Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
Ebe ọ bụ na ndị Kraịst adịghị etinye ego n’iti ébè, hà pụrụ ịnara tiketi ma ọ bụ kere okè n’ịnwale ihe ndabara, bụ́ nke ha pụrụ irite ihe na ya?
Ajụjụ a ebilitewo site na mgbe ruo na mgbe, ya mere atụlewo ya n’ime akwụkwọ anyị dị iche iche. N’ụfọdụ asụsụ, anyị ewepụtawo akwụkwọ index nke akwụkwọ anyị, dị ka Watch Tower Publications Index 1930-1985 (na nke yiri ya nke jikọtara malite na 1986-1990). Ọ bụrụ na onye Kraịst nwere akwụkwọ index ndị ahụ n’asụsụ ya, nke a ga-abụ ihe bara uru n’ịchọta azịza na-eju afọ ngwa ngwa.
Ajụjụ ahụ dị n’elu bụ otu ihe atụ. Ileba anya n’Index maka 1930-1985 n’okpuru isiokwu bụ́ “Questions From Readers” (Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ), a ga-ahụ isiokwu nta bụ́ “‘drawings,’ may Christian accept ticket for?” (ịnwale ihe ndabara, onye Kraịst ọ̀ pụrụ ịnara tiketi maka ya?) E zoora onye na-agụ akwụkwọ aka gaa ‘n’Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ’ n’Ụlọ Nche (Bekee) nke February 15, 1973, peji 127.a Ọtụtụ Ndịàmà nwere mpịakọta (ma ọ bụ mbipụta otu otu) nke Ụlọ Nche maka 1973, ma ọ bụ a pụrụ ịga gụọ ya n’ebe ndebe akwụkwọ nke ọtụtụ Ụlọ Nzukọ Alaeze.
Nkwurịta okwu ahụ e bipụtara na 1973 rụtụrụ aka na ndị Kraịst na-ezere ịzọ̀ nzọ̀ ma ọ bụ ịnwale ihe ndabara ndị gụnyere ịzụrụ ohere (dị ka raffle tiketi) ma ọ bụ itinye ego maka inweta ohere nke irite ihe. N’ikwu ya n’ụzọ dị mfe, anyị na-ezere ịgba chaa chaa, nke bụ n’ezie ngosipụta nke anyaukwu.—1 Ndị Kọrint 5:11; 6:10; Ndị Efesọs 4:19; 5:3, 5.
Otú ọ dị, ụlọ ahịa ma ọ bụ òtù azụmahịa pụrụ iji ịnwale ihe ndabara mee ihe dị ka ụzọ nke ịkpọsa ngwa ahịa. Nanị ihe mmadụ ga-eme bụ inye aha ya ma ọ bụ ziga fọm ma ọbụ tiketi, n’azụghị ihe ọ bụla. Nnwale nke ihe ndabara ahụ bụ akụkụ nke atụmatụ ime mkpọsa; e mere ya ka ọ bụrụ ụzọ nke ikpebi onye a ga-enye ihe nrite ahụ n’eleghị anya n’ihu. Ndị Kraịst ụfọdụ pụrụ iche na ha pụrụ ịnara ihe nrite ahụ ná nnwale ihe ndabara nke na-emetụtaghị ịgba chaa chaa, dị nnọọ ka ha ga-anara ihe ndị a na-enye ná nkịtị ma ọ bụ onyinye ndị ọzọ nke òtù azụmahịa ma ọ bụ ụlọ ahịa pụrụ iji mee ihe n’usoro mkpọsa ngwa ahịa ya.
Otú ọ dị, ndị Kraịst ụfọdụ ga-ajụ ihe ọ bụla yiri nke a, n’achọghị ịsụ ndị ọzọ ngọngọ ma ọ bụ tinye ha ná mgbagwoju anya nakwa n’ihi ịchọ idebe onwe ha ebe dị anya pụọ n’ịtụkwasị obi n’ihe ahụ a kpọrọ Chi Ọma. Dị ka Aịsaịa 65:11 (NW) na-egosi, ndị na-ejere Chineke ozi adịghị ejikọ onwe ha na “chi nke Chi Ọma” ma ọ bụ “chi nke Akara Aka.” Ha pụkwara iche na ha agaghị achọ ịbụ akụkụ nke mkpọsa ihu ọha nke a ga-achọ ka ndị nwere mmeri kere òkè na ya. Ndị na-eche otú a ekwesịghị n’ezie ịkọcha onye ma ọ bụ ndị Kraịst ndị akọ na uche ha kwere ha ka ha tinye aka n’ụdị nnwale nke ihe ndabara ndị dị otú ahụ.—Tụlee Ndị Rom 14:1-4.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a A hazikwara otu ihe ọmụma ahụ n’okpuru isiokwu bụ́ “Mkpọsa,” “Azụmahia,” na “Ịgba Chaa Chaa,” ya mere ịsa mbara nke isiokwu ndị dị na index na-enyere mmadụ aka ịchọta ihe ọmụma ahụ.