Ọkụ Ala Mmụọ—Ọ̀ Na-enwusi Ike Ka Ọ̀ Na-anyụlata Anyụlata?
ONYE Protestant na-ekwu okwuchukwu bụ́ Jonathan Edwards na-eji ihe osise ndị pụtara ìhè nke hell na-etinye egwu n’obi ndị America ahụ a Na-achị Achị na narị afọ nke 18. N’otu oge, ọ kọwara otu ihe omume nke ọ bụ n’ime ya ka Chineke ṅara ndị mmehie n’ọkụ dị ka ududo a kpọrọ asị. Edwards baara ndị ọgbakọ ya mba, sị: “Gị onye mmehie, ị kwụ n’eriri dị tịgị tịgị, nke ire ọkụ nke iwe Chineke na-enwu gburugburu ya, ma dịrị njikere mgbe nile iretụ ya, ma rebie ya abụọ.”
Otú ọ dị, n’oge na-adịghị anya mgbe Edwards kwusịrị ajọ okwuchukwu nke a, okwukwe e kwere n’ozizi ọkụ ala mmụọ malitere ịdalata.a Akwụkwọ bụ́ The Decline of Hell, nke D. P. Walker dere, na-ekwu na “ka ọ na-erula iri afọ nke anọ nke narị afọ nke 18, a na-ama ozizi nke ntaramahụhụ ebighị ebi maka ndị a mara ikpe aka n’ihu ọha.” Na narị afọ nke 19, ọkụ na-enwu enwu nke hell gara n’ihu na-anyụlata, mgbe ọ na-erulekwa ọkara nke narị afọ nke 20, echiche Edwards nke hell dị ka ‘ọkụ na-enwu enwu ebe a na-enye ndị nọ n’ime ya oké ahụhụ n’uche ha na n’ime ahụ ha ruo mgbe ebighị ebi’ kwụsịrị ịbụ isiokwu e ji ekwu okwu. “N’ịbụ nke amamihe ọgbara ọhụrụ wakwasịrị na nke ire ọkụ Hiroshima na Oké Mgbukpọ ahụ karịrị n’ịdị njọ,” ka onye nta akụkọ bụ́ Jeffery Sheler na-ekwu, “nkọwa dị iche iche a na-enye hell adịghịzi atụ egwu dị ka ọ na-atụbu.”
Ọtụtụ ndị nkwusa atụfuwokwa mmasị ha nwere maka ọkụ na brimstone. Okwuchukwu ndị na-ada ụda banyere ihe egwu dị iche iche nke hell pụrụ site n’okwu na-atọ ụtọ n’elu pọlpit nke chọọchị ndị a ma ama nke Krisendọm. Nye ihe ka ọtụtụ ná ndị ọkà mmụta okpukpe, hell ghọrọ isiokwu nke oge ya gabigaworo nke ukwuu ịbụ ihe a ga-amụsi ike. Afọ ole na ole gara aga otu onye na-ede akụkọ ihe mere eme nke chọọchị na-eme nnyocha maka otu ihe ọ ga-akụzi na mahadum banyere hell, o wee tụlee ntụaka isiokwu dị iche iche nke akwụkwọ ọkà mmụta dị iche iche. Ọ pụghị ịhụ ọbụna otu ịhụ e dere ihe banyere ya. Dị ka magazin bụ́ Newsweek kwuru, onye ahụ na-ede akụkọ ihe mere eme kwubiri, sị: “Hell pụrụ n’anya. Ọ dịghịkwa onye matara.”
Mbịaghachi nke Hell
Pụọ n’anya? Ọ dịchaghị otú ahụ. N’ụzọ na-atụ n’anya, n’oge ndị na-adịbeghị anya ozizi nke hell apụtakwala ọzọ n’ebe ụfọdụ. Ajụjụ ọnụ a jụrụ n’America na-egosi na ọnụ ọgụgụ ndị sị na ha kwenyere na hell rịrị elu site na 53 pasent na 1981 ruo 60 pasent na 1990. Gbakwụnyere nke a mmụba zuru ụwa ọnụ nke òtù ndị na-ekwusa banyere hell, ọ na-aghọkwa ihe pụtara ìhè na mbịaghachi siri ike hell bịaghachiri n’echiche Krisendọm bụ ihe omume zuru ụwa ọnụ n’ezie.
Ma ntụteghachi nke a ọ̀ na-emetụta nanị ndị aghasa chọọchị, ka ò ruwokwa n’ebe ndị ụkọchukwu nọ? Nke bụ eziokwu bụ na ọkụ ala mmụọ dị ka Jonathan Edwards si kwusaa ya 250 afọ gara aga apụbeghị mgbe ọ bụla n’etiti ụfọdụ n’ime ndị ndú nke Krisendọm na-adịghị achọ mgbanwe. Na 1991, akwụkwọ bụ́ U.S.News & World Report kwuru, sị: “Ọbụna n’etiti òtù okpukpe ndị na-anabata echiche ndị si n’ebe ọzọ, e nwere ihe àmà na ndị ọkà mmụta okpukpe na-amalite ichesi echiche ike karị banyere echiche nke hell karịa ka ha meworo n’ọtụtụ iri afọ.” N’ụzọ doro anya, mgbe ọtụtụ afọ nke nleghara anya gasịrị, ọkụ ala mmụọ bụkwa nke a maara ọzọ ma na-ewere n’ihe dị mkpa gburugburu ụwa. Otú ọ dị, ọdịdị dị iche iche nke inwu ọkụ ya hà ka dị na ya?
Ajụjụ Ndị A Jụrụ
Onye ọkà mmụta okpukpe bụ W. F. Wolbrecht enweghị ihe ịrụ ụka ọ bụla: “Hell bụ hell, ọ dịghịkwa ọchịchọ ma ọ bụ echiche ọ bụla nke mmadụ ga-eme ka ọ ghara ịbụkwa amamikpe ebighị ebi.” Ọtụtụ ndị na-aga chọọchị ejichaghị n’aka. Ọ bụ ezie na ha adịghị arụ ụka banyere ịdị adị nke hell, ha nwere ajụjụ dị iche iche banyere ọdịdị nke hell. Onye ọkà mmụta okpukpe ọzọ na-ekweta, sị: “Nyekwa mụ onwe m, hell bụ ihe dị adị nke a na-adịghị arụ ụka, nke a kpọsara n’ụzọ doro anya n’ime ihe àmà nke Bible, ma ihe bụ ọdịdị ya kpọmkwem bụ ihe mgbagwoju anya.” Ee, nye ọnụ ọgụgụ na-aba ụba nke ndị ọkà mmụta okpukpe na ndị aghasa chọọchị, ajụjụ dị taa abụghịzi, “Hell ọ dị?” kama, “Gịnị ka hell bụ?”
Olee otú ị ga-esi zaghachi? Gịnị ka a gwaworo gị banyere ọdịdị nke hell? N’ihi gịnịkwa ka ozizi nke a ji enye ezi ndị Kraịst nsogbu?
Ihe atụ Doré nke Ekwensu na Virgil maka Divine Comedy nke Dante
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Na July 8, 1741, Edwards kwuru okwuchukwu bụ́ “Ndị Mmehie n’Aka Chineke Iwe Ji.”
[Ebe e si Nweta Foto dị na peeji nke 2]
Foto dị n’ihu: Ihe atụ Doré nke Ọgba Aghara na Mgbapụ Maka Divine Comedy nke Dante
[Ebe e si Nweta Foto dị na peeji nke 3]
Ihe atụ Doré nke Ekwensu na Virgil maka Divine Comedy nke Dante