Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w93 8/1 p. 4-8
  • Nkwurịta Okwu—Karịrị Ikwu Nanị Okwu

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Nkwurịta Okwu—Karịrị Ikwu Nanị Okwu
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Igosi Ezi Uche
  • Ịghọta Oge Gara Aga
  • Mgbe Oge Gara Aga Bụ nke Mmetọ
  • Iwe Ji Ya Dị Ka Ọnyà
  • Ihe Iri Ahụ Na-emebi Nkwurịta Okwu
  • Idozi Nsogbu
  • Ihe Karịrị Ntachi Obi
  • Ihe Ndị Ga-enyere Gị Aka Iso Di Ma Ọ Bụ Nwunye Gị Na-ekwurịta Okwu
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
  • A Pụrụ Ịzọpụta Alụmdi na Nwunye Gị!
    Teta!—2001
  • Na-akwanyere Di Gị Ma Ọ Bụ Nwunye Gị Ùgwù
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
  • Ndị Di na Nwunye, Na-ekwurịtanụ Okwu nke Ọma Ka Unu Dịkwuo ná Mma
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
w93 8/1 p. 4-8

Nkwurịta Okwu—Karịrị Ikwu Nanị Okwu

CHEEDỊ echiche otu ìgwè ndị njem na-ekiri otu mbara ala mara mma. Ọ bụ ezie na ndị nọ n’ìgwè ahụ na-ahụ otu ihe nkiri ahụ, onye ọ bụla na-ahụ ya n’ụzọ dị iche. N’ihi gịnị? N’ihi na onye nke ọ bụla nwere ụzọ dị iche o si ele ihe anya. Ọ dịghị mmadụ abụọ na-eguzo kpọmkwem n’otu ebe. Ọzọkwa, ọ bụghị mmadụ nile na-elekwasị anya n’otu akụkụ nke ihe nkiri ahụ. Onye ọ bụla na-achọta akụkụ dị iche nke na-akpali akpali karịsịa.

Nke ahụ bụkwa eziokwu n’ime alụmdi na nwunye. Ọbụna mgbe ha kwekọrọ onwe ha nke ukwuu, ọ dịghị mmadụ abụọ na-enwe kpọmkwem otu echiche n’ihe. Di na nwunye na-enwe ọdịiche n’ihe ndị dị ka ọdịdị mmetụta uche, ahụmahụ e nwere na nwata, na mmetụta ezinụlọ. Nghọta ndị ahụ na-eyighị onwe ha nke si na ya apụta pụrụ ịkpata esemokwu dị ilu. Pọl onyeozi kwuru hoo haa, sị: “Ndị na-alụ di na nwunye ga-enwe ihe mgbu na mwute.”​—⁠1 Ndị Kọrint 7:28, The New English Bible.

Nkwurịta okwu gụnyere mgbalị ịchịkọta ọdịiche ndị a n’ime mmekọrịta nke otu anụ ahụ. Nke a chọrọ iwepụta oge ikwurịta okwu. (Lee igbe dị na peji nke 7.) Ma o metụtara ọtụtụ ihe karịa nke ahụ.

Igosi Ezi Uche

Otu ilu Bible na-asị: “Obi onye maara ihe na-eme ka ọnụ ya nwee uche, ọ na-atụkwasịkwara egbugbere ọnụ ya abụọ mmụta.” (Ilu 16:23) Okwu Hibru a sụgharịrị ebe a ịbụ ‘na-eme ka e nwee uche’ pụtara ịma ihe, iji nlezianya tụlee ihe n’uche. Ya mere, ebe bụ isi nke nkwurịta okwu dị irè bụ obi, ọ bụghị ọnụ. Onye na-enwe nkwurịta okwu nke ọma aghaghị ịbụ onye na-eme ihe karịrị ikwu okwu; ọ ghaghị ịbụ onye na-eji ọmịiko na-aṅa ntị. (Jemes 1:19) Ọ ghaghị ịghọta mmetụta na ihe iseokwu dị n’okpuru àgwà elu elu nke onye ọ na-alụ.​—⁠Ilu 20:5.

