Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w93 6/15 p. 3-4
  • N’ihi Gịnị Ka A Ga-eji Nwalee Izi Ezi Nke Bible?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • N’ihi Gịnị Ka A Ga-eji Nwalee Izi Ezi Nke Bible?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Isi Iyi Pụrụ Iche nke Amamihe Ka Elu
    Gịnị Bụ Nzube nke Ndụ? Olee Otú Ị Pụrụ Isi Chọta Ya?
  • Olee Ebe Ị Pụrụ Ịchọta Nduzi?
    Obi Ụtọ—Ụzọ E Si Enweta Ya
  • Baịbụl na Sayensị Hà Na-ekwu Otu Ihe?
    Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • Izi Ezi nke Ihe E Kwuru
    Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
w93 6/15 p. 3-4

N’ihi Gịnị Ka A Ga-eji Nwalee Izi Ezi Nke Bible?

Olee otú i si ele Bible anya? Ụfọdụ ndị kwenyesịrị ike na ọ bụ mkpughe Chineke nye mmadụ. Ndị ọzọ kwenyere na ọ bụ nanị akwụkwọ nkịtị. Ndị ọzọkwa emebeghị mkpebi ọ bụla. Ọ bụrụ na i nwere obi abụọ ọ bụla banyere mmalite nke Bible, e nwere ihe ndị na-akpali akpali mere i kwesịrị iji nyochaa ya ma dozie isiokwu ahụ.

RUO narị afọ nke 18, a na-akwanyere Bible ùgwù n’ebe nile dị ka Okwu Chineke ná mba dị iche iche nke Krisendọm. Ma, site na narị afọ nke 19 gaa n’ihu, ọnụ ọgụgụ na-eto eto nke ndị na-ezi ihe, ndị ọkà mmụta sayensị, na ọbụna ndị ọkà mmụta okpukpe na ndị ndú chọọchị malitere ikwupụta n’ihu ọha obi abụọ banyere izi ezi nke Bible.

Dị ka ihe si na nke a pụta, nkatọ Bible abụrụwo ihe gbasara ọtụtụ ebe nke na ọtụtụ na-eme mkpebi ọbụna n’amaghị ihe dị n’ime Bible. Iji dochie Bible, ọtụtụ ndị n’ime Krisendọm ugbu a na-elegara nkà ihe ọmụma ụmụ mmadụ anya. N’agbanyeghị nke ahụ, nkà ihe ọmụma ọgbara ọhụrụ emepụtabeghị ụwa nke na-adịghị ize ndụ na nke nwere obi ụtọ karị. Nke ahụ bụ otu ezi ihe mere a ga-eji nyochaa Bible ma lee ma nduzi ya ọ̀ na-eduga n’obi ụtọ na ihe ịga nke ọma.

Ihe ọzọ mere a ga-eji nwalee izi ezi nke Bible bụ olileanya magburu onwe ya nke ọ na-esetịpụrụ ihe a kpọrọ mmadụ. Dị ka ihe atụ, Abụ Ọma 37:29 na-asị: “Ndị ezi omume ga-enweta ala, birikwa n’elu ya ruo mgbe ebighị ebi.” (Mkpughe 21:​3-⁠5) Mmetụta dị aṅaa ka ụdị nkwa ndị ahụ na-enwe n’ebe ị nọ? N’ezie ha bụ ihe ndị zuru ezu mere a ga-eji nyochaa Bible ma lee ma à pụrụ ịtụkwasị ya obi.

Magazin a anọgidewo na-akwado ịbụ eziokwu nke Bible ma wepụtakwa nnwapụta nke izi ezi ya mgbe mgbe. E nwere ọtụtụ akụkụ ndị a pụrụ ịnwale izi ezi nke Bible na ha. Mbipụta dị iche iche nke Ụlọ Nche ga-enyere gị aka ịza ajụjụ ndị a: Eziokwu ndị anyị maara banyere akụkọ ihe mere eme nke mgbe ochie ò kwekọrọ na Bible? Amụma ya nile hà ziri ezi? Ndụmọdụ ya ọ̀ dị irè, ma ọ bụ ndị na-ezi ihe na ndị ọkà ihe ọmụma nke oge a hà anwapụtawo na Bible bụ ihe oge ya gafeworo?

Nkà mmụta banyere ọdịdị ụwa bụ akụkụ ọzọ ị pụrụ ịnwalee izi ezi nke Bible na ya. Akụkọ ọdịbendị na-emeghị eme nke ndị ọgọ mmụọ megidere eziokwu nke nkà mmụta ọdịdị ụwa. Dị ka ihe atụ, ọtụtụ ndị oge gboo kọrọ akụkọ banyere njem ndị e mere gaa n’ebe a kpọrọ ụwa ndị nwụrụ anwụ. Banyere ndị Grik oge ochie, akwụkwọ bụ́ A Guide to the Gods na-akọwa, sị: “A hụrụ elu ala dị ka ihe dị mbadamba nke mmiri dị ukwuu a kpọrọ Oké Osimiri gbara gburugburu. N’okpuru nke a ka e nwere Ụwa Ọzọ, ala ihe na-adịghị nke osisi ndị dị nji na ndị na-adịghị amị mkpụrụ dịsasịrị na ya.” Mgbe nke a mesịrị bụrụ akụkọ ọdịbendị na-emeghị eme, ndị ọkà ihe ọmụma nke ndị ọgọ mmụọ kwuru ebe ọzọ ihe ha kpọrọ ụwa ọzọ dị. “A chọtara ebe kwesịrị ekwesị, n’okpuru elu ala, nke e ji ọtụtụ ọgbà ndị dị ukwuu jikọta ya na ụwa nke a,” ka onye na-ede akwụkwọ bụ́ Richard Carlyon kọwara. Taa, anyị maara na nke a bụkwa akụkọ ọdịbendị na-emeghị eme. Ụdị ụwa ọzọ ma ọ bụ ụzọ ngafe ahụ adịghị adị.

N’adịghị ka akụkọ ọdịbendị na-emeghị eme nke ndị mgbe ochie, Bible enweghị n’ime ya echiche hiere ụzọ nke na ụwa dị mbadamba. Kama nke ahụ, o kwuru eziokwu nke nkà sayensị na ụwa bụ ihe gbara okirikiri na-enweghị ihe ọ dịkwasịrị na ya. (Job 26:7; Aịsaịa 40:22) Olee banyere nkọwa nkà mmụta ọdịdị ụwa ndị ọzọ a kpọtụrụ uche na Bible? Hà bụ akụkọ ọdịbendị na-emeghị eme, ka ọ̀ bụ ihe pụrụ ikwe omume iji izi ezi jiri anya nke uche hụ ihe omume dị iche iche nke Bibe mgbe a na-eje ileta Ijipt nke oge ugbu a, tinyere Ala Saịnaị Mmiri Gbara Gburugburu, na Israel oge ugbu a?

[Foto dị na peeji nke 3]

“Ọ bụ onye ahụ nke na-anọdụ n’elu gburugburu ụwa.”—Aịsaịa 40:22

“Ọ na-ekokwasịkwa ụwa n’ihe na-abụghị ihe.”—Job 26:7

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya