“O Yighị Nnọọ Ka Anyị Pụrụ Inwe Nkwurịta Okwu!”
MICHAEL, onye ọkà iwu, bụ onye ọ dị mkpa ịbụ onye maara ka e si ekwu okwu n’ụzọ na-ekpo ọkụ. Ọrụ ya mere ka ọ dị mkpa. Ma mgbe afọ 16 nke alụmdi na nwunye gasịrị, a manyere Michael ịghọta na mgbe ọ lakwutere nwunye ya, bụ́ Adrian n’ụlọ, ọ na-eyi ka nkà nkwurịta okwu ya na-efunyụ anya. “Imegharị mkpesa, ịchọgharị okwu, ibogharị ebubo,” ka Michael na-echeta, “mụ na Adrian na-enwekarị nghọtahie, echekwara m na ọ ga-eme ka ike gwụ anyị. O juru m anya ma nke ahụ ọ bụkwa alụmdi na nwunye, ịnọgide na-agba égbè ọnụ nke enweghị afọ ojuju na mkpasu iwe. Ọ bụrụ na nke ahụ bụ ihe mụ na ya gaje ịhụ ná ndụ anyị fọrọ afọ, achọrọ m isepụ aka—anaghị egwuri egwu. Apụghị m nnọọ ịnagide afọ 20, 30, 40 nke ụdị mkpasu iwe na ihe isi ike dị otú ahụ na-apụta mgbe nile.”
Ọ bụghị nanị Michael na Adrian na-enwe ụdị mmetụta dị otú ahụ. Ọ bụ ihe a na-ahụ ná ndụ nye ọtụtụ di na nwunye bụ́ ndị mmekọrịta ha bụ nke a lụtụ ọgụ a gbatụ nkịtị. Nkwurịta okwu nkịtị na-aghọ égbè ọnụ. Ha “na-anụ” ihe ndị a na-ekwughị. Ha na-ekwu ihe ndị ha na-ezubeghị. Ha na-alụ ọgụ ma na-ebo ebubo, mgbe ahụ ha na-amalite iburu onwe ha iwe n’obi. Ha adịghị ekewa, ma ha abụghịkwa “otu anụ ahụ” n’ezie. (Jenesis 2:24) Mmekọrịta ahụ adịghị aga nke ọma. Ịla azụ ga-apụta ikewa; ịga n’ihu ga-apụta iji isi koro nsogbu. Iji zere ihe mgbu nke nhọrọ nke ọ bụla, di na nwunye ndị a na-ekpebi onye ọ bụla ịgawara onwe ya n’ụzọ na-agaghị emejọ mmetụta nke onye ọ bụla n’ime ha.
Ọ dị mkpa ka di na nwunye ndị dị otú ahụ ‘nweta ezi ndụmọdụ’ n’alụmdi na nwunye ha. (Ilu 1:5) Ndụmọdụ nke a dị n’Okwu Chineke, bụ́ Bible. Akwụkwọ ozi nke abụọ Pọl degaara Timoti na-egosi na Bible “bakwara uru iji zie ihe, na iji tụọ mmadụ mmehie ha n’anya, na iji mee ka uche mmadụ guzozie.” (2 Timoti 3:16) Nke ahụ na-aghọ eziokwu n’ịgwọta ndakpọ e nwere ná nkwurịta okwu alụmdi na nwunye, dị ka anyị gaje ịhụ.