Alaeze Ukwu Furu efu Nke Menyere Ndị Nkatọ Bible Ihere
“Na mbụ akụkọ ihe mere eme banyere alaeze ukwu Asiria bụ otu n’ime ihe ndị kasị ghara ido anya n’ihe ndekọ ụwa.” “Nanị ihe a maara banyere Nineve oge ochie dị n’izo aka na amụma ndị dịsasịrị adịsa ndị na-atụ aka n’ebe ọ dị n’ime Bible, na ihe ịrịba ama ndị a na-echeghị eche na ndị na-adịkọghị ọnụ nke akụkọ ihe mere eme Asiria Diodorus Siculus . . . na ndị ọzọ.”—Cyclopædia of Biblical Literature, Mpịakọta nke 1 na nke 3, 1862.
ONYE Grik na-akọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Diodorus Siculus biri ndụ 2,000 afọ gara aga. O mere nzọrọ na Nineve bụ obodo nwere akụkụ anọ; akụkụ anọ ahụ gbakọtara 480 stadium n’ogologo. Ọ bụ ọ̀tụ̀tụ̀ ịdị okirikiri dị 60 maịlụ (96 kilomita)! Bible sere onyinyo yiri nke ahụ, na-akọwa Nineve dị ka obodo ukwu ga-ewe “ije nke ụbọchị atọ.”—Jona 3:3.
Ndị nkatọ Bible nke narị afọ nke 19 jụrụ ikwere na obodo a na-amaghị ama nke ụwa oge ochie gaara ebuwo ibu otú a. Ha kwukwara na ọ bụrụ na Nineve dịrị adị ma ọlị, ọ gaara abụwo akụkụ nke mmepeanya oge ochie nke bu Babilọn ụzọ.
Echiche nke a megidere Jenesis isi 10, nke kwuru na nwa nwa nwa Noa, bụ́ Nimrọd, hiwere obodo mbụ nke ndọrọ ndọrọ ọchịchị n’ógbè Bebel, ma ọ bụ Babilọn. “O siri n’ala ahụ pụọ,” ka Bible gara n’ihu ikwu, “jee Asiria, wuo Nineve, na Rehobot-Ia na Kala, na Resen n’etiti Nineve na Kala (nke ahụ bụ obodo ukwu ahụ).” (Jenesis 10:8-12) Rịba ama na akụkụ akwụkwọ nsọ ahụ kọwara obodo anọ ọhụrụ nke Asiria ịbụ otu “obodo ukwu.”
Na 1843, onye France bụ́ ọkà n’ihe mgbe ochie ndị e gwutere n’ala, bụ́ Paul-Émile Botta, chọpụtara mkpọmkpọ ebe nke otu obíeze nke ghọrọ akụkụ nke obodo Asiria. Mgbe akụkọ banyere nchọpụta nke a ruru ọha mmadụ ntị, ọ kpatara oké mkpali. “Mmasị ọha mmadụ rịwanyere elu,” ka Alan Millard na-akọwa n’akwụkwọ ya bụ́ Treasures From Bible Times, “mgbe a nwapụtara na obíeze ahụ bụ nke Sagọn, bụ́ eze Asiria a kpọrọ aha n’Aịsaịa 20:1, onye a rụworo ụka banyere ịdị adị ya n’ihi na ọ dịghị ihe ọzọ e ji mara ya.”
Ka ọ dị mgbe ahụ, onye ọkà ọzọ n’ihe mgbe ochie ndị e gwutere n’ala bụ́ Austen Henry Layard malitere igwulite mkpọmkpọ ebe n’ebe a kpọrọ Nimrud nke dị ihe dị ka 42 kilomita n’ebe ndịda ọdịda anyanwụ nke Khorsabad. Mkpọmkpọ ebe ahụ ghọrọ Kala—otu n’ime obodo anọ ndị ahụ nke Asiria bụ́ ndị e hotara na Jenesis 10:11. E mesịa na 1849, Layard gwulitere mkpọmkpọ ebe nke obíeze buru oké ibu n’ebe a kpọrọ Kuyunjik, n’etiti Kala na Khorsabad. Ebe ahụ ghọrọ akụkụ Nineve. N’etiti Khorsabad na Kala ka e nwere mkpọmkpọ ebe nke ime obodo ndị ọzọ, gụnyere ugwu nta a kpọrọ Karamles. “Ọ bụrụ na anyị ewere nnukwute ugwu nta anọ ahụ nke Nimrúd [Kala], Koyunjik [Nineve], Khorsabad, na Karamles, dị ka isi nkuku nke ebe nwere akụkụ anọ hà nhata,” ka Layard kwuru, “a ga-ahụ na akụkụ anọ ya kwekọrọ nnọọ na 480 stadium ma ọ bụ 60 maịlụ nke onye ọkà n’ihe banyere ọdịdị ụwa, bụ́ nke mejupụtara njem ụbọchị atọ nke onye amụma bụ́ [Jona].”
Mgbe ahụ, ihe àmà na-egosi na Jona gụnyere ime obodo ndị a dị ka otu “obodo ukwu,” na-akpọ ha aha nke obodo mbụ e depụtara na Jenesis 10:11, ya bụ, Nineve. A na-eme otu ihe ahụ taa. Dị ka ihe atụ, e nwere ọdịiche n’obodo bụ isi a na-akpọ London na ime obodo ya dị iche iche, bụ́ nke na-emejupụta ihe a na-akpọ mgbe ụfọdụ “London Ka Ukwuu.”
Eze Asiria Dị Mpako
Obíeze dị na Nineve nwere ihe karịrị 70 ọnụ ụlọ, nwee mgbidi ájá fọrọ nke nta ka o ruo kilomita 3. E kokwasịrị n’elu mgbidi ájá ndị a ihe ọkpụkpụ ndị ọkụ gbafọrọ bụ́ ndị e ji echeta mmeri dị iche iche n’agha na ihe ndị ọzọ a rụpụtara. E mebiri ihe ka ọtụtụ nke ukwuu. Otú ọ dị, n’ọgwụgwụ nke ọnụnọ ya, Layard chọpụtara otu ime ụlọ e chekwara n’ọnọdụ dị ịrịba ama. Ná mgbidi ájá ya e gosiri mmeri e meriri otu obodo e wusiri ike, na-eme ka ndị e jidere n’agha zọrọ ije na-agafe n’ihu eze ahụ wakwasịrị ha, bụ́ onye nọkwasịrị n’ocheeze dị n’èzí obodo ahụ. N’isi eze ahụ e nwere ihe e dere nke ndị ọkachamara n’ihe odide ndị Asiria sụgharịrị n’ụzọ dị otú a: “Senakerib, eze ụwa, eze Asiria, nọdụrụ n’ocheeze nimedu, wee nyochaa ihe a lụtara n’agha (e wetara) na Lekish (La-ki-su).”
Taa, a pụrụ ikiri ihe ngosi na okwu ndị a n’Ebe Ndebe Ihe Mgbe Ochie Britain. O kwekọrọ n’akụkọ mere eme nke e dekọrọ na Bible ná 2 Ndị Eze 18:13, 14: “N’afọ nke iri na anọ nke eze, bụ́ Hezekaịa, Senakerib, bụ́ eze Asiria, rịgoro imegide obodo nile e wusiri ike nke Juda, were ha. Hezekaịa, bụ́ eze Juda, wee zigara eze Asiria ozi ruo Lekish, sị, Emehiewo m; si n’ebe m nọ laghachi: ihe ị ga-ebo m m ga-eburu ya. Eze Asiria wee tụkwasị Hezekaịa, bụ́ eze Juda, [narị talent ọlaọcha atọ] na iri talent ọlaedo atọ.”
A chọtara ihe ndị ọzọ e dere n’etiti mkpọmkpọ ebe nke Nineve, na-akọwa ihe ndị ọzọ banyere mwakpo Senakerib wakporo Juda na ụtụ Hezekaịa kwụrụ. “Ma eleghị anya otu n’ime ihe ndabara ndị kasị dị ịrịba ama nke akaebe akụkọ ihe mere eme e nwere ndekọ ya, ùkwù nke akụ̀ ọlaedo a naara Hezekaịa, iri talent atọ, kwekọrọ n’ihe ndekọ abụọ dịwagara iche site n’ibe ha,” ka Layard dere. Sir Henry Rawlinson, bụ́ onye nyere aka ịkọwa ihe e dere n’asụsụ Asiria, mara ọkwa na ihe ndị a e dere “debere nkọwa [Senakerib] n’akụkọ ihe mere eme n’ọnọdụ a na-apụghị ịgbagha ya.” Ọzọkwa, Layard jụrụ n’akwụkwọ ya bụ́ Nineveh and Babylon, sị: “Ònye gaara ekwerewo na ọ pụrụ ime eme, tupu e mee nchọpụta ndị a, na n’okpuru mkputamkpu ala na ihe ndị e kpofuru ekpofu nke kara akara ebe Nineve dịrị, na a ga-achọta akụkọ ihe mere eme nke agha ndị a lụrụ n’etiti Hezekaịa na Senakerib, nke Senakerib n’onwe ya dere kpọmkwem n’oge ha weere ọnọdụ, ma na-emesi ọbụna ihe ndị dịkarịsịrị nta n’ihe ndekọ Bible ike?”
Otú ọ dị, ihe ụfọdụ banyere ndekọ Senakerib ekwekọghị na Bible. Dị ka ihe atụ, onye ọkà n’ihe mgbe ochie e gwutere n’ala bụ́ Alan Millard rịbara ama, sị: “Eziokwu kasị na-atụ n’anya dị ná ngwụsị [ihe ndekọ Senakerib]. Hezekaịa zigaara Senakerib ‘nke mesịrị, laa Nineve,’ onye ozi ya, na ụtụ nile ahụ. Ndị agha Asiria ebughị ha laa n’ụzọ na-egosi mmeri dị ka ha na-emebu.” Bible na-ekwu na a kwụrụ ụtụ ahụ tupu eze Asiria alaghachi Nineve. (2 Ndị Eze 18:15-17) Gịnị kpatara ọdịiche ahụ? N’ihi gịnịkwa ka Senakerib na-enweghị ike itu ọnụ banyere imeri isi obodo Juda, bụ́ Jerusalem, n’ụzọ o si tuo ọnụ banyere mmeri o meriri obodo Juda e wusiri ike, bụ́ Lekish? Mmadụ atọ soo dee Bible na-enye azịza ya. Otu n’ime ha, bụ́ onye hụrụ ihe mere, dere, sị: “Mmụọ ozi nke Jehova wee pụọ, tigbuo n’ọmụma ụlọikwuu Asiria [narị puku ndị ikom na puku iri asatọ na ise]: mmadụ wee bilie n’isi ụtụtụ, ma, lee, ha nile bụ ozu nwụrụ anwụ. Senakerib, bụ́ eze Asiria, wee bulie ije, jee, laghachi, biri na Nineve.”—Aịsaịa 37:36, 37; 2 Ndị Eze 19:35; 2 Ihe Emere 32:21.
N’akwụkwọ ya bụ́ Treasures From Bible Times, Millard kwubiri, sị: “E nweghị ezi ihe ọ bụla mere a ga-eji rụọ eziokwu a ụka . . . O kwere nghọta na Senakerib agaghị edekọ ọdachi dị otú ahụ ka ndị ga-esochi ya gụọ, n’ihi na ọ ga-abụrụ ya ihe mkparị.” Kama nke ahụ, Senakerib nwara igosi na mwakpo ọ wakporo Juda nwere ihe ịga nke ọma nakwa na Hezekaịa nọgidere na-anọ n’okpuru ya, na-eziga ụtụ ahụ na Nineve.
A Nwapụta Mmalite Asiria
A chọpụtara ebe ndebe akwụkwọ dị iche iche ndị nwere ọtụtụ iri puku nke nkume ụrọ na Nineve. Ihe odide ndị a na-anwapụta na Alaeze Asiria nwere mmalite ya n’ebe ndịda Babilọn, dị nnọọ ka Jenesis 10:11 na-egosi. Site n’ịgbaso ihe ọmụma nke a, ndị ọkà n’ihe mgbe ochie ndị e gwutere n’ala malitere ichekwu mgbalị ha ihu n’ebe ndịda. Akwụkwọ Encyclopædia Biblica na-akọwa, sị: “Ndị Asiria n’ihe nile ha hapụrụ n’azụ ha na-egosi na ha malitere na Babilọn. E wetara asụsụ ha na ụzọ ha si ede ihe, ihe ọgụgụ ha, okpukpe ha, na sayensị ha, site ná ndị agbata obi ha n’akụkụ ndịda ma dozigharịa ha nke nta.”
Nchọpụta ndị dị ka ndị dị n’elu amanyewo ndị nkatọ Bible iwetulatụ echiche ha. N’ezie, nnyocha nke Bible site n’ezi obi na-ekpughe na ọ bụ ndị edemede nwere obi eziokwu, ndị na-elezi anya dere ya. Onye bụbu onye isi ọkàikpe nke Ụlọikpe Kasị Elu nke United States, bụ́ Salmon P. Chase, kwuru mgbe o nyochasịrị Bible, sị: “Ọ bụ ọmụmụ ihe dị ogologo, nke siri ike, nke miri emi: ijikwa otu ụkpụrụ ndị ahụ nke ihe àmà n’ihe a metụtara okpukpe dị ka m na-eme mgbe nile n’ihe ndị metụtara okwu ụwa, abịawo m ná mkpebi nke na Bible bụ akwụkwọ karịrị mmadụ, na o sitewo n’aka Chineke.”—The Book of Books: An Introduction.
N’ezie, Bible karịrị nnọọ akụkọ ihe mere eme nke ziri ezi. Ọ bụ Okwu Chineke sitere n’ike mmụọ nsọ, onyinye maka abamuru ihe a kpọrọ mmadụ. (2 Timoti 3:16) A pụrụ ịhụ ihe nnwapụta nke a site n’inyocha nkà mmụta ọdịdị ụwa nke Bible. A ga-atụle nke a ná mbipụta na-eso.
[Foto ndị dị na peeji nke 6, 7]
N’elu: Ihe atọ e nwetara site ná mgbidi ájá
N’ala: Ihe osise nke mgbidi ájá Asiria nke na-egosi nnọchibido a nọchibidoro Lekish
[Ebe E Sigasị Nweta Foto]
(A natara The British Museum ike)
(Site na The Bible in the British Museum nke British Museum Press bipụtara)
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 4]
A natara Trustees of The British Museum ikike