N’ụzọ dị aṅaa? Mgbe ụfọdụ a pụrụ imezu nke a site n’ịtụle ọnọdụ ndị gbara esemokwu ahụ gburugburu. Onye ị na-alụ ọ̀ nọ n’okpuru oké nrụgide mmetụta uche ma ọ bụ nke anụ ahụ? Ọrịa ò so na-akpata ọnọdụ uche nke onye ị na-alụ? “Lee ihe ọṅụ ọ bụ ịchọta nnọọ okwu kwesịrị ekwesị maka oge kwesịrị ekwesị!” ka Bible na-ekwu. (Ilu 15:23, Today’s English Version) Ya mere ịtụle ọnọdụ ndị ahụ ga-enyere gị aka ime ihe kwesịrị ekwesị.​—⁠Ilu 25:11.

Otú ọ dị, ọtụtụ mgbe, ihe kpatara esemokwu gbanyere mkpọrọgwụ n’ihe ndị na-emetụtaghị ọnọdụ ndị dị ugbu a.

Ịghọta Oge Gara Aga

Ahụmahụ ndị e nwere ná nwata na-eme ihe dị ukwuu n’ịkpụzi echiche anyị ma anyị too. Ebe ndị bụ di na nwunye na-esite n’ezinụlọ dị iche iche, echiche ndị na-emegide onwe ha aghaghị ịdị.

Otu akụkọ e dekọrọ na Bible na-eme ihe atụ nke a. Mgbe e bughachiri igbe ọgbụgba ndụ ahụ na Jerusalem, Devid gosipụtara ịnụ ọkụ n’obi ya n’ihu ọha. Ma gịnị banyere nwunye ya, bụ́ Maịkal? Bible na-akọ, sị: “Maịkal nwa nwanyị Sọl lepụrụ anya na window, hụ eze, bụ́ Devid, ka ọ na-awụli, na-etekwa egwú, n’ihu Jehova; o wee leda ya anya n’obi ya.”​—⁠2 Samuel 6:​14-⁠16.

Maịkal gosipụtara ọnọdụ uche nke enweghị okwukwe nke nna ya onye ajọ omume, bụ́ Sọl. Ndị na-akọwa Bible bụ́ C. F. Keil na F. Delitzsch na-atụ aro na nke a bụ ihe mere e ji kpọọ Maịkal n’amaokwu nke 16 “nwa nwanyị Sọl” kama ịbụ nwunye Devid. Otú o sina dị, esemokwu dị n’etiti ha na-eme ka o doo anya na Devid na Maịkal enweghị otu echiche banyere ihe omume nke a na-enye ọṅụ.​—⁠2 Samuel 6:​20-⁠23.

Ihe atụ nke a na-egosi na mmetụta nzuzo nke sitere n’ụzọ e si zụlite mmadụ pụrụ ime ka di na nwunye lee ihe anya n’ụzọ dị nnọọ iche. Nke a bụ eziokwu ọbụna ma ọ bụrụ na ha abụọ dị n’otu n’ijere Jehova ozi. Dị ka ihe atụ, onye bụ nwunye, nke a na-enyeghị nkwado mmetụta uche zuru ezu mgbe ọ dị na nwata pụrụ igosipụta mkpa pụrụ iche nke ukwuu maka inweta nnwapụta na mmesi obi ike. Nke a pụrụ iju di ya anya. “Apụrụ m ịgwa ya na m hụrụ ya n’anya otu narị ugbo,” ka di pụrụ ikwu, “ma n’agbanyeghị nke ahụ ọ gaghị ezu!”

N’ihe banyere nke a, nkwurịta okwu gụnyere ‘ile anya ọ bụghị n’ihe nke aka gị nanị, kamakwa n’ihe nke mmadụ ibe gị.’ (Ndị Filipaị 2:4) Iji na-enwe nkwurịta okwu, onye bụ di aghaghị ile nwunye ya anya site n’ịghọta oge ya gara aga kama ịbụ site n’oge nke ya onwe ya. Otú ọ dịkwa, e kwesịrị ịkpali onye bụ nwunye imekwa otu ihe ahụ maka di ya.​—⁠1 Ndị Kọrint 10:24.

Mgbe Oge Gara Aga Bụ nke Mmetọ

Mmasị onwe onye dị mkpa karịsịa mgbe e dinaworo onye ị na-alụ n’ike ma ọ bụ metọọ ya n’ụzọ mmekọahụ n’oge ọ dị na nwata​—⁠n’ụzọ dị mwute, nke a bụ nsogbu na-amụba amụba n’oge a. Dị ka ihe atụ, onye bụ nwunye pụrụ ịchọpụta na n’oge mmekọahụ, ọ pụghị ịkpa ókè n’etiti oge ugbu a na oge gara aga, di ya na onye mwakpo ahụ, ma ọ bụ mmekọrịta mmekọahụ na mmetọ mmekọahụ. Nke a pụrụ ịkụda mmụọ, karịsịa ma ọ bụrụ na onye bụ di adịghị atụle ihe isi ike nke a site n’ụzọ nwunye ya si ele ihe anya.​—⁠1 Pita 3:8.

Ọ bụ ezie na ị pụghị imegharị ihe gaworo aga ma ọ bụ gwọta mmetụta ya kpam kpam, ị pụrụ ime ihe dị ukwuu iji kasie onye ị na-alụ nke na-eru újú obi. (Ilu 20:5) N’ụzọ dị aṅaa? “Unu ndị bụ di kwesịrị ịgbalị ịghọta ndị nwunye unu na ha bi,” ka Pita dere. (1 Pita 3:7, Phillips) Ịghọta ahụmahụ oge gara aga nke onye ị na-alụ bụ akụkụ dị mkpa nke nkwurịta okwu. Ma e nweghị ọmịiko obi ebere, okwu gị agaghị aba uru.

Jisọs ‘nwere ọmịiko’ mgbe ọ na-ezute ndị na-arịa ọrịa, ọ bụ ezie na ọ dịghị mgbe ya onwe ya nweworo ahụmahụ nke ihe na-arịa ha. (Matiu 14:14) N’otu aka ahụ, ọ pụrụ ịbụ na gị onwe gị enwebeghị ahụmahụ nke otu ụdị nleda anya ma ọ bụ mmetọ ahụ dị ka nwunye gị, ma kama ile ihe mgbu ya anya dị ka obere ihe, nakwere ahụmahụ ya nke oge gara aga, nyekwa ya nkwado gị. (Ilu 18:13) Pọl dere, sị: “Ma anyị onwe anyị, bụ́ ndị nwere ike, anyị aghaghị ibu adịghị ike nile nke ndị na-enweghị ike, na ịghara ime ihe na-atọ onwe anyị ụtọ.”​—⁠Ndị Rom 15:1.

Iwe Ji Ya Dị Ka Ọnyà

Alụmdi na nwunye dị ka ụgbọ dị oké ọnụ ahịa. Mgbe e ji ịkwa iko mebie ya, mmerụahụ na-enweghị atụ na-ewere ọnọdụ. (Ilu 6:32) N’eziokwu, ọ bụrụ na onye nke aka ya dị ọcha ekpebie ịgbaghara, a pụrụ ijikọta iberibe ndị ahụ nile site n’ikpezi okwu. Ma mgbawa ndị ahụ na-anọgide, n’oge a na-arụkwa ụka, a pụrụ inwe ọchịchọ ilenye anya ná mgbawa ndị ahụ na iji ihe gaworo aga mere ngwá ọgụ.

Iwe na-abụkarị mmeghachi omume maka ekwesịghị ntụkwasị obi nke onye mmadụ na-alụ. Ma ọ bụrụ na ị gbagharawo onye ị na-alụ, nọrọ na nche megide ikwe ka ọnụma dị gị n’obi mebie ezi ihe ahụ nke i mere site n’ịgbaghara. Ma iwe ahụ ọ̀ nọ na-asụ gị asụ n’ime obi ma ọ bụ bụrụ nke a wụsara n’emeghị ebere, ịnọgide na-ebu iwe n’obi na-emerụ di na nwunye ahụ. N’ihi gịnị? Otu onye dọkịta tụrụ aro, sị: “Ọ bụrụ na onye ị na-alụ mere ihe were gị iwe, ọ bụ n’ihi na ị ka nwere mmasị n’ebe ọ nọ. Ya mere site n’ịnọrọ onwe gị ma ọ bụ site n’ịchọ ka i megwara, ọ bụghị nanị na ị na-emerụ onye ị na-alụ ahụ kama ị na-ebibi onwe gị. Ị ga-agakwa n’ihu ịkwatu mmekọrịta ahụ nke ị chọrọ ka o zuo ezu.”

Ee, ọ dịghị nnọọ otú ị pụrụ isi dozie nsogbu ndị dị n’alụmdi na nwunye gị n’emeghị ka iwe gị dajụọ. Ya mere, n’oge mgbe ọ na-adịghị onye iwe ji, soro onye ị na-alụ tụlee mmetụta gị. Kọwaa ihe mere o ji wute gị, ihe dị gị mkpa iji bụrụ onye e mesiri obi ike, na ihe ị ga-eme iji chebe mmekọrịta ahụ. Ya adịla mgbe ị ga-eji ihe gaworo aga mee ihe dị ka ngwá ọgụ iji merie n’arụmụka.

Ihe Iri Ahụ Na-emebi Nkwurịta Okwu

Alụmdi na nwunye na-enwe ihe isi ike nke ukwuu mgbe di ma ọ bụ nwunye na-eji ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya ma ọ bụ ọgwụ na-eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi. Onye nke na-enweghị ihe riworo ya ahụ pụrụ ịnọ n’ọnọdụ yiri nke Abigail, dị ka a kọrọ na Bible. Ọ bụ ezie na di ya bụ́ Nebal ‘ṅụbigara mmanya ókè nke ukwuu,’ Abigail na-agbasi mbọ ike imegharị ihe ndị si n’àgwà amaghị ihe ya pụta. (1 Samuel 25:​18-31, 36) Alụmdi na nwunye nke otu onye nwere nsogbu ihe iri ahụ ma onye nke ọzọ nọrọ na-eme mgbalị ịgbanwe àgwà nke onye ahụ ihe riri ahụ na-eyikarị ezinụlọ nke Nebal na Abigail.a

N’ụzọ kwere nghọta, a na-enweta oké izu ike mgbe onye ihe riri ahụ malitere ịgbake. Ma nke a bụ nanị mmalite. Cheedị echiche oké ifufe nke kpatara mbibi n’otu obere obodo. Ọtụtụ ụlọ na-adakpọ, osisi na-esi n’úkwù fopu, waya telifon na-adatusị. A na-enwe oké ọṅụ mgbe ifufe ahụ kwụsịrị. Ma ugbu a ọrụ ndozi dị ukwuu dị mkpa. Otu ihe ahụ bụ eziokwu mgbe di ma ọ bụ nwunye malitere ịgbake. Mmekọrịta dakpọrọ adakpọ aghaghị ịbụ nke a rụzigharịrị arụzi. Ntụkwasị obi na iguzosi ike n’ezi ihe aghaghị ịbụ nke e weghachiri. Ọ dị mkpa ka e wughachi usoro nkwurịta okwu. Nye onye ihe riri ahụ nke na-eme mgbanwe, nrụzigharị nke a ji nwayọọ na-eme bụ akụkụ nke “mmadụ ọhụrụ” ahụ nke Bible chọrọ ka ndị Kraịst zụlite. Mmadụ ọhụrụ nke a aghaghị ịgụnye ‘mmụọ ahụ nke na-eme ya uche unu dị ọhụrụ.’​—⁠Ndị Efesọs 4:​22-⁠24.

Ọmụmụ Bible nyeere Leonard na Elaine aka ịkwụsị iji ọgwụ ọjọọ eme ihe, ma mmụọ ahụ nke na-eme ka uche dị ọhụrụ amalitebeghị ịrụ ọrụ n’ụzọ zuru ezu.b N’oge na-adịghị anya iri ahụ ndị ọzọ pụtara ìhè. “Ruo afọ 20, anyị gbalịrị itinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ na inwe alụmdi na nwunye na-enye afọ ojuju, ma ọ nọgidere na-esiri anyị ike omume,” ka Elaine kwuru. “Iri ahụ anyị gbara mkpọrọgwụ miri emi. Anyị enweghị ike iji ọmụmụ ihe ma ọ bụ ekpere kwụsị ha.”

Leonard and Elaine chọrọ ndụmọdụ iji ghọta ihe na-akpata iri ahụ ha. Isiokwu bịara n’oge nke sitere n’aka “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche” banyere mmetọ ụmụaka, aṅụrụma, na ịkwanyere ụmụ nwanyị ùgwù abụwo enyemaka pụrụ iche.c (Matiu 24:​45-⁠47) “E nyeworo anyị aka idozi ihe ahụ mebirinụ ma mezie mmekọrịta anyị,” ka Elaine kwuru.

Idozi Nsogbu

Rebeka nwetara oké ihe mgbu n’ihi ndị nwunye nwa ya nwoke bụ́ Ịsọ. N’ịtụ egwu na nwa ya nwoke nke ọzọ, bụ́ Jekọb, ga-agbaso ihe nlereanya nke Isọ, Rebeka kwupụtara nkụda mmụọ ya site n’ịgwa di ya, bụ́ Aịsak, sị: “Ike ndụ m agwụsịwo m site n’ihu ụmụ ndị inyom Het: ọ bụrụ na Jekọb lụrụ nwunye sitere n’ụmụ ndị inyom Het, dị ka ndị a, bụ́ site n’ụmụ ndị inyom ala nke a, uru gịnị ka ndụ baara m?”​—⁠Jenesis 27:46.

Rịba ama na ọ bụ ezie na Rebeka kwusiri okwu ike banyere mmetụta ya, ọ gwaghị Aịsak n’onwe ya okwu ọjọọ. Ọ sịghị, “Ọ bụ gị ka ụta dịịrị!” ma ọ bụ, “I kwesịrị ịma ihe a ga-eme n’ọnọdụ nke a!” Kama nke ahụ, Rebeka ji nnọchiaha ahụ bụ “m” mee ihe ịkọwa ụzọ nsogbu ahụ si metụta ya. Omume nke a kpaliri ọmịiko Aịsak, ọ bụghị ọchịchọ ya nke ichebe ùgwù ya. N’ịbụ onye na-echeghị na a gwara ya okwu ọjọọ, o doro anya na mmeghachi omume Aịsak n’ihe Rebeka rịọrọ bụ nke na-egbughị oge.​—⁠Jenesis 28:​1, 2.

Ndị di na nwunye pụrụ ịmụta ihe site n’ihe nlereanya Rebeka. Mgbe esemokwu bilitere, lụsonụ nsogbu ahụ ọgụ kama ịlụso onwe unu ọgụ. Dị ka Rebeka, kwupụta nkụda mmụọ gị site n’ụzọ o si metụta gị. “Enwere m nkụda mmụọ n’ihi na . . .” ma ọ bụ, “Echere m na a ghọtahiere m n’ihi na . . .” dị irè nke ukwuu karịa “Ị na-eme ka m nwee nkụda mmụọ!” ma ọ bụ, “Ọ dịghị mgbe ị na-aghọta m!”

Ihe Karịrị Ntachi Obi

Alụmdi na nwunye nke mmadụ abụọ mbụ ahụ, bụ́ Adam na Iv, nọruru ọtụtụ narị afọ, na-amụpụta ezinụlọ nke ọtụtụ ụmụ nwoke na ụmụ nwanyị. (Jenesis 5:​3-⁠5) Ma nke a apụtaghị na alụmdi na nwunye ha bụ ihe kwesịrị nṅomi. Ná mmalite, mmụọ nke nnwere onwe na nleda anya maka iwu ezi omume nile nke Onye Okike mebiri ihe nkekọ otu anụ ahụ ha.

N’otu aka ahụ, alụmdi na nwunye n’oge a pụrụ ịbụ nke nọworo ogologo oge, ma ghara inwe isi ihe ndị dị mkpa ná nkwurịta okwu. Ọ pụrụ ịdị mkpa ka e kpochapụ echiche ọjọọ nile siri ike na àgwà ọdịdị mmadụ ndị na-ezighị ezi. (Tụlee 2 Ndị Kọrint 10:​4, 5.) Nke a bụ usoro ọzụzụ na-aga n’ihu n’ihu. Ma mgbalị e tinyere na ya ga-aba uru. Jehova Chineke nwere mmasị miri emi na ndokwa alụmdi na nwunye, ebe ọ bụ Onye Okike ya. (Malakaị 2:​14-⁠16; Ndị Hibru 13:4) Ya mere, ọ bụrụ na anyị emee òkè anyị, anyị pụrụ inwe obi ike na ọ ga-achọpụta mgbalị anyị ma nye anyị amamihe na ume dị mkpa iji gwọta ndakpọ ọ bụla dị ná nkwurịta okwu alụmdi na nwunye.​—⁠Tụlee Abụ Ọma 25:4, 5; 119:34.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a A tụlere enyemaka maka ezinụlọ ndị aṅụrụma ná mbipụta nke Teta! August 8, 1992, peji nke 3-⁠7.

b A gbanwewo aha ndị ahụ.

c Lee mbipụta Teta! nke October 8, 1991 [Bekee], August 8, 1992, na October 8, 1992.

[Igbe dị na peeji nke 6]

“E wepụtaara ihe mkpofu oge ka ukwuu!”

A JỤRỤ otu di na nwunye na-enwe ihe isi ike alụmdi na nwunye ka ha kwuo oge ole ha na-etinye n’ịwụfu ihe mkpofu ha kwa izu. Azịza ha bụ ihe dị ka 35 minit kwa izu, ma ọ bụ minit 5 kwa ụbọchị. Mgbe ahụ a jụrụ ha oge ole ha na-etinye n’ikwurịta okwu. Nke ahụ juru di ahụ anya. “E wepụtaara ihe mkpofu oge ka ukwuu!” ka ọ kwuru, na-ekwukwa, sị: “Anyị na-agbọgbu onwe anyị ma ọ bụrụ na anyị echee na minit ise kwa ụbọchị zuru ezu iji jigide alụmdi na nwunye. Ọ bụghịkwa oge zuru ezu n’ezie iji mee ka alụmdi na nwunye ahụ too.”

[Igbe dị na peeji nke 7]

Guzobe Ụkpụrụ Nduzi

◻ Tụlee otu isiokwu n’otu mgbe (1 Ndị Kọrint 14:​33, 40)

◻ Kwupụta mmetụta; ebola ebubo (Jenesis 27:⁠46)

◻ Etila ihe (Ndị Efesọs 5:​28, 29)

◻ Akpọla iyi (Ilu 26:⁠20)

◻ Zube ikpezi, ọ bụghị imeri (Jenesis 13:​8, 9)

[Foto dị na peeji nke 4]

Mgbe esemokwu bilitere, lụsonụ nsogbu ahụ ọgụ kama ịlụso onwe unu ọgụ

[Foto dị na peeji nke 8]

Kwupụta mmetụta; ebola ebubo

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya