Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w93 4/15 p. 31
  • Ị̀ Na-echeta?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ị̀ Na-echeta?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Baptizim Gị Pụtara
    Fee Onye Nanị Ya Bụ Ezi Chineke ahụ Ofufe
  • Ndị Kraịst Na-efe Ofufe n’Ime Mmụọ na n’Eziokwu
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
  • Geraịzim—‘N’elu Ugwu A Ka Anyị Fere Ofufe’
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Iji Obi Dị n’Otu Na-eje Ije
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
w93 4/15 p. 31

Ị̀ Na-echeta?

Ì jiwo nlezianya cheba echiche ná mbipụta ndị na-adịbeghị anya nke Ụlọ Nche? Ọ bụrụ otú ahụ, ma eleghị anya ị ga-ahụ ya dị ka ihe na-adọrọ mmasị icheta ihe ndị na-esonụ:

▫ Gịnị bụ “ihe ịrịba ama banyere ezi ihe” nke Jehova na-arụzuru ndị na-eso nzọụkwụ Jisọs? (Abụ Ọma 86:17) Ọ bụ “ọṅụ nke mmụọ nsọ” mere ka ndị Kraịst oge mbụ sie ike ịtachi obi n’ụdị dị iche iche nke mkpagbu ndị na-adakwasị ha. (1 Ndị Tesalọnaịka 1:6) Ọ bụ otu ihe ahụ taa, ọ dịkwa Jehova, bụ́ Onye Na-enye “ezi onyinye ọ bụla na ihe ọ bụla zuru okè” ụtọ “iwere karị mmụọ nsọ nke ukwuu nye ndị na-arịọ ya.” (Jemes 1:17; Luk 11:13) Ya mere ọ bụ ọṅụ nke mmụọ nsọ na-arụzuru ndị na-eso ụzọ Jisọs “ihe ịrịba ama banyere ezi ihe.”​—⁠12/15, peji nke 18-⁠19.

▫ N’ihi gịnị ka o ji dị anyị mkpa ịnakwere echiche Chineke banyere ịgha ụgha? Abụ Ọma 5:6 na-ekwu na Chineke “ga-eme ka ndị nile na-ekwu okwu ụgha laa n’iyi.” Mkpughe 21:8 kwukwara na ọdịnihu ndị ụgha nile bụ “ọnwụ nke abụọ ahụ.” N’ihi ya, ịnakwere echiche Chineke banyere ịgha ụgha na-enye anyị ihe siri ike mere anyị ga-eji na-ekwu eziokwu wee si otú a nata onyinye ya nke ndụ.​—⁠12/15, peji nke 23.

▫ Gịnị mejupụtara ụdị ofufe nke ndị Sameria? (Jọn 4:20) Ndị Sameria, n’ofufe ha a gwagburu agwagbu, nakweere akwụkwọ ise ndị mbụ nke Mosis, bụ́ Pentateuch, dị ka Akwụkwọ Nsọ. N’ihe dị ka na narị afọ nke anọ T.O.A. ha wuru otu ụlọ nsọ n’Ugwu Geraịzim, n’ịma ụlọ nsọ Chineke nke dị na Jerusalem aka. Ọ bụ ezie na e bibiri ụlọ nsọ nke ndị Sameria, ruo taa ha na-eme ememe Ngabiga kwa afọ n’elu Geraịzim.​—⁠1/1, peji nke 25.

▫ À chọrọ n’aka ndị Kraịst ịkwalite ihe omume dị iche iche nke imegide mmetọ ma ọ bụ idebe mbara ụwa ọcha? Mgbe ọ nọ n’elu ụwa, Jisọs anwaghị idozi nsogbu nile metụtara ọha mmadụ n’ụbọchị ya. Mgbe Jehova site n’Alaeze Mesaịa ya ga-etinye ụkpụrụ ezi omume ya n’ọrụ n’ụzọ zuru ụwa nile ọnụ, a ga-egbo mkpa gburugburu ebe obibi n’ụzọ na-adịgide adịgide. N’ihi ya, Ndịàmà Jehova na-ele ya anya n’ụzọ kwesịrị ekwesị. Ịhụnanya maka ndị agbata obi na-akpali ha ịkwanyere ihe onwunwe nke ndị ọzọ ùgwù, ma n’ụzọ ziri ezi ha na-edebe nkwusa nke ozi Alaeze Chineke n’ọnọdụ mbụ. (Matiu 6:33)​—⁠1/1, peji nke 31.

▫ N’ụzọ ndị dị aṅaa ka Jisọs jere ozi dị ka onye na-enye ìhè? (Jọn 8:12) Jisọs tinyere uche ya n’ikwusa ozi ọma nke Alaeze Chineke. (Luk 4:43; Jọn 18:37) O kpughekwara ụgha nke okpukpe wee si otú a mee ka ndị ahụ e ji n’agbụ nke okpukpe nwere onwe ha n’ụzọ ime mmụọ. (Matiu 15:​3-⁠9) N’ụzọ pụtara ìhè, o gosipụtara na ya bụ ìhè nke ụwa site n’ịtọgbọ ndụ mmadụ ya zuru okè dị ka ihe mgbapụta. (Matiu 20:28; Jọn 3:16)​—⁠1/15, peji nke 10-⁠11.

▫ Olee ụfọdụ n’ime ihe ndị mere anyị ji jide Jehova Chineke ụgwọ nke ido onwe anyị n’okpuru ya? Jehova bụ Ọkaaka nke Eluigwe na Ala, n’ihi nke a kwa anyị ji ya ụgwọ ido onwe anyị n’okpuru ya. Ọzọkwa, ebe ọ bụ na Jehova bụ onye pụrụ ime ihe nile, ọ dịghị onye pụrụ inwe ihe ịga nke ọma n’iguzogide ya, ya mere anyị apụghị ileghara ido onwe anyị n’okpuru ya anya. E kere ihe nile e kere eke nwere ọgụgụ isi imezu nzube nke Onye Mere ha, nke a kwa na-eme ka mmadụ nile nwee ibu ọrụ nke ido onwe ha n’okpuru Chineke n’ihe nile.​—⁠2/1, peji nke 10-⁠11.

▫ Gịnị nyeere Josef aka iguzogide isoro nwunye Pọtịfa kwaa iko? Josef nwere ike dị ukwuu na-akpali uche ya. Mmekọrịta nke ya na Jehova dị ya mkpa, ọ ghọtakwara na omume nke ịkwa iko ga-abụ ime mmehie ọ bụghị nanị megide di nwanyị ahụ, kama, nke ka mkpa megide Chineke.​—⁠2/15, peji nke 21.

▫ Gịnị ka Jisọs bu n’uche mgbe ọ sịrị: “Mụ onwe m bụ . . . eziokwu”? (Jọn 14:6) Jisọs ekwughị nanị eziokwu ma kụzie ya; o biri ndụ eziokwu ma gosipụta ya ná ndụ ya. Otú a, Iso Ụzọ Kraịst abụghị nanị echiche; ọ bụ ụzọ nke ndụ.​—⁠3/1, peji nke 15.

▫ Ihe mmụta dị aṅaa nke na-akasi obi dị n’Abụ Ọma nke 51? Abụ ọma nke a na-enyere anyị aka ịghọta na ọ bụrụ na anyị asụọ ngọngọ wee daba ná mmehie ma nwee nchegharị n’ezie, Nna anyị nke eluigwe na-ahụ n’anya ga-anụ olu ákwá anyị maka imere anyị ebere ma zọpụta anyị site n’obi nkoropụ. Otú ọ dị, nchegbu anyị bụ isi kwesịrị ịbụ nkọcha nke a ga-ewetara aha Jehova.​—⁠3/15, peji nke 18.

▫ Gịnị ka baptism mmiri bụ ihe atụ ya? Baptism bụ ihe ngosipụta a na-ahụ anya nke nrara mmadụ raara onwe ya nye Jehova Chineke. Imikpu ha n’ime mmiri na-egosi na ndị a na-eme baptism na-anwụ n’ihe banyere ụzọ ndụ nke ilekwasị anya n’ebe onwe ha nọ. Ịbụ ndị e si n’ime mmiri wepụta bụ ihe atụ nke na ha dị ndụ ugbu a nye ime uche Chineke, na-etinye ya n’ọnọdụ mbụ ná ndụ ha. (Matiu 16:24)​—⁠4/1, peji nke 5-⁠6.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya