Ụba Ihe Onwunwe Pụrụ Itinye Okwukwe Gị N’ule
ỤBA ihe onwunwe pụrụ itinye okwukwe nke onye ziri ezi n’ule. Ịgba mbọ inwe akụ na ụba bara ụba pụrụ iduga n’enweghị okwukwe. (1 Timoti 6:9, 10) Ma ụba ihe onwunwe pụkwara itinye okwukwe n’ule n’ụzọ ọzọ. Mgbe onye ezi omume hụrụ na ndị ajọ omume na-enwe akụ na ụba bara ụba ebe ọ na-ahụju anya, a pụrụ ịnwa ya ịgbaso ụzọ asọpụrụghị Chineke. Lee, nke a edubawo ọbụna ụfọdụ n’ime ndị ohu Jehova inwe obi abụọ banyere abamuru nke ịgbaso ndụ ziri ezi!
Nke a mere onye Livaị ahụ na-agụ egwú bụ́ Esaf n’oge ọchịchị nke eze Israel bụ́ Devid. Esaf dere abụ ọma ndị e ji mee ihe n’ofufe ihu ọha. N’isonyere Himan na Jedutun, o bukwara amụma, na-enye Jehova Chineke otuto na ekele site n’egwú ọgụgụ. (1 Ihe Emere 25:1; 2 Ihe Emere 29:30) Ọ bụ ezie na Esaf nwere ihe ùgwù, Abụ Ọma nke 73 na-egosi na ụba ihe onwunwe nke ndị ajọ omume ghọrọ oké ule nye okwukwe ya.
Àgwà Dị Ize Ndụ nke Esaf
“N’ezie Chineke dị mma n’ebe Israel nọ, bụ́ n’ebe ndị dị ọcha n’obi nọ. Ma mụ onwe m, ọ fọdụrụ nwa ntịị ka ụkwụ m abụọ wezụga onwe ha; nzọụkwụ m fọdụrụ nke nta ka ha gbụchapụ.” (Abụ Ọma 73:1, 2) Site n’okwu ndị a, Esaf kwetara na Jehova meere mba Israel ihe ọma. Nke ahụ dị otú ahụ karịsịa nye ndị “dị ọcha n’obi,” n’ihi na ọ bụ ọchịchọ ha inye Chineke ofufe a na-akpaghịrị ókè na ikere òkè n’ido aha nsọ ya nsọ. Ọ bụrụ na anyị nwere àgwà ahụ, anyị ga-agọzi Jehova site n’ikwu ihe dị mma banyere ya ọbụna ma à sị na a na-anwasi anyị ọnwụnwa ike site n’ụba ihe onwunwe nke ndị ajọ omume ma ọ bụ site n’ọnọdụ ọ bụla ọzọ.—Abụ Ọma 145:1, 2.
Ọ bụ ezie na Esaf maara banyere ịdị mma nke Jehova, ọ fọrọ ntakịrị ka ụkwụ ya gbụchapụ n’okporo ụzọ nke ezi omume. Ọ dị ka à ga-asị na ha na-agbụchapụ n’ala na-amị amị n’oge a na-agba ọsọ dị anya nke na-agwụ ike. N’ihi gịnị ka okwukwe ya jiworo daa mbà nke ukwuu? Ọ kọwara, sị: “N’ihi na ekwosoro m ndị na-anya isi ekworo, ọ bụ udo nke ndị na-emebi iwu ka m na-ahụ. N’ihi na ọ dịghị mmekpa ahụ ọ bụla dị n’ọnwụ ha: ma ahụ ha mara abụba. Ha anọghị n’ahụhụ mmadụ ọzọ; a dịghị etikwa ha ihe otiti n’etiti mmadụ nile.”—Abụ Ọma 73:3-5.
Ụba ihe onwunwe nke ndị ajọ omume mere ka Esaf kwosa ha ekworo. O yiri ka hà na-enwe udo, ọ bụ ezie na ha kpakọbara akụ na ụba ha site n’ụzọ aghụghọ. (Tụlee Abụ Ọma 37:1.) N’agbanyeghị ajọ omume ha, site n’ọdịdị elu ahụ, ha nọ ná ntụkwasị obi. Lee, ha na-akwụsị ịdị ndụ n’enweghị ajọ ihe mgbu nke ọnwụ! Mgbe ụfọdụ ha na-anwụ n’udo nakwa n’ụzọ juru ha afọ, n’enweghị nghọta ọ bụla nke mkpa ime mmụọ. (Matiu 5:3) N’aka nke ọzọ, ụfọdụ n’ime ndị ohu Chineke na-arịa ọrịa ma na-anwụ ọnwụ ndị na-egbu mgbu, ma ọ na-anagide ha, ha nwekwara olileanya dị ebube nke mbilite n’ọnwụ.—Abụ Ọma 43:1-3; Jọn 5:28, 29.
Ọtụtụ ndị ajọ omume adịghị enwe nsogbu ahụ ike nke na-egbochi ha inweta ọṅụ n’ụba ihe oriri ha. “Ahụ ha mara abụba,” ha na-enwe afọ ukwu. Ọzọkwa, ha “anọghị n’ahụhụ mmadụ,” n’ihi na n’adịghị ka ọha nile nke ihe a kpọrọ mmadụ, ọ dịghị mkpa ka ha gbaa mbọ inweta ihe ndị dị mkpa ná ndụ. Esaf kwubiri na ndị ajọ omume ‘enweghị ihe otiti n’etiti mmadụ.’ Karịsịa ha na-agbanahụ ọnwụnwa nile nke ndị na-asọpụrụ Chineke na-enweta n’ihi na ndị ikpeazụ ahụ na-arapara n’ụkpụrụ ezi omume nile nke Jehova n’ajọ ụwa Setan.—1 Jọn 5:19.
N’ihi na ndị ajọ omume na-aba ụba, Esaf gara n’ihu ikwu banyere ha, sị: “N’ihi nke a mpako dị ha gburugburu dị ka ịyagba olu; a na-ewere ime ihe ike kpuchie ha dị ka uwe. Anya ha esiwo n’abụba ha guzopụta: ntụgharị nile nke obi ha agabigawo ókè. Ha na-akwa emo, na-ekwukwa okwu mmegbu n’ihe ọjọọ: ha na-esi n’ebe dị elu kwuo okwu. Ha edowo ọnụ ha n’eluigwe, ire ha na-ejegharịkwa n’ụwa.”—Abụ Ọma 73:6-9.
Ndị ajọ omume na-eyi mpako dị ka “ịyagba olu,” ime ihe ike ha dịkwa ọtụtụ nke ukwuu nke na ‘e kpuchiri ha n’ime ya dị ka e ji uwe.’ N’ikpebisi ike inweta ihe ha chọrọ, ha na-akakwasị ndị ọzọ anya. Anya nke ndị ajọ omume adịghị adakpu n’ime n’ihi erighị ihe ahụ chọrọ kama o ‘siwo n’abụba guzopụta,’ na-eguzopụta n’ihi oké ibu nke iri oké nri kpatara. (Ilu 23:20) Atụmatụ ha nwere ihe ịga nke ọma nke ukwuu nke na ha ‘gabigara ọbụna ntụgharị nile nke obi ha.’ Ha na-ekwu banyere aghụghọ ha n’ụzọ mpako “dị elu.” Lee, ‘ha doro ọnụ ha n’eluigwe, ire ha na-ejegharịkwa n’ụwa’! N’enweghị nkwanye ùgwù maka onye ọ bụla nọ n’eluigwe ma ọ bụ n’elu ụwa, ha ma na-ekwulu Chineke ma na-ekwutọ ụmụ mmadụ.
N’ụzọ doro anya, ọ bụghị nanị Esaf ka ihe ọ hụrụ na-emetụta n’ụzọ dị njọ. O kwuru, sị: “N’ihi nke a ndị ya na-alata n’ebe a, ha na-amịpụtakwara onwe ha mmiri ga-eju afọ. Ha wee sị, Chineke si aṅaa mara? Ọ̀ dịkwa ọmụma ihe dị n’Onye Kachasị Ihe Nile Elu?” (Abụ Ọma 73:10, 11) Ihe odide Hibru ahụ nwere ike ịpụta na n’ihi na o yiri ka ndị ajọ omume hà na-aba ụba, ụfọdụ n’ime ndị Chineke na-enwe echiche na-ezighị ezi, bụrụkwa ndị a na-ewebata n’otu ọnọdụ ahụ ndị na-emebi iwu nọ na ya, na-asị: ‘Chineke amaghị ihe na-emenụ, ọ gaghịkwa eme ihe megide mmebi iwu.’ N’aka nke ọzọ, ịhụ ka ndị ajọ mmadụ na-emebi iwu n’ụzọ yiri ka ọ̀ bụ na e nweghị ahụhụ ha na-ata dị ka ịṅụ ihe ọṅụṅụ dị ilu, nke na-akpali ndị ziri ezi ịjụ, sị: ‘Olee ihe mere Chineke ga-eji nagide ihe ndị a? Ọ̀ bụ na ọ dịghị ahụ ihe na-emenụ?’
N’iji ọnọdụ ya tụnyere nke ndị ajọ omume, Esaf kwuru, sị: “Lee, ndị a bụ ndị na-emebi iwu; ọzọ, ebe ha na-anọgide n’udo mgbe ebighị ebi, ha emewo ka akụ ha bukarịa ibu. Ọ bụ nanị n’efu ka m meworo ka obi m dị ọcha, n’efu ka m kwọworo ọbụ aka m abụọ n’emeghị ihe ọjọọ; bụrụkwa onye a na-eti ihe ogologo ụbọchị nile, onye ịba mba m dị kwa ụtụtụ.” (Abụ Ọma 73:12-14) Esaf chere na ọ baghị uru ibi ndụ n’ụzọ ziri ezi. Ndị ajọ omume na-aba ụba, eleghị anya ‘na-eme ka akụ ha buo ibu’ site n’ụzọ aghụghọ. O yiri ka ha na-agbanahụ ntaramahụhụ maka ajọ omume kasị njọ, ma Esaf na-enwe ihe otiti “ogologo ụbọchị nile”—site ná mgbe o tetara n’ụra ruo mgbe ọ labara ụra n’abalị. O chere na Jehova na-agbazi ya olu kwa ụtụtụ. Ebe o yiri ka nke a ezighị ezi, o tinyere okwukwe Esaf n’ule.
Ime Mgbanwe n’Echiche
N’imesị n’ikpeazụ chọpụta na echiche ya ezighị ezi, Esaf kwuru, sị: “Ọ bụrụ na a sịwo m, M ga-akọ akụkọ otú a; lee, ọ bụ ọgbọ nke ụmụ gị ka m ga-aghọgbuworị. M wee chee echiche ịmata nke a, ndọgbu onwe m n’ọrụ ka ọ bụ n’anya m; ruo mgbe m na-aba n’ebe nsọ nile nke Chineke, ghọta ikpeazụ ha. N’ezie ọ bụ n’ebe nile na-alọ alọ ka ị na-edo ha: i mewo ka ha daruo ntikpọ. Hà siri aṅaa ghọọ ebe tọgbọrọ n’efu n’otu ntabi anya? Ha agwụwo gwụsịa site n’ihe egwu dị iche iche. Dị ka nrọ mgbe mmadụ na-eteta n’ụra; otú a, Onyenwe anyị, mgbe ị ga-akpọte onwe gị, ị ga-eleda onyinyo ha anya.”—Abụ Ọma 73:15-20.
Ọ bụ ihe dị mma na Esaf ekwupụtaghị okwu mkpesa, n’ihi na ikwu n’ihu ọha na ọ baghị uru ijere Jehova ozi pụrụ ịkụdaworị mmụọ nke ndị so n’ezinụlọ ya nke ndị na-efe ofufe ma ọ bụ ọ pụrụ imebiworị okwukwe ha. Lee ka o si ka mma ịgbachi nkịtị na ime ihe Esaf mere! Iji hụ ihe mere ndị ajọ omume ji agbanahụ ahụhụ nke ajọ omume ha ebe ndị ziri ezi na-ata ahụhụ, ọ gara n’ebe nsọ nke Chineke. Gburugburu ebe ahụ nyere Esaf ohere ịtụgharị uche n’ụzọ dị jụụ n’etiti ndị na-efe Jehova, a gbanwekwara echiche ya. Ya mere taa, ọ bụrụ na ihe anyị na-ahụ juru anyị anya, ka anyị n’otu aka ahụ chọọ azịza nye ajụjụ anyị site n’iso ndị Chineke na-akpakọrịta kama ikewapụ onwe anyị.—Ilu 18:1.
Esaf mesịrị ghọta na Chineke edowo ndị ajọ omume ‘n’ebe na-alọ alọ.’ N’ihi na ndụ ha na-adabere n’ihe onwunwe, ha nọ n’ihe ize ndụ nke inwe ahụmahụ ntikpọ mberede. Ya dịkarịa anya, ha gaje ịnwụ n’oge agadi ha, akụ na ụba ha kpatara n’ụzọ ọjọọ agaghị ewetara ha ogologo ndụ karị. (Abụ Ọma 49:6-12) Ụba ha ga-adị ka nrọ na-agabiga ngwa ngwa. Ihe ọjọọ ha mere pụrụ ọbụna iwetara ha nsogbu tupu ha emee agadi ka ha nọ na-aghọrọ mkpụrụ ha kụrụ. (Ndị Galetia 6:7) Ebe ọ bụ na ha echewo azụ ha n’ebe Onye ahụ nke nanị ya pụrụ inyere ha aka nọ, ha nọ n’enweghị enyemaka, n’enweghị olileanya. Mgbe Jehova mere ihe megide ha, ọ ga-ele “onyinyo” ha anya—ọkwá na ọnọdụ ha—ná nleda anya.
Chee Mmeghachi Omume Gị Nche
N’ịbụ onye meghachiworo omume n’ụzọ na-adịghị mma n’ihe ọ hụrụ, Esaf kwetara, sị: “N’ihi na obi m na-agbarịị ụka, ọ na-adụtụkwa m ogwu n’akụrụ m abụọ. Ma mụ onwe m bụ anụ ọhịa, amaghịkwa m ihe; nanị anụ ka m bụworo n’ihu gị. Ma mụ onwe m nọ n’aka gị mgbe nile: i jidewo aka nri m. Ị ga-eji ndụmọdụ gị na-edu m, e mesịa ị ga-ejikwa nsọpụrụ nara m.”—Abụ Ọma 73:21-24.
Ibi n’ụba ihe onwunwe nke ndị ajọ omume nakwa ná nhụjuanya nke ndị ziri ezi pụrụ ime ka obi jọọ mmadụ njọ ma ọ bụ ka ọ dị ya ilu. N’ime ime—n’akụrụ ya—oké mgbagwoju anya Esaf banyere ọnọdụ nke a kpataara ya oké ihe mgbu. Site n’ụzọ Jehova si ele ihe anya, ọ ghọrọ onye dị ka anụmanụ na-adịghị eche echiche nke na-emeghachi omume ná ndabere nke mkpali nkịtị. Ma, Esaf ‘nọ n’aka Chineke mgbe nile, bụ́ onye jideworo aka nri ya.’ Ọ bụrụ na anyị emehie n’echiche anyị ma chọọ ndụmọdụ Jehova dị ka Esaf mere, Chineke ga-ejide anyị aka, iji kwadoo ma duo anyị. (Tụlee Jeremaịa 10:23.) Nanị site n’itinye ndụmọdụ ya n’ọrụ ka anyị pụrụ ịbụ ndị e dubara n’ọdịnihu obi ụtọ. Anyị pụrụ inweta mmechu ihu ruo nwa oge, ma Jehova ga-emegharị ihe nile, ‘na-anara anyị ná nsọpụrụ,’ ma ọ bụ otuto.
N’ịghọta mkpa ọ dị ịdabere n’ebe Jehova nọ, Esaf kwukwara, sị: “Ònye ka m nwere n’eluigwe ma ọ́ bụghị gị? Ma ọ bụghị gị ọ dịghị onye ihe ya tọworo m ụtọ n’ụwa. Anụ ahụ m na obi m agwụsịwo: oké nkume nke obi m na òkè m ka Chineke bụ ruo mgbe ebighị ebi. N’ihi na, lee, ndị nọ gị n’ebe dị anya ga-ala n’iyi: i kpochapụwo onye ọ bụla nke na-apụ n’aka gị akwa iko. Ma mụ onwe m, ịbịaru Chineke nso dị m mma: edowo m ebe mgbaba m n’Onyenwe anyị, bụ́ Jehova, ka m wee kọọ akụkọ banyere ije ozi gị nile.”—Abụ Ọma 73:25-28.
Dị ka Esaf, anyị enweghị onye ọzọ e wezụga Jehova bụ́ onye anyị ga-adabere na ya maka ezi ịnọ ná ntụkwasị obi na nkasi obi. (2 Ndị Kọrint 1:3, 4) Ya mere kama inwe ekworo maka akụ na ụba elu ala nke onye ọzọ, ka anyị na-ejere Chineke ozi ma na-akpakọ akụ n’eluigwe. (Matiu 6:19, 20) Inwe ọnọdụ dị mma n’anya Jehova kwesịrị ịbụ ihe kasị enye anyị obi ụtọ. Ọbụna ma à sị na anụ ahụ na obi anyị akwụsị ịrụ ọrụ, ọ ga-agba anyị ume ma mee ka obi anyị guzosie ike ka anyị wee ghara inwe ndakpọ olileanya na obi ike n’oge ihe isi ike. Inwe mmekọrịta chiri anya n’ebe Jehova nọ bụ ihe onwunwe dị oké ọnụ ahịa. Ikwe ka o funahụ anyị ga-akpata ọdachi nye anyị nakwa ndị nile na-agbahapụ ya. Ya mere, dị ka Esaf, ka anyị bịaruo Chineke nso ma tụkwasị ya nchegbu anyị nile. (1 Pita 5:6, 7) Nke a na-akwalite ọdịmma ime mmụọ anyị ma na-akpali anyị ịkọrọ ndị ọzọ banyere ọrụ nile dị ebube nke Jehova.
Nọgidesie Ike n’Ihe nye Jehova
O nyere Esaf nsogbu n’obi n’ihi na ọ hụrụ ndị ajọ omume ka ha na-enwe ihe onwunwe bara ụba n’Israel, bụ́ obodo ya. N’etiti ndị ohu Jehova na-anọgidesi ike n’ihe, e nwere “ndị na-emebi iwu” ndị aka ha dị n’ịnya isi, mpako, ime ihe ike, ịkwa emo, na aghụghọ, bụ́ ndị na-ekwetaghịkwa na Chineke maara ihe ha na-eme. (Abụ Ọma 73:1-11) Lee ịdọ aka ná ntị nke ahụ bụ! Iji mee ihe na-atọ Jehova Chineke ụtọ, anyị aghaghị izere igosipụta àgwà ndị dị ka nganga, ime ihe ike, ịkwa emo, na emeghị ihe n’eziokwu. Dị ka Esaf, ka ndị ohu Jehova nile ‘bata n’ebe nsọ nile nke Chineke’ site n’iso ndị na-efe Ya ofufe na-anọgidesi ike n’ihe na-ezukọta mgbe nile. N’ezie, ka ndị nile hụrụ Jehova n’anya ‘bịaruo Chineke nso,’ na-adabere n’ebe ọ nọ maka ịkwado ha n’oge nhụjuanya, n’agbanyeghị ihe ndị ọzọ pụrụ ikwu ma ọ bụ ime.—Abụ Ọma 73:12-28; 3 Jọn 1-10.
N’ezie, ụba ihe onwunwe nke ndị ajọ omume pụrụ itinye okwukwe anyị n’ule, dị ka o tinyere nke Esaf. Ma, anyị pụrụ ịtachi obi n’ọnwụnwa nke a ma ọ bụrụ na anyị etinye ndụ anyị n’ozi Jehova. A ga-akwụghachi anyị ụgwọ maka ime nke a n’ihi na ‘Chineke abụghị onye ajọ omume ichezọ ọrụ anyị na ịhụnanya anyị gosiri n’ebe aha ya dị.’ (Ndị Hibru 6:10) Ọnwụnwa anyị ga-adị ‘mfe dịkwa nwa oge’ ma e jiri ya tụnyere ụgwọ ọrụ anyị. (2 Ndị Kọrint 4:17) Ọbụna ihe dị ka 70 ma ọ bụ 80 afọ nke nhụjuanya dị ka nkupụ ume nkịtị na-agabiga n’egbugbere ọnụ anyị ma anyị kwuo okwu n’olu dị nta mgbe e ji ya tụnyere ndụ obi ụtọ ebighị ebi nke Jehova kwere ndị ohu ya na-anọgidesi ike n’ihe ná nkwa.—Abụ Ọma 90:9, 10.
Ka anyị ghara ikwe mgbe ọ bụla ka ụba ihe onwunwe nke ndị ajọ omume n’iji ya tụnyere ahụhụ anyị na-ata n’ihi ezi omume gbochie anyị igosipụta okwukwe nke bụ mkpụrụ nke mmụọ nsọ Chineke. (Ndị Galetia 5:22, 23; 1 Pita 3:13, 14) Ọ ga-eme Setan obi ụtọ ma ọ bụrụ na anyị eṅomie ndị ajọ omume, bụ́ ndị na-abakarị ụba n’ihi na ha na-eme omume rụrụ arụ. Kama nke ahụ, ka anyị nye aha Jehova nsọpụrụ site n’iguzogide ọnwụnwa ndị na-eme ka anyị gbahapụ ụkpụrụ ezi omume ya nile. (Zefanaịa 2:3) Ka anyị ghara inwe ịda mbà n’obi n’ihi ọganihu nke ndị ajọ omume, n’ihi na, ya karịsịa, ha pụrụ inweta nanị ụba ihe onwunwe. Oleekwa uru nke ahụ bara? Ọ dịghịkwa ebe o ruru ọbụna ma e jiri ya tụnyere ụba ihe ime mmụọ nke ndị na-egosipụta okwukwe n’Eze Onyenwe anyị bụ́ Jehova na-enweta.