọjọọ?

IHE fọrọ nke nta ka ọ bụrụ puku afọ abụọ gara aga, e kpere Jisọs Kraịst, nwoke aka ya dị ọcha, ikpe maka ndụ ya. Ndị ikom ọjọọ na-eme atụmatụ ọjọọ ikpochapụ ya n’ihi na o kwuru eziokwu. E boro ya ebubo ụgha nke ịgwa ndị mmadụ okwu iji gbaa ha ume ibili megide ndị ọchịchị, ìgwè mmadụ ahụ tisikwara mkpu ike ka e gbuo ya. Onye ọchịchị Rom, bụ́ onye weere ihe ùgwù nke ọchịchị ya dị ka ihe bara uru karịa ndụ nke onye ọkwá nkà dị umeala n’obi, mara Jisọs ikpe ịnwụ ọnwụ dị ilu. N’ile ya anya n’elu elu dị ka e si ahụ ihe, o yiri ka ihe ọjọọ ò nwewo mmeri.

Otú ọ dị, n’abalị bu ụbọchị e gburu ya ụzọ, Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Mụ onwe m emeriwo ụwa.” (Jọn 16:33) Gịnị ka okwu ya pụtara? N’otu akụkụ, na ihe ọjọọ dị n’ụwa emebeghị ka o nwee mmetụta na-egbu mgbu, o mebeghịkwa ka o megwara n’otu ụzọ ahụ e si mesoo ya. Ụwa emeghị ka o yie ya n’ime ihe ọjọọ. (Tụlee Ndị Rom 12:2, Phillips.) Ọbụna mgbe ọ na-anwụ, o kpere ekpere n’ihi ndị gburu ya, sị: “Nna, gbaghara ha; n’ihi na ha amataghị ihe ha na-eme.”​—⁠Luk 23:34.

Jisọs gosipụtara​—⁠ruo mgbe ọ nwụrụ⁠—​na a pụrụ imeri ihe ọjọọ. Ọ gbara ndị na-eso ụzọ ya ume ịlụ ọgụ nke onwe ha megide ihe ọjọọ. Olee otú ha pụrụ isi mee nke ahụ? Site n’ịṅa ntị n’okwu ndụmọdụ dị n’Akwụkwọ Nsọ ka ‘a ghara inyeghachi onye ọ bụla ihe ọjọọ n’ọnọdụ ihe ọjọọ’ na ‘iwere ezi ihe merie ihe ọjọọ,’ dị ka Jisọs meworo. (Ndị Rom 12:​17, 21) Ma ụzọ dị otú ahụ ọ̀ na-arụpụta ihe?

Ịlụso Ihe Ọjọọ Ọgụ na Dachau

Else bụ nwanyị onye Germany a tụrụ mkpọrọ na Dachau, onye nyere nwa agbọghọ nta onye Russia gbara 14 afọ onyinye dị oké ọnụ ahịa, onyinye nke okwukwe na olileanya.

Dachau bụ ogige ịta ahụhụ nwere aha ọjọọ a ma ama ebe ọtụtụ puku mmadụ nwụrụ, na ebe e jiri ọtụtụ narị ndị mmadụ, tinyere nwa agbọghọ nta nke a bụ onye Russia, mee ajọ nnwale nke nkà ọgwụ. O yiri ka Dachau ọ bụ ezi ihe atụ nke ihe ọjọọ. Otú o sina dị, ọbụna n’ala dị otú ahụ nke yiri ihe na-adịghị amị mkpụrụ, ezi ihe pulitere, ọbụnakwa baa ụba.

Else nwere mmetụta ọmịiko dị ukwuu maka nwa agbọghọ nta nke a na-eto eto, bụ́ onye a manyere ikiri ndị nche SS ka ha na-edina nne ya n’ike n’obi ọjọọ. Else, n’itinye ndụ ya n’ihe ize ndụ, chọrọ ohere dị iche iche ịgwa nwa agbọghọ nta ahụ okwu banyere ihe ọma na ihe ọjọọ na banyere olileanya Akwụkwọ Nsọ maka mbilite n’ọnwụ. Ọ kụziiri ezi enyi ya ahụ ịbụ onye na-ahụ n’anya kama ịbụ onye na-akpọ asị. N’ihi Else, nwa agbọghọ onye nta Russia ahụ lanarịrị ọnọdụ ọjọọ nile nke Dachau.

Else mere ihe o mere n’ihi na ọ chọrọ ịgbaso ihe nlereanya nke Kraịst nke achọghị ọdịmma onwe onye nanị. Dị ka otu onye n’ime Ndịàmà Jehova, ọ mụtawo ịghara iji ihe ọjọọ kwụghachi n’ọnọdụ ihe ọjọọ, okwukwe ya kpalikwara ya inyere ndị ọzọ aka ime otu ihe ahụ. Ọ bụ ezie na ọ tara ahụhụ na Dachau, o nwere mmeri nke omume ọma megide ọchịchị ọjọọ. Ọ bụghịkwa nanị ya mere otú ahụ.

Paul Johnson, n’akwụkwọ ya bụ́ A History of Christianity, kwuru na “[Ndịàmà Jehova] jụrụ iso ọchịchị ndị Nazi mekọọ ihe ọ bụla bụ́ nke ha mara ikpe dị ka ihe bụ ihe ọjọọ kpam kpam. . . . Pasent iri itoolu na asaa bụkwa ndị e sogburu n’otu ụzọ ma ọ bụ n’ụzọ ọzọ.” Ọ̀ bụ mgba olileanya na-adịghị na ya? N’akwụkwọ bụ́ Values and Violence in Auschwitz, onye Poland bụ́ onye ọkà na nkà mmụta ihe banyere mmekọrịta ọha na eze bụ́ Anna Pawelczynska kwuru banyere Ndịàmà, sị: “Ìgwè nta nke a nke ndị mkpọrọ bụ ikike siri ike nke nwere echiche na-eduzi ya, ha merikwara n’agha ha megide ọchịchị Nazi.”

Otú ọ dị, nye ihe ka ọtụtụ n’ime anyị, agha bụ isi a na-ebu bụ megide ihe ọjọọ nke dị n’ime mmadụ kama ịbụ megide mmetụta ọjọọ dị iche iche ndị dị n’ezí. Ọ bụ mgba anyị na-agba n’ime onwe anyị.

Imeri Ihe Ọjọọ Dị n’Ime Anyị

Pọl onyeozi kọwara agha nke a n’ụzọ na-esonu: “Ọ bụghị ihe ọma m chọrọ ime ka m na-eme n’ezie; ọ bụ ihe ọjọọ nke m na-achọghị ime ka m na-anọgide na-eme.” (Ndị Rom 7:19, The New Testament, nke William Barclay dere) Dị ka Pọl maara nke ọma, ime ihe ọma adịghị abịa nnọọ n’onwe ya mgbe nile.

Eugenioa bụ́ nwoke na-eto eto bụ́ onye Spain, lụrụ ọgụ megide ọchịchọ ọjọọ ya ruo afọ abụọ. “M mesiri onwe m ihe ike nke ukwuu,” ka ọ na-akọwa. “Site ná mgbe m dị na nwata, enwere m omume nke ibi ndụ rụrụ arụ. Dị ka onye nọ n’agbata afọ iri na atọ na iri na itoolu, akpachapụrụ m anya na-ekere òkè n’omume nke ịdịna ụdị onwe onye, n’ikwukwa eziokwu, ụdị ndụ dị otú ahụ tọrọ m ụtọ.” Gịnị n’ikpeazụ mere ya ịchọ ime mgbanwe?

“Achọrọ m ime ihe na-atọ Chineke ụtọ, amụtakwara site na Bible na ọ nwapụtaghị ụzọ m si na-adị ndụ,” ka Eugenio kwuru. “Ya mere ekpebiri m ịghọ ụdị mmadụ dị iche, ime ihe kwekọrọ n’ụkpụrụ nduzi nke Chineke. Kwa ụbọchị m ghaghị ịlụ ọgụ megide echiche n’ezighị ezi, nke ruru unyi bụ́ nke ka na-enubata n’uche m. Ekpebisiri m ike imeri n’agha nke a, ekpekwara m ekpere mgbe nile maka enyemaka nke Chineke. Mgbe afọ abụọ gasịrị nke ka njọ gabigara, ọ bụ ezie na m ka jisikwara onwe m ike. Ma mgba ahụ bara uru. Enwere m ùgwù onwe onye ugbu a, alụmdi na nwunye dị mma, na, karịsịa ihe nile, mmekọrịta dị mma nke mụ na Chineke. Amaara m site n’ahụmahụ nke onwe onye na a pụrụ iwezụga echiche ọjọọ tupu ha amịa mkpụrụ​—⁠ma ọ bụrụ na i mee mgbalị n’ezie.”

Ihe ọma na-emeri ihe ọjọọ mgbe ọ bụla a jụrụ echiche ọjọọ, mgbe ọ bụla anyị jụrụ iji ihe ọjọọ kwụghachị n’ọnọdụ ihe ọjọọ. Ma, n’agbanyeghị otú mmeri ndị dị otú a dịruru na mkpa, hà adịghị ewepụ isi iyi abụọ bụ isi nke ihe ọjọọ. N’agbanyeghị otú anyị meruru ná mgbalị, anyị apụghị imericha adịghị ike nile anyị ketara eketa, Setan ka nọkwa na-enwe ikike ọjọọ n’elu ihe a kpọrọ mmadụ. Ya mere ọnọdụ a ọ̀ dị mgbe ọ bụla ọ ga-agbanwe?

Ime Ka Ekwensu Ghara Ịdị Irè

Ikwesi ntụkwasị obi Jisọs ruo ọnwụ bụ mmeri dị ukwuu e meriri Setan. Ekwensu dara ná mgbalị ya imebi ịnọgidesi ike n’ezi ihe nke Jisọs, ọdịda ahụ kakwara akara mmalite nke ọgwụgwụ nke Setan. Dị ka Bible na-akọwa, Jisọs detụrụ ọnwụ ire ka o “site n’ọnwụ mee ka onye ahụ ghara ịdị irè . . . ya bụ ekwensu.” (Ndị Hibru 2:14) Ka mbilite n’ọnwụ ya gasịrị Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “E werewo ike nile dị n’eluigwe na n’elu ụwa nye m.” (Matiu 28:18) A ga-ejikwa ike nke a mee ihe iji mebie ọrụ nile nke Setan.

Akwụkwọ Mkpughe na-akọwa ụbọchị ahụ mgbe Jisọs ga-achụpụ Setan site n’eluigwe. Onye Isi ome ihe ọjọọ nke a, tinyere ndị mmụọ ọjọọ ya, bụ ndị a ga-akpaara ókè ịnọ na gburugburu elu ala ebe a. Dị ka ihe si na ya pụta, Bible na-adọ aka ná ntị na ihe ọjọọ ga-ejupụta: “Ahụhụ ga-adịrị ụwa na oké osimiri: n’ihi na ekwensu arịdakuruwo unu, na-enwe oké ọnụma, ebe ọ matara na o nwere nanị nwa oge.”​—⁠Mkpughe 12:​7-9, 12.

Amụma Bible na-egosi na ihe omume nke a dị mkpa ewereworịị ọnọdụ​—⁠n’ihe dị ka n’oge Agha Ụwa Mbụ.b Nke ahụ na-eme ka a ghọta ihe mere e ji nwee ịba ụba a rịbara ama nke ihe ọjọọ anyị hụworo n’oge anyị. Ma n’oge na-adịghị anya a ga-egbochi Setan kpam kpam ime ihe ọ bụla nke na ọ pụghịkwa ọzọ inwe ike n’ahụ onye ọ bụla ọzọ.​—⁠Lee Mkpughe 20:​1-⁠3.

Gịnị ka ihe a nile ga-apụta nye ihe a kpọrọ mmadụ?

“Ha Agaghị Eme Ihe Ọjọọ”

Dị ka Eze nke Alaeze Chineke, Jisọs n’oge na-adịghị anya ga-eji ‘ike ya n’elu ala’ mee ihe n’ịhazi ihe omume nke ozizi ihe ime mmụọ nke e ziri ọzọ. “Ezi omume ka ndị bi n’elu ụwa dum mmadụ bi mụtaworo.” (Aịsaịa 26:9) Abamuru ya dị iche iche ga-abụ ihe doro onye ọ bụla anya. Bible na-emesi anyị obi ike, sị: “Ha agaghị eme ihe ọjọọ, ha agaghị ebibikwa . . . n’ihi na ihe ọmụma Jehova ga-ejupụta ụwa, dị ka mmiri si ekpuchi oké osimiri.”​—⁠Aịsaịa 11:9.

Ọbụna ugbu a, a pụrụ imerị ọtụtụ n’ime nchepụta ọjọọ anyị. Mgbe a na-enweghịkwa ikike ndị mmụọ ọjọọ ọzọ, n’ezie ọ ga-adị nnọọ ezi mfe karị ‘isi n’ihe ọjọọ wezụga onwe onye, meekwa ezi ihe.’​—⁠1 Pita 3:11.

Anyị nwere ezi ihe mere anyị ga-eji nwee obi ike na ihe ọma ga-emeri ihe ọjọọ n’ihi na Chineke dị mma, sitekwa n’enyemaka ya ndị ahụ chọrọ ime ihe ọma pụrụ imeri ya, dị ka Jisọs gosipụtara site n’ihe nlereanya nke onwe ya. (Abụ Ọma 119:68) Ndị ahụ nwere ọchịchọ ịlụ ọgụ megide ihe ọjọọ ugbu a pụrụ ịtụ anya ibi ndụ n’ime ụwa nke e mere ka ọ dị ọcha, bụ́ nke Alaeze Chineke ga-achị, ọchịchị kwere nkwa ikpochapụ ihe ọjọọ ruo mgbe nile. Onye ọbụ abụ na-akọwa ihe si na ya pụta, sị: “Ebere na eziokwu ezutewo; ezi omume na udo esutuwo ọnụ. Eziokwu na-epu epu n’ala; ezi omume esiwokwa n’eluigwe lepụ anya.”​—⁠Abụ Ọma 85:​10, 11.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a  Ọ bụghị ezi aha ya.

b  Maka inwetakwu ihe ọmụma lee peji 20-⁠22 nke akwụkwọ bụ́ Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya