Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w93 9/15 p. 7-8
  • Papias Jiri Okwu Onyenwe Anyị Kpọrọ Ihe

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Papias Jiri Okwu Onyenwe Anyị Kpọrọ Ihe
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ụzọ Nlezianya
  • Ihe Ndị O Dere
  • Nkọwa n’Oziọma Ndị Ahụ
  • Ịma Mkpa Ime Mmụọ Ya
  • Apọkalips—È Kwesịrị Ịtụ Ya Egwu Ka E Kwesịrị Ile Anya Ya?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Ndị Nna Okwukwe Mgbe Ochie Hà Kụziri Ozizi Ndịozi n’Ezie?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
  • ‘Zere Ihe Ọmụma—Nke A Na-akpọ Otú Ahụ n’Ụzọ Ụgha’
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Akụkụ nke 2—Ndị Nna Chọọchị Hà Kụziri Ozizi Atọ n’Ime Otu?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
w93 9/15 p. 7-8

Papias Jiri Okwu Onyenwe Anyị Kpọrọ Ihe

“ENWEGHỊ m mmasị . . . ná ndị nwere ọtụtụ ihe ikwu, kama ndị kụzịrị ihe bụ eziokwu.” Otú a ka Papias dere, onye sị na ya bụ onye Kraịst na narị afọ nke abụọ nke Oge Anyị.

Papias biri ndụ n’oge sochiri ozugbo ọnwụ ndị ozi Jisọs Kraịst gasịrị. N’ezie, ọ bụ onye ya na Polycarp kpakọrịtara, bụ́ onye a sịrị na ọ mụtara ihe n’ọnụ Jọn onyeozi. Ihe nnwapụta ndị a, tinyere ụzọ Papias si enweta ihe ọmụma, mere ka o yie ka o nwere ezi ihe ọmụma.

Ụzọ Nlezianya

Akpịrị ịkpọ nkụ Papias maka eziokwu pụtara nnọọ ìhè n’akwụkwọ ise mejupụtara ihe o dere banyere ihe Onyenwe anyị kwuru. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na n’afọ ya ndị mbụ, Papias chịkọtara ọtụtụ okwu nke eziokwu ọ nụworo. E mesịa, site n’ebe obibi ya n’obodo Hierapọlis nke Frijia, n’Asia Minor, Papias jụrụ ndị meworo okenye ajụjụ iji mata ma ha ahụtụwo ma ọ bụ nụ okwu nke otu n’ime ndị ozi Jisọs. O ji ịnụ ọkụ n’obi jụọ ha ajụjụ ma detuo ihe ha nwere ikwu.

Papias kọwara, sị: “M gaghị ala azụ idetu . . . ihe ọ bụla m ji nlezianya mụta n’oge ọ bụla site n’aka ndị okenye ahụ, jirikwa nlezianya cheta, na-eme ka i jide ịbụ eziokwu ha n’aka. N’ihi na enweghị m mmasị, dị ka ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ndị mmadụ, ná ndị nwere ọtụtụ ihe ikwu, kama ndị kụziri ihe bụ eziokwu; enweghịkwa m mmasị ná ndị na-enyeghachi iwu ndị ọzọ nyere, kama ndị na-akọ ndị nke Onyenwe anyị nyere maka okwukwe ahụ ma na-esite n’eziokwu ahụ n’onwe ya. Ọ bụrụkwa na m ga-ezute onye ọ bụla bụ́ onye bụworo onye na-eso ụzọ ndị okenye ahụ, m ga-ajụ maka ihe ndị okenye ahụ kọrọ—ihe Andru ma ọ bụ ihe Pita kwuru, ma ọ bụ ihe Filip ma ọ bụ ihe Tọmas ma ọ bụ Jemes, ma ọ bụ ihe Jọn ma ọ bụ Matiu kwuru, ma ọ bụ ndị ọ bụla ọzọ na-eso ụzọ Onyenwe anyị.”

Ihe Ndị O Dere

Ihe ịrụ ụka adịghị ya na Papias nwere ike inweta ụba nke ihe ọmụma ime mmụọ. Anyị pụrụ nanị iche n’echiche otú o si ṅasie ntị ike n’ihe ndị gbara ndụ onwe onye na ozi nke onye ozi nke ọ bụla gburugburu. Ihe dị ka na 135 O.A., Papias deturu ihe o nwere ịkọ n’akwụkwọ nke ya. Ọ bụ ihe mwute na akwụkwọ a efuwo. Irenaeus, bụ́ onye sị na ya bụ onye Kraịst na narị afọ nke abụọ O.A., nakwa ọkọ akụkọ ihe mere eme nke narị afọ nke anọ bụ́ Eusebius, hotara ya. N’ezie, a ka na-agụ ya na narị afọ nke 9 O.A., ọ pụrụ ịdịwokwa ruo narị afọ nke 14.

Papias kwere n’Ọchịchị Narị Afọ Iri Kraịst nke na-abịa. (Mkpughe 20:2-7) Dị ka Irenaeus kwuru, o dere banyere oge “mgbe ihe e kere eke, e mere ka ọ dị ọhụrụ, tọhapụkwa ya, ga-amị ụdị nri nile n’ụba, site n’igirigi nke eluigwe na ike ime nri nke ala, dị nnọọ ka ndị okenye ahụ, ndị hụrụ Jọn, onye na-eso ụzọ Onyenwe anyị, kọrọ na ha anụwo otú Onyenwe anyị si ezi ihe banyere oge ndị ahụ.” Papias dekwara, sị: “Nye ndị kwere ekwe ihe ndị a bụ eziokwu. Mgbe Judas, onye nraranye ahụ, jụkwara ikwere ma jụọ sị, ‘Olee otú Onyenwe anyị ga-esi mepụta ihe dị otú ahụ?’ Onyenwe anyị sịrị, ‘Ndị ruru oge ahụ ga-ahụ.’”

Papias dere ihe mgbe Nkụzi Ejighị n’Aka ma Chineke Ọ̀ Dị jupụtara ebe nile. Ndị Na-ejighị n’Aka ma Chineke Ọ̀ Dị kekọtara nkà ihe ọmụma, ịkọ nkọ, na ihe omimi ịgọ mmụọ na Iso Ụzọ Kraịst si n’ezi ofufe dapụ. N’ezie, mkpughepụ nke echiche, ma ọ bụ okwu Onyenwe anyị nke Papias, bụ mgbalị ịkwụsị mgbasa nke Nkụzi Ejighị n’Aka ma Chineke Ọ̀ Dị. Mgbe ọ nwụsịrị, Irenaeus gara n’ihu n’iguzogide ime nsọ nsọ ụgha nke Ndị Na-ejighị n’Aka ma Chineke Ọ̀ Dị. Akwụkwọ na-akwado Ejighị n’Aka ma Chineke Ọ̀ Dị aghaghị ibuworị ibu, na-akpali izo aka ịkwa emo nke Papias zoro n’ebe “ndị na-ekwu ọtụtụ okwu” nọ. Ebumnobi ya doro anya—iji eziokwu kwugide ụgha.—1 Timoti 6:4; Ndị Filipaị 4:5.

Nkọwa n’Oziọma Ndị Ahụ

N’iberibe ihe odide dị iche iche nke Papias bụ́ ndị ka dị adị, anyị na-ahụ izo aka n’ihe ndekọ nke Matiu na Mak dere. Dị ka ihe atụ, Papias na-ekwu banyere ihe ndekọ Mak, sị: “Mak, ebe ọ ghọworo onye na-atụgharịrị Pita okwu, deturu n’izi ezi ihe nile o chetara.” Ịgbakwu akaebe maka izi ezi nke Oziọma nke a, Papias gara n’ihu, sị: “Ya mere Mak edehieghị ihe ọ bụla, ọ bụ ezie na ọ na-ede ihe ụfọdụ dị ka o si cheta ha; n’ihi na o bu n’uche na ya agaghị ahapụ ihe ọ bụla ọ nụrụ, ma ọ bụ detuo okwu ụgha ọ bụla n’ime ya.”

Papias nyere ihe àmà ndị sitere n’èzí nke na Matiu detuburu Oziọma ya n’asụsụ Hibru. Papias sịrị: “O dere okwu ndị ahụ n’asụsụ Hibru, onye ọ bụla tụgharịkwara ya otú kasị mma o nwere ike.” Ọ pụrụ ịbụ na Papias zoro aka n’ihe ndekọ Oziọma ndị nke Luk na Jọn, nakwa n’ihe odide ndị ọzọ nke Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst. Ọ bụrụ otú ahụ, ọ ga-abụ otu n’ime ndị akaebe kasị ochie na-egosi izi ezi ha na ha isite n’ike mmụọ nsọ Chineke. Otú ọ dị, ọ bụ ihe mwute na nanị ntakịrị iberibe ole na ole nke ihe ndị Papias dere ka dị.

Ịma Mkpa Ime Mmụọ Ya

Dị ka onye nlekọta n’ọgbakọ dị na Hierapọlis, Papias bụ onye nnyocha ike na-adịghị agwụ agwụ. Tinyere ịbụ onye nnyocha na-arụsi ọrụ ike, o gosipụtara mmasị miri emi maka Akwụkwọ Nsọ. Papias kpebiri n’izi ezi na okwu ozizi ọ bụla nke Jisọs Kraịst ma ọ bụ ndị ozi Ya kwuru ga-aba uru nke ukwuu ịkọwa ya karịa okwu ọ bụla a na-ejighị n’aka a na-achọta n’akwụkwọ ndị e nwere n’ụbọchị ya.—Jud 17.

A kọrọ na e gburu Papias n’ihi okwukwe ya na Pagamọm na 161 ma ọ bụ 165 O.A. A pụghị ikwu kpọmkwem ókè hà aṅaa nkụzi Jisọs Kraịst nwere mmetụta miri emi ná ndụ na akparamagwa Papias. Ma, o nwere ọchịchọ dị mma ịmụta na ịtụle Akwụkwọ Nsọ. Otú ahụ ka ọ dị ezi ndị Kraịst taa, n’ihi na ha maara mkpa ha nwere n’ime mmụọ. (Matiu 5:3) Dịkwa ka Papias ha ji ihe Onyenwe anyị kwuru kpọrọ ihe.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya