Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w93 7/15 p. 3-5
  • Ònye Bụ Jehova?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ònye Bụ Jehova?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ọ Dị Elu Karịa Chi Nile nke Ijipt
  • Onye Nchebe nke Ndị Ya
  • Ihe Mmụta Ndị Ahụmahụ Kụziri
  • ‘Jaa Ghọọrọ M Nzọpụta’
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
  • Ahụhụ Atọ Mbụ A Tara Ndị Ijipt
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
  • Mozis na Erọn Ejee Ịhụ Fero
    Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
  • Mosis na Erọn—Ndị Nkwusa Nwere Obi Ike nke Okwu Chineke
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
w93 7/15 p. 3-5

Ònye Bụ Jehova?

“ÒNYE bụ Jehova?” A jụrụ ajụjụ ahụ na 3,500 afọ gara aga site n’ọnụ Fero onye mpako, bụ́ eze Ijipt. O doro anya na nnupụisi kpaliri ya ikwukwa, sị: “Amaghị m Jehova.” Ndị ikom abụọ guzo mgbe ahụ n’ihu Fero maara onye Jehova bụ. Ha bụ ụmụnne anụ ahụ bụ́ Mosis na Erọn, nke agbụrụ Israel bụ́ Livaị. Jehova zipụrụ ha ịga gwa onye ọchịchị Ijipt ka o ziga ụmụ Israel n’ọzara ije mee otu ememe okpukpe.​—⁠Ọpụpụ 5:​1, 2.

Fero achọghị azịza ọ bụla nye ajụjụ ya. N’okpuru ọchịchị ya, ndị nchụàjà kwalitere ofufe nke ọtụtụ narị chi ụgha. Lee, e lere Fero n’onwe ya anya dị ka chi! Dị ka akụkọ ọdịnala na-emeghị eme ndị Ijipt si dị, ọ bụ diọkpara nke chi anyanwụ bụ́ Ra nakwa onye lọrọ ụwa nke chi ahụ nwere isi nkwọ bụ́ Horus. A na-akpọ Fero aha otutu dị iche iche dị ka “chi nke bụ dike” na “onye na-adị ebighị ebi.” Ya mere ọ bụghị ihe ijuanya na ọ ga-eji ịkwa emo jụọ, sị: “Ònye bụ Jehova, na m ga-ege ntị n’olu ya?”

Ọ dịghị mkpa ka Mosis na Erọn zaa ajụjụ ahụ. Fero maara na Jehova bụ Chineke nke ụmụ Israel, bụ́ ndị nọ n’agbụ nke Ijipt n’oge ahụ, na-efe. Ma n’oge na-adịghị anya Fero na ndị Ijipt nile ga-amụta na Jehova bụ ezi Chineke ahụ. N’otu aka ahụ taa, Jehova ga-eme ka mmadụ nile mara aha na ịbụ Chineke ya n’elu ala. (Ezikiel 36:23) Ya mere anyị pụrụ irite uru site n’ịtụle ụzọ Jehova Chineke si bulie aha ya elu n’Ijipt oge ochie.

Ọ Dị Elu Karịa Chi Nile nke Ijipt

Mgbe Fero ji nnupụisi jụọ onye Jehova bụ, ọ tụghị anya inweta ahụmahụ nke ihe ndị si na ya pụta. Jehova n’onwe ya zaghachiri, na-eweta ihe otiti iri n’ala Ijipt. Ihe otiti ndị ahụ abụghị ihe e tiri mba ahụ nanị. Ha bụ ihe otiti megide chi nile nke Ijipt.

Ihe otiti ndị ahụ gosipụtara ọkaaka nke Jehova n’ebe chi nile nke Ijipt dị. (Ọpụpụ 12:12; Ọnụ Ọgụgụ 33:4) Cheedị echiche ọgba aghara dịnụ mgbe Jehova gbanwere Osimiri Naịl na mmiri nile nke Ijipt ịghọ ọbara! N’ihi ọrụ ebube nke a, Fero na ndị ya mụtara na Jehova dị elu karịa chi Naịl, bụ́ Hapi. Ọnwụ nke azụ ndị dị na Naịl bụkwa ihe otiti nye okpukpe ndị Ijipt, n’ihi na a na-efe ụdị azụ ụfọdụ ofufe.​—⁠Ọpụpụ 7:​19-⁠21.

Ọzọ, Jehova wetara ihe otiti nke awọ n’ala Ijipt. Nke a metọrọ ùgwù nke chi nwanyị awọ ndị Ijipt, bụ́ Heqt. (Ọpụpụ 8:​5-⁠14) Ihe otiti nke atọ gbagwojuru ndị nchụàjà ahụ na-eme majik anya, bụ́ ndị na-enweghị ike ime ihe yiri ọrụ ebube Jehova nke ịgbanwe uzuzu ájá ịghọ anwụnta. “Mkpịsị aka Chineke ka nke a bụ,” ka ha kwupụtara. (Ọpụpụ 8:​16-⁠19) Chi ndị Ijipt bụ́ Thoth, nke a sịrị na ọ bụ ya chepụtara nkà majik, enweghị ike inyere ndị ahụ ji ihe ọmụma etu ọnụ aka.

Fero na-amụta onye Jehova bụ. Jehova bụ Chineke nke pụrụ ịma ọkwa nzube ya site n’ọnụ Mosis ma mesịa mezuo ya site n’iweta ihe otiti ọrụ ebube n’ahụ ndị Ijipt. Jehova pụkwara ịmalite na iweta ihe otiti ndị ahụ n’ọgwụgwụ dị ka uche ya si dị. Otú ọ dị, ihe ọmụma nke a akpalighị Fero ịnọ n’okpuru Jehova. Kama nke ahụ, onye ọchịchị mpako ndị Ijipt ji ịgba isi akwara nọgide na-eguzogide Jehova.

N’oge ihe otiti nke anọ, odudu mebiri ala ahụ, febajuo n’ụlọ, ma eleghị anya jupụta n’ikuku, nke bụ n’onwe ya ihe a na-enye ofufe nke e gosipụtara na chi bụ́ Shu ma ọ bụ na chi nwanyị Isis, bụ́ eze nwanyị eluigwe. A sụgharịwo okwu Hibru maka ahụhụ nke a ịbụ “odudu,” “oké ijiji,” na “ebè.” (The Holy Bible in Igbo; Septuagint; Young) Ọ bụrụ na ebé ukwu so na ha, e ji ahụhụ ndị Ijipt lere anya dị ka ndị dị nsọ tie ha ihe otiti, ndị mmadụ apụghịkwa ijegharịworị n’ejighị ụkwụ zọpịa ha. Otú o sina dị, ihe otiti nke a kụziiri Fero ihe ọhụrụ banyere Jehova. Ọ bụ ezie na chi nile nke Ijipt apụghị igbochi ndị na-efe ha n’aka odudu ndị ahụ, Jehova pụrụ ichebe ndị ya. Ihe otiti nke a na ndị nile sochiri ya metụtara ndị Ijipt ma o metụtaghị ndị Israel.​—⁠Ọpụpụ 8:​20-⁠24.

Ihe otiti nke ise bụ ọrịa nke dakwasịrị anụ ụlọ ndị Ijipt. Ihe otiti nke a bụ ihe ihere nye Hathor, Apis, na chi nwanyị eluigwe nke nwere ahụ ehi bụ́ Nut. (Ọpụpụ 9:​1-⁠7) Ihe otiti nke isii wetara ọnyá ọjọọ n’ahụ mmadụ na anụmanụ, na-ewetu ùgwù nke chi ndị bụ Thoth, Isis, na Ptah, bụ́ ndị a na-akwanyere ùgwù na-ezighị ezi maka inwe ikike ịgwọ ọrịa.​—⁠Ọpụpụ 9:​8-⁠11.

Ihe otiti nke asaa bụ akụ mmiri igwe, ya na ọkụ na-acha n’etiti akụ mmiri igwe ndị ahụ. Ihe otiti nke a wetara ihere nye chi Reshpu, nke a sịrị na ọ na-achịkwa àmụ̀mà, na Thoth, nke a sịrị na ọ na-elekọta mmiri ozuzo na égbè eluigwe. (Ọpụpụ 9:​22-⁠26) Ihe otiti nke asatọ, bụ́ ihe otiti nke igurube, gosiri ọkaaka Jehova n’ebe chi ịmụ nwa bụ́ Min dị, nke a sịrị na ọ na-echebe ihe ọkụkụ. (Ọpụpụ 10:​12-⁠15) Ihe otiti nke itoolu, bụ́ ọchịchịrị ụbọchị atọ n’ala Ijipt, wetaara chi ndị Ijipt ndị dị ka chi anyanwụ bụ́ Ra na Horus nleda anya.​—⁠Ọpụpụ 10:​21-⁠23.

N’agbanyeghị ihe otiti itoolu ahụ wetara mbibi, Fero ka jụrụ ịtọhapụ ụmụ Israel. Obi ịkpọ nkụ ya mebiiri Ijipt oké ihe mgbe Chineke wetara ihe otiti nke iri na nke ikpeazụ​—⁠ọnwụ nke nwa mbụ nke mmadụ na anụmanụ. Ọbụna nwa mbụ nke Fero nwụrụ, ọ bụ ezie na e lere ya anya dị ka chi. Otú a, Jehova ‘mere ihe e kpere n’ikpe n’ahụ chi nile nke Ijipt.’​—⁠Ọpụpụ 12:​12, 29.

Ugbu a Fero kpọrọ Mosis na Erọn wee sị: “Bilienụ, si n’etiti ndị m pụọ, ma unu onwe unu ma ụmụ Israel; jeekwanụ, fee Jehova, dị ka unu kwuru. Chịrịnụ ma ìgwè ewu na atụrụ umu ma ìgwè ehi unu, dị ka unu kwuru, jeenụ; gọziekwanụ m.”​—⁠Ọpụpụ 12:​31, 32.

Onye Nchebe nke Ndị Ya

Ndị Israel kwapụrụ, ma n’oge na-adịghị anya o yiri Fero ka ha na-akpagharị ná nkịtị n’ọzara. Ya na ndị ohu ya jụrụ ajụjụ ugbu a, sị: “Gịnị bụ nke a anyị meworo, na anyị ezipụwo Israel n’ife anyị?” (Ọpụpụ 14:​3-⁠5) Ọpụpụ nke mba ohu a ga-abụrụ Ijipt oké ndakpọ akụ na ụba.

Fero kpọkọtara usuu ndị agha ya wee chụọ ọsọ Israel ruo Paị-hahaịrọt. (Ọpụpụ 14:​6-⁠9) N’ụzọ agha, ọnọdụ ahụ yiri nke dị mma nye ndị Ijipt n’ihi na ndị Israel tọrọ n’etiti osimiri na ugwu dị iche iche. Ma Jehova mere ihe iji chebe ndị Israel site n’iweta igwe ojii n’etiti ha na ndị Ijipt. N’akụkụ ndị Ijipt, “igwe ojii ahụ na ọchịchịrị ahụ wee dị,” si otú a na-egbochi mwakwasị. N’akụkụ nke ọzọ, igwe ojii ahụ na-enwu zaa, “na-enye ìhè n’abalị” maka Israel.​—⁠Ọpụpụ 14:​10-⁠20.

Ndị Ijipt siri ọnwụ itikpọ na ibibi ihe ma igwe ojii ahụ gbochiri ha. (Ọpụpụ 15:9) Mgbe o kpochara, lee ihe ịtụnanya ha hụrụ! E kewawo mmiri nke Osimiri Uhie ụzọ abụọ, ndị Israel na-agafekwa n’akụkụ nke ọzọ n’ala akọrọ! Fero na ndị agha ya wụbara n’ala mmiri ahụ, na-ekpebisi ike ịdọkpụrụ na ịkwakọrọ ihe onwunwe nke ndị ohu ha na mbụ. Otú ọ dị, onye ọchịchị mpako ndị Ijipt ejighị Chineke ndị Hibru kpọrọ ihe. Jehova malitere itinye ndị Ijipt n’ihe mgbagwoju anya, na-ekwokapụ wheel ụgbọ ịnyịnya ha.​—⁠Ọpụpụ 14:​21-⁠25a.

“Ka anyị gbapụ n’ihu Israel!” ka ndị dike Ijipt tiri mkpu, “n’ihi na Jehova na-eburu ha agha megide ndị Ijipt.” Fero na ndị ikom ya ghọtara nke a mgbe oge gaworo. N’ịbụ ndị na-anọghị n’ihe ize ndụ n’ụsọ osimiri nke ọzọ, Mosis gbatịrị aka ya n’ebe osimiri ahụ dị, mmiri ahụ wee laghachi, na-egbu Fero na ndị agha ya.​—⁠Ọpụpụ 14:​25b-⁠28.

Ihe Mmụta Ndị Ahụmahụ Kụziri

Ya mere, mgbe ahụ, ònye bụ Jehova? Fero mpako ahụ nwetara azịza nye ajụjụ ahụ. Ihe ndị mere n’Ijipt gosipụtara na Jehova bụ nanị ezi Chineke, n’adịghị kpam kpam ka ‘chi ihe efu nile’ nke mba dị iche iche. (Abụ Ọma 96:​4, 5) Site n’ike ya dị ebube, Jehova ‘mere eluigwe na ụwa.’ Ọ bụkwa Onye Mgbapụta Ukwu, bụ́ Onye ‘ji ihe ịrịba ama, ihe ebube, ogwe aka setịrị esetị, na egwu dị ukwuu, kpọpụta ndị ya, bụ́ Israel, n’ala Ijipt.’ (Jeremaịa 32:​17-⁠21) Lee ụzọ nke a si gosipụta nke ọma na Jehova pụrụ ichebe ndị ya!

Fero mụtara ihe ndị ahụ site n’ahụmahụ dị ilu. N’ezie, ihe mmụta nke ikpeazụ ahụ napụrụ ya ndụ ya. (Abụ Ọma 136:​1, 15) Ọ gaara enwewo amamihe karị ma ọ bụrụ na o gosiri ịdị umeala n’obi mgbe ọ jụrụ, sị, “Ònye bụ Jehova?” Mgbe ahụ onye ọchịchị ahụ pụrụ imeworị omume n’ụzọ kwekọrọ n’azịza o nwetara. N’ụzọ na-enye obi ụtọ, ọtụtụ ndị dị umeala taa na-amụta onye Jehova bụ. Ụdị àgwà dịkwa aṅaa ka O nwere? Gịnị ka ọ chọrọ anyị n’aka? Ka isiokwu nke na-esonụ mụbaa nghọta gị maka Onye ahụ nke nanị ya nwere aha ahụ bụ́ Jehova.​—⁠Abụ Ọma 83:18.

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 3]

Pictorial Archive (Near Eastern History) Est.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya