Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w93 10/1 p. 15-20
  • “Gwupụta Ala Obi M, Chineke”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “Gwupụta Ala Obi M, Chineke”
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Lee Ka Echiche Nile nke Chineke Si Dị Oké Ọnụ Ahịa!
  • Ịkpọ Ihe Jehova Kpọrọ Asị Asị
  • Mgbe Chineke Na-egwupụta Ala Obi Anyị
  • Jehova Maara Anyị Nke Ọma!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Chineke Ọ̀ Maara Gị N’ezie?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Nweta Obi nke Dị Ka Jehova Si Chọọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
  • Chebe Obi Gị
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
w93 10/1 p. 15-20

“Gwupụta Ala Obi M, Chineke”

“Gwupụta ala obi m, Chineke, wee mara obi m: . . . durukwa m n’ụzọ ebighị ebi.”—ABỤ ỌMA 139:23, 24.

1. Olee ụzọ Jehova si emeso ndị ohu ya ihe?

ANYỊ nile na-enwe mmasị ịbụ ndị onye nwere nghọta, onye na-echeba echiche n’ọnọdụ anyị, onye na-enye aka mgbe anyị mejọrọ, onye na-adịghị achọ n’aka anyị ihe anyị na-agaghị emenwu, mesoro ihe. Jehova Chineke na-emeso ndị ohu ya n’ụzọ dị otú a. Abụ Ọma 103:14 na-asị: “Ya onwe ya maara otú a kpụworo anyị; ọ na-echeta na ájá ka anyị bụ.” Jisọs Kraịst kwa, bụ́ onye yiri Nna ya n’ụzọ zuru okè, nyere ọkpụkpọ òkù ahụ na-ekpo ọkụ, sị: “Bịakwutenụ m, unu nile ndị na-adọgbu onwe unu n’ọrụ, ndị e bowokwara ibu dị arọ, mụ onwe m ga-emekwa ka unu zuru ike. Nyaranụ yoke nke m n’olu unu, [ma ọ bụ, “Soronụ m nọrọ n’okpuru yoke nke m,” (NW), ntụala ala ala peji] mụtakwanụ ihe n’ọnụ m; n’ihi na abụ m onye nwayọọ na onye wedatara onwe ya ala n’obi: unu ga-ahụkwa izu ike nye mkpụrụ obi unu. N’ihi na yoke nke m adịghị egbu mgbu, ibu m dịkwa mfe.”—Matiu 11:28-30.

2. Gosi ọdịiche dị n’etiti echiche Jehova na nke ụmụ mmadụ banyere (a) Jisọs Kraịst, na (b) ndị na-eso ụzọ Kraịst.

2 Ụzọ Jehova si ele ndị ohu ya anya na-adịkarị iche pụọ na nke ụmụ mmadụ. Ọ na-ele ihe anya site n’ụzọ dị iche ma na-atụle akụkụ ndị ọ pụrụ ịbụ na ndị ọzọ amaghị ihe ọ bụla banyere ya. Mgbe Jisọs Kraịst jegharịrị n’elu ala, “e ledara ya anya, ọ bụkwa onye mmadụ hara aka.” Ndị na-etinyeghị okwukwe na ya dị ka Mesaịa “wee ghara ịgụ ya n’ihe.” (Aịsaịa 53:3; Luk 23:18-21) Ma, n’anya Chineke, ọ bụ “Ọkpara [Chineke] hụrụ n’anya,” bụ́ onye Nna ya sịrị: “Ihe gị dị m ezi mma.” (Luk 3:22; 1 Pita 2:4) N’etiti ndị na-eso ụzọ Jisọs Kraịst e nwere ndị e lere anya na ha dị ala n’ihi na ha dara ogbenye n’ihe onwunwe ma na-atachi obi n’oké mkpagbu. Ma, n’anya Jehova na Ọkpara ya, ndị dị otú ahụ pụrụ ịbụ ọgaranya. (Ndị Rom 8:35-39; Mkpughe 2:9) N’ihi gịnị ka e ji nwee ọdịiche n’ụzọ e si ele ihe anya?

3. (a) N’ihi gịnị ka echiche Jehova banyere ndị mmadụ ji adịkarị iche n’ebe nke ụmụ mmadụ dị? (b) N’ihi gịnị ka o ji dị oké mkpa nye anyị inyocha ụdị mmadụ anyị bụ n’ime?

3 Jeremaịa 11:20 zaghachiri, sị: “Jehova . . . na-anwa akụrụ na obi.” Ọ na-ahụ ihe anyị bụ n’ime, ọbụna akụkụ nile nke ọdịdị mmadụ anyị ndị zoro ezo n’anya ndị ọzọ. Ná nnyocha ya, ọ na-elekwasị anya n’ụzọ bụ isi n’àgwà na ọnọdụ ndị dị mkpa n’iso ya nwee ezi mmekọrịta, ndị kasị baa uru n’ụzọ na-adịgide adịgide nye anyị. Anyị ịmara nke ahụ na-emesi obi ike; ọ bụkwa ihe na-akpali ntụgharị uche. Ebe Jehova na-atụkwasị uche n’ihe anyị bụ n’ime, ọ dị mkpa ka anyị nyochaa ihe anyị bụ n’ime ma ọ bụrụ na anyị gaje ịghọ ụdị mmadụ ndị ọ chọrọ n’ime ụwa ọhụrụ ya. Okwu ya na-enyere anyị aka ime nnyocha dị otú ahụ.—Ndị Hibru 4:12, 13.

Lee Ka Echiche Nile nke Chineke Si Dị Oké Ọnụ Ahịa!

4. (a) Gịnị kpaliri onye ọbụ abụ ahụ ikwupụta na echiche nile nke Chineke dị oké ọnụ ahịa nye ya? (b) N’ihi gịnị ka ha kwesịrị iji dị oké ọnụ ahịa nye anyị?

4 Mgbe ọ tụgharịsịworo uche n’ịdị obosara na ịdị omimi nke ihe ọmụma Chineke nwere banyere ndị ohu ya, tinyekwara n’ikike pụrụ iche nke Chineke iwepụta enyemaka ọ bụla pụrụ ịdị ha mkpa, onye ọbụ abụ bụ́ Devid dere, sị: “Lee ka echiche gị nile si dị oké ọnụ ahịa n’anya m.” (Abụ Ọma 139:17a) Echiche ndị ahụ, ndị e kpughere n’Okwu ya e dere ede, dị elu nke ukwuu karịa ihe ọ bụla sitere n’aka ụmụ mmadụ, n’agbanyeghị otú echiche ha pụrụ isi yie nke amamihe. (Aịsaịa 55:8, 9) Echiche nile nke Chineke na-enyere anyị aka ilekwasị anya n’ihe ndị dị mkpa n’ezie ná ndụ na ịnụ ọkụ n’obi n’ozi ya. (Ndị Filipaị 1:9-11) Ha na-egosi anyị ụzọ isi na-ele ihe anya n’ụzọ Chineke si ele ha. Ha na-enyere anyị aka ịgwa onwe anyị eziokwu, iji obi eziokwu nakwere ụdị onye anyị bụ n’ezie n’obi. Ị̀ dị njikere ime nke ahụ?

5. (a) Gịnị ka Okwu Chineke na-agba anyị ume ichebe ‘karịa ihe nile’? (b) Olee ụzọ ihe ndekọ Bible banyere Ken pụrụ isi baara anyị uru? (ch) Ọ bụ ezie na anyị anọghị n’okpuru Iwu Mosis, olee ụzọ o si enyere anyị aka ịghọta ihe na-atọ Jehova ụtọ?

5 Ụmụ mmadụ na-achọkarị itinye oké mmasị n’ọdịdị elu ahụ, ma Akwụkwọ Nsọ na-adụ anyị ọdụ, sị: “Karị ihe ndebe gị nile chebe obi gị.” (Ilu 4:23) Ma site n’ụkpụrụ na ihe atụ dị iche iche, Bible na-enyere anyị aka ime nke ahụ. Ọ na-agwa anyị na Ken ji nnọọ ka e mezuo iwu chụọ àjà nye Chineke ma n’ime obi ya jupụta n’iwe, mgbe ahụ ịkpọasị, n’ebe nwanne ya Ebel nọ. Ọ na-agbakwa anyị ume ka anyị ghara ịdị ka ya. (Jenesis 4:3-5; 1 Jọn 3:11, 12) Ọ dekọrọ ihe Iwu Mosis chọrọ maka nrubeisi. Ma ọ na-emesikwa ike na ihe Iwu ahụ kasị chọọ n’aka mmadụ bụ na ndị na-efe Jehova aghaghị ịhụ ya n’anya site n’obi, uche, mkpụrụ obi, na ume ha dum; ọ na-ekwukwa na nke na-esote n’ịdị mkpa bụ iwu ahụ bụ ka ha hụ ndị agbata obi ha n’anya dị ka onwe ha.—Deuterọnọmi 5:32, 33; Mak 12:28-31.

6. N’itinye Ilu 3:1 n’ọrụ, ajụjụ dị aṅaa ka anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị?

6 N’Ilu 3:1, a na-agba anyị ume ọ bụghị nanị idebe ihe nile Chineke nyere n’iwu kama ijide n’aka na nrubeisi ahụ bụ ngosipụta nke ihe dị anyị n’obi n’ezie. N’otu n’otu ọ dị mkpa ka anyị jụọ onwe anyị sị, ‘Nke ahụ ọ̀ bụ eziokwu banyere nrubeisi m nye ihe ndị Chineke chọrọ m n’aka?’ Ọ bụrụ na anyị achọpụta na n’ihe ụfọdụ mkpali ma ọ bụ echiche anyị nwere ihe kọrọ ya—ọ dịghịkwa onye ọ bụla n’ime anyị pụrụ ikwu na anyị enweghị ntụpọ—mgbe ahụ ọ dị mkpa ka anyị jụọ sị, ‘Gịnị ka m na-eme iji meziwanye ọnọdụ ahụ?’—Ilu 20:9; 1 Jọn 1:8.

7. (a) Olee ụzọ nkatọ Jisọs katọrọ ndị Farisii na Matiu 15:3-9 pụrụ isi nyere anyị aka n’ichebe obi anyị? (b) Ọnọdụ ndị dị aṅaa pụru ịchọ n’aka anyị ime ihe ndị dị ike iji nye uche na obi anyị ọzụzụ?

7 Mgbe ndị Farisii bụ́ ndị Juu mere ka à ga-asị na ha na-enye Chineke otuto ma jiri aghụghọ na-akwalite omume nke ọdịmma onwe onye kpaliri, Jisọs katọrọ ha dị ka ndị ihu abụọ ma gosi na ofufe ha bụ n’efu. (Matiu 15:3-9) Jisọs dọkwara aka ná ntị na iji mee ihe na-atọ Chineke ụtọ, bụ́ onye na-ahụ obi, o zughị ezu ịdị ndụ nke ọdịdị omume ọma ma n’otu oge ahụ, iji nweta mkpalị ahụ ụtọ, anyị na-anọgidekwa na-eche echiche ndị rụrụ arụ. Ọ pụrụ ịdị mkpa ka anyị mee ihe ndị pụtara ìhè iji nye uche na obi anyị ọzụzụ. (Ilu 23:12; Matiu 5:27-29) Ọzụzụ dị otú ahụ dịkwa mkpa ma ọ bụrụ na n’ihi ọrụ ego anyị, ihe mgbaru ọsọ agụmakwụkwọ anyị, ma ọ bụ nhọrọ anyị nke ntụrụndụ, anyị na-aghọ ndị na-eṅomi ụwa, na-ekwere ka ọ kpụzie anyị dị ka ụkpụrụ ya si dị. Ka anyị ghara ichefu mgbe ọ bụla na Jemes onye na-eso ụzọ kpọrọ ndị na-ekwu na ha bụ ndị Chineke ma bụrụ ndị chọrọ ịbụ ndị enyi nke ụwa “ndị na-akwa iko.” N’ihi gịnị? N’ihi na “ụwa dum na-atọgbọkwa n’aka ajọ onye ahụ.”—Jemes 4:4; 1 Jọn 2:15-17; 5:19.

8. Iji rite uru zuru ezu site n’echiche nile dị oké ọnụ ahịa nke Chineke, gịnị ka ọ dị mkpa ka anyị mee?

8 Iji wee rite uru zuru ezu site n’echiche Chineke n’ihe ndị a na ndị ọzọ, ọ dị mkpa ka anyị setịpụ oge iji na-agụ ha ma ọ bụ na-anụ ha. Karịa nke ahụ, ọ dị mkpa ịmụ ha, ikwu okwu banyere ha, na ịtụgharị uche na ha. Ọtụtụ ndị na-agụ Ụlọ Nche mgbe mgbe na-abịa nzukọ ọgbakọ nke Ndịàmà Jehova, ebe a na-atụle Bible. Ha na-azụchapụta oge site ná nchụso ndị ọzọ iji nwee ike ime ya. (Ndị Efesọs 5:15-17) Ihe ha na-enweta ná nkwụghachi bara uru nke ukwuu karịa akụ ihe onwunwe. Nke ahụ ọ́ bụghị mmetụta gị?

9. N’ihi gịnị ka ụfọdụ ndị na-aga nzukọ ndị Kraịst ji enwe ọganihu ngwa ngwa karịa ndị ọzọ?

9 Otú ọ dị, ụfọdụ ndị na-abịa nzukọ ndị a na-enwe ọganihu ime mmụọ ngwa ngwa karịa ka ndị ọzọ na-enwe. Ha na-etinye eziokwu ahụ n’ọrụ n’ụzọ zuru ezu karị ná ndụ ha. Gịnị na-akpata nke a? Ọtụtụ mgbe, isi ihe na-akpata ya bụ ịdị uchu ha n’ọmụmụ ihe onwe onye. Ha na-aghọta na ọ bụghị achịcha ka anyị ji adị ndụ; nri ime mmụọ kwa ụbọchị dị nnọọ mkpa dịkwa ka iri nri nkịtị mgbe mgbe. (Matiu 4:4; Ndị Hibru 5:14) Ya mere ha na-agba mbọ itinye ọ dịkarịa ala oge ụfọdụ kwa ụbọchị ịgụ Bible ma ọ bụ akwụkwọ ndị na-akọwa ya. Ha na-akwadebe maka nzukọ ọgbakọ, na-amụ ihe mmụta ndị dị na ha tupu oge ma na-achọta akụkụ akwụkwọ nsọ dị na ha. Ha na-eme ihe karịrị ịgụ ihe odide ahụ; ha na-atụgharị uche na ya. Usoro ọmụmụ ihe ha gụnyere ichesi echiche ike banyere mmetụta nke ihe ha na-amụta kwesịrị inwe ná ndụ onwe ha. Ka ọnọdụ ime mmụọ ha na-eto, ha na-amalite inwe mmetụta dị ka onye ọbụ abụ ahụ bụ́ onye dere, sị: “Lee ka m si hụ iwu gị n’anya! . . . Oké ọrụ ka ihe àmà gị nile bụ.”—Abụ Ọma 1:1-3; 119:97, 129.

10. (a) Ruo ogologo oge hà aṅaa ka ọ bara uru ịnọgide na-amụ Okwu Chineke? (b) Olee ụzọ Akwụkwọ Nsọ si na-egosi nke a?

10 Ma ànyị amụwo Okwu Chineke ruo otu afọ, afọ 5, ma ọ bụ 50 afọ, ọ dịghị mgbe ọ na-aghọ nanị mmegharị ihe—ọ bụghị ma ọ bụrụ na echiche nile nke Chineke dị oké ọnụ ahịa nye anyị. N’agbanyeghị ókè onye ọ bụla n’ime anyị mụtaworo ihe site n’Akwụkwọ Nsọ, e nwere ọtụtụ ihe nke anyị na-amaghị. “Chineke! Lee ka ọnụ ọgụgụ nile ha si dị ukwuu hie nne!” ka Devid kwuru. “Ọ bụrụ na agụọ m ha ọnụ, ha bara ụba karị ájá.” Echiche nile nke Chineke karịrị ihe anyị ga-enwe ike ịgụta. Ọ bụrụ na a sị anyị jiri ụbọchị nile gụọ echiche nile nke Chineke ma nọrọ n’ime nke ahụ hie ụra, mgbe anyị tetara n’ụtụtụ, a ka ga-enwe ọtụtụ a ga-eche banyere ha. Otú a, Devid dere, sị: “Mgbe m tetaworo, mụ na gị na-anọgide.” (Abụ Ọma 139:17, 18) Ruo mgbe nile ebighị ebi a ga-enwe ọtụtụ ihe anyị ga-amụta banyere Jehova na ụzọ ya nile. Ọ dịghị mgbe anyị ga-erute n’ókè ebe anyị ga-amaracha ihe nile.—Ndị Rom 11:33.

Ịkpọ Ihe Jehova Kpọrọ Asị Asị

11. N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa ọ bụghị nanị ịmara echiche Chineke kamakwa inwe ụdị mmetụta ya?

11 Ọmụmụ anyị na-amụ Okwu Chineke abụghị nanị maka iji mejupụta isi anyị n’ihe ọmụma. Ka anyị na-ekwere ka ọ bamie n’obi anyị, anyị na-amalitekwa inwe ụdị mmetụta Chineke na-enwe. Lee ka nke ahụ si dị mkpa! Ọ bụrụ na anyị azụliteghị ụdị mmetụta ahụ, gịnị pụrụ isi na ya pụta? Ọ bụ ezie na anyị pụrụ inwe ike ikwughachi ihe Bible kwuru, anyị pụrụ, otú o sina dị, ile ihe a machibidoro iwu anya dị ka ihe kwesịrị ekwesị, ma ọ bụ anyị pụrụ iche na ihe a chọrọ anyị n’aka bụ ibu arọ. Ọ bụ eziokwu na ọbụna à sị na anyị kpọrọ ihe ọjọọ asị, anyị pụrụ ịnọ n’ọgụ na mgba n’ihi ezughị okè mmadụ. (Ndị Rom 7:15) Ma ọ bụrụ na anyị etinyesighị mgbalị ike ime ka ihe anyị bụ n’ime kwekọọ n’ihe ziri ezi, ànyị pụrụ ịtụ anya ime ihe na-atọ Jehova ụtọ, bụ́ “onye na-anwa obi”?—Ilu 17:3.

12. Ruo ókè hà aṅaa ka ịhụnanya Chineke na ịkpọasị Chineke bụ ihe dị mkpa?

12 Ịkpọasị yiri nke Chineke bụ nchebe dị ike megide ajọ omume, ọbụna dị ka ịhụnanya Chineke na-eme ka ime ihe ziri ezi bụrụ ihe dị ụtọ. (1 Jọn 5:3) Mgbe mgbe Akwụkwọ Nsọ na-agba anyị ume ịzụlite ma ịhụnanya ma ịkpọasị. “Unu ndị na-ahụ Jehova n’anya, kpọọnụ ihe ọjọọ asị.” (Abụ Ọma 97:10) “Na-akpọnụ ajọ ihe asị; na-arapara ezi ihe n’ahụ.” (Ndị Rom 12:9) Ànyị na-eme nke ahụ?

13. (a) Olee ekpere Devid kpere banyere mbibi nke ndị ajọ omume nke anyị kwenyere n’ụzọ zuru ezu? (b) Dị ka e gosiri n’ekpere Devid, olee ndị bụ ndị ajọ omume ahụ o kpere ekpere ka Chineke bibie?

13 Jehova ekwupụtawo nzube ya n’ụzọ doro anya ikpochapụ ndị ajọ omume n’ụwa ma webata ụwa ọhụrụ nke ezi omume ga-ebi n’ime ya. (Abụ Ọma 37:10, 11; 2 Pita 3:13) Ndị hụrụ ezi omume n’anya na-achọsi ike ka oge ahụ bịa. Ha kwetara n’ụzọ zuru ezu n’ihe onye ọbụ abụ ahụ bụ́ Devid kwuru, bụ́ onye kpere ekpere, sị: “Ọ ga-adị m nnọọ mma ma à sị na i gbuo onye na-emebi iwu, Chineke: ya mere, unu ndị ọbara, sinụ n’ebe m nọ wezụga onwe unu. Ha bụ ndị na-ekwu okwu megide gị n’ime nzube ọjọọ, ndị e buliworo nye ihe efu ka ndị iro gị bụ.” (Abụ Ọma 139:19, 20) Ọ gụghị Devid agụụ igbu ndị ajọ omume dị otú ahụ n’onwe ya. O kpere ekpere na ntaramahụhụ ha ga-abịa site n’aka Jehova. (Deuterọnọmi 32:35; Ndị Hibru 10:30) Ndị a abụghị ndị kpasuworo nnọọ Devid iwe n’onwe ya n’ihe ụfọdụ. Ha emebiwo aha Chineke, na-eji aha ya eme ihe efu. (Ọpụpụ 20:7) N’okwu ụgha, ha na-ekwu na ha na-ejere ya ozi, ma ha na-eji aha ya akwalite atụmatụ nke aka ha. Devid enweghị ịhụnanya maka ndị na-ahọrọ ịbụ ndị iro Chineke.

14. È nwere ndị ajọ omume a pụrụ inyere aka? Ya bụrụ otú ahụ, n’ụzọ dị aṅaa?

14 E nwere ọtụtụ ijeri ndị na-amaghị Jehova. Ọtụtụ n’ime ha, n’amaghị nke a na-akọ, na-eme ihe ndị Okwu Chineke gosiri na ha dị njọ. Ọ bụrụ na ha anọgide n’ụzọ nke a, ha ga-eso ná ndị ga-ala n’iyi n’oge oké mkpagbu ahụ. Ma, Jehova adịghị enwe obi ụtọ n’ọnwụ nke ndị ajọ omume, anyị ekwesịghịkwa ime otú ahụ. (Ezikiel 33:11) Ruo ókè oge nyere ohere ya, anyị na-agba mbọ inyere ndị dị otú ahụ aka ịmụta na itinye ụzọ nile nke Jehova n’ọrụ. Ma gịnị ma ọ bụrụ na ndị ụfọdụ egosi oké ịkpọasị maka Jehova?

15. (a) Olee ndị ka onye ọbụ abụ ahụ lere anya dị ka “ndị iro”? (b) Olee ụzọ anyị pụrụ isi gosi taa na anyị kpọrọ ndị na-enupụ isi megide Jehova “asị”?

15 Banyere ha, onye ọbụ abụ ahụ sịrị: “Ọ́ bụghị ndị na-akpọ gị asị, Jehova, ka m na-akpọ asị? Ọ́ bụghịkwa ndị na-ebili imegide gị ka m na-asọ oyi? Ọ bụ ịkpọasị nke zuru okè ka m ji kpọọ ha asị: ndị iro ka ha bụụrụ m.” (Abụ Ọma 139:21, 22) Ọ bụ n’ihi na ha kpọrọ Jehova asị nke ukwuu ka Devid ji lee ha anya n’ịkpọasị. A gụnyere ndị si n’ezi ofufe dapụ n’etiti ndị na-egosi ịkpọasị ha maka Jehova site n’inupụ isi megide ya. Ndapụ n’ezi ofufe bụ, n’ikwu eziokwu, nnupụisi megide Jehova. Ụfọdụ ndị si n’ezi ofufe dapụ na-ekwu na ha maara ma na-ejere Chineke ozi, ma ha na-ajụ ozizi ma ọ bụ ihe ndị a chọrọ n’aka ha, bụ́ ndị e setịpụrụ n’Okwu ya. Ndị ọzọ na-azọrọ na ha kwere na Bible, ma ha na-ajụ nzukọ Jehova ma na-agbalịsi ike igbochi ọrụ ya. Mgbe ha kpachaara anya họrọ ihe ọjọọ dị otú ahụ ka ha matasịrị ihe ziri ezi, mgbe ihe ọjọọ gbanyesiri mkpọrọgwụ ike nke na ọ bụ akụkụ a na-apụghị ikewapụ ekewapụ n’ọdịdị mmadụ ha, mgbe ahụ onye Kraịst aghaghị (n’ụzọ Bible si eji okwu ahụ eme ihe) ịkpọ ndị jụworo iwezụga onwe ha n’ihe ọjọọ asị. Ezi ndị Kraịst na-enwe ụdị mmetụta Jehova na-enwe n’ebe ndị ndị si n’ezi ofufe dapụ nọ; ha adịghị achọ ịmara echiche ndị si n’ezi ofufe dapụ. N’ụzọ megidere nke ahụ, ndị meworo onwe ha ndị iro Chineke ‘na-asọ ha oyi,’ ma ha na-ahapụrụ ya Jehova inweta ịbọ ọ́bọ̀.—Job 13:16; Ndị Rom 12:19; 2 Jọn 9, 10.

Mgbe Chineke Na-egwupụta Ala Obi Anyị

16. (a) N’ihi gịnị ka Devid ji chọọ ka Jehova gwupụta ala obi ya? (b) Gịnị banyere obi nke anyị ka anyị kwesịrị ịrịọ Chineke ka o nyere anyị aka chọpụta?

16 Devid achọghị ịdị ka ndị ajọ omume n’ụzọ ọ bụla. Ọtụtụ ndị na-agbalị izochi ihe ha bụ n’ime, ma Devid ji umeala kpee ekpere, sị: “Gwupụta ala obi m, Chineke, wee mara obi m: na-anwa m, wee mara iche uche m nile: hụkwa ma ọ dị ụzọ ọ bụla na-eweta ihe mgbu dị n’ime m, durukwa m n’ụzọ ebighị ebi.” (Abụ Ọma 139:23, 24) Mgbe ọ na-ezo aka n’ebe obi ya dị, Devid ebughị n’uche mkpụrụ obi ya nkịtị. N’ikwekọ n’ihe okwu ahụ pụtara n’ụzọ ihe atụ, o zoro aka n’ihe ọ bụ n’ime, bụ́ mmadụ ime. Anyị onwe anyị kwesịrị ịchọ ka Chineke nyochaa obi anyị ma chọpụta ma anyị nwere ọchịchọ, ịhụnanya, mmetụta, nzube, echiche, ma ọ bụ ebumnuche na-ezighị ezi. (Abụ Ọma 26:2) Jehova na-akpọ anyị òkù, sị: “Nwa m, nye m obi gị, ka ụzọ m nile tọọkwa anya gị abụọ ụtọ.”—Ilu 23:26.

17. (a) Kama ikpuchi echiche anyị, gịnị ka anyị kwesịrị ime? (b) Ò kwesịrị iju anyị anya ịchọta izu ọjọọ n’obi anyị, gịnịkwa ka anyị kwesịrị ime banyere ha?

17 Ọ bụrụ na e nwere echiche ọ bụla na-eweta ihe mgbu nke zoro ezo n’ime anyị n’ihi ọchịchọ ọjọọ ma ọ bụ ebumnuche ọjọọ ma ọ bụ n’ihi omume ọjọọ ụfọdụ n’akụkụ anyị, mgbe ahụ anyị chọrọ n’ezie ka Jehova nyere anyị aka dozie ọnọdụ ahụ. Kama ahịrị okwu bụ́ “ụzọ ọ bụla na-eweta ihe mgbu,” nsụgharị nke Moffatt ji ahịrị okwu bụ́ “ụzọ ọjọọ” mee ihe; nsụgharị The New English Bible na-asị: “Okporo ụzọ ọ bụla nke na-ewute gị [ya bụ, Chineke].” Ọ pụrụ ịbụ na anyị onwe anyị aghọtachaghị echiche anyị wee ghara ịma otú anyị ga-esi kwupụta nsogbu anyị gwa Chineke, ma ọ na-aghọta ọnọdụ anyị. (Ndị Rom 8:26, 27) O kwesịghị iju anyị anya ma e nwee izu ọjọọ n’obi anyị; ma, anyị ekwesịghị inye ha ohere. (Jenesis 8:21) Anyị kwesịrị ịchọ enyemaka Chineke iji kpochapụ ha. Ọ bụrụ na anyị hụrụ Jehova na ụzọ ya nile n’anya, anyị pụrụ ịbịakwute ya maka enyemaka dị otú ahụ na-enwe obi ike na “Chineke ka obi anyị ukwuu, ọ makwaara ihe nile.”—1 Jọn 3:19-21.

18. (a) Olee ụzọ Jehova si eduzi anyị n’ụzọ nke mgbe ebighị ebi? (b) Ọ bụrụ na anyị anọgide na-agbaso ntụziaka Jehova, ịja mma na-ekpo ọkụ dị aṅaa ka anyị pụrụ ịtụ anya inweta?

18 N’ikwekọ n’ekpere onye ọbụ abụ ahụ nke bụ ka Jehova duzie ya n’ụzọ nke mgbe ebighị ebi, Jehova n’ezie na-eduzi ndị ohu ya dị umeala, na-erube isi. Ọ na-eduzi ha ọ bụghị nanị n’ụzọ nke pụrụ ịkpata ogologo ndụ n’ihi na ha adịghị anwụchu ọnwụ n’ihi ime ajọ omume kama n’echiche nke na ụzọ ahụ na-eduga ná ndụ ebighị ebi. Ọ na-eme ka anyị ghọta mkpa anyị nwere maka uru nke àjà Jisọs nke na-ekpuchi mmehie. Site n’Okwu ya na nzukọ ya, ọ na-enye anyị ntụziaka dị mkpa ka anyị wee nwee ike ime uche ya. Ọ na-emesiri anyị ike ịdị mkpa nke ịnara enyemaka ya ka anyị wee ghọọ n’ime anyị ụdị mmadụ nke anyị na-ekwu na anyị bụ ná mpụta. (Abụ Ọma 86:11) Ọ na-agbakwa anyị ume site n’olileanya nke ahụ ike zuru okè n’ime ụwa ọhụrụ nke ezi omume ya na ndụ ebighị ebi, iji wee na-ejere ya ozi, bụ́ nanị ezi Chineke ahụ. Ọ bụrụ na anyị anọgide na-anara ntụziaka ya ná nguzosi ike n’ihe, ọ gaje, n’ihi nke ahụ, ịgwa anyị, dị ka ọ gwara Ọkpara ya, sị: “Ihe gị dị m ezi mma.”—Luk 3:22; Jọn 6:27; Jemes 1:12.

Gịnị Bụ Azịza Gị?

◻ N’ihi gịnị ka echiche Jehova banyere ndị ohu ya ji adịkarị iche n’ebe nke ụmụ mmadụ dị?

◻ Gịnị pụrụ inyere anyị aka ịghọta ihe Chineke na-ahụ mgbe o nyochara obi anyị?

◻ Ụdị ọmụmụ ihe dị aṅaa na-enyere anyị aka ịmụta ihe ọmụma na ichebe obi anyị?

◻ N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa ọ bụghị nanị ịmara ihe Chineke na-ekwu kama inwe mmetụta yiri nke ya?

◻ N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji kpee ekpere n’onwe anyị, sị: “Gwupụta ala obi m, Chineke, wee mara obi m”?

[Foto dị na peeji nke 16]

Mgbe ị na-amụ ihe, gbaa mbọ ime ka echiche na mmetụta Chineke bụrụ nke gị

[Foto dị na peeji nke 18]

Echiche nile nke Jehova “bara ụba karịa ájá”

[Ebe E Si Nweta Foto]

Pictorial Archive (Near Eastern History) Est.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya